< Izikiel 5 >

1 “Ma gị, nwa nke mmadụ, were mma agha dị nkọ dịka agụba onye ọkpụisi, kpụchaa isi gị na afụọnụ gị; werekwa ihe e ji atụ ihe ọtụtụ tụọ agịrị isi gị, ka ụzọ ọbụla hara nʼotu.
“Báyìí, ọmọ ènìyàn, mú ìdá tí ó mú kí o sì fi ṣe abẹ ìfárí onígbàjámọ̀, kí o fi fá irun orí àti irùngbọ̀n rẹ. Fi irun yìí sórí ìwọ̀n kí o sì pín in.
2 Ị ga-ewere otu ụzọ nʼụzọ atọ, kpọọ ya ọkụ nʼetiti obodo ahụ mgbe ụbọchị nke nnọchigide ahụ zuru; ị ga-ewere otu ụzọ, jiri mma agha chabichaa ya gburugburu obodo ahụ, otu ụzọ nke ọzọ ka ị ga-efesacha nʼikuku. Nʼihi na aga m eji mma agha chụsachaa ha.
Nígbà tí ọjọ́ ìgbóguntì bá parí, sun ìdákan nínú ìdámẹ́ta irun yìí níná láàrín ìlú. Mú ìdákan nínú mẹ́ta kí o fi idà bù ú káàkiri ìlú. Kí o sì tú ìdákan yòókù ká sínú afẹ́fẹ́. Nítorí pé pẹ̀lú idà ni èmi yóò máa lé wọn ká.
3 Ma ị ga-esite nʼime ya wepụta agịrị isi dị ole na ole, kedo ha nʼọnụ ọnụ uwe gị.
Ṣùgbọ́n mú díẹ̀ nínú irun yìí kí o sì ta á mọ́ etí aṣọ rẹ.
4 Ọzọkwa, site na ndị a, ị ga-ewere ụfọdụ tụnye ha nʼime ọkụ ka ha ree ọkụ, site na ha ka ọkụ ga-esi banye nʼụlọ Izrel niile.
Tún ju díẹ̀ nínú irun yìí sínú iná, kí o sun ún níná. Torí pé láti ibẹ̀ ni iná yóò ti jáde lọ sí gbogbo ilé Israẹli.
5 “Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nke a bụ Jerusalem, obodo m mere ka ọ dịrị nʼetiti mba dị nʼụwa, nke mba dị iche iche gbara gburugburu.
“Báyìí ni Olúwa Olódùmarè wí: Èyí ní Jerusalẹmu, tí mo gbé kalẹ̀ sí àárín àwọn Orílẹ̀-èdè, pẹ̀lú àwọn ìlú gbogbo tí o yí i ká.
6 Ma o sitela nʼajọ omume ya, nupu isi nʼiwu na ụkpụrụ m nyere, karịa mba na obodo ndị ọzọ ahụ niile gbara ya gburugburu. Ọ jụkwara idebe iwu m, jụkwa ịgbaso ụkpụrụ m.
Síbẹ̀ nínú ìwà búburú rẹ ó ti ṣọ̀tẹ̀ si òfin àti ìlànà mi ju àwọn orílẹ̀-èdè àti àwọn ilẹ̀ tó yí i ká lọ. Ó ti kọ òfin mi sílẹ̀, o kò sì pa ìlànà mi mọ́.
7 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ị bụrụla onye nnupu isi karịa mba niile ndị gbara gị gburugburu. Ị jụkwara idebe iwu m na ịgbaso ụkpụrụ m, ọ bụghịkwa dịka iwu na atụmatụ nke mba dị iche iche nọ gị gburugburu ka ị mere.
“Nítorí náà, báyìí ni Olúwa Olódùmarè wí: Nítorí pé ẹ̀yin ti ṣe àìgbọ́ràn ju àwọn orílẹ̀-èdè tó yí yín ká lọ, tí ẹ kò sì tẹ̀lé ìlànà mi tàbí kí o pa òfin mi mọ́. O kò tilẹ̀ túnṣe dáradára tó àwọn orílẹ̀-èdè tó yí ọ ká.
8 “Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-emegide gị bụ Jerusalem, kpee gị ikpe nʼihu mba niile.
“Nítorí náà báyìí ni Olúwa Olódùmarè wí: Èmi gan an lòdì sí ọ, Jerusalẹmu, èmi yóò sì jẹ ọ́ ní yà lójú àwọn orílẹ̀-èdè tó yí ọ ká.
9 Nʼihi ihe arụ gị niile, aga m eme gị ihe m na-emebeghị mbụ, nke m agaghị emekwa ọzọ.
Nítorí gbogbo ohun ìríra rẹ, èmi yóò ṣe ohun tí n kò tí ì ṣe rí láàrín rẹ àti èyí tí n kò ní í ṣe irú rẹ̀ mọ́.
10 Nʼihi nke a, ndị bụ nna ga-eri ụmụ ha nʼetiti gị, ụmụ ga-erikwa ndị nna ha. Aga m ekpe gị ikpe mee ka ndị fọdụrụ ndụ gbasasịa nʼụwa niile.
Nítorí náà láàrín rẹ àwọn baba yóò máa jẹ ọmọ wọn, àwọn ọmọ náà yóò máa jẹ baba wọn. Èmi yóò jẹ ọ́ ní yà, èmi yóò sì tú àwọn tó bá ṣẹ́kù ká sínú ẹ̀fúùfù.
11 Ya mere, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ebe ọ bụ na i jirila oyiyi ihe arụ na omume rụrụ arụ merụọ ụlọ m, aga m esite nʼebe ị nọ wezuga ịhụnanya m. Agaghị m emekwara gị ebere maọbụ hapụ ịta gị ahụhụ.
Nítorí náà, Olúwa Olódùmarè wí pé, bí mo ṣe wà láààyè, nítorí pé ìwọ ti sọ ibi mímọ́ mi di àìmọ́ pẹ̀lú àwọn àwòrán ẹ̀gbin àti àwọn ohun ìríra rẹ, èmi yóò mú ojúrere mi kúrò lára rẹ, èmi kò ní í da ọ sí, bẹ́ẹ̀ ni èmi kì yóò wò ọ́ pẹ̀lú àánú mọ́.
12 Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị bi nʼime gị ga-anwụ site nʼagụụ maọbụ na ọrịa; otu ụzọ ga-anwụ site na mma agha nke ndị iro nọ nʼazụ mgbidi gị, otu ụzọ fọdụrụ ka a ga-achụsa nʼifufe, a ga-eji mma agha ndị iro chụsasịa ha.
Ìdámẹ́ta nínú àwọn ènìyàn rẹ yóò kú nípa àjàkálẹ̀-ààrùn tàbí kí ìyàn run wọ́n: ìdámẹ́ta yóò ṣubú nípa idà lẹ́yìn odi rẹ, èmi yóò sì tú ìdámẹ́ta yòókù ká sínú ẹ̀fúùfù, èmi yóò sì máa fi idà lé wọn.
13 “Mgbe ahụ, iwe m ga-akwụsị, ọnụma m megide ha ga-adajụkwa, na nke a ka a ga-abọrọ m ọbọ. Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼekworo mgbe m mezuru ọnụma m nʼahụ ha.
“Ìbínú mi yóò sì dúró, bẹ́ẹ̀ ni ìbínú gbígbóná mi yóò sì rọlẹ̀, èmi yóò sì ti gba ẹ̀san mi. Nígbà tí mo bá sì parí ìbínú mi lórí wọn, wọn ó mọ̀ pé, Èmi Olúwa ti sọ̀rọ̀ nínú ìtara mi.
14 “Nʼihi ya, aga m eme ka ị bụrụ ihe e bibiri ebibi, na ihe e ji eme ihe ọchị nye mba niile gbara gị gburugburu, na nʼihu ndị na-agafe nʼụzọ ahụ.
“Èmi yóò fi ọ́ ṣòfò, èmi yóò sì sọ ọ́ di ẹ̀gàn fún àwọn orílẹ̀-èdè tó yí ọ ká, àti lójú àwọn tó ń kọjá.
15 Ị ga-abụ ihe e ji eme ihe ọchị na ihe nkọcha nye mba dị iche iche gbara gị gburugburu, mgbe m ga-eji iwe na obi ọkụ na ntaramahụhụ dị egwu kpee gị ikpe, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.
O ó wá di ẹ̀gàn, ẹ̀sín àti ẹ̀kọ̀ àti ohun ẹ̀rù àti ìyanu fún àwọn orílẹ̀-èdè tó yí ọ ká, nígbà tí mo bá fìyà jẹ ọ́ nínú ìbínú àti nínú ìbínú gbígbóná mi. Èmi Olúwa ni ó sọ bẹ́ẹ̀.
16 Mgbe m gbara gị àkụ ọjọọ ahụ na-eweta ọnwụ na ịla nʼiyi, bụ àkụ nke oke ụnwụ, aga m agba gị ya, gbajaa gị. Aga m anọgide na-ezite ụnwụ tutu ruo mgbe e mere ka ihe oriri kọọ gị.
Nígbà tí èmi ó rán ọfà búburú ìyàn sí wọn, èyí tí yóò jẹ́ fún ìparun wọn. Èmí tí èmi yóò rán run yín. Èmí yóò sì sọ ìyàn di púpọ̀ fún yín. Èmí yóò sì ṣẹ́ ọ̀pá oúnjẹ yín.
17 Aga m ezitere gị oke ụnwụ na ajọ anụ ọhịa, ha ga-agbawa gị aka nwa, ọrịa ọjọọ na ọbara ga-esi nʼetiti gị gafee; aga m eji mma agha megide gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”
Èmi yóò rán ìyàn àti ẹranko búburú sí i yín, wọn yóò fi yín sílẹ̀ ni àìlọ́mọ. Àjàkálẹ̀-ààrùn àti ìtàjẹ̀ sílẹ̀ yóò kọjá láàrín yín. Èmi yóò si mú idà wá sórí rẹ. Èmi Olúwa ló sọ bẹ́ẹ̀.”

< Izikiel 5 >