< Izikiel 33 >
1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Neno la Bwana likanijia kusema:
2 “Nwa nke mmadụ, gwa ndị gị okwu sị ha, ‘Mgbe m wetara mma agha imegide mba ọbụla, ma ndị ala ahụ ahọpụta otu onye nʼetiti ha mee ya ka ọ ghọrọ ha onye nche,
“Mwanadamu, sema na watu wako uwaambie, ‘Nitakapoleta upanga dhidi ya nchi, nao watu wa nchi wakamchagua mmoja wa watu wao na kumfanya awe mlinzi wao,
3 onye ga-ahụ mma agha ka ọ na-abịakwasị ala ahụ, ọ bụrụ na o gbuo opi ike, ịdọ ndị bi na mba ahụ aka na ntị banyere mma agha nke na-abịa,
naye auonapo upanga unakuja dhidi ya nchi na kupiga tarumbeta kuonya watu,
4 ọ bụrụkwa na onye ọbụla anụ opi ike ahụ ma jụ ịnabatara onwe ya ịdọ aka na ntị ahụ, mma agha ahụ gbuo ya, ọbara ya ga-adịkwasị ya nʼisi.
kama mtu yeyote asikiapo sauti ya tarumbeta hakukubali kuonywa, basi upanga ujapo na kuutoa uhai wake, damu yake itakuwa juu ya kichwa chake mwenyewe.
5 Nʼihi na ha nụrụ ụda opi nke ịdọ aka na ntị ahụ ma ha geghị ntị. Ọ bụ ha wetaara onwe ha ịla nʼiyi. A sị na ha gere ntị ha gaara azọpụta ndụ ha.
Kwa kuwa alisikia sauti ya tarumbeta lakini hakukubali maonyo, damu yake itakuwa juu ya kichwa chake mwenyewe. Kama angekubali maonyo, angelijiokoa mwenyewe.
6 Ma ọ bụrụ na onye nche elepụ anya hụ ndị agha ka ha na-abịa hapụ igbu opi ịdọ ndị mmadụ aka na ntị, ọnwụ ha dị nʼisi ya. Ha ga-anwụ nʼime mmehie ha, ma aga m ajụta ọbara ha site nʼaka onye nche ahụ.’
Lakini kama mlinzi akiona upanga unakuja na asipige tarumbeta kuonya watu na upanga ukija na kutoa uhai wa mmoja wao, yule mtu ataondolewa kwa sababu ya dhambi yake, lakini damu yake nitaitaka mkononi mwa mlinzi huyo.’
7 “Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.
“Mwanadamu, nimekufanya wewe kuwa mlinzi kwa ajili ya nyumba ya Israeli, kwa hiyo sikia neno nisemalo na uwape maonyo kutoka kwangu.
8 Mgbe m na-asị onye ajọ omume, gị onye na-emebi iwu, ị ghaghị ịnwụ! Ọ bụrụ na ị kwughị okwu, ime ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.
Nimwambiapo mtu mwovu, ‘Ewe mtu mwovu, hakika utakufa,’ nawe hukusema neno la kumwonya ili atoke katika njia zake, yule mtu mwovu atakufa kwa ajili ya dhambi yake, mimi nitaitaka damu yake mkononi mwako.
9 Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, ma o meghị nke a, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha, ma ndụ gị onwe gị ka ị zọpụtara.
Lakini kama utamwonya huyo mtu mwovu aache njia zake mbaya naye hafanyi hivyo, atakufa kwa ajili ya dhambi yake, lakini utakuwa umejiokoa mwenyewe.
10 “Nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka unu na-ekwu, “Njehie niile anyị na mmehie niile anyị adịla arọ nʼahụ anyị. Ọ bụkwa nʼime ya ka anyị na-ata ahụ. Olee otu anyị ga-esi dị ndụ?”’
“Mwanadamu, sema na nyumba ya Israeli uwaambie, ‘Hili ndilo mnalosema: “Makosa yetu na dhambi zetu zimetulemea, nasi tunadhoofika kwa sababu ya hayo. Tutawezaje basi kuishi?”’
11 Gwa ha, ‘Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ọnwụ onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ, kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu sitere nʼụzọ ya chegharịa dịrị ndụ. Chigharịanụ, sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu niile chigharịa. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji nwụọ, unu bụ ụlọ Izrel?’
Waambie, ‘Hakika kama mimi niishivyo, asema Bwana Mwenyezi, sifurahii kifo cha watu waovu, bali kwamba wageuke kutoka njia zao mbaya wapate kuishi. Geukeni! Geukeni kutoka njia zenu mbaya! Kwa nini mkafe, ee nyumba ya Israeli?’
12 “Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, gwa ndị ala gị, ‘Ezi omume nke onye na-eme ezi ihe agaghị azọpụta ya ma ọ bụrụ na ọ tụgharịa, mee ihe ọjọọ. Otu a kwa, mmehie niile nke onye na-emebi iwu agaghị eme ka ọ laa nʼiyi ma ọ bụrụ na o chegharịa pụọ site na mmehie.’
“Kwa hiyo, mwanadamu, waambie watu wako, ‘Haki ya mtu mwenye haki haitamwokoa wakati anapoacha kutii, wala uovu wa mtu mwovu hautamsababisha yeye kuanguka anapotubu na kuacha uovu. Mtu mwenye haki, kama akitenda dhambi, hataishi kwa sababu ya uadilifu wake wa awali.’
13 Ọ bụrụ na m asị onye ezi omume, na ọ ghaghị ịdị ndụ, ma onye dị otu a atụkwasị obi nʼezi omume ya mee ajọ ihe, ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Ha ga-anwụ nʼihi ajọ ihe ha mere.
Kama nikimwambia mtu mwenye haki kwamba hakika utaishi, lakini akategemea hiyo haki yake na kutenda uovu, hakuna tendo lolote la haki alilotenda litakalokumbukwa, atakufa kwa ajili ya uovu alioutenda.
14 Ma ọ bụrụ na m asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma onye ahụ esite na mmehie ya chigharịa, mee ihe ziri ezi na nke dị mma,
Nami kama nikimwambia mtu mwovu, ‘Hakika utakufa,’ kisha akageuka kutoka dhambi yake na kufanya lile lililo haki na sawa,
15 ọ bụrụ na o nyeghachi ihe ebe ọ naara nʼaka ndị ọ gbazinyere ego, kwụghachi ihe niile o zuuru nʼohi, gbasoo ụkpụrụ ahụ niile bụ nke na-enye ndụ, gharakwa ime ajọ omume; onye dị otu a aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ.
kama akirudisha kile alichochukua rehani kwa ajili ya deni, akarudisha alichoiba na kufuata amri zile ziletazo uzima, wala hafanyi uovu, hakika ataishi, hatakufa.
16 Ọ dịghị mmehie niile nke onye ahụ mere nke a ga-echeta megide ya. Nʼihi na o meela ihe ziri ezi na nke dịkwa mma, ọ gaghị ịdị ndụ.
Hakuna dhambi yoyote aliyoitenda itakayokumbukwa juu yake. Ametenda lile lililo haki na sawa, hakika ataishi.
17 “Ma ndị gị na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma ọ bụ ụzọ ha bụ nke na-ezighị ezi.
“Lakini watu wako wanasema, ‘Njia ya Bwana si sawa.’ Lakini ni njia zao ambazo si sawa.
18 Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime ihe ọjọọ, ọ ga-anwụ maka ya.
Kama mtu mwenye haki akigeuka kutoka uadilifu wake na kufanya uovu, atakufa kwa ajili ya huo uovu.
19 Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume ya chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-adị ndụ site nʼime nke a.
Naye mtu mwovu kama akigeuka kutoka uovu wake na kufanya lile lililo haki na sawa, kwa kufanya hivyo ataishi.
20 Ma unu bụ ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị.”
Lakini, ee nyumba ya Israeli, unasema, ‘Njia ya Bwana si sawa.’ Lakini nitamhukumu kila mmoja wenu sawasawa na njia zake mwenyewe.”
21 O ruo nʼafọ nke iri na abụọ nke e mere ka anyị jee biri na mba ọzọ, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, otu onye nʼime ndị sitere na Jerusalem gbapụ bịakwutere m gwa m sị, “Obodo ahụ adaala.”
Mwaka wa kumi na mbili wa uhamisho wetu, mwezi wa kumi, siku ya tano, mtu aliyekuwa ametoroka kutoka Yerusalemu akanijia na kusema, “Mji wa Yerusalemu umeanguka!”
22 Ma nʼanyasị, tupu onye ahụ gbapụrụ agbapụ abịa, aka Onyenwe anyị ruru m ahụ, mee ka m nweekwa ike ikwu okwu ọzọ.
Basi jioni kabla mtu huyo hajaja, mkono wa Bwana, ulikuwa juu yangu, naye alifungua kinywa changu kabla ya mtu yule aliyenijia asubuhi hajafika. Basi kinywa changu kilifunguliwa na sikuweza tena kunyamaza.
23 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Ndipo neno la Bwana likanijia kusema:
24 “Nwa nke mmadụ, ndị ahụ bi nʼebe dakpọsịrị adakpọsị nʼala Izrel na-asị, ‘Ebraham bụ otu nwoke, ma o nwetachara ala a niile! Ma anyị dị ukwuu, nʼihi enyela anyị ala dịka ihe nweta anyị.’
“Mwanadamu, watu wanaoishi katika magofu hayo katika nchi ya Israeli wanasema hivi, ‘Abrahamu alikuwa mtu mmoja tu, hata hivyo akaimiliki nchi. Lakini sisi ni wengi, hakika tumepewa nchi kuwa milki yetu.’
25 Ya mere, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na unu na-eri anụ nke ọbara dị nʼime ya, na-elekwasịkwa arụsị unu anya, na-awụsikwa ọbara, o kwesiri ka unu nweta ala a?
Kwa hiyo waambie, ‘Hili ndilo Bwana Mwenyezi asemalo: Kwa kuwa mnakula nyama pamoja na damu na kuinulia sanamu zenu macho na kumwaga damu, je, mtaimiliki nchi?
26 Unu na-atụkwasị obi unu na mma agha unu, unu na-eme ihe arụ dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu na-emerụ nwunye onye agbataobi ya. Ọ bụkwa ala nke a ka unu ga-enweta?’
Mnategemea panga zenu, mnafanya mambo ya machukizo na kila mmoja wenu humtia unajisi mke wa jirani yake. Je, mtaimiliki nchi?’
27 “Gwa ha nke a, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, dịka m na-adị ndụ, ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ e tikpọrọ etikpọ ga-anwụcha site na mma agha. Ndị bi nʼọhịa ka anụ ọhịa ga-atagbu. Ndị niile bi nʼọgba na nʼebe niile e wusiri ike ga-anwụ site nʼọrịa.
“Waambie hivi: ‘Hili ndilo Bwana Mwenyezi asemalo: Hakika kama niishivyo, wale waliobaki katika magofu wataanguka kwa upanga, wale walio nje mashambani nitawatoa wararuliwe na wanyama pori, nao wale walio katika ngome na kwenye mapango watakufa kwa tauni.
28 Aga m eme ka ala unu ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Nganga ya, na ike ya ga-agwụsị. Obodo niile dị nʼugwu Izrel ga-aghọ ebe e tikpọrọ etikpọ, mmadụ agakwaghị esite nʼebe ahụ gafee ọzọ.
Nitaifanya nchi kuwa ukiwa na utupu na kiburi cha nguvu zake zitafikia mwisho, nayo milima ya Israeli itakuwa ukiwa ili mtu yeyote asipite huko.
29 Ha ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesiri ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi ihe arụ niile nke ha mere.’
Kisha watajua kuwa Mimi ndimi Bwana, nitakapokuwa nimeifanya nchi kuwa ukiwa na utupu kwa sababu ya mambo yote ya machukizo waliyotenda.’
30 “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, ndị ala gị na-ekwu banyere gị nʼakụkụ mgbidi ha na nʼọnụ ụzọ ụlọ ha. Ha na-asịrịta onwe ha, ‘Bịanụ ka anyị gaa nụrụ ozi sitere nʼọnụ Onyenwe anyị.’
“Kwa habari yako wewe, mwanadamu, watu wako wanaongea habari zako wakiwa karibu na kuta na kwenye milango ya nyumba, wakiambiana kila mmoja na mwenzake, ‘Njooni msikie ujumbe ule utokao kwa Bwana.’
31 Ha na-abịakwute gị dịka ndị mmadụ si abịa, ha na-anọrọ ala nʼihu gị na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya nʼomume: nʼihi na ha na-eji egbugbere ọnụ ha na-egosi ịhụnanya, ma obi ha nọ naanị na uru ọjọọ ha ga-enweta.
Watu wangu wanakujia, kama wafanyavyo, nao wanaketi mbele yako kama watu wangu na kusikiliza maneno yako, lakini hawayatendi. Kwa maana udanganyifu u katika midomo yao, lakini mioyo yao ina tamaa ya faida isiyo halali.
32 Nʼanya ha, ị dịka onye ji ezigbo olu na-ekwe ukwe ịhụnanya, dịka onye nwere olu ụtọ, nke na-abụ abụ dị ụtọ, na onye maara ka e si eti ịgba. Ha na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha ejighị ya kpọrọ ihe ọbụla.
Naam, mbele yao umekuwa tu kama yeye aimbaye nyimbo za mapenzi kwa sauti nzuri za kuvutia na kupiga vyombo kwa ustadi, kwa kuwa wanasikia maneno yako lakini hawayatendi.
33 “Ma mgbe nke a bịara na mmezu, nʼihi ọ ghaghị ịbịa, ha ga-amata na onye amụma anọtụla nʼetiti ha.”
“Wakati mambo haya yote yatakapotimia, kwa kuwa hakika yatatokea, ndipo watakapojua kwamba nabii amekuwepo miongoni mwao.”