< Izikiel 46 >

1 “‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ọnụ ụzọ ama nke ogige ime, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ ga-abụ ihe e mechiri emechi nʼụbọchị isii niile unu na-arụ ọrụ. Ma a ga-emeghe ya nʼụbọchị izuike, na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ.
KE i mai nei Iehova ka Haku, penei; E paa no ka puka o ka pahale maloko e nana ana ma ka hikina, i na la eono e hana'i; aka, i ka Sabati e weheia'i no ia, a i ka la o ka mahina hou e weheia'i no ia.
2 Nwa eze ga-esitekwa na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama bata, guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ndị nchụaja ga-edozikwa aja nsure ọkụ ya, na aja udo ya. Ọ ga-anọkwa nʼụlọ mbata kpọọ isiala nke ofufe ya, sitekwa nʼebe ahụ pụọ. Ma a gaghị emechi ọnụ ụzọ ahụ tutu ruo anyasị.
A e komo no ka moi ma ke ala o ka lanai o ka puka mawaho, a e ku no oia ma ka laau ku o ka puka, a e hoomakaukau ke kahuna i kana mohaikuni, a me kana mau mohaihoomalu, a e hoomana no oia ma ka paepae o ka puka: alaila e hele aku no ia: aka, aole e pani e ia ka puka a hiki i ke ahiahi.
3 Nʼihu ọnụ ụzọ ama ka ndị ala a ga-anọ fee Onyenwe anyị ofufe nʼụbọchị izuike na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ.
E hoomana no hoi na kanaka o ka aina ma ka puka o keia ipuka ma ke alo o Iehova, i na Sabati, a me na mahina hou.
4 Ihe nwa eze ahụ ga-eji chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ nʼụbọchị izuike na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ ga-abụ ụmụ ebule isii, na otu ebule, ndị na-enweghị ntụpọ.
A o ka mohaikuni a ka moi e kaumaha aku ai ia Iehova, i ka la Sabati, eono keikihipa kina ole ia, a me ka hipakane kina ole.
5 Ọ ga-eweta ihe e ji achụ aja mkpụrụ ọka, nke bụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu ebule. Ọ ga-ewetakwa lita mmanụ oliv asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ahụ, tinyere onyinye ụmụ atụrụ dịka o si masị ya.
A o ka mohaiai, he epa ia no ka hipakane, a o ka mohaiai no na keikihipa e like no ia me ka haawina o kona lima, a he hina aila no ka epa.
6 Nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ, ọ ga-eweta otu nwa oke ehi, ụmụ atụrụ isii na otu ebule, ha niile ọ dịghị nke ga-enwe ntụpọ ọbụla.
A i ka la o ka mahina hou he bipi opiopio kina ole, eono keikihipa a me ka hipakane: he mau mea kina ole ia.
7 Ọ ga-ewetakwa otu oke ehi na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ, maka aja mkpụrụ ọka. Ọ ga-enye ebule ahụ na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ. Ọ ga-enyekwa ụmụ atụrụ ndị ahụ na ụtụ ọka dịka o si masị ya inye ha, tinyere iri lita ọka abụọ na abụọ, nke ọ ga-eweta maka lita mmanụ oliv asaa.
A e hoomakaukau oia i mohaiai, he epa no ka bipi, he epa hoi no ka hipakane, a no na keikihipa e like ia me ka mea i loaa i kona lima, a he hina aila no ka epa.
8 Mgbe nwa eze ga-abata nʼụlọ ahụ, ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ebe ahụ kwa ka ọ ga-esikwa pụọ.
A i ke komo ana'e o ka moi, e komo no ia ma ke ala o ka lanai o ka ipuka; a ma ia ala e puka hou ai ia.
9 “‘Ma mgbe ndị ala ahụ ga-abata nʼihu Onyenwe anyị nʼoge mmemme dị nsọ, onye ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu bata aghaghị ịpụ site nʼọnụ ụzọ nke dị na ndịda. Ndị si na ndịda bata ga-esitekwa nʼụzọ nke ugwu pụọ. Ọ dịghị onye ga-esi nʼụzọ o si bata laghachi, kama ha ga-esi ụzọ nke chere ebe ha si bata ihu pụọ.
Aka, aia hele mai na kanaka o ka aina imua i ke alo o Iehova i na ahaaina, o ka mea i komo ma ke ala o ka ipuka kukulu akau, e hoomana, e puka aku no ia ma ke ala o ka ipuka kukulu hema; a o ka mea komo ma ke ala o ka ipuka kukulu hema, e puka no ia ma ke ala o ka ipuka kukuluakau; aole ia e hoi aku ma ke ala o ka ipuka i komo mai ai ia, aka, e puka aku no ia ma kahi ku pono ia mea.
10 Nwa eze ga-anọ nʼetiti ha, ọ bụrụ na ha abanye, ọ ga-eso ha banye, ọ bụrụkwa na ha apụwa, ọ ga-esokwa ha pụọ.
A o ka moi iwaenakonu o lakou, i ko lakou komo ana, o komo no ia; a i ko lakou puka ana, e puka no ia.
11 Nʼoge mmemme ndị ahụ pụrụ iche, na mmemme ndị akara aka, ihe a ga-eji nye onyinye mkpụrụ ọka ga-abụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu oke ehi, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ na otu ebule, tinyere ụmụ atụrụ nke ọnụọgụgụ ya ga-abụ dịka o si masị ya, tinyere lita mmanụ asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ọbụla.
A i na ahaaina, a i na akoakoa ana, o ka mohaiai he epa no ka bipi, a he epa no ka hipakane, a no na keikihipa e like ia me ka haawina o kona lima, a he hina aila no ka epa.
12 “‘Mgbe ọbụla onyeisi chọrọ inye onyinye afọ ofufu, maka ịchụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ maọbụ aja udo, a ga-emeghere ya ọnụ ụzọ ime nke dị nʼọwụwa anyanwụ ka o si nʼebe ahụ bata. Ọ ga-enye onyinye ya dịka e si enye ya nʼụbọchị izuike. Emesịa, ọ ga-atụgharịa pụọ. A ga-emechikwa ụzọ ahụ mgbe ọ pụchara.
A i ka wa e hoomakaukau ka moi i ka mohaikuni na kona makemake iho, a he mau mohaihoomalu paha na kona makemake iho no Iehova, e weheia nona ka puka e nana ana i ka hikina, a e hoomakaukau oia i kana mohaikuni a me kana mau mohaihoomalu, me ia i hana'i i ka la Sabati: alaila e puka aku no ia; a mahope o kona puka ana e paniia ka puka.
13 “‘Ọ bụ nwa atụrụ gbara otu afọ nke na-enweghị ntụpọ ka ị ga-eweta ụbọchị niile maka ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ọ bụ kwa ụtụtụ, kwa ụtụtụ ka ị ga-eweta ya.
O ke keikihipa kina ole no kona makahiki mua, o kau ia e hoomakaukau ai i kela la i keia la i mohaikuni no Iehova: i kela kakahiaka i keia kakahiaka e hana'i no oe ia.
14 Ị ga-ewetakwa onyinye mkpụrụ ọka kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ tinyere ya, ihe niile ga-emejupụta ya bụ lita ụtụ ọka isii, na lita mmanụ abụọ e ji agwakọta ya. Iche onyinye mkpụrụ ọka a nʼihu Onyenwe anyị bụ ụkpụrụ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
A e hoomakaukau oe i mohaiai nona, i kela kakahiaka i keia kakahiaka, o ka hapa ono o ka epa, a o ka hapa kolu o ka hina aila, e hui pu me ka palaoa wali; he mohaiai mau, no Iehova, ma ke kanawai mau.
15 Ya mere, ha ga-edozi nwa atụrụ na ụtụ ọka na mmanụ oliv ahụ, kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ, maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa mgbe niile.
Pela e hoomakaukau ai lakou i ke keikihipa, a me ka mohaiai, a me ka aila, i kela kakahiaka i keia kakahiaka, i mohaikuni mau.
16 “‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ọ bụrụ na onyeisi enye onye ọbụla nʼime ụmụ ya ndị ikom onyinye site nʼihe nketa ya, ihe ahụ ga-abụ nke ya, bụrụkwa nke mkpụrụ ya, ọ ga-abụ oke ha site nʼihe nketa ruo ebighị ebi.
Ke i mai nei Iehova ka Haku, penei; Ina e haawi ka moi i ka makana i kekahi o kana mau keiki, e lilo no ia i kana mau keiki; e lilo no ia no lakou ponoi ma ka hooili ana.
17 Ọ bụrụkwanụ na o kenye otu nʼime ndị ohu ya ala site nʼihe nketa ya, ala ahụ ga-abụ nke ohu ahụ tutu ruo nʼafọ inwere onwe, nke bụ afọ asaa ọbụla. Mgbe ahụ, ohu ahụ ga-enwere onwe ya, ma ala ahụ ga-aghọkwa nke nwa eze ahụ. Ihe nketa ya bụ nke dịịrị naanị ụmụ ya, nke ha ka ọ bụ.
Aka, ina e haawi oia i ka haawina o kona hooilina i kekahi o kana mau kauwa, e lilo ia nona a hiki i ka makahiki o ka hookuu wale; a mahope iho e hoi no ia i ka moi; aka, e lilo kona hooilina i kana mau keiki no lakou.
18 Nwa eze ahụ agaghị ewere ala ọbụla site nʼihe nketa ndị mmadụ nʼaka ike, si otu a chụpụ ha site nʼala ha. Ala ọbụla ọ na-enye ụmụ ya ga-abụrịrị ihe nketa sitere nʼala nke aka ya. Ka a ghara ime ka ọ bụladị otu nʼime ndị m bụrụ onye e kewapụrụ site nʼihe nketa ha.’”
A aole e lawe ka moi i kauwahi o ka kanaka hooilina ma ka hooluhihewa, e kipaku aku ai ia lakou mai ko lakou hooilina ae; aka, e haawi oia i hooilina no kana mau keiki noloko o kona hooilina iho, i ole e hele liilii ae ko'a poe kanaka mai ko lakou hooilina ae.
19 Mgbe nke a gasịrị, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama kpọbata m nʼọnụụlọ ndị ahụ dị nsọ, nke chere ihu nʼugwu, nke bụ ihe nketa ndị nchụaja. O gosiri m otu ebe dị na nsọtụ akụkụ ọdịda anyanwụ.
A mahope iho, lawe mai oia ia'u, ma kahi e komo ai, e pili ana i ka aoao o ka ipuka, maloko o na keena hoano no na kahuna, ka mea e nana ana i ke kukulu akau: aia hoi, he wahi ma na aoao elua ma ke komohana.
20 Ọ sịrị m, “Ebe a ka ndị nchụaja ga-anọ sie anụ aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Ebe a ka ha ga-anọkwa ghee onyinye mkpụrụ ọka, ka a ghara iwebata ha na mpụta ogige a nakwa ido ndị mmadụ nsọ.”
Alaila, olelo mai la oia ia'u, Eia ka wahi e hoolapalapa ai na kahuna i ka mohaihala, a me ka mohailawehala, kahi hoi e hoomoa ai i ka mohaiai; i ole lakou e hali ia mea mawaho ma ka pahale mawaho e hoolaa ai i na kanaka.
21 Mgbe ahụ, o mere ka m pụta ọzọ nʼogige ezi. O duuru m gaa nʼakụkụ anọ nke ogige ahụ. Ahụrụ m na e nwere ogige nke dị nʼakụkụ ọbụla.
Alaila, lawe mai oia ia'u maloko o ka pahale mawaho, a hoohele ae ia'u ma na kihi eha o ka pahale; aia hoi, he pahale maloko o kela kihi keia kihi o ka pahale.
22 Nʼakụkụ anọ nke ogige ndị a, ogige ndị ọzọ dị nʼime ha. Ha ruru mita iri abụọ na atọ nʼogologo, ebe obosara ha rukwara mita iri na asaa nʼọkara. Ogige anọ ndị a ha nʼotu.
Ma na kihi eha o ka pahale, he mau pahale i hoopaaia, he kanaha ka loa, he kanakolu ka laula; hookahi no ke ana o keia mau kihi eha.
23 Nʼime ụlọ ahụ, gburugburu ya, e nwere ahịrị e ji nkume doo, nke nwere ekwu dị nʼokpuru ahịrị nkume ahụ.
He pa no kekahi a puni ma ia mau mea, a puni ia mau mea eha, a ua hanaia me na kapuahi e hoolapalapa ai malalo ae o na pa a puni.
24 Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ụlọ ebe ndị niile na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu ahụ ga-anọ na-esi ihe aja niile ndị mmadụ webatara.”
Alaila, i mai la oia ia'u, Eia na wahi o ka poe hoolapalapa, kahi e hoolapalapa ai ka poe lawelawe o ka hale i ka mohai a na kanaka.

< Izikiel 46 >