< Izikiel 6 >
1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Neno la Yahwe likanijia, likisema,
2 “Nwa nke mmadụ, chee iru gị nʼugwu niile nke nʼIzrel, buo amụma megide ha,
“Mwana wa adamu, weka uso wako dhidi ya milima ya Israeli na uwatabirie.
3 sị, ‘Unu ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị nye ugwu ukwu na ugwu nta niile, na iyi mmiri niile, na ndagwurugwu niile. Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, ga-eme ka agha bịakwasị unu, aga m ebibikwa ebe dị iche iche unu na-achụ aja.
Sema, 'Milima ya Israeli, silikilizeni neno la Bwana Yahwe! Bwana Yahwe asema hivi kwenye milima kwenye vilele, kwenye vijito na kwenye mabonde: Tazama! Naleta upanga dhidi yenu, na nitapaharibu pahali penu pa juu.
4 A ga-etikpọ ebe ịchụ aja unu, tipịa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Aga m atụsa ndị unu e gburu egbu nʼihu arụsị unu.
Kisha madhabahu zenu zitakuwa ukiwa na nguzo zenu zitaharibiwa, na nitatupa chini wafu wenu mbele ya sanamu zao.
5 Aga m atọgbọ ozu ndị Izrel nʼihu arụsị ha. Aga m aghasakwa ọkpụkpụ unu gburugburu ebe ịchụ aja unu.
Nitalaza miili iliyokufa kwa watu wa Israeli mbele ya sanamu zao, na kuitawanya mifupa yenu kuzizunguka madhabahu zenu.
6 Ebe ọbụla unu bi, a ga-etikpọ obodo ndị ahụ, tipịakwa ebe ịchụ aja niile, si otu a mee ka ebe ịchụ aja unu ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu. A ga-etipịakwa arụsị unu, kụjiekwa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ihe niile unu ji aka unu mepụta ka a ga-ekpochapụkwa.
Kila mahali utaishi, miji itaharibiwa na mahali pa juu kuangamia, hivyo basi madhabahu zenu zitaharibiwa na kufanywa ukiwa. Kisha zitavunjwa na kupotea, nguzo zenu zitaangushwa chini na kazi zenu zitafutwa mbali.
7 Ndị e gburu egbu ga-ada nʼetiti unu, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Waliokufa wataanguka chini kati yenu nanyi mtajua kwamba mimi ni Yahwe.
8 “‘Ma aga m eme ka ụfọdụ nʼime ndị m fọdụ. Ndị ahụ fọdụrụ ga-esi nʼihu mma agha gbapụ, gbasasịa nʼala niile, na mba niile nke ụwa.
Lakini nitahifadhi mabaki kwenu, na kutakuwa na wale watakao toroka upanga miongoni mwa mataifa,
9 Mgbe ha nọ dịka ndị a dọtara nʼagha na mba ọzọ, ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ga-echeta m. Ha ga-echeta otu ha si jiri obi nke ịkwa iko jupụtara nʼime ya, nke si nʼebe m nọ wezuga onwe ya, na anya nke na-agbaso arụsị ha, mee ka obi jọọ m njọ. Ha ga-akpọ onwe ha asị nʼihi ihe ọjọọ ndị ahụ ha mere, ya na ọchụchụ aja rụrụ arụ ha chụrụ.
Kisha wale watakao toroka watanikumbuka miongoni mwa mataifa amabapo watakapochukuliwa mateka, ndivyo nitakavoyowaponda mioyo yao ya kikahaba ambayo imeniacha, na kwa macho yao ya kikahaba kufuata sanamu zao. Kisha wataonyesha chuki kwenye nyuso zao kwa udhaifu walioufanya kwa machukizo yao yote.
10 Ha ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, matakwa na mgbe m gwara ha na ihe ndị a niile gaje ịbịakwasị ha, na ọ bụghị okwu efu ka m kwuru.
Hivyo watajua kwamba mimi ni Yahwe. Kulikuwa na sababu kwamba nimesema nitaleta huu uovu kwao.
11 “‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, kụkọọ ọbọ aka gị abụọ ọnụ, zọkwaa ụkwụ gị nʼala, ma tisikwaa mkpu akwa ike site nʼobi mwute, nʼihi ihe ọjọọ niile na omume rụrụ arụ ndị Izrel mere. Nʼihi na ha ga ịla nʼiyi site nʼoke ụnwụ, na site nʼagha, na site nʼọrịa na-efe efe.
Bwana Yahwe asema hivi: Piga makofi na kanyaga kwa mguu wako! Sema! 'Ole!' kwa sababu ya uovu wote wa chukizo wa nyumba ya Israeli! Wataanguka kwa upanga, njaa, na tauni.
12 Ndị nọ nʼebe dị anya ga-anwụ site nʼọrịa na-efe efe, ndị nọ nso ga-anwụ site na mma agha, ndị fọdụrụ ndụ ga-anwụ site nʼagụụ. Aga m eme ka ha nụrụ ụfụ oke iwe m.
Yule aliye mbali sana atakufa kwa tauni, na yule aliyekaribu ataanguka kwa upanga. Wale watakaobaki na kuishi watakufa kwa upanga. Kwa njia hii ndivyo nitakavyo kamilisha madhabahu yangu dhidi yao.
13 Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe ozu ndị e gburu egbu ga-atọgbọsị nʼetiti arụsị niile, na nʼebe ịchụ aja niile, na nʼugwu nta niile, na nʼugwu ukwu niile, na nʼokpuru osisi ọbụla, na nʼokpuru osisi ook niile, ebe ha na-anọ na-esure ụda na-esi isi ụtọ nye arụsị ha.
Kisha mtajua kwamba mimi ni Yahwe, wakati waliokufa watakapolala kati ya sanamu zao, kuzizunguka madhabahu, kwa kila mlima mrefu-juu ya vilele vya mlima, na chini ya mti wenye majani mabichi na mwalo mnene-sehemu wanapochomea ubani kwa sanamu zao zote.
14 E, aga m esetipụ aka m megide ha, mee ka ala ha laa nʼiyi, nʼebe niile ha bi, site nʼọzara ruo na Ribla. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
Nitapiga kwa mkono wangu na kuifanya nchi ukiwa na isiyofaa, kutoka jangwa hata Dibla, kupita sehemu zote wanapoishi. Kisha watajua kwamba mimi ni Yahwe.”