< Izikiel 33 >
1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
A message from the Lord came to me, saying,
2 “Nwa nke mmadụ, gwa ndị gị okwu sị ha, ‘Mgbe m wetara mma agha imegide mba ọbụla, ma ndị ala ahụ ahọpụta otu onye nʼetiti ha mee ya ka ọ ghọrọ ha onye nche,
“Son of man, tell your people: If I brought an army to attack a country, the people there would choose one of them to be their watchman.
3 onye ga-ahụ mma agha ka ọ na-abịakwasị ala ahụ, ọ bụrụ na o gbuo opi ike, ịdọ ndị bi na mba ahụ aka na ntị banyere mma agha nke na-abịa,
When he saw the army advancing to attack the country, he would blow the trumpet to warn everyone.
4 ọ bụrụkwa na onye ọbụla anụ opi ike ahụ ma jụ ịnabatara onwe ya ịdọ aka na ntị ahụ, mma agha ahụ gbuo ya, ọbara ya ga-adịkwasị ya nʼisi.
So if you hear the trumpet but don't pay attention to the warning, and you're killed in the attack, you will be responsible for your own death.
5 Nʼihi na ha nụrụ ụda opi nke ịdọ aka na ntị ahụ ma ha geghị ntị. Ọ bụ ha wetaara onwe ha ịla nʼiyi. A sị na ha gere ntị ha gaara azọpụta ndụ ha.
Since you heard the trumpet but didn't pay attention to the warning, then you will be responsible for your own death. If you had paid attention the warning, you could have saved your life.
6 Ma ọ bụrụ na onye nche elepụ anya hụ ndị agha ka ha na-abịa hapụ igbu opi ịdọ ndị mmadụ aka na ntị, ọnwụ ha dị nʼisi ya. Ha ga-anwụ nʼime mmehie ha, ma aga m ajụta ọbara ha site nʼaka onye nche ahụ.’
But if the watchman saw the attack coming and didn't blow the trumpet to warn everyone, and someone is killed, then that person will die in their sins, but I will hold the watchman responsible for their death.
7 “Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.
Son of man, I have appointed you as a watchman for the people of Israel. Listen to what I tell you and warn them for me.
8 Mgbe m na-asị onye ajọ omume, gị onye na-emebi iwu, ị ghaghị ịnwụ! Ọ bụrụ na ị kwughị okwu, ime ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.
If I tell the wicked ‘You're wicked; you're going to die’; but you don't warn them to change what they're doing, then they'll die in their sins and I will hold your responsible for their deaths.
9 Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, ma o meghị nke a, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha, ma ndụ gị onwe gị ka ị zọpụtara.
But if you warn the wicked to change what they're doing, and they don't, they will die in their sins, but you will save your own life.
10 “Nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka unu na-ekwu, “Njehie niile anyị na mmehie niile anyị adịla arọ nʼahụ anyị. Ọ bụkwa nʼime ya ka anyị na-ata ahụ. Olee otu anyị ga-esi dị ndụ?”’
Son of man, tell the people of Israel that this is what they've been saying, ‘We recognize our sins and wrongs, and they weigh on us, wearing us out. How can we go on living?’
11 Gwa ha, ‘Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ọnwụ onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ, kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu sitere nʼụzọ ya chegharịa dịrị ndụ. Chigharịanụ, sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu niile chigharịa. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji nwụọ, unu bụ ụlọ Izrel?’
Tell them: As I live, declares the Lord God, it brings me no pleasure when wicked people die. I wish they would stop sinning and live! Stop! Stop sinning! Why should you die, people of Israel?
12 “Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, gwa ndị ala gị, ‘Ezi omume nke onye na-eme ezi ihe agaghị azọpụta ya ma ọ bụrụ na ọ tụgharịa, mee ihe ọjọọ. Otu a kwa, mmehie niile nke onye na-emebi iwu agaghị eme ka ọ laa nʼiyi ma ọ bụrụ na o chegharịa pụọ site na mmehie.’
So, son of man, tell your people: All the good things a good person has done won't save them when they sin; while the bad things a bad person has done won't be a problem for them if they stop sinning. But good people won't live if they start sinning.
13 Ọ bụrụ na m asị onye ezi omume, na ọ ghaghị ịdị ndụ, ma onye dị otu a atụkwasị obi nʼezi omume ya mee ajọ ihe, ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Ha ga-anwụ nʼihi ajọ ihe ha mere.
If I tell a good person that they will live and then they rely on their goodness and start sinning, then none of the good things they did will be remembered; he will die because of the sins.
14 Ma ọ bụrụ na m asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma onye ahụ esite na mmehie ya chigharịa, mee ihe ziri ezi na nke dị mma,
But if I tell a bad person, ‘You're going to die’ and they stop sinning and do what is good and right,
15 ọ bụrụ na o nyeghachi ihe ebe ọ naara nʼaka ndị ọ gbazinyere ego, kwụghachi ihe niile o zuuru nʼohi, gbasoo ụkpụrụ ahụ niile bụ nke na-enye ndụ, gharakwa ime ajọ omume; onye dị otu a aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ.
if they return security given for a loan, pay back what they've stolen, and follows my laws about how to live, not doing wrong—then they will live; they won't die.
16 Ọ dịghị mmehie niile nke onye ahụ mere nke a ga-echeta megide ya. Nʼihi na o meela ihe ziri ezi na nke dịkwa mma, ọ gaghị ịdị ndụ.
None of their sins will be remembered; they have done what is good and right and so they will live.
17 “Ma ndị gị na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma ọ bụ ụzọ ha bụ nke na-ezighị ezi.
However, your people are complaining, ‘What the Lord does isn't right.’ But it's what they're doing that isn't right.
18 Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime ihe ọjọọ, ọ ga-anwụ maka ya.
If a good person stops doing good and sins, they will die because of it.
19 Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume ya chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-adị ndụ site nʼime nke a.
On the other hand, if a bad person turns from their sins and they do what is good and right, they will live as a result.
20 Ma unu bụ ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị.”
So how can you say, ‘What the Lord does isn't right’? Well, I'm going to judge each of you depending on what you've done, people of Israel.”
21 O ruo nʼafọ nke iri na abụọ nke e mere ka anyị jee biri na mba ọzọ, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, otu onye nʼime ndị sitere na Jerusalem gbapụ bịakwutere m gwa m sị, “Obodo ahụ adaala.”
On the fifth day of the tenth month of the twelfth year of our exile, a refugee who'd escaped from Jerusalem arrived and told me, “The city has been captured!”
22 Ma nʼanyasị, tupu onye ahụ gbapụrụ agbapụ abịa, aka Onyenwe anyị ruru m ahụ, mee ka m nweekwa ike ikwu okwu ọzọ.
The previous evening before the messenger arrived the Lord had touched me so I could speak again. This was before the man came to see me in the morning. I wasn't mute any longer—I could speak again.
23 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
A message from the Lord came to me, saying,
24 “Nwa nke mmadụ, ndị ahụ bi nʼebe dakpọsịrị adakpọsị nʼala Izrel na-asị, ‘Ebraham bụ otu nwoke, ma o nwetachara ala a niile! Ma anyị dị ukwuu, nʼihi enyela anyị ala dịka ihe nweta anyị.’
“Son of man, people living among the ruins in Israel are saying, ‘Abraham was only one man, but the country was given to him to own. There's plenty of us, so the country should belong to us.’
25 Ya mere, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na unu na-eri anụ nke ọbara dị nʼime ya, na-elekwasịkwa arụsị unu anya, na-awụsikwa ọbara, o kwesiri ka unu nweta ala a?
So tell them that this is what the Lord God says: You eat meat with the blood still in it. You go and worship your idols. You commit murder. Do you really think the country should belong to you?
26 Unu na-atụkwasị obi unu na mma agha unu, unu na-eme ihe arụ dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu na-emerụ nwunye onye agbataobi ya. Ọ bụkwa ala nke a ka unu ga-enweta?’
You rely on your swords to get your way. You have done some disgusting things. You're all having sex with each other's wives. Should the country belong to you?
27 “Gwa ha nke a, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, dịka m na-adị ndụ, ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ e tikpọrọ etikpọ ga-anwụcha site na mma agha. Ndị bi nʼọhịa ka anụ ọhịa ga-atagbu. Ndị niile bi nʼọgba na nʼebe niile e wusiri ike ga-anwụ site nʼọrịa.
Tell them that this is what the Lord God says: As I live, in the people living among the ruins will be killed by the sword. Those living in the countryside will be eaten by wild animals. Those living in the fortresses and caves will die from disease.
28 Aga m eme ka ala unu ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Nganga ya, na ike ya ga-agwụsị. Obodo niile dị nʼugwu Izrel ga-aghọ ebe e tikpọrọ etikpọ, mmadụ agakwaghị esite nʼebe ahụ gafee ọzọ.
I will turn the country into a wasteland, and power you are so proud of will be ended. The mountains of Israel will become wild places that no one will want to travel through.
29 Ha ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesiri ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi ihe arụ niile nke ha mere.’
Then the people will acknowledge that I am the Lord, when I have turned the country into a wasteland because of all the disgusting things they have done.
30 “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, ndị ala gị na-ekwu banyere gị nʼakụkụ mgbidi ha na nʼọnụ ụzọ ụlọ ha. Ha na-asịrịta onwe ha, ‘Bịanụ ka anyị gaa nụrụ ozi sitere nʼọnụ Onyenwe anyị.’
Son of man, your people are talking about you out in the streets and in the doorways of their houses. They encourage one another, saying, ‘Come on! Let's go and hear a message from the Lord!’
31 Ha na-abịakwute gị dịka ndị mmadụ si abịa, ha na-anọrọ ala nʼihu gị na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya nʼomume: nʼihi na ha na-eji egbugbere ọnụ ha na-egosi ịhụnanya, ma obi ha nọ naanị na uru ọjọọ ha ga-enweta.
So my people come and visit you like they usually do. They sit and listen to the message you share, but they don't do anything about it. Even though they talk about love, all they're thinking about is how to cheat others.
32 Nʼanya ha, ị dịka onye ji ezigbo olu na-ekwe ukwe ịhụnanya, dịka onye nwere olu ụtọ, nke na-abụ abụ dị ụtọ, na onye maara ka e si eti ịgba. Ha na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha ejighị ya kpọrọ ihe ọbụla.
In fact, to them you're just someone who sings love songs with a lovely voice and who is a fine musician. They listen to the message you share, but they don't do anything about it.
33 “Ma mgbe nke a bịara na mmezu, nʼihi ọ ghaghị ịbịa, ha ga-amata na onye amụma anọtụla nʼetiti ha.”
So when what you say does happen (and it will), then they will realize that they did have a prophet among them.”