< Izikiel 36 >

1 “Nwa nke mmadụ, buo amụma nye ugwu niile dị nʼIzrel, na-asị ha, ‘Ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị.
Wena-ke ndodana yomuntu, profetha kuzo izintaba zakoIsrayeli, uthi: Lina zintaba zakoIsrayeli, zwanini ilizwi leNkosi.
2 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị iro unu ekwuola megide unu sị, “Ahaa! Ebe niile dị elu nke mgbe ochie aghọọla ihe nnweta anyị.”’
Itsho njalo iNkosi uJehova: Ngoba isitha sitshilo simelene lani: Aha, ngitsho izindawo zasendulo eziphakemeyo ziyilifa lethu;
3 Nʼihi ya, buo amụma sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na ha emeela ka unu tọgbọrọ nʼefu, chụgharịa unu ọsọ nʼakụkụ niile, mekwaa ka unu ghọọrọ mba niile ihe nnweta, ma meekwa ka unu bụrụ ndị a na-ekwujọ, na ndị a na-akọcha,
ngakho profetha uthi: Itsho njalo iNkosi uJehova: Ngoba, yebo, ngoba bakwenze incithakalo, baliginya inhlangothi zonke, ukuze libe yilifa kuyo insali yabezizwe, liphakanyiswa endebeni zolimi, laba lunyeyo lwabantu;
4 nʼihi ya, unu ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa ugwu ukwuu na ugwu nta niile, na mgbawara niile dị nʼala, na ndagwurugwu niile, na ebe niile tọgbọrọ nʼefu, na obodo ndị ahụ niile ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya, nke ndị mba ọzọ kwakọọrọ ihe dị ha nʼime, ma jirikwa ha na-eme ihe ọchị.
ngakho, lina zintaba zakoIsrayeli, zwanini ilizwi leNkosi uJehova: Itsho njalo iNkosi uJehova ezintabeni, lemaqaqeni, emifuleni, lezihotsheni, lemanxiweni achithekileyo, lemizini etshiyiweyo, esibe yimpango lenhlekisa kunsali yezizwe ezizingelezeleyo.
5 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nke obi m ka m ji kwuo okwu megide mba ndị ọzọ, ma megidekwa Edọm, nʼihi na ọ bụ site nʼịkpọ asị nke obi ha ka ha ji mee ka ala m bụrụ ihe nnweta ha, ka ha si otu a kposaa, ma chịkọrọkwa ihe niile dị nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ala ahụ.’
Ngakho itsho njalo iNkosi uJehova: Isibili ngomlilo wobukhwele bami sengikhulume ngimelene lensali yabezizwe, ngimelene leEdoma yonke, abazinikele ilizwe lami ukuthi libe yilifa ngentokozo yenhliziyo yonke, ngengqondo yokudelela, ngenxa yokuliphosa libe yimpango.
6 Nʼihi nke a, buo amụma banyere Izrel, gwa ugwu ukwu ya na ugwu nta ya niile, na mgbawara ala ya, na ndagwurugwu ya niile, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, ọ bụ site nʼọnụma nke ekworo ka m ji ekwu okwu ndị a, nʼihi na unu ahụọla ahụhụ site na nlelị ndị mba ọzọ na-elelị unu.
Ngakho profetha ngelizwe lakoIsrayeli, uthi ezintabeni, lemaqaqeni, emifuleni, lezihotsheni: Itsho njalo iNkosi uJehova: Khangela, ngikhulumile ebukhweleni bami lelakeni lwami, ngoba lithwele ihlazo lezizwe.
7 Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, eweliri m aka m elu ṅụọ iyi na mba ndị a gbara unu gburugburu ga-anọkwa nʼọnọdụ ihere.
Ngakho itsho njalo iNkosi uJehova: Mina ngiphakamisile isandla sami. Isibili izizwe ezilihanqileyo, yizo ezizathwala ihlazo lazo.
8 “‘Ma unu, ugwu niile nke Izrel ga-awapụta ngalaba, mịakwa mkpụrụ nke ndị m ga-eri, nʼihi na oge ha ga-alọghachi adịghịkwa anya.
Kodwa lina, zintaba zakoIsrayeli, lizaveza ingatsha zenu, lithele isithelo senu kubantu bami uIsrayeli, ngoba basondela ukubuya.
9 Lee, mụ onwe m dịnyeere unu; aga m abịa inyere unu aka, nʼihi na a ga-akọgharịkwa unu, kụọkwa mkpụrụ nʼime unu.
Ngoba, khangelani, ngilani, ngiphendukele ngakini, njalo lizalinywa lihlanyelwe.
10 Aga m emekwa ka ọnụọgụgụ ndị ga-ebi nʼime unu baa ụba, ọ bụladị ụlọ Izrel niile. Ha ga-ebikwa nʼobodo niile, wugharịakwa ebe niile e tikpọrọ etikpọ.
Njalo ngizakwandisa abantu phezu kwenu, yonke indlu kaIsrayeli, yona yonke; lemizi izahlalwa, lamanxiwa azakwakhiwa.
11 Aga m eme ka ọnụọgụgụ ndị mmadụ, na anụ ụlọ dị nʼime gị baa ụba. Ha ga-amụbakwa, jupụtakwa ebe niile. Ndị mmadụ ga-ebikwa nʼelu gị dịka ha si biri nʼoge gara aga. Aga m emekwa ka ihe gaara ha nke ọma karịa ka ọ dị na mbụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Njalo ngizakwandisa phezu kwenu umuntu lenyamazana, njalo kuzakwanda kuthele izithelo; ngilenze lihlale njengasezindaweni zenu zendulo, ngikwenze kube kuhle kulezikhathi zenu zokuqala. Khona lizakwazi ukuthi ngiyiNkosi.
12 Aga m eme ka ndị m, ndị m bụ Izrel, biri nʼime unu. Unu ga-abụ ihe nweta ha, unu ga-aghọkwara ha ihe nketa. Unu agakwaghị agbaba ha aka ụmụ ọzọ.
Yebo ngizakwenza abantu bahambe phezu kwenu, abantu bami uIsrayeli; badle ilifa lakho, wena ube yilifa labo, kawusayikubenza bafelwe ngabantwana futhi.
13 “‘Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼihi na ụfọdụ mba na-ekwutọ gị na-asị, “Ị bụ ala na-eri ụmụ ya, ala na-agbaba ndị ya aka ụmụ.”
Itsho njalo iNkosi uJehova: Ngoba bathi kini: Wena ungumudli wabantu, wenze izizwe zakho zifelwe ngabantwana.
14 Nʼihi nke a, ị gaghị erikwa mmadụ ọzọ. Ị gaghị agbawakwa mba gị aka ụmụ ọzọ. Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Ngakho kawusayikudla abantu, kawusayikukhubekisa izizwe zakho, itsho iNkosi uJehova.
15 Agaghị m emekwa ka ị nụrụ mkparị nke ndị mba ọzọ na-akparị gị. Ị gaghị anọkwa ọnọdụ nke ga-eme ka ndị mba ọzọ lelịa gị, maọbụ nọọ ọnọdụ nke ga-eme ka ị sọọ ngọngọ. Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’”
Njalo kangisayikuzwakalisa kuwe ihlazo lezizwe, kawusayikuthwala inhloni zabantu, kawusayikukhubekisa izizwe, itsho iNkosi uJehova.
16 Ọzọkwa, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,
Ilizwi leNkosi lafika kimi futhi lisithi:
17 “Nwa nke mmadụ, mgbe ụmụ Izrel bi nʼala nke aka ha, ha merụrụ ya, site na ndụ ọjọọ ha, na omume ha. Ndụ ọjọọ ha nʼihu m, dị ka adịghị ọcha nke nwanyị nʼoge ọ nọ na nsọ ya, nʼọnwa niile.
Ndodana yomuntu, abendlu kaIsrayeli besahlala elizweni lakibo, balingcolisa ngendlela yabo langezenzo zabo; indlela yabo phambi kwami yayifanana lokungcola kowesifazana osemfuleni.
18 Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m, nʼihi na ha na-awụsi ọbara nʼala ahụ, jirikwa arụsị ha na-emerụ ya.
Ngakho ngathululela ulaka lwami phezu kwabo ngenxa yegazi ababelichithe elizweni, langenxa yezithombe zabo ababelingcolise ngazo.
19 Achụsasịrị m ha na mba dị iche iche. Otu a ka m si kpee ha ikpe nʼihi ụzọ ọjọọ ha, na omume ọjọọ ha.
Ngasengibahlakaza phakathi kwezizwe, basabalaliswa phakathi kwamazwe; ngabahlulela njengokwendlela yabo lanjengokwezenzo zabo.
20 Ma ebe niile ha gara nʼetiti mba niile, ha mere ka aha nsọ m gharakwa ịdị nsọ, nʼihi na a na-ekwu banyere ha, sị, ‘Ndị a bụ ndị nke Onyenwe anyị, ma agbanyeghị nke a, ha sitere nʼala ya pụọ.’
Lapho befika kwabezizwe, lapho abaya khona, bangcolisa ibizo lami elingcwele, lapho kwathiwa ngabo: Laba ngabantu beNkosi, baphume elizweni layo.
21 Ihe na-ewutekwa m bụ aha nsọ m, nke ụlọ Izrel mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile bụ ebe ha gara.
Kodwa ngalihawukela ibizo lami elingcwele, indlu kaIsrayeli eyayilingcolise phakathi kwezizwe, lapho abaya khona.
22 “Ya mere, gwa ụlọ Izrel, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụghị nʼihi na unu, ụlọ Izrel, ka m ji na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ nʼihi aha nsọ m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile dị iche iche ebe ndị unu gara.
Ngakho tshono kuyo indlu kaIsrayeli: Itsho njalo iNkosi uJehova: Kangikwenzi ngenxa yenu, lina ndlu kaIsrayeli, kodwa ngenxa yebizo lami elingcwele, elilingcolisileyo phakathi kwezizwe, lapho elaya khona.
23 Aga m eme ka ịdị nsọ nke aha ukwuu m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile, pụta ìhè. Mgbe ahụ, mba niile ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, mgbe a ga-edo m nsọ site nʼime unu nʼanya ha.
Njalo ngizangcwelisa ibizo lami elikhulu, elingcoliswe phakathi kwezizwe, elilingcolisileyo phakathi kwazo; lezizwe zizakwazi ukuthi ngiyiNkosi, itsho iNkosi uJehova, lapho ngizangcweliswa kini emehlweni abo.
24 “‘Nʼihi na aga m esi na mba niile dị iche iche kpọpụta unu. Aga m achịkọta unu site nʼala niile, mee ka unu bata nʼala unu.
Ngoba ngizalithatha ezizweni, ngilibuthe emazweni wonke, ngililethe elizweni lenu.
25 Aga m efekwasị unu mmiri dị ọcha, unu ga-adịkwa ọcha. Aga m eme ka unu dị ọcha site na-adịghị ọcha unu niile, na site nʼikpere arụsị unu niile.
Khona ngizafafaza amanzi ahlambulukileyo phezu kwenu, lihlambuluke; kukho konke ukungcola kwenu, lakuzo zonke izithombe zenu, ngizalihlambulula.
26 Aga m enye unu obi ọhụrụ, kenyekwa unu mmụọ ọhụrụ. Aga m ewepụ obi nkume nke mmehie dị nʼime unu, nye unu mkpụrụobi nke anụ ahụ.
Ngilinike inhliziyo entsha, ngifake umoya omutsha phakathi kwenu, ngisuse inhliziyo yelitshe enyameni yenu, ngilinike inhliziyo yenyama.
27 Aga m etinyekwa mmụọ m nʼime unu, mee ka unu gbaso ụkpụrụ m niile ma lezie anya mekwaa ihe niile m nyere nʼiwu.
Ngifake uMoya wami phakathi kwenu, ngilenze ukuthi lihambe ngezimiso zami, ligcine izahlulelo zami lizenze.
28 Unu ga-ebikwa nʼala ahụ nke m nyere nna unu ha. Unu ga-abụ ndị m, aga m abụkwa Chineke unu.
Lizahlala-ke elizweni engalinika oyihlo, libe ngabantu bami, lami ngibe nguNkulunkulu wenu.
29 Aga m azọpụta unu site na-adịghị ọcha unu niile. M ga-akpọ mkpụrụ ubi, mee ka o rie nne nke ukwu, agaghị m emekwa ka ụnwụ dakwasị unu ọzọ.
Njalo ngizalisindisa kukho konke ukungcola kwenu; ngibize amabele, ngiwandise, ngingabeki ndlala phezu kwenu.
30 Aga m emekwa ka mkpụrụ osisi na ihe owuwe ubi baa ụba nke ukwuu, ka unu gharakwa ịnata ihere ọzọ nʼihi ụnwụ, nʼetiti mba niile dị iche iche.
Ngandise isithelo sesihlahla, lesivuno sensimu, ukuze lingaphindi lemukele ihlazo lendlala phakathi kwezizwe.
31 Mgbe ahụ, unu ga-echeta ụzọ ọjọọ unu niile na omume ọjọọ unu niile, unu ga-asọkwa onwe unu oyi nʼihi mmehie unu na ihe arụ niile unu mere.
Khona lizakhumbula izindlela zenu ezimbi lezenzo zenu ezingalunganga; linengeke ngani ngokwenu ngobubi benu langenxa yezinengiso zenu.
32 Ma achọrọ m ka unu mata na ọ bụghị nʼihi mma unu ka m ji na-eme ihe ndị a. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Unu ụlọ Izrel, ihere kwesiri ime unu nʼihi omume ọjọọ unu mere.
Kangikwenzi ngenxa yenu, itsho iNkosi uJehova; kakwaziwe kini. Banini lenhloni libe lehlazo ngenxa yezindlela zenu, lina ndlu kaIsrayeli.
33 “‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ m ga-eme ka ị dị ọcha site na mmehie gị niile, aga m eme ka unu lọghachi nʼobodo unu biri, a ga-ewugharịkwa ebe niile tọgbọrọ nʼefu.
Itsho njalo iNkosi uJehova: Mhla ngilihlambulula kubo bonke ububi benu, ngizakwenza imizi ihlalwe, lamanxiwa akhiwe.
34 Ala ubi ndị ahụ nke tọgbọrọ nʼefu agaghị atọgbọkwa nʼefu nʼihu anya ndị na-agafe agafe. A ga-akọkwa ha niile.
Lelizwe elichithekileyo lizalinywa, endaweni yokuthi beliyinkangala emehlweni abo bonke abadlulayo.
35 Mgbe ahụ, ha ga-asị, “Ala a, nke naara atọgbọ nʼefu, aghọọla ubi a gbara ogige, nke yiri ogige Iden. Leekwa na obodo niile ndị ahụ e tikpọrọ etikpọ, ka e wuzikwara, werekwa mgbidi gbaa ha ogige. Ugbu a, ndị mmadụ jupụtakwara nʼime ha.”
Njalo bazakuthi: Lelilizwe ebeselichithekile selinjengesivande seEdeni; lemizi eyinkangala lengamanxiwa lediliziweyo isibiyelwe yahlalwa.
36 Mgbe ahụ, mba niile gbara unu gburugburu, bụ ndị fọdụrụ, ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị wuziri ebe niile e tikpọrọ etikpọ, kụọkwa mkpụrụ nʼebe niile tọgbọrọ nʼefu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ekwuola, aga m emekwa ya.’
Khona izizwe ezisele zilizingelezele zizakwazi ukuthi mina iNkosi ngakha indawo ezidiliziweyo, ngihlanyele ezichithekileyo. Mina Nkosi ngikhulumile, ngizakwenza.
37 “Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ọzọkwa, aga m ege ntị, zaa ekpere ụlọ Izrel, mezuoro ha arịrịọ ha. Aga m eme ka ha baa ụba dịka igwe anụ ụlọ,
Itsho njalo iNkosi uJehova: Langalokhu ngizacelwa yindlu kaIsrayeli, ukuthi ngiyenzele khona; ngizabandisa ngabantu njengomhlambi.
38 dịka igwe anụ ụlọ, nke na-ejupụta na Jerusalem nʼoge mmemme ya niile a kara aka. Nʼụzọ dị otu a, obodo niile e tikpọrọ etikpọ ga-ejupụtakwa na mmadụ ọzọ. Mgbe ahụ ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
Njengomhlambi ongcwele, njengomhlambi weJerusalema emikhosini yawo emisiweyo, ngokunjalo imizi echithekileyo izagcwala ngemihlambi yabantu. Khona bazakwazi ukuthi ngiyiNkosi.

< Izikiel 36 >