< Izikiel 7 >
1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
La parole du Seigneur me fut adressée en ces termes:
2 “Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ala Izrel: “‘Ọgwụgwụ! Ọgwụgwụ abịakwasịla akụkụ anọ nke ala ahụ.
"O toi, fils de l’homme, ainsi a parlé le Seigneur Dieu au pays d’Israël: Fin! La fin est venue pour les quatre coins du pays.
3 Ugbu a ka ọgwụgwụ bịakwasịrị unu. Lee, aga m eme ka iwe m bịakwasị unu; aga m ekpe unu ikpe dịka omume unu si dị, aga m ata unu ahụhụ maka arụ unu niile.
Maintenant la fin est sur toi, je déchaînerai ma colère contre toi, je te jugerai selon tes voies, et ferai retomber sur toi toutes tes abominations.
4 Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ, agaghị m emekwara gị ebere, kama aga m ata unu ahụhụ maka omume unu na arụ niile dị nʼetiti unu. “‘Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
Et mon oeil ne te prendra pas en pitié, je n’aurai pas de compassion, car je ferai retomber sur toi ta conduite, et tes abominations se manifesteront au milieu de toi, et vous saurez que je suis l’Eternel."
5 “Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “‘Oke mbibi, oke mbibi nke a na-anụbeghị ụdị ya mbụ. Lee, ka ọ na-abịa.
Ainsi a dit le Seigneur Dieu: "Un malheur, voici qu’un malheur est venu!
6 Ọgwụgwụ abịala! Ọgwụgwụ abịala! Ọ kpalitela onwe ya imegide unu. Lee, ka ọ na-abịa!
La fin est venue, elle est venue la fin, elle s’est éveillée contre toi, voilà qu’elle est venue!
7 Oke nsogbu abịakwasịla gị, gị onwe gị bi nʼala ahụ. Oge ahụ abịala! Ụbọchị ahụ dịkwa nso! Ọgbaaghara dị ebe niile, ọ bụghị ọṅụ dị nʼelu ugwu niile.
L’Aurore s’est levée sur toi, habitant du pays, le temps est arrivé; il est proche, le jour; c’est le désarroi et non les clameurs joyeuses sur les montagnes.
8 Ejikerela m ịwụkwasị gị ọnụma m nʼahụ mee ka oke iwe m zuo gị ahụ niile. Aga m ekpe gị ikpe dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ gị niile.
Maintenant, sans retard, je déverserai mon courroux sur toi et j’épuiserai contre toi ma colère; je te jugerai selon tes voies, et te chargerai de toutes tes abominations.
9 Agaghị m emere gị ebere, agakwaghị m ahapụ ịta gị ahụhụ. Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ niile nke dị nʼetiti unu. “‘Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-eti unu ihe ndị a.
Mon regard ne s’attendrira pas et je n’aurai pas pitié; selon tes voies je te punirai, et tes abominations se manifesteront dans ton sein, vous saurez ainsi que c’est moi l’Eternel 'qui frappe.
10 “‘Lee, ụbọchị ahụ! Lee, ka ọ na-abịa! Oke nsogbu enupụtala, mkpanaka agbala okoko nganga amaala ifuru!
Voici le jour! Voici qu’elle vient, qu’elle pointe, l’aurore; la verge a fleuri, l’impudence est éclose.
11 Ihe ike ebilitala, mkpọrọ eji ata ndị ajọ omume ahụhụ. O nweghị onye ọbụla nʼime ha nke ga-afọdụ, maọbụ igwe mmadụ maọbụ ụba ha, o nweghịkwa nke bara uru.
La violence se dresse en verge vengeresse de l’iniquité, rien d’eux ne reste, ni de leur richesse, ni de leur multitude, pas même de plaintes à leur sujet.
12 Mgbe ahụ abịala! Ụbọchị ahụ abịakwala nso. Ka onye na-azụ ahịa ghara ịṅụrị ọṅụ ka onye na-ere ere ghara iru ụjụ, nʼihi na ọnụma ahụ dịrị igwe mmadụ niile.
Le temps est venu, le jour est arrivé; que l’acquéreur ne se réjouisse pas, que le vendeur ne se désole pas; car la colère éclate sur toute leur richesse.
13 Onye rere ahịa agaghị enwetaghachi ngwa ahịa nke erere ere ọ bụladị dịka onye rere na onye zụrụ na-adị ndụ. Nʼihi na ọhụ nke a gbasara igwe mmadụ niile bụ nke a na-apụghị ịgbanwe. Nʼihi mmehie ha niile, o nweghị onye nʼime ha nke pụrụ ichebe ndụ ya.
Car le vendeur ne rentrera plus en possession de ce qu’il a vendu, même s’il demeure encore en vie, car il y a une vision contre tout leur avoir, elle ne sera pas révoquée, chacun a sa vie attachée à son péché; ils ne se maintiendront pas.
14 “‘Ha afụọla opi ike, ha edoziela ihe niile ma o nweghị onye ga-aga ibu agha nʼihi na ọnụma m dịkwasịrị igwe mmadụ ahụ niile.
Ils ont sonné de la trompette, on a préparé tout, et personne ne part en guerre, car ma colère est sur toute leur foule.
15 Mma agha dị nʼezi; ajọ ọrịa na-efe efe na ụnwụ dịkwa nʼime. Onye nọ nʼọhịa ga-anwụ site na mma agha, ndị nọ nʼime obodo ukwu ka ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịa.
Le glaive est au dehors, et la peste et la famine à l’intérieur; ceux des champs mourront par l’épée, ceux de la ville, la famine et la peste les dévoreront.
16 Ma ndị gbapụrụ agbapụ ga-agbaga nọrọ nʼugwu. Ọ bụ dịka nduru nke ndagwurugwu, ha niile ga-asụ ude akwa, onye ọbụla nʼihi mmehie ha.
Et s’il en est qui sont épargnés, ils se sauveront et ils seront sur les montagnes comme les colombes des vallées, toutes gémissantes, chacun pour son péché.
17 Aka niile ga-akụda, ikpere niile ka a ga-eji amịrị nyụdee.
Toutes les mains seront défaillantes, et tous les genoux s’en iront en eau.
18 Ha ga-eyikwasị akwa mkpe, oke ihe egwu ga-ekpuchi ha. Ọ bụkwa ihu niile ka ihere ga-ekpuchi, a ga-akpụchakwa isi niile.
Ils se ceindront de cilices, et l’épouvante les enveloppera, sur toutes les faces il y aura de la confusion et sur toutes leurs têtes de la calvitie.
19 “‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha. Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị enwe ike napụta ha nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị. Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha, maọbụ mee ka afọ ju ha, nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie.
Leur argent, ils le jetteront dans les rues, et leur or sera un objet de répulsion; leur argent et leur or ne pourront les sauver au jour de la colère du Seigneur, ils ne rassasieront pas leurs corps et leurs entrailles, ils ne les rempliront pas, car leur richesse les a fait tomber dans le crime.
20 Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga, ha jikwa ya mepụta arụsị rụrụ arụ ha dị iche iche. Ha ji ya metakwa oyiyi ihe arụ niile jọgburu onwe ya; ya mere, aga m eme ka ọ bụụrụ ha ihe rụrụ arụ.
De l’éclat de leur parure, ils ont fait un sujet d’orgueil, confectionné leurs idoles abominables, leurs horreurs; c’est pourquoi j’en fais pour eux un objet de répulsion.
21 Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha, nyekwa ya ndị ajọ omume nke ụwa dịka ihe nkwata ndị ga-emerụ ya.
Et je le donnerai en proie aux mains d’étrangers et en butin aux impies de la terre et ils le profaneront.
22 Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m ndị ohi ga-emerụkwa ebe ahụ m kpọrọ ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-abata nʼime ya merụọkwa ya.
Je détournerai d’eux ma face, et on profanera le lieu de ma retraite; des gens de rapine y pénétreront et le déshonoreront.
23 “‘Kwadoonụ ụdọ igwe. Nʼihi na ala ha jupụtara nʼigbu ọchụ na ịwụsa ọbara, obodo ahụ jupụtara nʼihe ike.
Qu’on prépare les chaînes, car le pays est plein de crimes méritant la mort et la ville est pleine d’actes de violence.
24 Aga m akpọta mba ndị ahụ jọgburu onwe ha ka ha bịa nwetara onwe ha ụlọ ha niile. Aga m eme ka mpako nke ndị bụ dike kwụsị, meekwa ka ebe nsọ ha niile bụrụ ebe e merụrụ emerụ.
J’Amènerai les plus méchants d’entre les nations et ils prendront possession de leurs maisons; je mettrai fin à l’orgueil des puissants et on s’emparera de leurs sanctuaires.
25 Mgbe ihe mmekpa ahụ bịara, ha ga-achọ udo ma o nweghị nke ga-adị.
Le frisson de la terreur survient, ils cherchent le salut, il n’en est point!
26 Mbibi ga-esochi mbibi, akụkọ na-enweghị isi ga-esochikwa akụkọ na-enweghị isi. Ha ga-agagharị na-achọ ọhụ site nʼaka onye amụma, ntụziaka onye nchụaja ga-akwụsị, ndụmọdụ nke ndị okenye agaghị adịkwa.
Il arrive désastre sur désastre, et une mauvaise nouvelle suit une mauvaise nouvelle, on sollicitera une vision du prophète, et l’enseignement échappera au pontife, et la sagesse aux vieillards.
27 Eze ga-eru ụjụ, nwa eze ga-eyikwasị ịda mba nke obi dịka uwe, aka ga-ama ndị ala ahụ niile jijiji nʼihi egwu. Aga m emeso ha dịka omume ha si dị, aga m ekpekwa ha ikpe dịka ihe ha kwenyeere si dị. “‘Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
Le roi prendra le deuil et le prince se vêtira de stupeur, et les mains du vulgaire seront prises de tremblement; je les traiterai en raison de leurs actes, je les jugerai selon leurs jugements, et ils sauront que je suis l’Eternel."