< Izikiel 44 >
1 Mgbe ahụ, o mere ka m laghachi nʼụzọ, nʼọnụ ụzọ ama nke ebe nsọ ahụ, nke dị nʼezi, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ, ma a gbachiri ya agbachi.
Moto yango azongisaki ngai na ekuke ya libanda ya Esika ya bule; Ekuke yango ezalaki na ngambo ya este mpe ezalaki ya kokangama.
2 Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Ọnụ ụzọ ama nke a ga-abụ ihe e mechiri emechi. A gaghị emeghe ya ọzọ, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi na ya bata. Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel esitela na ya bata. Ya mere, ọ bụ ihe emechiri emechi.
Yawe alobaki na ngai: « Ekuke oyo ekotikala ya kokangama, bakoki kofungola yango te, mpe moto moko te akoki kokota na nzela na yango. Ekotikala kaka ya kokangama, pamba te Yawe, Nzambe ya Isalaele, akotelaki na nzela na yango.
3 Naanị nwa eze, naanị ya onwe ya, bụ onye ga-anọdụ ala nʼime ya, iri nri nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ bata, ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ ga-esi pụọ.”
Kasi mokambi, ye kaka, lokola azali mokambi nde akoki kovanda na kati mpo na kolia bilei liboso ya Yawe; akokotela na nzela ya ndako moke ya kokotela mpe akobimela kaka na nzela wana. »
4 Mgbe ahụ, o mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ. Elere m anya hụ na ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼihi ya, adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.
Moto yango amemaki ngai lisusu na nzela ya ekuke ya nor kino na liboso ya Tempelo. Tango natalaki, namonaki nkembo na Yawe kotondisa Tempelo ya Yawe, mpe ngai nakweyaki elongi kino na mabele.
5 Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, leruo anya nke ọma, gee ntị nke ọma nʼihe niile m na-agwa gị banyere iwu m niile na usoro niile nke ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Leruo anya nke ọma banyere ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọnsọ ukwu a, na nke ọpụpụ niile nke ebe nsọ a.
Yawe alobaki na ngai: « Mwana na moto, sala keba! Fungola miso na yo mpe yoka na matoyi na yo makambo nyonso oyo nakoyebisa yo na tina na Tempelo mpe mitindo na yango! Sala penza keba na ekotelo ya Tempelo mpe bikuke nyonso ya Esika ya bule.
6 Ị ga-agwa ndị Izrel bụ ndị ụlọ nnupu isi, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, o zuola bụ ibi ndụ arụ unu niile ahụ, unu ndị Izrel!
Yebisa batomboki oyo, libota ya Isalaele: ‹ Tala liloba oyo Nkolo Yawe alobi: Oh libota ya Isalaele, nalembi misala na bino nyonso ya nkele!
7 Nʼihi na ọ bụghị naanị na ihe arụ unu mere dị ukwu, kama unu mekwara ihe arụ kachasị site nʼịkpọbata ndị ala ọzọ a na-ebighị anụ ahụ ha na obi ha ugwu nʼime ụlọnsọ, si otu a merụọ ụlọnsọ mgbe unu na-ewetara m nri nsọ, nke bụ abụba na ọbara. Nʼụzọ dị otu a, unu emebiela ọgbụgba ndụ m.
Wana bozalaki kobonzela Ngai bilei, mafuta mpe makila ya banyama, bokotisaki kati na Esika na Ngai ya bule bapaya oyo batosaka Ngai te mpe bakatama ngenga te, mpo na kobebisa bosantu ya Tempelo na Ngai; na bongo, bobebisaki boyokani na Ngai mpo na kokokisa misala na bino nyonso ya mbindo!
8 Unu edebeghị iwu m nyere unu banyere ihe m ndị dị nsọ, kama unu goro ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-elekọta ebe nsọ m.
Na esika ete bomipesa na mosala ya biloko na Ngai ya bule, bino bozali nde kopesa mosala na Ngai epai ya bapaya, kati na Esika na Ngai ya bule.
9 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, o nweghị onye ala ọzọ ọbụla a na-ebighị anụ ahụ ya na obi ya ugwu kwesiri ịbata nʼụlọnsọ m. Ọ bụladị ndị ọbịa ndị bi nʼetiti ụmụ Izrel.
Tala liloba oyo Nkolo Yawe alobi: Mopaya moko te oyo atosaka Ngai te mpe oyo akatisa ngenga te akokota na Esika na Ngai ya bule, ezala bapaya oyo bazali kovanda kati na bana ya Isalaele.
10 “‘Ndị ikom agbụrụ Livayị niile, ndị sitere nʼijere m ozi wezuga onwe ha mgbe Izrel bidoro ịgbaso arụsị niile ha, ga-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
Balevi oyo bakomaki mosika na Ngai, tango Isalaele abungaki nzela mpe azalaki koyengayenga mosika na Ngai mpo na kolanda banzambe na bango ya bikeko, bakomema mikumba ya masumu na bango.
11 Ha ga-abụ ndị na-eje ozi nʼime ebe nsọ m, ndị nlekọta nke ọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwuu, na-ejekwa ozi nʼime ya; ha ga-egburu ndị m anụ e wetara maka ịchụ aja nsure ọkụ na nke aja ndị ọzọ, ha ga-eguzokwa nʼihu ha jeere ha ozi.
Kati na Esika na Ngai ya bule, bakosala kaka mosala ya kokengela bikuke ya Tempelo mpe misala mosusu ya Tempelo; bakobanda koboma mpo na bato bambeka ya kotumba mpe bambeka mosusu mpe bakotelema liboso ya bato mpo na kosalela bango.
12 Ma nʼihi na ha guzoro nʼihu arụsị jeere ha ozi, mee ka ụlọ Izrel daba na mmehie ikpere arụsị, nʼihi nke a, eweliela m aka elu na-aṅụ iyi na ha aghaghị ịta ahụhụ mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Kasi lokola basalelaki bango liboso ya banzambe na bango ya bikeko mpe bakweyisaki libota ya Isalaele na masumu, nalapi ndayi, na kotombola loboko, ete bakomema mikumba ya masumu na bango, elobi Nkolo Yawe.
13 Ha agaghị abịakwute m nso ije ozi dịka ndị nchụaja, maọbụ bịaruo nso ihe nsọ m niile ọbụla maọbụ onyinye m dị nsọ karịchasịa onyinye nsọ niile, ha aghaghị ibu ọnọdụ ihere nke ihe arụ niile ha mere.
Bakopusana lisusu liboso na Ngai te mpo na kosalela Ngai lokola Banganga-Nzambe to pene ya biloko nyonso oyo ebulisami mpo na Ngai to mpe pene ya biloko oyo eleki bule. Boye, bakolata soni ya misala na bango ya nkele.
14 Ma aga m ahọpụta ha ka ha bụrụ ndị ilekọta ụlọnsọ m dị nʼaka, nʼihi ịrụ ọrụ niile na ije ozi niile dị nʼime ya.
Nakopesa bango mokumba ya kobatela Tempelo mpe kosala misala na yango nyonso, nyonso oyo esengeli kosalema kati na yango.
15 “‘Ma ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk, ndị Livayị, ndị chegidere ebe nsọ m nche, mgbe Izrel niile sitere nʼebe m nọ kpafuo, ga-abịa nso ijere m ozi, ha ga-eguzo nʼihu m chụọ aja abụba na ọbara. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Kasi Banganga-Nzambe oyo bazali Balevi mpe bakitani ya Tsadoki, oyo bakobaki kobatela na boyengebene misala na bango kati na Esika na Ngai ya bule tango bana ya Isalaele babungaki nzela na Ngai, bakopusana pene na Ngai mpo na kosalela Ngai; bakotelema liboso na Ngai mpo na kobonza bambeka ya mafuta mpe makila ya banyama, elobi Nkolo Yawe.
16 Ọ bụ naanị ha ga-abanye nʼime ebe nsọ m, naanị ha ga-abịakwa na tebul m ije ozi nʼihu m, na ife m dịka ndị nche.
Bango kaka nde bakokota na Esika na Ngai ya bule, bakopusana pene ya mesa na Ngai mpo na kosalela Ngai mpe kokokisa mosala na Ngai.
17 “‘Mgbe ha na-abata nʼọnụ ụzọ ama nke ogige dị nʼime, ha ga-eyi naanị akwa ọcha. Ha agaghị eyi uwe ọbụla e ji ajị anụ kpaa mgbe ha na-eje ozi nʼogige ime nke ụlọnsọ ukwu m.
Tango bakokota na bikuke ya lopango ya kati, basengeli kolata bilamba ya lino; bakoki kolata bilamba oyo basala na bapwale ya meme te tango bakozala kosala mosala na bikuke ya lopango ya kati to kati na Tempelo.
18 Ha ga-eji akwa ọcha kee nʼisi ha, yirikwa uwe ọcha nʼukwu ha. Ha agaghị eyi ihe ọbụla ga-eme ka ọsịsọọ gbaa ha.
Bakolata bitendi ya lino na mito na bango mpe bakaputula ya lino na baloketo na bango; bakoki kolata te bilamba oyo etokisaka bato.
19 Mgbe ha na-apụ nʼogige dị nʼezi ebe ndị mmadụ nọ, ha ga-eyipụ uwe ha yi mgbe ha na-eje ozi, hapụkwa ha nʼime ọnụụlọ nsọ ndị a, yiri uwe ọzọ, ka ha ghara ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị e doro nsọ site nʼimetụ uwe ha ahụ.
Tango bakobima mpo na kokende na lopango ya libanda, na esika oyo bato bazalaka, bakolongola bilamba oyo bazalaki kosalela mosala na kati mpe bakotika yango kati na bashambre ya bule; bakolata bilamba mosusu mpo ete babulisa bato te na nzela ya bilamba na bango.
20 “‘Ha agaghị ekwe ka agịrị isi ha too ogologo, ha agakwaghị akpụchapụ ya. Naanị mkpacha ka ha ga na-akpacha isi ha.
Banganga-Nzambe bakoki te kokokola suki ya mito na bango to kokolisa makasi suki na bango; kasi basengeli kokata suki na bango malamu.
21 Onye nchụaja ọbụla agaghị aṅụ mmanya vaịnị mgbe ọ na-abata nʼogige dị nʼime.
Nganga-Nzambe moko te akomela masanga ya vino liboso ete akota na lopango ya kati.
22 Ha agaghị alụ nwanyị nke di ya nwụrụ anwụ, maọbụ nwanyị gbaara di ya alụkwaghị m. Kama ọ bụ naanị ụmụ agbọghọ ndị sitere nʼagbụrụ Izrel ndị na-amaghị nwoke, maọbụ nwunye ndị nchụaja nwụrụ anwụ.
Bakoki kobala te basi oyo bakufisa mibali to basi oyo bakabwana na mibali na bango na libala, kasi bakobala kaka bilenge basi ya Isalaele oyo bayebi nanu nzoto ya mibali te to basi ya Banganga-Nzambe oyo basila kokufa.
23 Ha ga-akụziri ndị m ihe dị iche nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ; gosi ha otu esi amata ihe dị iche nʼetiti ihe na-adịghị ọcha na nke dị ọcha.
Bakoteya bato ete bayeba kosala bokeseni kati na biloko ya bule mpe oyo ya bule te, kati na biloko ya mbindo mpe oyo ya peto.
24 “‘Ha ga-abụ ndị ikpe, idozi esemokwu dapụtara nʼetiti ndị m. Usoro iwu m niile ka ha ga-eji kpee ikpe. Ndị nchụaja nʼonwe ha kwa ga-erube isi nʼiwu m niile nʼoge mmemme ọbụla dị nsọ. Ha ga-ahụkwa na e doro ụbọchị izuike nsọ.
Na tango ya matata, Banganga-Nzambe bakotelema lokola basambisi mpo na kokata makambo kolanda mibeko, bakotosa mibeko mpe bikateli na Ngai, bafeti na Ngai, oyo ekatama mpe bosantu ya mikolo na Ngai ya Saba.
25 “‘Onye nchụaja agaghị emerụ onwe ya site nʼije nʼebe ozu dị, karịakwa maọbụ ozu nna ya maọbụ nne ya, ma o bụ nwa ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị na-enweghị di.
Nganga-Nzambe moko te akomikomisa mbindo na kopusana pene ya moto ya kokufa. Nzokande, akoki kondima komikomisa mbindo soki moto oyo akufi azali tata to mama na ye, mwana na ye ya mobali to ya mwasi, ndeko na ye ya mobali to ya mwasi oyo amibalelaki te.
26 Mgbe e mechara ka ọ dị ọcha ọzọ, ọ ga-echere ruo ụbọchị asaa.
Sima na kopetolama na ye, akozela mikolo sambo.
27 Ma nʼụbọchị ahụ, ọ ga-alọghachi nʼụlọ ukwu ahụ ịbanye nʼime ebe nsọ, ọ ga-ebu ụzọ chụọ aja mmehie nʼihi onwe ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Na mokolo oyo akokota kati na Esika ya bule, kati na lopango ya kati mpo na kosala mosala, akobonza mbeka mpo na masumu na ye moko, elobi Nkolo Yawe.
28 “‘Ọ bụ naanị mụ onwe m bụ ihe nketa nke ndị nchụaja ga-enweta. Unu agaghị enye ha ihe nweta ọbụla nʼIzrel. Mụ onwe m bụ ihe nketa ha.
Tala oyo ekozala libula ya Banganga-Nzambe: Ngai moko nde nazali libula na bango. Bokopesa bango mabele te kati na Isalaele; Ngai moko nde nakozala mabele na bango.
29 Ha ga-eri onyinye ịnata ihuọma, ihe aja mmehie, ihe aja ikpe ọmụma, ihe niile dị nʼIzrel e doro nsọ nye Onyenwe anyị ga-abụ nke ha.
Bakolia makabo ya bambuma, bambeka ya masumu mpe bambeka ya kozongisa boyokani; biloko nyonso oyo, kati na Isalaele, ebulisama mpo na Yawe ekozala ya bango.
30 Mkpụrụ mbụ kachasị mma site na mkpụrụ ubi ọbụla na onyinye niile pụrụ iche ga-abụ nke ndị nchụaja. Ọka mbụ a kwọrọ akwọ, nke a na-eweta nʼihe ubi ga-abụkwa nke ndị nchụaja, ime ka ngọzị dịkwasị nʼụlọ unu.
Bambuma ya liboso oyo ya kitoko mpe makabo na bino nyonso, kolongola ata eloko moko te, ekozala ya Banganga-Nzambe; bokopesa bango bambuma ya liboso ya bilanga na bino ya ble mpo ete mapamboli ezala kati na bandako na bino.
31 Ndị nchụaja agaghị ata nnụnụ ọbụla, maọbụ anụ nke nwụrụ ọnwụ chi ya, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu.
Banganga-Nzambe bakoki kolia te ndeke to nyama oyo ekufi yango moko to oyo nyama mosusu esili koboma.