< Izikiel 4 >

1 “Ugbu a, gị nwa nke mmadụ, were otu ọkpụrụkpụ aja, tọgbọ ya nʼihu gị. Sepụtakwa obodo Jerusalem nʼelu ya.
“Yanzu, ɗan mutum, ka ɗauki tubalin yumɓu, ka ajiye shi a gabanka ka kuma zāna birnin Urushalima a kansa.
2 Seekwa ihe nnọchigide nʼagha megide ya, wuokwa ụlọ ndị agha gburugburu ya, wukọta ụlọ ikwu dị iche iche megide ya na ihe e ji akụdasị mgbidi ya niile.
Sa’an nan ka yi mata ƙawanya. Ka kafa mata katangar ƙawanya, ka gina katangar da ɗan tudu ka kewaye ta da dundurusai.
3 Werekwa efere igwe debe nʼetiti gị na obodo ahụ dịka mgbidi e ji igwe wuo. Chee obodo ahụ ihu gị, ka ị chegide ya nke ọma nʼihi na ndị iro gbara ya gburugburu. Nke a ga-abụ ihe ama nye ndị Izrel.
Sa’an nan ka ɗauki kwanon ƙarfe, ka shirya shi kamar katangar ƙarfe tsakaninka da birnin ka kuma zuba mata ido. Za tă kasance a ƙarƙashin ƙawanya, kai kuwa za ka yi mata ƙawanya. Wannan zai zama alama ga gidan Isra’ila.
4 “Ugbu a, dinara ala nʼakụkụ aka ekpe gị, aga m enye gị ntaramahụhụ mmehie ndị Izrel, ị ga-ata ahụhụ mmehie ha ụbọchị niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị.
“Sa’an nan ka kwanta a hagunka ka kuma sa zunubin gidan Isra’ila a kanka. Za ka ɗauki zunubinsu na waɗansu kwanakin da kake kwance a gefenka.
5 Nʼihi na ana m enye gị narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọnụọgụgụ nke a na ọnụọgụgụ nke afọ ntaramahụhụ ha ga-abụ otu, ọ bụ oge ha. Otu a ka ị ga-esi buru mmehie Izrel.
Na ɗora maka kwanaki bisa ga shekarun zunubinsu. Saboda haka cikin kwana 390 za ka ɗauki zunubin gidan Isra’ila.
6 “Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-edina ala nke ugboro abụọ, ma ọ ga-abụ nʼakụkụ aka nri gị, ị ga-eburu ntaramahụhụ mmehie ndị Juda. Ọ bụ iri abalị anọ, otu ụbọchị ga-anọchi anya otu afọ.
“Bayan ka gama haka, ka sāke kwantawa, a wannan lokaci a gefen damarka, ka kuma ɗauki zunubin gidan Yahuda. Na ɗora maka kwanaki 40, kwana guda a madadin shekara guda.
7 Chee ihu gị nʼebe nnọchibido Jerusalem, gbara aka nkịtị buo amụma megide ya.
Ka juya fuskarka wajen ƙawanyar Urushalima da hannunka a buɗe ka yi annabci a kanta.
8 Aga m eke gị eriri ahụ gị niile, ka ị ghara inwe ike tụgharịa site nʼotu akụkụ gaa nʼakụkụ nke ọzọ tutu ụbọchị nnọchigide gị ahụ niile ezuo.
Zan ɗaura ka da igiyoyi don kada ka juya daga wannan gefe zuwa wani gefe sai ka gama kwanakin ƙawanyarka.
9 “Ma gị were ọka wiiti na ọka balị, werekwa akịdị na lentil, na ọka milet na spelti. Tinyekọta ha nʼotu ite were ha meere onwe gị achịcha. Nʼụbọchị ole ahụ niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị, narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọ bụ ya ka ị ga-eri.
“Ka ɗauki alkama da sha’ir, wake da acca, gero da maiwa; ka sa su a tulun ajiya ka kuma yi amfani da su don yin burodi wa kanka. Za ka ci shi a kwanaki 390 da za ka kwanta a gefenka.
10 A ga-atụ ihe oriri gị atụ, nri nke ị ga-eri otu mgbe ga-abụ narị gram abụọ na iri gram atọ; naanị otu mgbe ka ị ga-eri nri nʼụbọchị.
Ka auna shekel ashirin na abinci don kowace rana ka kuma ci shi a ƙayyadadden lokaci.
11 A ga-ekupụtakwa mmiri ị ga-aṅụ, ị ga-aṅụ mmiri naanị otu ugboro nʼụbọchị, otu udu mmiri e kere ụzọ isii.
Haka ma ka auna kashi ɗaya bisa shida na garwan ruwa ka sha shi a ƙayyadadden lokaci.
12 Ị ga-eri ya dịka ogbe achịcha ọka balị, ị ga-eghe ya nʼelu nsị mmadụ kpọrọ nkụ mgbe ndị mmadụ nọ na-ele gị anya.”
Ka ci abinci yadda za ka ci ƙosai sha’ir, ka gasa shi a gaban mutane, ka yi amfani da najasar mutane kamar itacen wuta.”
13 Onyenwe anyị kwuru, “Otu a ka ndị Izrel ga-esi rie nri rụrụ arụ, nʼetiti mba dị iche iche ebe m ga-achụga ha.”
Ubangiji ya ce, “Ta haka mutanen Isra’ila za su ci ƙazantaccen abinci a cikin al’ummai inda zan kore su in kai.”
14 Mgbe ahụ, asịrị m, “E e, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee, emerụbeghị m onwe m site na nwantakịrị m ruo ugbu a, eribeghị ihe ọbụla nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, anụ na-adịghị ọcha abatụbeghị m nʼọnụ.”
Sai na ce, “Ba haka ba ne, Ubangiji Mai Iko Duka! Ban taɓa ƙazantar da kaina ba. Daga ƙuruciyata har zuwa yanzu ban taɓa cin wani abin da aka samu ya mutu ko abin da namun jeji suka kashe ba. Ba nama marar tsabtan da ya taɓa shiga bakina.”
15 Ọ sịrị, “Ọ dị mma, aga m enye gị nsị ehi nʼọnọdụ nke mmadụ, nʼelu ya ka ị ga-akwado achịcha gị.”
Sai ya ce, “To da kyau, zan bari ka gasa burodin a kan kashin shanu a maimakon najasar mutane.”
16 Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, lee, aga m eme ka nri kọ na Jerusalem; ha ga-eji nchegbu rie nri a tụpụtara atụpụta, jirikwa egwu ṅụọ mmiri e kupụtara ekupụta.
Sa’an nan ya ce mini, “Ɗan mutum, zan yanke tanadin abinci a Urushalima. Mutane za su auna abincin da za su ci da tsoro su kuma auna ruwan da za su sha cikin fargaba,
17 Aga m eme ka ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ kọọ ha. Ha ga na-elerịta onwe ha anya nʼoke egwu, ha ga-anwụkwa nʼihi mmehie ha.”
domin abinci da ruwa za su kāsa. Za su damu da ganin juna za su kuma lalace saboda zunubinsu.

< Izikiel 4 >