< Izikiel 41 >

1 Mgbe ahụ, nwoke ahụ kpọbatara m nʼọnụ ụlọ ezumezu ahụ, ọ tụrụ akụkụ ọnụ ụzọ ya. Akụkụ ya ọbụla dị mita atọ na ụma abụọ, nke a bụ obosara ụlọ ikwu ahụ.
Kisha yule mtu akanileta mahali patakatifu pa hekalu na mihimili-dhiraa sita upana pande zote.
2 Obosara ọnụ ụzọ mbata ya dị mita ise na ụma atọ. Akụkụ aja abụọ nke ọnụ ụzọ ahụ dịkwa mita abụọ na ụma asaa. Ọ tụkwara ogologo ụlọ ezumezu ahụ; ya dịrị iri mita abụọ na otu nʼogologo, obosara ya dị mita iri na otu.
Upana wa maingilio ulikuwa dhiraa kumi; ukuta kila upande dhiraa tano urefu kila upande. Kisha yule mtu akapima ukubwa wa mahali patakatifu-dhiraa arobaini upana urefu na dhiraa ishirini upana.
3 Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ime ebe nsọ ahụ, tụọ ogidi dị nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime ya, chọpụta na obosara nke ọbụla bụ otu mita na otu ụma, obosara ọnụ ụzọ ahụ nʼonwe ya dị mita atọ na ụma abụọ. Akụkụ aja nke ọnụ ụzọ ọbụla dị mita atọ na ụma asaa nʼobosara.
Kisha yule mtu akaenda hata mahali patakatifu sana na kuipima miimili ya matokeo-dhiraa mbili-kuta pande zote zilikuwa dhiraa saba upana.
4 Ọ tụrụ ogologo ime ebe nsọ ahụ, ya dị mita iri na ọkara, obosara ya dịkwa mita iri na ọkara, nʼogologo ụlọ ezumezu ahụ. Ma ọ sịrị m, “Ebe a bụ Ebe Kachasị Nsọ.”
Kisha akapima urefu wa vyumba-dhiraa ishirini. Upana wake-dhiraa ishirini hata mbele kwenye ukumbi wa hekalu. Kisha akanambia, “Hapa ndipo mahali patakatifu sana.”
5 Ọ tụkwara mgbidi ụlọnsọ ukwu ahụ chọpụta na ịdị igbidi ya bụ mita atọ na ụma abụọ. E nwekwara ọnụụlọ ndị dị gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ, nke ọbụla dị mita abụọ na otu ụma nʼigbidi.
Kisha yule akapima kuta za nyumba-zilikuwa dhiraa sita unene. Upana wa kila upande wa chumba kuzunguka nyumba dhiraa nne upana.
6 Ọnụụlọ nta ndị a dị nʼokpukpu atọ, nke ọbụla nʼelu ibe ya, okpukpu ọbụla nwere iri ọnụụlọ atọ. E nwere mgbidi gbara aja ụlọnsọ ahụ gburugburu nʼakụkụ niile, ka ha bụrụ ihe nkwado nye ọnụụlọ nta ndị a, ka ihe nkwado ndị a ghara ịbụ ihe a rụnyere nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ.
Kulikuwa na pande tatu za vyumba, chumba kimoja juu ya kingine, vyumba thelathini, kulikuwa na kibao kitokezacho ukutani kuzunguka ukuta wa nyumba, kusaidia pande zote za vyumba, kwa kuwa hapakuwa na msaada uliokuwa umewekwa kwenye ukuta wa nyumba.
7 E wuru ọnụụlọ nta ndị a ka obosara ọnụụlọ ndị ahụ niile dị nʼelu ibe ha dị ukwuu karịa obosara ndị nke dị nʼokpuru ha. Nʼụzọ dị otu a, obosara ọnụụlọ niile dị nʼokpukpu nke abụọ dị ukwuu karịa nke dị nʼala; nke atọ dịkwa ukwuu karịa nke abụọ. E wukwara ebe e si arịgo site nʼokpukpu nke dịkarịsịrị ala rigoruo nʼọnụụlọ ndị kachasị elu, site nʼokpukpu nke dị nʼetiti.
Hivyo mbavu za nyumba zilipanuka na kuzunguka kwenda juu, kwa kuwa nyumba ilizunguka kwenda juu, na ngazi kuelekea juu hata sehemu ya juu, kupitia sehemu ya katikati.
8 Ahụrụ m na ụlọnsọ ukwu ahụ nwere ebe e wuliri elu nʼakụkụ ya niile. Ọ bụkwa ebe a dị elu ka e ji mee ntọala ọnụụlọ nta ndị ahụ niile. Ịdị ogologo nke ebe ahụ e wuliri elu bụ mita atọ na ụma abụọ.
Kisha nikaona sehemu iliyoinuka kuzunguka nyumba, msingi kwa ajili ya pande za vyumba; ikapimwa fimbo nzima urefu-dhiraa sita.
9 Ịdị arọ nke mgbidi ọnụụlọ nta ndị a nʼakụkụ ezi bụ mita abụọ na ụma atọ. Ala tọgbọrọ nʼefu nʼetiti ọnụụlọ nta ụlọnsọ ukwu ahụ,
Upana wa ukuta wa vyumba vya pembeni kwa upande wa nje ulikuwa dhiraa tano. Kulikuwa na sehemu ya wazi kwa upande wa nje wa hivi vyumba katika patakatifu.
10 na ọnụụlọ ndị nchụaja dị mita iri na ọkara nʼobosara, gbaa gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ.
Kwa upande mwingine wa hii sehemu ya wazi kulikuwa na vyumba vya makuhani upande wa nje; hii sehemu ilikuwa na dhiraa ishirini upana kupazunguka patakatifu.
11 E nwere ọnụ ụzọ ndị a na-esi abanye nʼọnụụlọ nta ndị ahụ, site nʼala ahụ na-enweghị ihe arụrụ na ya, otu ọnụ ụzọ nʼakụkụ ugwu, nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Obosara ala nke fọdụrụ dị mita abụọ na ụma atọ nʼakụkụ niile gbaa gburugburu.
Kulikuwa na milango kwenye vyumba vya pembeni kutoka sehemu ya wazi nyingine-njia ya mlango moja uliokuwa upande wa kaskazini, na mwingine upande wa kusini. Upana wa hili eneo la wazi ulikuwa na dhiraa tano kupazunguka.
12 Ma ụlọ nke na-eche ihu nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, dị iri mita atọ na asaa nʼobosara, ịdị igbidi nke aja ụlọ ahụ dị mita abụọ na ụma atọ, gbaa gburugburu, ogologo ya dịkwa iri mita anọ na asatọ.
Lile jengo lililokuwa limeelekea kwenye ua upande wa magaribi dhiraa sabini upana. Ukuta wake ulipimwa dhiraa tano pande zote, na ilikuwa dhiraa tisini urefu.
13 Mgbe ahụ, ọ tụrụ ụlọnsọ ukwu ahụ, ya dịrị iri mita ise na atọ, ogige ụlọnsọ, na ụlọ ahụ nakwa mgbidi ya, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo.
Kisha yule mtu akapapima patakatifu-dhiraa mia moja urefu. jengo lililokuwa limetengeka, kuta zake, na kwenye ua pia palipimwa dhiraa mia moja urefu.
14 Obosara nke ogige ụlọnsọ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, tinyere ebe ihu ụlọnsọ ukwu ahụ, dị iri mita ise na atọ.
Upana wa mbele kwenye ua mbele ya patakatifu pia kulikuwa dhiraa mia moja.
15 Ọ tụrụ ịdị ogologo nke ụlọ ahụ chere ihu nʼogige dị nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, tinyere ebe njegharị ya nke dị nʼakụkụ abụọ ya. Ọ dị iri mita ise na atọ. Ụlọ ezumezu ahụ, nʼime ebe nsọ ahụ, na mpụta nke ọnụ ụlọ, bụ nke chere ihu nʼogige ahụ,
Kisha yule mtu akapima urefu wa jengo karibu na patakatifu, kwa upande wake wa magharibi, na juu ya baraza pande zote-dhiraa mia moja. Mahali patakatifu na varanda,
16 ya na ọnụ ụzọ ndị ahụ, na oghereikuku niile dị warawara, na ebe njegharị gbara ha atọ gburugburu, ihe niile, elu ma ala, tinyere ọnụ ụzọ bụ nke eji osisi mmachite. Ala ya, na mgbidi ya ruo na oghereikuku, ma oghereikuku niile bụkwa ihe ekpuchiri ekpuchi.
kuta za ndani na madirisha, pamoja na madirisha madogo, na baraza za pande zote kwenye pande tatu, zilikuwa zimefungwa kwa mbao.
17 Nʼelu oghere dị nʼebe ọnụ ụzọ ezi, nke gara nʼime ebe nsọ, nakwa nʼahụ aja niile, na nkebi na nkebi, gbaa gburugburu nʼime na nʼezi ebe nsọ ahụ,
Juu ya lango la kuingilia hata patakatifu pa ndani na kuwekwa karibu na kuta kulikuwa na pazia lililokuwa limepimwa.
18 ka a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ. Cherubim na-esota osisi nkwụ. Osisi nkwụ ọbụla na-esotakwa cherubim. Cherub ọbụla nwere ihu abụọ:
Palikuwa pamepambwa na makerubi mitende; pamoja na mitende kati ya kerubi na kerubi, na kila kerubi lilikuwa na nyuso mbili:
19 otu akụkụ cherub nke bụ ihu mmadụ chere ihu nʼotu nkwụ. Ihu ya nke ọzọ, nke bụ ihu ọdụm, chere ihu na nkwụ nke dị akụkụ nke ọzọ. A tụrụ ha gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ.
uso wa mtu aliyekuwa ameelekea mtende mmoja, na uso wa mwana simba ulitazama kuelekea mtende kwa upande mwingine. Vilifunikwa kuzunguka malango ya kuingia yote ya nyumba.
20 Site nʼala ụlọ ruo nʼelu ọnụ ụzọ ya, a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ nʼahụ aja ụlọ ezumezu ahụ.
Kutoka chini hata juu kwenye njia ya mlango, makerubi na mtende vilifunikwa na ukuta wa nje ya nyumba.
21 Ọnụ ụlọ ezumezu ahụ nwere mbudo ibo nke akụkụ anọ ya ha otu nʼọtụtụ. Nke dị nʼihu Ebe ahụ Kachasị Nsọ, yiri ndị ọzọ.
Mihimili ya lango la mahali patakatifu lilikuwa mraba. Umbo lao lilikuwa kama umbo la
22 Ebe ịchụ aja ya bụ nke eji osisi wuo. Akụkụ niile nke ebe ịchụ aja a ha nʼotu. Ọ dị otu mita na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita itoolu nʼakụkụ ya ọbụla. Osisi ka e ji wuo nkuku anọ ya, akụkụ ya niile, na ntọala ya. Mgbe ahụ, nwoke ahụ gwara m, “Nke a bụ tebul na-adị nʼihu Onyenwe anyị.”
kwanza madhabahu ya mbao mbele ya mahali patakatifu, ambapo kulikuwa na dhiraa tatu kwenda juu na dhiraa urefu kwa kila upande. Pembe zake mihimili, kitako, na kiunzi kilitengenezwa kwa mbao. Kisha yule mtu akanambia, “Hii ni meza ambayo itakuwa kwa ajili ya Yahwe.”
23 Ma ụlọ ezumezu, ma Ebe ahụ Kachasị Nsọ, nwere ọnụ ụzọ abụọ, nʼotu nʼotu.
Kulikuwa na milango miwili kwa ajili ya mahali patakatifu na mahali patakatifu sana.
24 Ọnụ ụzọ ọbụla nwere ibo abụọ, ibo abụọ nke a na-akwagharị gburugburu.
Hii milango ilikuwa na bawaba mbili kila mlango paneli, paneli mbili kwa ajili ya mlango mmoja na paneli mbili kwa ajili ya mwingine.
25 A tụnyere onyinyo cherubim na osisi nkwụ nʼelu ibo na-edubanye nʼụlọ ezumezu ahụ, dịka ndị ahụ a tụrụ nʼahụ mgbidi niile. E jikwa osisi rụchie elu ihu mpụta nke ọnụ ụlọ ahụ.
Ilifunikwa-juu ya milango ya mahali patakatifu ambapo makerubi na mti wa mtende kama kuta ilipambwa, kulikuwa na paa ya mbao juu ya varanda kwa mbele.
26 Windo dị warawara dị nʼaja mpụta ọnụ ụlọ ahụ, nke e sekwasịrị oyiyi osisi nkwụ; ọnụụlọ nta niile nke ụlọnsọ ukwu ahụ nwekwara ihe a rụnyere nʼelu ụzọ ya, nke a machiri amachi.
Kulikuwa na madidsha madogo miti ya mitende kwenye varanda pande zote. Hivyo vilikuwa vyumba vya pembeni ya nyumba, na pia ilizielekea dari.

< Izikiel 41 >