< Izikiel 39 >

1 “Ma gị, nwa nke mmadụ buo amụma megide Gog, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m emegide gị, Gog, onyeisi nke Meshek na Tubal.
"You, son of man, prophesy against Gog, and say, 'Thus says the LORD: "Look, I am against you, Gog, chief prince of Meshech and Tubal:
2 Aga m echigharị gị, kpụrụ gị na-aga. Aga m esi nʼebe dịkarịsịrị anya nʼakụkụ ugwu kpọta gị, ziga gị ka i buso ugwu niile nke Izrel agha.
and I will turn you around, drag you along, and bring you up from the remotest parts of the north, and bring you against the mountains of Israel.
3 Mgbe ahụ, aga m etichapụ ụta dị gị nʼaka ekpe, meekwa ka àkụ niile nke dị nʼaka nri gị dachapụ.
Then I will strike your bow out of your left hand, and will make your arrows fall from your right hand.
4 Nʼelu ugwu niile nke Izrel ka ị ga-ada, gị onwe gị, na usuu ndị agha gị niile, na mba niile dị iche iche ndị na-eso gị. Udele niile dị iche iche na anụ ọhịa niile ka m ga-enyefe anụ ahụ unu ka ha were unu mere ihe oriri.
You will fall on the mountains of Israel, you and all your troops and the people who are with you. I will give you to birds of prey of every king and to the beasts of the field to be devoured.
5 Ị ga-ada nʼọhịa na-enweghị ebe nzobe, nʼihi na m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
You will fall in the open field; for I have spoken," says the LORD.
6 Aga m awụkwasị ọkụ nʼahụ Magog, na nʼahụ ndị ahụ niile bi nʼudo, nʼọnụ mmiri niile. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
And I will send a fire on Magog and on those who dwell securely in the coastlands; then they will know that I am the LORD.
7 “‘Aga m eme ka amara aha nsọ m nʼetiti ndị m bụ Izrel. Agaghị m ekwekwa ka e lelịa aha nsọ m anya ọzọ. Mba niile dị iche iche ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nọ nʼIzrel.
"'And I will make my holy name known in the midst of my people Israel, and I will not allow my holy name to be profaned anymore. And the nations shall know that I am the LORD, the Holy One in Israel.
8 Lee, ọ na-abịa, nʼezie, ọ ga-emekwa, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Nke a bụ ụbọchị ahụ nke m kwuru ihe banyere ya.
Look, it is coming and it will happen, says the LORD. This is the day I have spoken about.
9 “‘Nʼoge ahụ, ndị bi nʼobodo niile nke Izrel ga-apụ tụtụkọtaa ngwa agha ndị ahụ, were fụnwue ọkụ, surekwaa ha ọkụ, ma ọta ukwu ma ọta nta niile, ụta na àkụ niile, ma mkpọ agha na ùbe niile. Ọ bụ afọ asaa ka ha ga-eji ha mere nkụ.
"'Then those who dwell in the cities of Israel shall go out and make fires of the weapons and burn them, both the shields and bucklers, bows and the arrows, war clubs and spears, and they shall make fires of them for seven years,
10 Ha agaghị akpatakwa nkụ site nʼọhịa ọzọ, maọbụ gbuta ha site nʼoke ọhịa, nʼihi na ha ga-eji ngwa agha ndị a mere ihe ịfụnwu ọkụ. Mgbe ahụ, ha ga-akwata ihe onwunwe nke ndị ahụ kwakọrọ ihe onwunwe ha nʼagha, lụtakwa ihe onwunwe nke ndị ahụ lụnara ha ihe onwunwe ha nʼike. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
so that they shall no need to take wood out of the field or gather firewood from the forests, because they shall make fires of the weapons; and they will take the spoil from those who despoiled them, and plunder those who plundered them, says the LORD.
11 “‘Nʼụbọchị ahụ, aga m enye Gog ebe olili ya nʼIzrel, nʼime ndagwurugwu si ọwụwa anyanwụ gawa nʼụzọ oke osimiri. Ọ ga-anọchi ụzọ ndị ije nʼihi na ebe ahụ ka a ga-eli Gog na usuu ndị agha ya. Ya mere, a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Hamọn Gog.
"'And it shall happen on that day that I will give to Gog a place for burial in Israel, the Valley of the Travelers east of the sea; and it shall block the way of the travelers. So they shall bury Gog and all his multitude; and they shall call it The Valley of Hamon Gog.
12 “‘Ọnwa asaa ka ọ ga-ewe ndị Izrel ili ozu ahụ niile, ime ka ala ahụ dị ọcha.
For seven months the house of Israel will be burying them, in order to cleanse the land.
13 Ndị niile nke ala ahụ ga-eli ha, ụbọchị ahụ m ga-eme ka ebube m pụta ìhè ga-abụ ụbọchị ihe ncheta nye ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Yes, all the people of the land shall bury them, and it shall be a memorial for them on the day that I show my glory, says the LORD.
14 A ga-ekewapụtakwa ndị ọrụ ha ga-abụ naanị ime ka ala ahụ dị ọcha. Ha ga-ejegharị nʼala ahụ niile, ha na ndị ọzọ, na-eli ozu ọbụla bụ ndị tọgbọrọ nʼala. “‘Mgbe ọnwa asaa zuru, ha ga-edo anya chọgharịa nʼala ahụ ma o nwere ebe ozu ọzọ dị.
And they shall designate men to travel through the land regularly, burying those who remain on the face of the land, in order to cleanse it. At the end of seven months they shall make a search.
15 Mgbe ahụ, ha na-ejegharị, ọ bụrụ na onye ọbụla achọta ọkpụkpụ mmadụ ọ ga-amanye ihe ịrịbama nʼakụkụ ya, ka ndị na-eli ozu hụ ha, kporokwa ha gaa na Ndagwurugwu Gog na ndị agha ya lie ha.
As they go through the land and anyone sees a human bone, he will put a marker next to it until the gravediggers have buried it in the Valley of Hamon Gog.
16 Ọzọkwa, otu obodo aha ya bụ Hamona, nke pụtara ọtụtụ, ga-adị nʼebe ahụ. Otu a ka ha ga-esi mee ka ala ahụ dị ọcha.’
Moreover, Hamonah will be the name of a city. Thus they shall cleanse the land.'
17 “Nwa nke mmadụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, kpọọ ụmụ nnụnụ niile oku, na anụ ọhịa niile dị iche iche, sị ha, ‘Chịkọtaanụ onwe unu, site nʼakụkụ niile bịanụ nʼọchụchụ aja m, nke mụ onwe m na-achụ nʼihi unu, bụ aja dị ukwuu nke m na-achụ nʼelu ugwu niile dị nʼIzrel. Nʼebe ahụ ka unu ga-anọ taa anụ, ṅụọkwa ọbara.
"And as for you, son of man, thus says the LORD: Speak to every kind of bird and to all the wild animals, 'Assemble and come, gather from all around to my sacrifice which I am going to sacrifice for you, a great sacrifice on the mountains of Israel, that you may eat flesh and drink blood.
18 Anụ ahụ ndị dị ike ka unu ga-eri, ọ bụkwa ọbara ndịisi niile nke ụwa ka unu ga-aṅụ, dịka a ga-asị na ha bụ ebule na ụmụ atụrụ, na mkpi, na oke ehi, anụ mara abụba nke si na Bashan.
You shall eat the flesh of the mighty, and drink the blood of the princes of the earth, of rams, of lambs, and of goats, of bulls, all of them fattened animals of Bashan.
19 Unu ga-erijukwa abụba afọ, ṅụbigakwa ọbara oke ruo mgbe ọ ga-ebu unu, site nʼaja mmemme nke m na-achụ nʼihi unu.
And you shall eat fat until you are full, and drink blood until you are drunk, at my sacrifice which I have sacrificed for you.
20 Afọ anụ ịnyịnya, na ụgbọala, na nke ndị dike, na nke ndị agha niile ga-eju unu na tebul m.’ Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
And you shall be filled at my table with horses and charioteers, with warriors and with all the soldiers,' says the LORD.
21 “Mgbe ahụ, aga m egosi ebube m na nsọpụrụ m nʼetiti mba niile dị iche iche. Mba niile ga-ahụkwa ahụhụ nke m tara ha, na aka m nke m tụkwasịrị ha.
"'And I will set my glory among the nations, and all the nations shall see my judgment when I have executed it and my hand when I lay it on them.
22 Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ụlọ Izrel ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.
So the house of Israel shall know that I am the LORD their God, from that day on.
23 Mba niile ga-amatakwa na ọ bụ nʼihi mmehie ka e ji dọta Izrel nʼagha, buru ha jee mba dị iche iche. Ha ga-amata na ihe dị otu a dakwasịrị ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji zoo ihu m site nʼebe ha nọ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha niile dakwara site na mma agha.
And the nations shall know that the house of Israel went into captivity for their iniquity, because they were unfaithful to me, so I hid my face from them, and I gave them into the hand of their adversaries, and all of them fell by the sword.
24 Atara m ha ahụhụ dịka adịghị ọcha ha na ajọ omume ha si dị. Ezokwara m ihu m site nʼebe ha nọ.
I dealt with them according to their uncleanness and according to their transgressions, and I hid my face from them.'
25 “Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Aga m eme ka Jekọb a dọtara nʼagha lọta. Aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ndị Izrel niile. Aga m esitekwa nʼekworo mee ka aha m dịgide nsọ.
"Therefore thus says the LORD: 'Now will I restore the fortunes of Jacob and have mercy on the whole house of Israel, and I will be jealous for my holy name.
26 Ha ga-echezọkwa ihe ihere ha, na-ekwesighị ntụkwasị obi ha niile, nke ha gosiri m, mgbe ha biri nʼudo nʼala ha, na-enweghị onye na-eme ka ha tụọ egwu.
And they shall feel remorse for their disgrace and all the unfaithfulness they committed against me, when they dwell securely in their land with none to make them afraid.
27 Mgbe m mere ka ha site na mba dị iche iche pụta, mgbe m sitere nʼala niile nke ndị iro ha kpọpụta ha, aga m esite na ha gosi ịdị nsọ m nye mba dị iche iche.
When I have brought them back from the peoples and gathered them out of their enemies' lands, then I will be sanctified through them in the sight of the many nations.
28 Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha. Ha ga-amata na ọ bụ ezie na ọ bụ m mere ka a dọta ha nʼagha buru ha jee mba dị iche iche, na m ga-achịkọta ha mee ka ha lọghachi nʼala nke aka ha. Ọ dịkwaghị onye a ga-ahapụ na mba ọzọ.
Then they will know that I am the LORD their God, because I sent them into exile among the nations, and then gathered them into their own land; and I will leave none of them there any more.
29 Agaghị m ezokwa ihu m ọzọ nʼebe ha nọ, nʼihi na aga m awụkwasị ụlọ Izrel Mmụọ m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
And I will no longer hide my face from them, when I pour out my Spirit on the house of Israel,' says the LORD."

< Izikiel 39 >