< Izikiel 5 >

1 “Ma gị, nwa nke mmadụ, were mma agha dị nkọ dịka agụba onye ọkpụisi, kpụchaa isi gị na afụọnụ gị; werekwa ihe e ji atụ ihe ọtụtụ tụọ agịrị isi gị, ka ụzọ ọbụla hara nʼotu.
“You, son of man, take a sharp sword. You shall take it as a barber’s razor to yourself, and shall cause it to pass over your head and over your beard. Then take balances to weigh and divide the hair.
2 Ị ga-ewere otu ụzọ nʼụzọ atọ, kpọọ ya ọkụ nʼetiti obodo ahụ mgbe ụbọchị nke nnọchigide ahụ zuru; ị ga-ewere otu ụzọ, jiri mma agha chabichaa ya gburugburu obodo ahụ, otu ụzọ nke ọzọ ka ị ga-efesacha nʼikuku. Nʼihi na aga m eji mma agha chụsachaa ha.
A third part you shall burn in the fire in the middle of the city, when the days of the siege are fulfilled. You shall take a third part, and strike with the sword around it. A third part you shall scatter to the wind, and I will draw out a sword after them.
3 Ma ị ga-esite nʼime ya wepụta agịrị isi dị ole na ole, kedo ha nʼọnụ ọnụ uwe gị.
You shall take a small number of these and bind them in the folds of your robe.
4 Ọzọkwa, site na ndị a, ị ga-ewere ụfọdụ tụnye ha nʼime ọkụ ka ha ree ọkụ, site na ha ka ọkụ ga-esi banye nʼụlọ Izrel niile.
Of these again you shall take, and cast them into the middle of the fire, and burn them in the fire. From it a fire will come out into all the house of Israel.
5 “Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nke a bụ Jerusalem, obodo m mere ka ọ dịrị nʼetiti mba dị nʼụwa, nke mba dị iche iche gbara gburugburu.
“The Lord GOD says: ‘This is Jerusalem. I have set her in the middle of the nations, and countries are around her.
6 Ma o sitela nʼajọ omume ya, nupu isi nʼiwu na ụkpụrụ m nyere, karịa mba na obodo ndị ọzọ ahụ niile gbara ya gburugburu. Ọ jụkwara idebe iwu m, jụkwa ịgbaso ụkpụrụ m.
She has rebelled against my ordinances in doing wickedness more than the nations, and against my statutes more than the countries that are around her; for they have rejected my ordinances, and as for my statutes, they have not walked in them.’
7 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ị bụrụla onye nnupu isi karịa mba niile ndị gbara gị gburugburu. Ị jụkwara idebe iwu m na ịgbaso ụkpụrụ m, ọ bụghịkwa dịka iwu na atụmatụ nke mba dị iche iche nọ gị gburugburu ka ị mere.
“Therefore the Lord GOD says: ‘Because you are more turbulent than the nations that are around you, and have not walked in my statutes, neither have kept my ordinances, neither have followed the ordinances of the nations that are around you;
8 “Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-emegide gị bụ Jerusalem, kpee gị ikpe nʼihu mba niile.
therefore the Lord GOD says: ‘Behold, I, even I, am against you; and I will execute judgments among you in the sight of the nations.
9 Nʼihi ihe arụ gị niile, aga m eme gị ihe m na-emebeghị mbụ, nke m agaghị emekwa ọzọ.
I will do in you that which I have not done, and which I will not do anything like it any more, because of all your abominations.
10 Nʼihi nke a, ndị bụ nna ga-eri ụmụ ha nʼetiti gị, ụmụ ga-erikwa ndị nna ha. Aga m ekpe gị ikpe mee ka ndị fọdụrụ ndụ gbasasịa nʼụwa niile.
Therefore the fathers will eat the sons within you, and the sons will eat their fathers. I will execute judgments on you; and I will scatter the whole remnant of you to all the winds.
11 Ya mere, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ebe ọ bụ na i jirila oyiyi ihe arụ na omume rụrụ arụ merụọ ụlọ m, aga m esite nʼebe ị nọ wezuga ịhụnanya m. Agaghị m emekwara gị ebere maọbụ hapụ ịta gị ahụhụ.
Therefore as I live,’ says the Lord GOD, ‘surely, because you have defiled my sanctuary with all your detestable things, and with all your abominations, therefore I will also diminish you. My eye won’t spare, and I will have no pity.
12 Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị bi nʼime gị ga-anwụ site nʼagụụ maọbụ na ọrịa; otu ụzọ ga-anwụ site na mma agha nke ndị iro nọ nʼazụ mgbidi gị, otu ụzọ fọdụrụ ka a ga-achụsa nʼifufe, a ga-eji mma agha ndị iro chụsasịa ha.
A third part of you will die with the pestilence, and they will be consumed with famine within you. A third part will fall by the sword around you. A third part I will scatter to all the winds, and will draw out a sword after them.
13 “Mgbe ahụ, iwe m ga-akwụsị, ọnụma m megide ha ga-adajụkwa, na nke a ka a ga-abọrọ m ọbọ. Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼekworo mgbe m mezuru ọnụma m nʼahụ ha.
“‘Thus my anger will be accomplished, and I will cause my wrath toward them to rest, and I will be comforted. They will know that I, the LORD, have spoken in my zeal, when I have accomplished my wrath on them.
14 “Nʼihi ya, aga m eme ka ị bụrụ ihe e bibiri ebibi, na ihe e ji eme ihe ọchị nye mba niile gbara gị gburugburu, na nʼihu ndị na-agafe nʼụzọ ahụ.
“‘Moreover I will make you a desolation and a reproach among the nations that are around you, in the sight of all that pass by.
15 Ị ga-abụ ihe e ji eme ihe ọchị na ihe nkọcha nye mba dị iche iche gbara gị gburugburu, mgbe m ga-eji iwe na obi ọkụ na ntaramahụhụ dị egwu kpee gị ikpe, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.
So it will be a reproach and a taunt, an instruction and an astonishment, to the nations that are around you, when I execute judgments on you in anger and in wrath, and in wrathful rebukes—I, the LORD, have spoken it—
16 Mgbe m gbara gị àkụ ọjọọ ahụ na-eweta ọnwụ na ịla nʼiyi, bụ àkụ nke oke ụnwụ, aga m agba gị ya, gbajaa gị. Aga m anọgide na-ezite ụnwụ tutu ruo mgbe e mere ka ihe oriri kọọ gị.
when I send on them the evil arrows of famine that are for destruction, which I will send to destroy you. I will increase the famine on you and will break your staff of bread.
17 Aga m ezitere gị oke ụnwụ na ajọ anụ ọhịa, ha ga-agbawa gị aka nwa, ọrịa ọjọọ na ọbara ga-esi nʼetiti gị gafee; aga m eji mma agha megide gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”
I will send on you famine and evil animals, and they will bereave you. Pestilence and blood will pass through you. I will bring the sword on you. I, the LORD, have spoken it.’”

< Izikiel 5 >