< Izikiel 31 >

1 O ruo, nʼafọ nke iri na otu, nʼọnwa nke atọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Och det begaf sig i ellofte årena, på första dagen i tredje månadenom, skedde Herrans ord till mig, och sade:
2 “Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha, “‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu?
Du menniskobarn, säg till Pharao, Konungen i Egypten, och till allt hans folk: Huru stor menar du då att du äst?
3 Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa, nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya. Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn, nke jupụtara nʼalaka mara mma, nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo, nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile.
Si, Assur var lika som ett cedreträ på Libanon, med sköna grenar, och tjockt af löf, och ganska högt, så att dess skate stod högt upp ibland stora tjocka qvistar.
4 O nwetara mmiri mere ka o buo ibu, na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo. Iyi ha niile na-asọ nʼokpuru ya. Ebe ahụ ka ha si ezipu ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri.
Det hade vatten nog, att det högt vardt, och många källor, att det starkt vardt; dess strömmar gingo allt omkring dess rot, och dess bäcker till all trä i skogenom.
5 Nʼihi ya, o toro tokarịa osisi niile nʼogologo. Ngalaba ya bara ụba, alaka ya topụkwara ogologo nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta.
Derföre är det högre vordet än all trä på markene, och fick många grenar och långa qvistar; ty det hade vatten nog till att utbreda sig.
6 Nʼalaka ya niile ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ, nʼokpuru ndo nke alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ, oke mba niile dị iche iche bikwara nʼokpuru ndo ya.
Alle himmelens foglar bodde uppå dess qvistar, och all vilddjur hade ungar under dess grenar, och under dess skugga bodde mång och stor folk.
7 Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya, nʼogologo nke alaka ya nʼawasa, nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba nʼebe mmiri dị ukwuu.
Det hade sköna, stora och långa grenar; ty dess rot hade mycket vatten.
8 Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige erughị ya nʼọtụtụ. Ọ dịghị osisi junipa niile nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya, osisi plenụ niile adịghịkwa ka alaka ya, ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige, nke yiri ya nʼịma mma ya
Och intet cedreträ var desso likt i Guds lustgård; furoträn voro dess grenom intet liknande, och mandelträn voro intet emot dess qvistar; ja, det var så dägeligit, att det öfvergick all trä i Guds lustgård.
9 Emere m ya ka ọ maa mma site nʼịba ụba nke alaka o nwere, ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIden nʼubi Chineke a gbara ogige.
Jag hafver gjort det så skönt, att det fick så många qvistar, att all lustig trä i Guds lustgård båro afund dervid.
10 “‘Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na o toro ogologo tokarịa osisi ọhịa niile, nʼihi na ọ nyara isi banyere ọnọdụ ịdị ogologo ya karịa ndị ọzọ,
Derföre säger Herren Herren alltså: Efter han så hög vorden är, att hans skate stod ibland stora, höga, tjocka qvistar, och hans hjerta upphof sig, att han så hög var;
11 Eweere m ya nyefee nʼaka onye ahụ na-achị mba niile, ka o mesie ya ike, dịka ịba ụba nke ajọ omume ya si dị. Ewezugakwara m ya nʼakụkụ.
Derföre hafver jag gifvit honom dem mägtigasta ibland Hedningarna i händer; han skall vara till verka med honom, och fördrifvan, såsom han med sitt ogudaktiga väsende förtjent hafver;
12 Mba ahụ kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere gbuturu ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼala. Ngalaba ya dara nʼelu ugwu ukwu niile nakwa nʼime ndagwurugwu niile. Alaka ya kwa dajisịrị danyesịa nʼime ebe niile gbawara agbawa nke ala mmiri si eru. Mba niile nke ụwa sitere nʼokpuru ndo ya pụta wezuga onwe ha.
Att främmande skola utrota honom, nämliga Hedningarnas tyranner, och förskingra honom, att hans qvistar skola ligga på all berg, och i alla dalar, och hans qvistar sönderbrutne vid alla bäcker i landena, så att all folk på jordene måste bortdraga undan hans skugga, och öfvergifva honom.
13 Ụmụ nnụnụ niile bere nʼelu ukwu osisi ahụ dara ada, nʼetiti alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa bịara biri.
Och alle himmelens foglar såto på hans kullfallna bål, och all vilddjur lade sig på hans afhuggna qvistar;
14 Ya mere, ka osisi niile nke dị nʼakụkụ mmiri gharakwa eto ogologo, maọbụ ka ọnụ ọnụ ya ghakwara ịdị elu karịa alaka ndị ahụ bara ụba. Nyekwa na ọ dịkwaghị osisi ọbụla na-enwetazu mmiri nke ga-etoru osisi ndị ahụ nʼogologo. Nʼihi na edebela ha nye ọnwụ, nye ịrịdaru nʼokpuru ụwa, nʼetiti ndị mmadụ ndị na-arịda nʼolulu omimi ahụ.
På det härefter intet trä vid vatten skall förhäfva sig af sine höjd, att dess skate ibland stora, tjocka qvistar står, och att intet trä vid vatten skall förhäfva sig öfver de andra; ty de måste alle under jordena, och dödenom öfvergifne varda, lika som andra menniskor, de der uti kulona fara.
15 “‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ e mere ka ọ rịdaruo nʼala mmụọ, a kwụsịrị m ogbu mmiri niile were ha kpuchie ya. A kwụsịrị nsọgharị nke mmiri, meekwa ka ịba ụba nke mmiri ya niile kwụsị. Nʼihi ya, eyinyere m Lebanọn uwe mkpe, osisi niile nke ọhịa kpọnwụkwara nʼihi ya. (Sheol h7585)
Detta säger Herren Herren: På den tiden, då han nederfor till helvetes, då gjorde jag en klagolåt, att djupet öfvertäckte honom, och hans strömmar måste stilla stå, och de stora vattnen intet löpa kunde; och gjorde det så, att Libanon sörjde öfver honom, och all trä i markene förtorkades öfver honom. (Sheol h7585)
16 Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma. (Sheol h7585)
Jag förskräckte Hedningarna, då de hörde honom falla, då jag nederstörte honom till helvetes, med dem som uti kulona fara; och all lustig trä under jordene unte honom det väl, de ädlesta och bästa på Libanon, och all de som vid vatten ståndit hade. (Sheol h7585)
17 Ha onwe ha kwa, dịka sida ukwuu ahụ, sokwaara gbadaruo nʼala mmụọ, gakwuru ndị niile eji mma agha gbuo, ha na ndị ikom ji mma agha bụ ndị biri nʼokpuru ndo ya nʼetiti mba dị iche iche. (Sheol h7585)
Ty de måste ock med honom neder åt helvetet, till de slagna med svärd, efter de under hans arms skugga ibland Hedningarna bott hade. (Sheol h7585)
18 “‘Olee osisi dị nʼIden a ga-eji tụnyere gị nʼịma mma, na nʼịdị ebube? Ma gị onwe gị kwa, na osisi ndị a niile dị nʼIden ka a ga-eme ka unu rịdaruo nʼokpuru ụwa. Ị ga-edina nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị eji mma agha gbuo. “‘Nke a bụ Fero na usuu ndị agha ya niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’”
Huru stor menar du då att du äst, med ditt prål och härlighet, ibland de lustiga trän? Ty du måste med de lustiga trän fara neder under jordena, och ligga ibland de oomskorna, hvilke med svärd slagne äro; alltså skall det gå dig, Pharao, med allo dino folke, säger Herren Herren.

< Izikiel 31 >