< Izikiel 35 >

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Moreover the word of the LORD came to me, saying,
2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu imegide nʼugwu Sia, buo amụma megide ya,
Son of man, set your face against mount Seir, and prophesy against it,
3 sị ya, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Mụ onwe m na-emegide gị, gị ugwu Sia. Aga m esetikwa aka m imegide gị, mee gị ka ị ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu.
And say to it, Thus says the Lord GOD; Behold, O mount Seir, I am against you, and I will stretch out my hand against you, and I will make you most desolate.
4 Obodo gị niile ka m ga-eme ka ha ghọọ mkpọmkpọ ebe, gị onwe gị ga-abụkwa ebe tọgbọrọ nʼefu. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
I will lay your cities waste, and you shall be desolate, and you shall know that I am the LORD.
5 “‘Nʼihi na i sitere nʼiro ahụ dị gị nʼobi siterịị na mgbe ochie rara ụmụ Izrel nye nʼaka mma agha, nʼoge ha nọ na-ahụju anya, nʼoge ahụ ịta ahụhụ nke ajọ omume ruru nʼogo dị ukwuu.
Because you have had a perpetual hatred, and have shed the blood of the children of Israel by the force of the sword in the time of their calamity, in the time that their iniquity had an end:
6 Nʼihi nke a, ebe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, aga m enyefe gị nʼaka ndị na-awụsi ọbara. Ọbara ga-achụkwa gị ọsọ. Ebe ọ bụ na ị kpọghị iwusi ọbara asị, ọbara a ga-awụsị nʼime gị ga-achụ gị ọsọ.
Therefore, as I live, says the Lord GOD, I will prepare you to blood, and blood shall pursue you: since you have not hated blood, even blood shall pursue you.
7 Aga m eme ka ugwu Sia ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Aga m esitekwa nʼime ya bipụ ndị na-abata abata, na ndị na-apụ apụ.
Thus will I make mount Seir most desolate, and cut off from it him that passes out and him that returns.
8 Ugwu ukwu gị niile ga-ejupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ, ugwu nta niile, na ndagwurugwu niile na mgbawara niile dị nʼala ga-ejupụta nʼozu ndị e ji mma agha gbuo.
And I will fill his mountains with his slain men: in your hills, and in your valleys, and in all your rivers, shall they fall that are slain with the sword.
9 Ị gaghị ebulitekwa isi gị ọzọ. Ebe tọgbọrọ nʼefu ka ị ga-abụ ruo ebighị ebi. A gaghị ewuzikwa obodo gị ọzọ. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
I will make you perpetual desolations, and your cities shall not return: and you shall know that I am the LORD.
10 “‘Nʼihi na ị sịrị, “Mba abụọ ndị a, na ala abụọ ndị a ga-abụ nke anyị, anyị ga-enweta ha,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ.
Because you have said, These two nations and these two countries shall be mine, and we will possess it; whereas the LORD was there:
11 Nʼihi ya, ebe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, aga m emeso gị mmeso dịka ịba ụba nke iwe gị na ekworo gị si dị, bụ nke i gosiri mgbe ị kpọrọ ha asị. Aga m emekwa ka ha mata onye m bụ, mgbe m kpesịrị gị ikpe.
Therefore, as I live, says the Lord GOD, I will even do according to your anger, and according to your envy which you have used out of your hatred against them; and I will make myself known among them, when I have judged you.
12 Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị nụrụ okwu ọjọọ ndị ahụ niile i kwuru megide ugwu Izrel niile, na-asị, “E meela ha ebe tọgbọrọ nʼefu, ewerela ha nyefee anyị nʼaka ka anyị dọgbuo ha.”
And you shall know that I am the LORD, and that I have heard all your blasphemies which you have spoken against the mountains of Israel, saying, They are laid desolate, they are given us to consume.
13 Unu nyakwara isi megide m, kwuo okwu kwugide m dịka o si dị unu mma. Anụkwara m ihe niile unu kwuru.
Thus with your mouth you have boasted against me, and have multiplied your words against me: I have heard them.
14 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Mgbe ụwa niile na-aṅụrị ọṅụ ka m ga-eme ka ị ghọọ mkpọmkpọ ebe.
Thus says the Lord GOD; When the whole earth rejoices, I will make you desolate.
15 Dịka ị ṅụrịrị ọṅụ mgbe ihe nketa Izrel ghọrọ mkpọmkpọ ebe, otu a ka m ga-esi mesoo gị mmeso. Ị ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ nʼefu, gị ugwu Sia, gị na ndị Edọm niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
As you did rejoice at the inheritance of the house of Israel, because it was desolate, so will I do to you: you shall be desolate, O mount Seir, and all Idumea, even all of it: and they shall know that I am the LORD.

< Izikiel 35 >