< Izikiel 41 >

1 Mgbe ahụ, nwoke ahụ kpọbatara m nʼọnụ ụlọ ezumezu ahụ, ọ tụrụ akụkụ ọnụ ụzọ ya. Akụkụ ya ọbụla dị mita atọ na ụma abụọ, nke a bụ obosara ụlọ ikwu ahụ.
그가 나를 데리고 성소에 이르러 그 문벽을 척량하니 이편 두께도 육 척이요 저편 두께도 육 척이라 두께가 이와 같으며
2 Obosara ọnụ ụzọ mbata ya dị mita ise na ụma atọ. Akụkụ aja abụọ nke ọnụ ụzọ ahụ dịkwa mita abụọ na ụma asaa. Ọ tụkwara ogologo ụlọ ezumezu ahụ; ya dịrị iri mita abụọ na otu nʼogologo, obosara ya dị mita iri na otu.
그 문통의 광이 십 척이요 문통 이편 벽의 광이 오 척이요 저편 벽의 광이 오 척이며 그가 성소를 척량하니 그 장이 사십 척이요 그 광이 이십 척이며
3 Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ime ebe nsọ ahụ, tụọ ogidi dị nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime ya, chọpụta na obosara nke ọbụla bụ otu mita na otu ụma, obosara ọnụ ụzọ ahụ nʼonwe ya dị mita atọ na ụma abụọ. Akụkụ aja nke ọnụ ụzọ ọbụla dị mita atọ na ụma asaa nʼobosara.
그가 안으로 들어가서 내전 문통의 벽을 척량하니 두께가 이 척이요 문통이 육 척이요 문통의 벽의 광이 각기 칠 척이며
4 Ọ tụrụ ogologo ime ebe nsọ ahụ, ya dị mita iri na ọkara, obosara ya dịkwa mita iri na ọkara, nʼogologo ụlọ ezumezu ahụ. Ma ọ sịrị m, “Ebe a bụ Ebe Kachasị Nsọ.”
그가 내전을 척량하니 장이 이십 척이요 광이 이십 척이라 그가 내게 이르되 이는 지성소니라 하고
5 Ọ tụkwara mgbidi ụlọnsọ ukwu ahụ chọpụta na ịdị igbidi ya bụ mita atọ na ụma abụọ. E nwekwara ọnụụlọ ndị dị gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ, nke ọbụla dị mita abụọ na otu ụma nʼigbidi.
전의 벽을 척량하니 두께가 육 척이며 전 삼면에 골방이 있는데 광이 각기 사 척이며
6 Ọnụụlọ nta ndị a dị nʼokpukpu atọ, nke ọbụla nʼelu ibe ya, okpukpu ọbụla nwere iri ọnụụlọ atọ. E nwere mgbidi gbara aja ụlọnsọ ahụ gburugburu nʼakụkụ niile, ka ha bụrụ ihe nkwado nye ọnụụlọ nta ndị a, ka ihe nkwado ndị a ghara ịbụ ihe a rụnyere nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ.
골방은 삼 층인데 골방 위에 골방이 있어 모두 삼십이라 그 삼면 골방이 전 벽 밖으로 그 벽에 의지하였고 전 벽 속은 범하지 아니하였으며
7 E wuru ọnụụlọ nta ndị a ka obosara ọnụụlọ ndị ahụ niile dị nʼelu ibe ha dị ukwuu karịa obosara ndị nke dị nʼokpuru ha. Nʼụzọ dị otu a, obosara ọnụụlọ niile dị nʼokpukpu nke abụọ dị ukwuu karịa nke dị nʼala; nke atọ dịkwa ukwuu karịa nke abụọ. E wukwara ebe e si arịgo site nʼokpukpu nke dịkarịsịrị ala rigoruo nʼọnụụlọ ndị kachasị elu, site nʼokpukpu nke dị nʼetiti.
이 두루 있는 골방이 그 층이 높아갈수록 넓으므로 전에 둘린 이 골방이 높아갈수록 전에 가까워졌으나 전의 넓이는 아래 위가 같으며 골방은 아랫층에서 중층으로 윗층에 올라가게 되었더라
8 Ahụrụ m na ụlọnsọ ukwu ahụ nwere ebe e wuliri elu nʼakụkụ ya niile. Ọ bụkwa ebe a dị elu ka e ji mee ntọala ọnụụlọ nta ndị ahụ niile. Ịdị ogologo nke ebe ahụ e wuliri elu bụ mita atọ na ụma abụọ.
내가 보니 전 삼면의 지대 곧 모든 골방 밑 지대의 고가 한 장대 곧 큰 자로 육 척인데
9 Ịdị arọ nke mgbidi ọnụụlọ nta ndị a nʼakụkụ ezi bụ mita abụọ na ụma atọ. Ala tọgbọrọ nʼefu nʼetiti ọnụụlọ nta ụlọnsọ ukwu ahụ,
전을 의지한 그 골방 바깥벽 두께는 오 척이요 그 외에 빈 터가 남았으며
10 na ọnụụlọ ndị nchụaja dị mita iri na ọkara nʼobosara, gbaa gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ.
전 골방 삼면에 광이 이십 척 되는 뜰이 둘려 있으며
11 E nwere ọnụ ụzọ ndị a na-esi abanye nʼọnụụlọ nta ndị ahụ, site nʼala ahụ na-enweghị ihe arụrụ na ya, otu ọnụ ụzọ nʼakụkụ ugwu, nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Obosara ala nke fọdụrụ dị mita abụọ na ụma atọ nʼakụkụ niile gbaa gburugburu.
그 골방 문은 다 빈 터로 향하였는데 한 문은 북으로 향하였고 한 문은 남으로 향하였으며 그 둘려 있는 빈 터의 광은 오 척이더라
12 Ma ụlọ nke na-eche ihu nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, dị iri mita atọ na asaa nʼobosara, ịdị igbidi nke aja ụlọ ahụ dị mita abụọ na ụma atọ, gbaa gburugburu, ogologo ya dịkwa iri mita anọ na asatọ.
서편 뜰 뒤에 건물이 있는데 광이 칠십 척이요 장이 구십 척이며 그 사면 벽의 두께가 오 척이더라
13 Mgbe ahụ, ọ tụrụ ụlọnsọ ukwu ahụ, ya dịrị iri mita ise na atọ, ogige ụlọnsọ, na ụlọ ahụ nakwa mgbidi ya, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo.
그가 전을 척량하니 장이 일백 척이요 또 서편 뜰과 그 건물과 그 벽을 합하여 장이 일백 척이요
14 Obosara nke ogige ụlọnsọ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, tinyere ebe ihu ụlọnsọ ukwu ahụ, dị iri mita ise na atọ.
전 전면의 광이 일백 척이요 그 앞 동향한 뜰의 광도 그러하며
15 Ọ tụrụ ịdị ogologo nke ụlọ ahụ chere ihu nʼogige dị nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, tinyere ebe njegharị ya nke dị nʼakụkụ abụọ ya. Ọ dị iri mita ise na atọ. Ụlọ ezumezu ahụ, nʼime ebe nsọ ahụ, na mpụta nke ọnụ ụlọ, bụ nke chere ihu nʼogige ahụ,
그가 뒷뜰 뒤에 있는 건물을 척량하니 그 좌우편 다락까지 일백 척이더라 내전과 외전과 그 뜰의 현관과
16 ya na ọnụ ụzọ ndị ahụ, na oghereikuku niile dị warawara, na ebe njegharị gbara ha atọ gburugburu, ihe niile, elu ma ala, tinyere ọnụ ụzọ bụ nke eji osisi mmachite. Ala ya, na mgbidi ya ruo na oghereikuku, ma oghereikuku niile bụkwa ihe ekpuchiri ekpuchi.
문통 벽과 닫힌 창과 삼면에 둘려 있는 다락은 문통 안편에서부터 땅에서 창까지 널판으로 가리웠고 (창은 이미 닫히었더라)
17 Nʼelu oghere dị nʼebe ọnụ ụzọ ezi, nke gara nʼime ebe nsọ, nakwa nʼahụ aja niile, na nkebi na nkebi, gbaa gburugburu nʼime na nʼezi ebe nsọ ahụ,
문통 위와 내전과 외전의 사면 벽도 다 그러하니 곧 척량한 대소대로며
18 ka a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ. Cherubim na-esota osisi nkwụ. Osisi nkwụ ọbụla na-esotakwa cherubim. Cherub ọbụla nwere ihu abụọ:
널판에는 그룹들과 종려나무를 새겼는데 두 그룹 사이에 종려나무 하나가 있으며 매 그룹에 두 얼굴이 있으니
19 otu akụkụ cherub nke bụ ihu mmadụ chere ihu nʼotu nkwụ. Ihu ya nke ọzọ, nke bụ ihu ọdụm, chere ihu na nkwụ nke dị akụkụ nke ọzọ. A tụrụ ha gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ.
하나는 사람의 얼굴이라 이편 종려나무를 향하였고 하나는 어린 사자의 얼굴이라 저편 종려나무를 향하였으며 온 전 사면이 다 그러하여
20 Site nʼala ụlọ ruo nʼelu ọnụ ụzọ ya, a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ nʼahụ aja ụlọ ezumezu ahụ.
땅에서부터 문통 위에까지 그룹들과 종려나무들을 새겼으니 성전벽이 다 그러하더라
21 Ọnụ ụlọ ezumezu ahụ nwere mbudo ibo nke akụkụ anọ ya ha otu nʼọtụtụ. Nke dị nʼihu Ebe ahụ Kachasị Nsọ, yiri ndị ọzọ.
외전 문설주는 네모졌고 내전 전면에 있는 식양은 이러하니
22 Ebe ịchụ aja ya bụ nke eji osisi wuo. Akụkụ niile nke ebe ịchụ aja a ha nʼotu. Ọ dị otu mita na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita itoolu nʼakụkụ ya ọbụla. Osisi ka e ji wuo nkuku anọ ya, akụkụ ya niile, na ntọala ya. Mgbe ahụ, nwoke ahụ gwara m, “Nke a bụ tebul na-adị nʼihu Onyenwe anyị.”
곧 나무 제단의 고가 삼 척이요 장이 이 척이며 그 모퉁이와 옆과 면을 다 나무로 만들었더라 그가 내게 이르되 이는 여호와의 앞의 상이라 하더라
23 Ma ụlọ ezumezu, ma Ebe ahụ Kachasị Nsọ, nwere ọnụ ụzọ abụọ, nʼotu nʼotu.
내전과 외전에 각기 문이 있는데
24 Ọnụ ụzọ ọbụla nwere ibo abụọ, ibo abụọ nke a na-akwagharị gburugburu.
문마다 각기 두 문짝 곧 접치는 두 문짝이 있어 이 문에 두 짝이요 저 문에 두 짝이며
25 A tụnyere onyinyo cherubim na osisi nkwụ nʼelu ibo na-edubanye nʼụlọ ezumezu ahụ, dịka ndị ahụ a tụrụ nʼahụ mgbidi niile. E jikwa osisi rụchie elu ihu mpụta nke ọnụ ụlọ ahụ.
이 성전 문에 그룹과 종려나무를 새겼는데 벽에 있는 것과 같고 현관 앞에는 나무 디딤판이 있으며
26 Windo dị warawara dị nʼaja mpụta ọnụ ụlọ ahụ, nke e sekwasịrị oyiyi osisi nkwụ; ọnụụlọ nta niile nke ụlọnsọ ukwu ahụ nwekwara ihe a rụnyere nʼelu ụzọ ya, nke a machiri amachi.
현관 좌우편에는 닫힌 창도 있고 종려나무도 새겼고 전의 골방과 디딤판도 그러하더라

< Izikiel 41 >