< Izikiel 32 >

1 Nʼafọ nke iri na abụọ, nʼọnwa nke iri na abụọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,
La douzième année, le premier jour du douzième mois, la parole de l'Éternel me fut adressée, en ces termes:
2 “Nwa nke mmadụ, buliere Fero bụ eze Ijipt, abụ akwa sị ya, “‘Ị dị ka ọdụm nʼetiti mba niile. Ị dịkwa ka ogologo anụ ọjọọ na-anọ nʼosimiri. I na-akpụgharị onwe gị nʼime mmiri. I ji ụkwụ abụọ na-agbarụ mmiri, na-emekwa ka mmiri iyi niile gbarụọ.
Fils de l'homme, prononce une complainte sur Pharaon, roi d'Égypte, et dis-lui: Tu semblais un lionceau parmi les nations; pareil au crocodile dans les mers, tu t'élançais dans tes fleuves; avec tes pieds tu troublais les eaux, et tu remplissais de boue leurs flots.
3 “‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “‘Aga m eji ọtụtụ ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ gbasaa ụgbụ m nʼelu gị. Ha ga-adọkpụkwara gị nʼime ụgbụ m.
Ainsi a dit le Seigneur, l'Éternel: J'étendrai mes filets sur toi, par une multitude nombreuse de peuples, qui te tireront dans mes filets.
4 Aga m atụsa gị nʼala, nʼọhịa ka m ga-atụfukwa gị, meekwa ka ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe bekwasị gị. Aga m emekwa ka anụ ọhịa nke ụwa niile rijuo afọ nʼanụ ahụ gị.
Je t'abandonnerai sur la terre, et te jetterai à la surface des champs; je ferai reposer sur toi tous les oiseaux des cieux, et je rassasierai de toi les bêtes de toute la terre.
5 Aga m tụsasịkwa anụ ahụ gị nʼugwu niile, werekwa ihe ọbụla fọdụrụ nʼime gị mejuo ndagwurugwu niile.
Je mettrai ta chair sur les montagnes, et de tes débris je remplirai les vallées.
6 M ga-eji ọbara gị na-asọ asọ dee ala niile dịka mmiri ọ bụladị ruo nʼugwu niile, ebe niile mmiri si erufe ga-ejupụtakwa nʼanụ ahụ gị.
J'abreuverai de ton sang la terre où tu nages, jusqu'aux montagnes, et les ravins seront remplis de toi.
7 Mgbe m ga-emenyụ gị dịka ọkụ, aga m ekpuchi ihu eluigwe, meekwa ka kpakpando niile jie nji. Aga m eji igwe ojii mechie ihu anyanwụ, ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.
Quand je t'éteindrai, je couvrirai les cieux, et j'obscurcirai leurs étoiles; je couvrirai le soleil de nuages, et la lune ne donnera plus sa lumière.
8 Ihe niile nke na-enye ìhè nʼeluigwe ka m ga-eme ka ha jie nji nʼelu gị, mee ka ọchịchịrị gbachie nʼala gị niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
A cause de toi, j'obscurcirai tous les luminaires qui éclairent les cieux, et je répandrai les ténèbres sur ton pays, dit le Seigneur, l'Éternel.
9 Aga m eweta obi mgbawa nʼetiti ndị mmadụ dị iche iche mgbe m ga-eme ka mbibi gị bịa nʼetiti mba niile nʼime ala dị iche iche nke ị na-amaghị.
Je ferai frémir le cœur de beaucoup de peuples, quand j'annoncerai ta ruine parmi les nations, dans des pays que tu n'as point connus.
10 Aga m eme ka i ju ọtụtụ ndị mmadụ anya, ndị eze ha ga-ama jijiji nʼụjọ maka gị mgbe m ga-efegharị mma agha m nʼihu ha. Onye ọbụla nʼime ha ga-ama jijiji na ntabi anya ọbụla nʼihi ndụ ya nʼụbọchị ahụ, ị ga-ada.
Je remplirai de stupeur beaucoup de peuples à ton sujet, et leurs rois seront éperdus à cause de toi, quand je brandirai devant eux mon épée. Ils trembleront à tout instant, chacun pour sa vie, au jour de ta ruine.
11 “‘Nʼihi na nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘Mma agha nke eze Babilọn ga-abịakwasị gị.
Car ainsi a dit le Seigneur, l'Éternel: L'épée du roi de Babylone fondra sur toi;
12 Usuu ndị agha gị ga-adakwa nʼihu mma agha nke ndị dị ike, bụ ndị mba ahụ kachasị mba niile njọ. Nganga niile nke Ijipt na ndị ya, ka ha ga-egwepịa. Ha ga-akwatu usuu ndị agha ha niile.
J'abattrai ta multitude par l'épée des hommes forts, tous les plus terribles d'entre les nations; ils détruiront l'orgueil de l'Égypte, et toute sa multitude sera anéantie.
13 Aga m emekwa ka anụmanụ ya niile, nke na-ata ahịhịa nʼakụkụ mmiri laa nʼiyi. Ụkwụ mmadụ, na ụkwụ anụmanụ agakwaghị agbarụ mmiri ahụ ọzọ.
Je ferai périr tout son bétail près des grandes eaux; nul pied d'homme ne les troublera plus, aucun sabot de bête ne les troublera plus.
14 Nʼihi ya, mmiri niile nke ya ga-adị ọcha, na-asọkwa dịka mmanụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru.
Alors j'apaiserai ses eaux, et je ferai couler ses fleuves comme l'huile, dit le Seigneur, l'Éternel.
15 Mgbe m bibiri Ijipt, kpochapụkwa ihe niile dị nʼime ya, mgbe m tidara ndị niile bi nʼime ya, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
Quand je réduirai le pays d'Égypte en désolation, et que le pays sera dénué de tout ce dont il était rempli, quand je frapperai tous ses habitants, ils sauront que je suis l'Éternel.
16 “Nke a bụ abụ akwa ha ga-abụrụ ya. Ndị inyom mba dị iche iche ga-abụ ya. Ha ga-abụ ya nʼihi Ijipt na usuu ndị agha ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
Telle est la complainte; les filles des nations la chanteront d'une voix plaintive; elles la chanteront pour plaindre l'Égypte et toute sa multitude, dit le Seigneur, l'Éternel.
17 Nʼafọ nke iri na abụọ ahụ, nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị sị,
La douzième année, le quinzième jour du mois, la parole de l'Éternel me fut adressée, en ces termes:
18 “Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa nʼihi usuu ndị agha Ijipt niile, wezuga ha baa nʼokpuru ụwa ma ndị inyom mba dị iche iche dị ukwuu, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu.
Fils de l'homme, fais une lamentation sur la multitude de l'Égypte. Précipite-la, elle et les filles des nations puissantes, dans les profondeurs de la terre, avec ceux qui descendent dans la fosse!
19 Gwa ha okwu sị ha, ‘Unu o nwere ihuọma karịa ndị ọzọ? Lee, ihe na-eche gị bụ olulu. Ọ bụkwa ndị a na-ebighị ugwu ka ị ga-edinakwuru.’
Vaux-tu mieux que d'autres? Descends, et couche-toi parmi les incirconcis!
20 Nʼetiti ndị e ji mma agha gbuo ka ha ga-ada. Amịpụtala mma agha maka ya, ka a dọkpụrụ ya na igwe ndị ya niile pụọ.
Ils tomberont au milieu de ceux que l'épée a blessés à mort. L'épée est tirée. Entraînez-la avec toute sa multitude
21 Ndị dike nke ndị ndu dike ga-esite nʼala mmụọ kwuo banyere Ijipt na ndị niile ha na ya dị na mma, ‘Ha arịdatala, ha na-edina ala ha na ndị a na-ebighị ugwu, nakwa ndị niile ahụ e ji mma agha gbuo.’ (Sheol h7585)
Les plus vaillants héros lui parlent au sein du séjour des morts, avec ceux qui furent ses auxiliaires; ils sont descendus et couchés, les incirconcis que l'épée blessa à mort. (Sheol h7585)
22 “Nʼebe ahụ ka Asịrịa na ndị agha ya niile nọ; ili ndị niile o gburu egbu gbara ya gburugburu, bụ ndị niile nwụrụ site na mma agha.
Là est Assur et toute sa multitude, et autour de lui ses tombeaux; tous ont été blessés, et sont tombés par l'épée.
23 Ili ha dị na nsọtụ niile nke olulu, ndị agha ya niile gbakwara ili ya gburugburu. E gbudala ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ. Ndị a nwụrụ site na mma agha.
Ses tombeaux se trouvent dans les profondeurs de la fosse, et sa multitude est rangée à l'entour; tous ont été blessés à mort, et sont tombés par l'épée, eux qui répandaient la terreur dans la terre des vivants.
24 “Nʼebe ahụ ka Elam na usuu ndị agha ya nọ gbaa ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị e gburu egbu, ndị nwụrụ site na mma agha. Ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ arịdaruola nʼolulu ahụ dịka ndị a na-ebighị ugwu. Ha esorola ndị ahụ rịdaruru nʼala mmụọ keta oke nʼihere dịrị ha.
Là est Élam et toute sa multitude, à l'entour de son tombeau. Tous sont blessés à mort, et sont tombés par l'épée; ils sont descendus incirconcis dans les profondeurs de la terre, eux qui répandaient la terreur sur la terre des vivants; ils portent leur ignominie avec ceux qui descendent dans la fosse.
25 E meere ya ebe ndina nʼetiti ndị nwụrụ anwụ. Igwe mmadụ ya nwụrụ anwụ gbakwara ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị a na-ebighị ugwu, ndị e ji mma agha gbuo, nʼihi na-emere ka oke egwu ha dị nʼala ndị dị ndụ, ma ha na-eburu ihere ha, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ha bụ ndị e debere nʼetiti ndị nwụrụ anwụ.
Au milieu des blessés à mort, on a mis sa couche, avec toute sa multitude; tout autour, ses tombeaux. Tous ces incirconcis sont blessés à mort par l'épée, car ils répandaient la terreur dans la terre des vivants; ils portent leur ignominie avec ceux qui descendent dans la fosse; on les a mis parmi les blessés à mort.
26 “Meshek na Tubal nọkwa nʼebe ahụ, ha na usuu ndị agha ha niile, gburugburu ili ha. Ha niile bụkwa ndị a na-ebighị ugwu, ndị e ji mma agha gbuo, nʼihi na ha mere ka oke egwu ha dị nʼala ndị dị ndụ.
Là sont Méshec, Tubal et toute leur multitude: tout autour, leurs tombeaux; tous ces incirconcis sont blessés à mort par l'épée, car ils répandaient la terreur dans la terre des vivants.
27 Ugbu a, e likọọla ha na ndị a na-ebighị ugwu, bụ ndị dike nʼagha, ndị nwụrụ anwụ, ndị ji ngwa agha ha gbadaa nʼime ili ha, ndị e hinyere ngwa agha ha nʼokpuru isi ha, ebe ọta ha dịkwasịrị nʼọkpụkpụ mgbe e tinyere ha nʼili. Ma nʼezie, ndị a bụ dike nʼagha mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ. (Sheol h7585)
Mais ils ne sont point couchés avec les vaillants hommes, tombés d'entre les incirconcis, qui sont descendus au Sépulcre avec leurs armes de guerre, et sous la tête desquels on a mis leurs épées. Leurs iniquités couvrent leurs ossements, car ils furent la terreur des hommes vaillants sur la terre des vivants. (Sheol h7585)
28 “Ma gị onwe gị, bụ Fero, otu a ka a ga-esi gbajie gị, ị ga-edinakwa nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị e ji mma agha gbuo.
Toi aussi, tu seras brisé au milieu des incirconcis, et tu seras couché avec ceux que l'épée a blessés à mort.
29 “Nʼebe ahụ ka Edọm na ndị eze ya, na ndịisi ya niile nọ. Nʼagbanyeghị ịdị ike ha, ha na ndị e ji mma agha gbuo tọgbọrọ nʼebe ahụ. Ha na ndị a na-ebighị ugwu so dinaa, bụ ndị na-arịdaru nʼolulu.
Là est Édom, ses rois et ses princes, qui malgré leur vaillance ont été mis au nombre de ceux que l'épée a blessés à mort; ils sont couchés avec les incirconcis, et avec ceux qui descendent dans la fosse.
30 “Ndịisi nke mba ndị ugwu, na ndị Saịdọn niile nọ nʼebe ahụ. Ụjọ niile nke ha sitere nʼisiike ha menye ndị mmadụ egbochighị ha iketa oke nʼihere nke iso ndị e gburu egbu nwụọ. Ha soro ndị eji mma agha gbuo dinaa na-ebighị ugwu, buru ihere ha, ha na-arịdaru nʼolulu.
Là sont tous les princes du nord, et tous les Sidoniens, qui sont descendus avec les blessés à mort, malgré la terreur qu'inspirait leur vaillance; ils sont confus, étendus, ces incirconcis, avec ceux que l'épée a blessés à mort, et ils portent leur ignominie, avec ceux qui descendent dans la fosse.
31 “Fero na ndị agha ya niile ga-ahụ ndị a, ọ ga-enwe nkasiobi maka ndị ya niile, na usuu ndị agha ya niile ndị eji mma agha gbuo. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
Pharaon les verra, et se consolera de toute sa multitude; Pharaon et toute son armée seront blessés à mort par l'épée, dit le Seigneur, l'Éternel;
32 Nʼagbanyeghị na emeela m ka ọ gbasaa ụjọ nʼala ndị dị ndụ, Fero na igwe mmadụ a niile ka a ga-eli nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, ya na ndị ejiri mma agha gbuo. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
Car je répandrai ma terreur sur la terre des vivants. Pharaon et toute sa multitude seront couchés au milieu des incirconcis, avec ceux que l'épée a blessés à mort, dit le Seigneur, l'Éternel.

< Izikiel 32 >