< Izikiel 34 >
1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
A message from the Lord came to me, saying,
2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị ọzụzụ atụrụ Izrel niile, buo amụma sị ha, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ahụhụ na-adịrị unu ndị ọzụzụ atụrụ Izrel, ndị na-enyeju naanị onwe ha afọ. Ọ kwesighị ka onye ọzụzụ atụrụ lekọtazie igwe atụrụ e tinyere nʼaka ya anya?
“Son of man, prophesy against the shepherds who lead Israel. Prophesy and tell them that this is what the Lord God says: Disaster is coming to the shepherds of Israel, who only look after themselves, and not the sheep! Shouldn't shepherds make sure their flock is fed?
3 Unu na-eri abụba ha niile, unu na-eyi uwe ajị anụ, na-egbu anụ ndị mara abụba nʼagbanyeghị na unu adịghị elekọta igwe ewu na atụrụ m ndị a.
You eat the cream, you use the wool for clothes, and you slaughter the fattened sheep, but you don't feed the flock.
4 Unu anaghị eme ka ndị na-adịghị ike dị ike, maọbụ gwọọ ndị na-arịa ọrịa, maọbụ kechie ọnya ndị merụrụ ahụ. Unu adịghị akpọghachite ndị kpafuru akpafu, maọbụ pụọ ịchọ ndị furu efu. Kama naanị aka ike ka unu ji na-achị ha.
You haven't taken care of the weak, healed the sick, bandaged the injured, brought home the strays, or looked for the lost. On the contrary, you ruled them using violence and cruelty.
5 Nʼihi ya, ha agbasasịala nʼihi na onye ọzụzụ atụrụ anọghị ya. Ha aghọkwaarala anụ ọhịa niile ihe oriri.
They were scattered because they didn't have a shepherd. When they scattered they were preyed on by all the wild animals for food.
6 Igwe ewu na atụrụ nke m na-awagharị nʼugwu niile, na nʼelu ugwu nta niile. Ọ bụkwa nʼelu ụwa niile ka ha gbasara. Ọ dịkwaghị onye na-ajụ ajụjụ banyere ha. Ọ dịkwaghị onye na-elenye anya nʼebe ha nọ.
My sheep strayed, going to all the mountains and high hills. They were scattered everywhere, and there was no one to go and look for them.
7 “‘Nʼihi nke a, unu ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị:
So, you shepherds, listen to what the Lord has to say:
8 Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ebe unu hapụrụ igwe atụrụ m na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ, mee ka ha ghọọrọ anụ ọhịa ihe oriri, ebe unu na-achọgharịghị ha, kama unu nọ na-enyeju onwe unu afọ, ma hapụ igwe atụrụ m ka agụụ gbuo ha,
As I live, declares the Lord God, because my sheep didn't have a shepherd and were preyed on by all the wild animals for food, and because my shepherds didn't look after my sheep but instead only fed themselves,
9 nʼihi ya, unu ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị:
so, you shepherds, you listen to what the Lord has to say!
10 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ana m edo onwe m megide ndị ọzụzụ atụrụ niile. Ọ bụkwa nʼaka ha ka m ga-ajụta ihe banyere igwe ewu na atụrụ m. Aga m eme ka ha kwụsị ị bụ ndị na-azụ igwe ewu na atụrụ m, ka ndị ọzụzụ atụrụ ndị a ghara ịzụ onwe ha nri ọzọ. Aga m esite nʼọnụ ha napụta igwe ewu na atụrụ m, ha agaghị abụkwara ha nri ọzọ.
This is what the Lord God says: Watch out, because I'm condemning the shepherds, and I will take my sheep back and stop them looking after the sheep so they won't be able to feed themselves anymore. I will take away my sheep from them, and I won't let them eat the sheep anymore.
11 “‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, mụ onwe m ga-eji aka m pụọ gaa chọgharịa igwe atụrụ m. Mụ onwe m kwa ga-elekọta ha.
For this is what the Lord God says: Watch as I myself will go looking for my sheep, searching to find them.
12 Dịka onye ọzụzụ atụrụ si elekọta igwe ewu na atụrụ ya anya, mgbe ha na ya nọ, otu a ka m ga-esi lekọta igwe atụrụ m. Aga m anapụta ha site nʼebe niile ha gbasasịrị gaa, nʼụbọchị igwe ojii na ọchịchịrị ahụ.
Just like a shepherd goes looking for his lost sheep when he is with the flock, so I will look for my sheep. I will rescue them from everywhere they were scattered on a dark and dismal day.
13 Aga m esite nʼobodo niile, na mba niile ha nọ kpọghachi ha nʼala nke ha. Aga m azụ ha nri nʼelu ugwu niile nke Izrel, na nʼakụkụ mmiri niile, ebe ala na-ewepụta nri nke ọma.
I will take them out from among the other nations. I will gather them from the different countries, and bring them back to their own country. Like a shepherd I will have them feed them on the mountains of Israel, in the valleys and everywhere that people live in the country.
14 Aga m azụ ha nʼebe ịta ahịhịa mara mma, na nʼelu ugwu niile nke Izrel. Nʼebe ahụ ka ha ga-amakpukwa nʼudo. Ha ga-ata nri nʼebe ịta ahịhịa mara mma nke elu ugwu Izrel.
I will provide them with good pasture and places to graze in the high mountains of Israel. They will also be able to rest there in the good pasture and in the places to graze in mountains of Israel.
15 Ọ bụ mụ onwe m ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ nke atụrụ m niile. Aga m eme ka ha makpuru nʼudo, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
I myself will look after my sheep and give them a place to rest, declares the Lord God.
16 Aga m achọ ndị furu efu nʼime ha, ndị kpafuru akpafu, kpọghachite ha nʼụlọ. Aga m ekechi ọnya ndị merụrụ ahụ, meekwa ka ọ dị ike. Ma ndị mara abụba na nke ndị ahụ dị ike ka m ga-ala nʼiyi. Aga m eji ikpe ziri ezi zụọ ha.
I will go looking for the lost, bring home the strays, bandage the injured, and strengthen the weak. However, I will destroy those who are fat and strong. Because I do what's right, I will be sure to take care of them.
17 “‘Ma unu onwe unu, ụmụ igwe anụ ụlọ m, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m ekpe ikpe nʼetiti atụrụ na atụrụ, ebule na mkpi.
My flock, this is what the Lord God says to you: Watch, because I will judge between one sheep and the next, between the rams and the goats.
18 Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-ata nri kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ zọtọsịa nke fọdụrụ? Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-aṅụ mmiri nke kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ unu na-agbarụ nke fọdụrụ?
Aren't you satisfied with feeding in good pasture? Do you have to trample down the rest of the pasture with your feet? Aren't you satisfied to drink the clear water? Do you have to muddy the rest of it with your feet?
19 Ọ bụ ihe kwesiri ekwesi na igwe atụrụ m ga-ata nri unu zọtọrọ azọtọ, ma ṅụọkwa mmiri unu gbarụrụ agbarụ?
Why does my flock have to feed on what your feet have trampled down, and drink the water that your feet have muddied?
20 “‘Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ha, nʼezie, mụ onwe m ga-ekpe ikpe nʼetiti atụrụ ndị gbara abụba, na atụrụ ndị a tara ahụ.
That's why the Lord God says to them: Watch, because I myself will judge between the fat sheep and the skinny sheep.
21 Nʼihi na unu ji akụkụ ahụ unu, na ubu aka unu na-enupu ha. Unu jikwa mpi unu na-enupu ndị na-adịghị ike, tutu ruo mgbe unu chụsachara ha.
Since you push others around with your sides and your shoulders, and use your horns to attack all the weak ones until you have chased them away,
22 Lee, aga m azọpụta igwe ewu na atụrụ m. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya. Ha agaghị aghọkwa ihe oriri ọzọ. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya.
I will rescue my flock, and they will no longer be your victims. I will judge between one sheep and the next.
23 Aga m edobe otu onye ọzụzụ atụrụ nke ga-elekọta ndị m, ọ bụladị ohu m Devid. Ya onwe ya ga-elekọta ha, bụrụkwa onye ọzụzụ atụrụ nye ha.
I will put one shepherd in charge of them, my servant David, and he will take care of them. He will take care of them and be their shepherd.
24 Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ga-abụ Chineke ha, ma ohu m Devid ga-abụ onyeisi nʼetiti ndị m. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
I the Lord will be their God, and my servant David will be their leader. I the Lord have spoken.
25 “‘Mụ na ha ga-agba ndụ udo. Aga m achụpụkwa anụ ọjọọ niile nʼala ha, ka ndị m nwee ike ibi nʼudo nʼọzara, ma rahụkwa ụra ọ bụladị nʼetiti oke ọhịa nʼenweghị nsogbu.
I will make an agreement of peace with them, and get rid of the wild animals from the country, so that they can live safely in the wilderness and sleep securely in the forest.
26 Aga m agọzi ndị m, gọziekwa ebe obibi ha na ihe niile gbara ugwu nta m gburugburu. Aga m ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, nʼezie, ngọzị ga-ezoro ha dịka mmiri.
I will bless them and everywhere around my hill. I will send rain at the right time. They will be showers of blessing.
27 Osisi ọhịa ga-amị mkpụrụ ya, ala ga-eme ihe omume ya. Ndị m ga-anọkwa nʼudo nʼala ha na-atụghị ụjọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tijasịrị mkpọrọ yoku niile ha, napụta ha site nʼaka ndị na-akpagbu ha.
The trees in the orchards will produce their fruit; the earth will grow its crops; and my flock will be live in safety in their country. Then they will know that I am the Lord, when I break their yokes of slavery, and set them free from those who made them slaves.
28 Ha agaghị abụkwa mba ndị ọzọ na-apụnara ihe ha nwere, maọbụ ndị anụ ọhịa ga-adọgbu. Ha ga-ebi na-atụghị ụjọ, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.
They won't be the victims of other nations anymore, and wild animals won't eat them. They will live in safety, and no one will terrorize them.
29 Aga m enye ha ala nke amaara nke ọma nʼihi ihe na-epupụta nʼime ya, ha agaghị abụkwa ndị ụnwụ mekpara ahụ nʼala ahụ ọzọ, maọbụ ihe a na-akwa emo nke mba dị iche iche.
I will make their fields produce remarkable harvests, and they won't suffer famine in their country again or be mocked by others.
30 Ha ga-amata na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke ha, na m na-anọnyere ha, na ha onwe ha kwa, bụ ụlọ Izrel, bụ ndị m, otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwupụtara.
Then they will know that I am with them as the Lord their God, and that the people of Israel belong to me, declares the Lord God.
31 Unu bụ igwe ewu na atụrụ m, atụrụ nke ebe ịta nri m, mụ onwe m bụkwa Chineke unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’”
You are my sheep, the sheep that I feed. You are my people, and I am your God, declares the Lord God.”