< Izikiel 48 >

1 “Nke a bụ aha ebo niile, na ala ha ga-eketa: “Dan otu oke. Site na nsọtụ ugwu, nʼakụkụ ụzọ Hetlon ruo mbata Hamat. Haza Enan na oke ala ugwu Damaskọs, nke dị nʼakụkụ Hamat ga-abụ akụkụ oke ala ha site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
Et voici les noms des tribus, en commençant par l'aquilon, à partir de la descente qui tire une ligne jusqu'à l'entrée d'Émath et au parvis du vestibule; tenant à Damas, vers l'aquilon, du côté du parvis d'Émath. Il y aura depuis l'orient jusqu'à la mer: Dan, une tribu;
2 Asha ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Dan, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
Et à partir des limites de Dan, depuis l'orient jusqu'à l'occident: Aser, une tribu;
3 Naftalị ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Asha, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
Et à partir des limites d'Aser, depuis l'orient jusqu'à l'occident, Nephthali, une tribu;
4 Manase nwere otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Naftalị, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
Et à partir des limites de Nephthali, depuis l'orient jusqu'à l'occident, Manassé, une tribu;
5 Ifrem ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Manase, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
Et à partir des limites de Manassé, depuis l'orient jusqu'à l'occident, Éphraïm, une tribu;
6 Ruben ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ifrem, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
Et à partir des limites d'Éphraïm, depuis l'orient jusqu'à l'occident, Ruben, une tribu;
7 Juda ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ruben, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
Et à partir des limites de Ruben, depuis l'orient jusqu'à l'occident, Juda, une tribu;
8 “Ala nke ya na oke ala ndị Juda ga-agbatị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ka ị ga-enye dịka onyinye pụrụ iche. Obosara ya ga-abụ ihe dị kilomita iri na atọ. Ogologo ya site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ ga-aha ka ala otu ebo ketara. Ụlọnsọ ukwu ahụ ga-adịkwa nʼetiti ya.
Et à partir des limites orientales de Juda il y aura les prémices que vous séparerez: vingt-cinq mille mesures de long et autant de large, le côté oriental étant égal à celui de l'occident, et mon sanctuaire sera au milieu de cet espace.
9 “Ogologo ebe a ewepụtara iche nye Onyenwe anyị ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita ise na ọkara.
Les prémices que vous séparerez pour le Seigneur auront vingt-cinq mille mesures de long, et vingt-cinq mille de large.
10 Nke a ga-abụ ala dị nsọ e debere iche nye ndị nchụaja. Nʼakụkụ ugwu, ịdị ogologo ala ahụ ga-abụ kilomita iri na atọ. Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ogologo ya bụ kilomita ise na ọkara. Ogologo nke akụkụ ndịda na nke ugwu bụ otu. Otu a kwa, ogologo nke akụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ bụ otu. Ebe nsọ Onyenwe anyị ga-adị nʼetiti ya.
On y prendra les prémices du sanctuaire pour les prêtres, savoir: vingt-cinq mille mesures du côté de l'aquilon, dix mille du côté de l'occident, vingt-cinq mille du côté du midi; et la montagne des saints sera au milieu de cet espace,
11 Ọ ga-adịrị ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk ndị e doro nsọ, ndị sitere nʼikwesị ntụkwasị obi jeere m ozi, ndị na-esiteghị nʼiso ụzọ m kpafuo dịka ndị Izrel na agbụrụ Livayị mere mgbe ha mehiere.
Pour les prêtres, pour les fils sanctifiés de Sadduc, pour ceux qui gardent les offices du temple, et qui ne se sont point égarés avec les fils d'Israël, comme l'ont fait des lévites.
12 Ọ bụ onyinye pụrụ iche a na-enye ha site nʼala ahụ dị nsọ, bụ ala ahụ kachasị nsọ, nke ya na ala ndị Livayị nwekọrọ oke ala.
Et ils auront pour prémices, au milieu des prémices de la terre, le saint des saints, proche du partage des lévites.
13 “Nʼakụkụ ala ndị nchụaja, a ga-ekenye ndị Livayị ala nke ha. Ha ga-eketa ala nke ogologo ya bụ kilomita iri na atọ, nke obosara ya bụ kilomita ise na ọkara.
Et pour les lévites à côté du partage des prêtres, il y aura vingt-cinq mille mesures de long, sur dix mille de large; ce sera toute leur part, vingt-cinq mille mesures de long, sur dix mille de large.
14 O nweghị akụkụ ala nsọ a a ga-ere ere, maọbụ nye ya ndị ọzọ, nʼihi na ihe dị nsọ ka ọ bụ nye Onyenwe anyị.
Il n'en sera rien vendu ni distrait; on ne pourra rien soustraire des fruits de ce territoire, parce que cette part sera consacrée au Seigneur.
15 “Ala nke fọdụrụ, nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dị kilomita ise na ọkara ga-abụ ala ọha. A ga-ewu ebe obibi nʼelu ya, wukwaa ebe ịzụ anụ ụlọ. Obodo ga-adị nʼetiti ya,
Et les cinq mille mesures de surplus sur le total de la largeur, qui est de vingt-cinq mille coudées, seront occupées par le faubourg de la ville, par ses maisons et son esplanade, et la ville sera au milieu de cet espace.
16 nke ogologo akụkụ ugwu ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ndịda ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ọwụwa anyanwụ ruru kilomita abụọ na ụma anọ, na akụkụ ọdịda anyanwụ rukwara kilomita abụọ na ụma.
Voici maintenant les dimensions de la ville: du côté de l'aquilon, quatre mille cinq cents mesures; du côté du midi, quatre mille cinq cents; du côté de l'orient, quatre mille cinq cents; et du côté de l'occident, quatre mille cinq cents.
17 Ogologo nke ala ebe ịta nri nke ga-agba obodo ahụ gburugburu ga-aha nʼotu. Ọ ga-adị narị mita na iri mita atọ na ise nʼugwu, na ndịda narị mita na iri mita atọ na ise, nʼọwụwa anyanwụ narị mita na iri mita atọ na ise, nʼakụkụ nʼọdịda anyanwụ narị mita na iri mita atọ na ise.
Et du côté de l'aquilon il y aura, à la ville, une esplanade de deux cent cinquante mesures, et trois autres de même dimension au midi, à l'orient et à l'occident.
18 Ma nke ga-afọdụ na ya, nʼakụkụ oke ala ahụ dị nsọ nke gara ogologo ya niile, ga-abụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ kilomita ise na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụkwa kilomita ise na ọkara. Ihe omume ya ga-abụ nri nye ndị ọrụ nke obodo ahụ.
Et le reste de la longueur, consacré aux prémices des saints, sera de dix mille mesures à l'orient, et de dix mille à l'occident: telles seront les prémices des saints; et de leurs récoltes on donnera du pain à ceux qui rendent des services dans la ville.
19 Ndị ọrụ si nʼobodo, bụ ndị na-akọ ya ga-abụkwa ndị sị nʼebo niile nke Izrel.
Et ceux qui rendront ainsi des services dans la ville même seront de toutes les tribus d'Israël.
20 Ala ahụ niile, ma ala ahụ e doro nsọ, ma ala ndị obodo, ga-adị kilomita iri na atọ nʼakụkụ ya ọbụla.
Les prémices entières auront donc vingt-cinq mille mesures de long, et vingt-cinq mille de large. Vous séparerez du territoire que possèdera la ville ce carré pour les prémices des saints.
21 “Ala niile fọdụrụ nʼakụkụ abụọ nke ala ahụ dị nsọ, na ala ndị obodo ga-abụ nke nwa eze. Ọ ga-agbatị ruo ọwụwa anyanwụ site nʼọtụtụ kilomita iri na atọ nke oke ahụ dọ nsọ ruo nʼoke ala ọwụwa anyanwụ, sitekwa na kilomita iri na atọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo oke ala ọdịda anyanwụ. Akụkụ abụọ ndị a nke gbatịrị ruo nʼoke ala ndị obodo ga-abụ nke onye ọchịchị, ebe nsọ ahụ na ụlọ ukwu ahụ ga-adị nʼetiti ha.
Or ce qui restera de ce carré, à partir du sanctuaire, sera pour le prince; il sera compris dans le territoire de la ville, sur une longueur de vingt-cinq mille mesures jusqu'à ses limites du côté de l'orient et de l'occident, et sur vingt-cinq mille de large jusqu'aux limites du côté de l'occident, tenant à la part du prince. Et ce seront les prémices des saints; et au milieu d'elles il y aura le sanctuaire du temple.
22 Ya mere, oke ala nke ndị Livayị na ala ndị obodo ga-adị nʼetiti ala nke nwa eze nwee. Oke ala nke nwa eze ahụ ga-adị nʼetiti oke ala Juda na oke ala Benjamin.
Et la part des lévites et le territoire de la ville, an milieu duquel sera la part du prince, seront entre les limites de Juda et les limites de Benjamin; ce sera la résidence des princes.
23 “Ala e nyere ebo fọdụrụ dị otu a: “Benjamin ga-enwe otu oke, nke sitere nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
Or voici la part du reste des tribus, depuis l'orient jusqu'à l'occident, Benjamin, une tribu;
24 Simiọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Benjamin ga-enwekọ otu oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
À partir des limites de Benjamin, depuis l'orient jusqu'à l'occident, Siméon, une tribu;
25 Isaka ga-enwe otu oke; ha na ndị Simiọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
À partir des limites de Siméon, depuis l'orient jusqu'à l'occident, Issachar, une tribu;
26 Zebụlọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Isaka ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
À partir des limites d'Issachar, depuis l'orient jusqu'à l'occident, Zabulon, une tribu;
27 Gad ga-enwe otu oke; ha na ndị Zebụlọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
À partir des limites de Zabulon, depuis l'orient jusqu'à l'occident, Gad, une tribu;
28 Ma oke ala Gad nke chere ihu nʼakụkụ ndịda ga-esi na Tama ruo nʼiyi Meriba Kadesh, sorokwa ọdọ mmiri Ijipt ruo nʼosimiri Mediterenịa.
À partir des limites de Gad, depuis l'orient, et tournant vers le midi, seront les confins de Théman et les eaux de Barimoth-Cadès, et l'héritage d'Israël finira à la grande mer.
29 “Nke a bụ ala unu ga-ekenye ebo Izrel niile dịka oke ha. Ha ga-abụkwara ha ihe nketa.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
Telle est la terre que vous vous partagerez au sort entre les tribus d'Israël, et tels seront les lots, dit le Seigneur Dieu.
30 “Ndị a ga-abụ ọnụ ụzọ ama e si apụ nʼobodo ahụ. “Nʼakụkụ nke ugwu, nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ,
Or voici les issues de la ville: celles du côté de l'aquilon, sur une longueur de quatre mille cinq cents mesures.
31 ọnụ ụzọ ama obodo ahụ ga-abụ aha ebo niile nke Izrel. Ọnụ ụzọ ama atọ nʼakụkụ ugwu ga-abụ ọnụ ụzọ ama Ruben, ọnụ ụzọ ama Juda, na ọnụ ụzọ ama Livayị.
Les portes de la ville prendront les noms des tribus d'Israël; il y aura trois portes à l'aquilon: la porte de Ruben, la porte de Juda, la porte de Lévi.
32 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nke mgbidi ya dị kilomita abụọ nʼogologo, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya. Ha ga-aza ọnụ ụzọ ama Josef, ọnụ ụzọ ama Benjamin, na ọnụ ụzọ ama Dan.
Celles de l'orient, percées dans une longueur de quatre mille cinq cents mesures, seront au nombre de trois: la porte de Joseph, la porte de Benjamin, la porte de Dan.
33 Nʼakụkụ ndịda, nke ogologo ya bụkwa kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama Simiọn, ọnụ ụzọ ama Isaka, na ọnụ ụzọ ama Zebụlọn.
Celles du midi, percées dans une longueur de quatre mille cinq cents mesures, seront au nombre de trois: la porte de Siméon, la porte d'Issachar, la porte de Zabulon.
34 Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama Gad, ọnụ ụzọ ama Asha, na ọnụ ụzọ ama Naftalị.
Celles du côté de l'occident, percées dans une longueur de quatre mille cinq cents mesures, seront au nombre de trois: la porte de Gad, la porte d'Aser, la porte de Nephthali.
35 “Gburugburu obodo ahụ bụ kilomita iri. “Aha a ga-akpọ obodo ahụ site nʼoge ahụ gawa, ga-abụ, ‘Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ.’”
L'enceinte entière aura dix-huit mille mesures, et, à partir de ce jour, le nom de la ville sera: C'est le nom du Seigneur.

< Izikiel 48 >