< Izikiel 8 >
1 Nʼafọ nke isii, nʼọnwa nke isii, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, mgbe mụ onwe m nọdụ ala nʼụlọ m, ndị okenye Juda na-anọdụkwa ala nʼihu m, aka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ nʼebe ahụ.
A shekara ta shida, a wata shida a ranar ta biya, yayinda nake zaune a gidana dattawan Yahuda kuma suna zaune a gabana, hannun Ubangiji Mai Iko Duka ya zo a kaina a can.
2 Ahụrụ m oyiyi yiri mmadụ. Akụkụ oyiyi a nke dị site nʼụkwụ ya ruo nʼala ya na-acha dịka ọkụ, sitekwanụ nʼụkwụ ya rigoo, ọ na-egbu nnọọ amụma dịka nkume amba dị oke ọnụahịa.
Na duba, sai na ga siffa kamar na mutum. Daga kwankwaso zuwa ƙasa ya yi kamar wuta, kuma daga kwankwaso zuwa sama kamanninsa ya yi haske yana ƙyalli kamar ƙarfe mai haske.
3 Oyiyi a setịpụrụ ihe dịka aka mmadụ, jiri ya jide m nʼagịrị isi m. Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu nʼetiti ala na mbara eluigwe. Nʼime ọhụ nke Chineke, o buuru m jee Jerusalem, nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼugwu, nʼime ogige ya, ebe arụsị ahụ na-akpasu ekworo guzo.
Ya miƙa abin da ya yi kamar hannu ya kama a gashin kaina. Ruhu ya ɗaga ni tsakanin sama da ƙasa, a cikin wahayoyi kuma Allah ya ɗauke ni zuwa Urushalima, zuwa ƙofa zuwa gabas na cikin fili, inda gunki mai tsokanar kishi yake tsaye.
4 Ma, lee, ebube Chineke Izrel jupụtara nʼebe ahụ, dị ka m si hụ ya na mbụ na ndagwurugwu.
A can gabana kuwa ga ɗaukakar Allah na Isra’ila, kamar a wahayin da na gani a fili.
5 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, welie anya gị lee nʼụzọ nke ugwu.” Eweliri m anya m lee nʼụzọ ugwu, ma lee, nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ebe ịchụ aja, ahụrụ m oyiyi arụsị ekworo ka o guzo nʼakụkụ ugwu ya.
Sai ya ce mini, “Ɗan mutum, duba waje arewa.” Sai na duba, a mashigin arewa na ƙofar bagaden kuwa na ga wannan gunki na tsokanar kishi.
6 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị na-ahụ ihe ha na-eme, arụ dị egwu nke ụlọ Izrel na-eme nʼebe a, ihe ndị ga-achụpụ m nʼebe dị anya site nʼebe nsọ m? Ma ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.”
Ya kuma ce mini, “Ɗan mutum, ka ga abin da suke yi, abubuwan banƙyamar da gidan Isra’ila ke yi a nan, abubuwan da za su kore ni daga wuri mai tsarkina? Amma za ka ga abubuwan da suka ma fi banƙyama.”
7 O mere ka m guzo nʼọnụ ụzọ ogige ahụ, mgbe m lere anya, ahụrụ m oghere dị nʼaja ụlọ ahụ.
Sa’an nan ya kawo ni mashigin filin. Na duba, na kuma ga rami a bango.
8 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ugbu a gwupuo aja ụlọ a.” Mgbe m gwupuru ya, ahụrụ m ọnụ ụzọ e si aba nʼebe ahụ.
Ya ce mini, “Ɗan mutum, yanzu ka haƙa cikin bangon.” Da na haƙa cikin bangon sai na ga ƙofar shiga a can.
9 Ọ sịrị m, “Banye nʼime ka ị hụ ihe arụ ọjọọ niile nke ha na-eme nʼebe a.”
Sai ya ce mini, “Shiga ka ga mugaye da kuma abubuwa banƙyamar da suke yi a can.”
10 Abanyere m hụ na ihe jupụtara nʼahụ ụlọ ahụ bụ naanị oyiyi e sere ese, nke ihe na-akpụ akpụ dịka agwọ dị iche iche, ngwere na anụmanụ rụrụ arụ dị iche iche, tinyekwara arụsị niile nke ụlọ Izrel na-efe.
Na kuwa shiga na duba, sai na ga zāne-zāne ko’ina a bangon na kowane irin abubuwa masu rarrafe da kuma dabbobi masu ƙazanta da dukan gumakan gidan Isra’ila.
11 Nʼihu ihe ndị a, ka iri ndị okenye asaa nke ụlọ Izrel, ha na Jaazanaya nwa Shefan guzo nʼebe ahụ. Onye ọbụla nʼime ha ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼaka ya, anwụrụ ọkụ si nʼihe nsure ọkụ ndị a na-agbagokwa elu.
A gabansu ga dattawa saba’in na gidan Isra’ila tsaye a cikinsu, Ya’azaniya ɗan Shafan kuwa yana tsaye a cikinsu. Kowa yana da farantin ƙona turare a hannunsa, tulin hayaƙin turare mai ƙanshi ya tunnuƙe zuwa sama.
12 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụla ihe ndị okenye ụlọ Izrel na-eme nʼọchịchịrị, onye ọbụla nʼime ụlọ ya nʼihu arụsị ya? Ma ha na-asị, ‘Onyenwe anyị adịghị ahụ anyị, O sitela nʼala anyị wezuga onwe ya.’”
Ya ce mini, “Ɗan mutum, ka ga abin da dattawan gidan Isra’ila suke yi a cikin duhu, kowa yana a ɗakin tsafin gunkinsa? Suna cewa, ‘Ubangiji ba ya ganinmu; Ubangiji ya yashe ƙasar.’”
13 Ọzọ, ọ sịrị m, “Ị ga-ahụkwa oke ihe arụ karịrị ndị a ha na-eme!”
Ya kuma ce, “Za ka gan su suna yin abubuwan da suka fi waɗannan banƙyama.”
14 O mere ka m bịakwa nʼọnụ ụzọ ahụ dị nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼebe ahụ, ahụrụ m ndị inyom nọ na-akwa akwa nʼihi Tamuz, chi ha.
Sa’an nan ya kawo ni mashigin arewa na ƙofar gidan Ubangiji, sai na ga mata zaune a can, suna makokin Tammuz.
15 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ị hụla ihe ndị a, nwa nke mmadụ? Ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.”
Ya ce mini, “Ɗan mutum, ka ga wannan? Za ka ga abubuwan da suke masu banƙyama fiye da wannan.”
16 O mere ka m baa nʼime ogige dị nʼime ụlọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼebe ahụ, nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼagbata ebe ịchụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, ka ihe ruru iri mmadụ abụọ na ise guzo, chee ihu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-efe anyanwụ. Ha gbakụtara ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị azụ mgbe ha na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ na-akpọ isiala nye anyanwụ.
Sa’an nan ya kawo ni cikin fili na cikin gidan Ubangiji, a can kuwa a ƙofar haikali, tsakanin shirayi da bagade, akwai kamar mutum ashirin da biyar. Suka ba haikalin Ubangiji baya suna fuskanta wajen gabas, suna rusuna wa rana a gabas.
17 Ọ sịrị m, “Ị hụla nke a, nwa nke mmadụ? Ọ bụ ihe dị nta nye ụlọ Juda, bụ ime ihe arụ niile ndị a ha na-eme nʼebe a? Ha ga-ejikwa ihe ike mejupụta ala, siri otu a na-akpasu m iwe mgbe niile? Lee ka ha si nọgide na-akparị m, na-etinye alaka nʼimi ha.
Ya ce mini, “Ka ga wannan, ɗan mutum? Ƙaramin abu ne gidan Yahuda su yi abubuwan banƙyamar da suke yi a nan? Dole ne su cika ƙasar da rikici su kuma ci gaba da tsokane ni in yi fushi? Dube su suna tsokanata!
18 Nʼihi ya, aga m eme ka ha nụrụ ụfụ iwe m, ọ dịkwaghị onye m ga-ahapụ. Ọ bụrụkwa na ha anọgide na-ebe akwa nʼoke olu, agaghị m aṅa ha ntị.”
Saboda haka zan hukunta su cikin fushi; Ba zan dube su da tausayi ko kuwa in ƙyale su ba. Ko da yake suna ihu a kunnuwana, ba zan saurare su ba.”