< Izikiel 31 >

1 O ruo, nʼafọ nke iri na otu, nʼọnwa nke atọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
A shekara ta goma sha ɗaya, a wata na uku a rana ta farko, maganar Ubangiji ta zo mini cewa,
2 “Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha, “‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu?
“Ɗan mutum, faɗa wa Fir’auna sarkin Masar da jama’arsa cewa, “‘Da wa za a kwatanta girmanka?
3 Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa, nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya. Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn, nke jupụtara nʼalaka mara mma, nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo, nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile.
Ka dubi Assuriya, ta taɓa zama kamar al’ul a Lebanon da rassa masu kyau suna inuwartar da kurmi; ya yi tsayi ainun kansa ya kai cikin gizagizai.
4 O nwetara mmiri mere ka o buo ibu, na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo. Iyi ha niile na-asọ nʼokpuru ya. Ebe ahụ ka ha si ezipu ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri.
Ruwa ya sa ya yi girma, zurfafan maɓulɓulai sun sa ya yi tsayi; rafuffuka suna gudu kewaye da tushensa yana aika da rafuffukansa zuwa dukan itatuwan kurmi.
5 Nʼihi ya, o toro tokarịa osisi niile nʼogologo. Ngalaba ya bara ụba, alaka ya topụkwara ogologo nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta.
Saboda haka ya yi tsayi fiye da sauran itatuwan kurmi; rassansa suka ƙaru suka yi tsayi, suka bazu saboda yalwar ruwaye.
6 Nʼalaka ya niile ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ, nʼokpuru ndo nke alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ, oke mba niile dị iche iche bikwara nʼokpuru ndo ya.
Dukan tsuntsayen sararin sama suka yi sheƙa a rassansa, dukan namun jeji suka haihu a ƙarƙashin rassansa; dukan al’ummai suka zauna a inuwarsa.
7 Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya, nʼogologo nke alaka ya nʼawasa, nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba nʼebe mmiri dị ukwuu.
Yana da girma a kyau, da dogayen rassansa da ya baza, gama saiwoyinsa sun nutse can ƙasa har cikin yalwar ruwaye.
8 Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige erughị ya nʼọtụtụ. Ọ dịghị osisi junipa niile nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya, osisi plenụ niile adịghịkwa ka alaka ya, ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige, nke yiri ya nʼịma mma ya
Al’ul a cikin lambun Allah ba su kai shi ba, balle itatuwan kasharina su kai rassansa, ko itatuwan durumi su kai rassansa, ko itace a lambun Allah ya kai kyansa.
9 Emere m ya ka ọ maa mma site nʼịba ụba nke alaka o nwere, ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIden nʼubi Chineke a gbara ogige.
Na sa ya yi kyau da yalwar rassa, abin ƙyashi na dukan itatuwan Eden a lambun Allah.
10 “‘Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na o toro ogologo tokarịa osisi ọhịa niile, nʼihi na ọ nyara isi banyere ọnọdụ ịdị ogologo ya karịa ndị ọzọ,
“‘Saboda haka ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka yana cewa domin ya yi tsayi, kansa kuma ya kai cikin gizagizai, kuma domin ya yi fariya saboda tsayinsa,
11 Eweere m ya nyefee nʼaka onye ahụ na-achị mba niile, ka o mesie ya ike, dịka ịba ụba nke ajọ omume ya si dị. Ewezugakwara m ya nʼakụkụ.
na miƙa shi ga mai mulkin al’ummai, don yă sāka masa gwargwadon muguntarsa. Na jefar da shi a gefe,
12 Mba ahụ kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere gbuturu ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼala. Ngalaba ya dara nʼelu ugwu ukwu niile nakwa nʼime ndagwurugwu niile. Alaka ya kwa dajisịrị danyesịa nʼime ebe niile gbawara agbawa nke ala mmiri si eru. Mba niile nke ụwa sitere nʼokpuru ndo ya pụta wezuga onwe ha.
kuma baƙi mafi mugunta na al’ummai suka sare shi suka bar shi. Rassansa sun fāɗi a kan duwatsun da suke cikin dukan kwaruruka; rassansa kuma sun kakkarye, sun fāɗi a cikin dukan magudanan ruwa na ƙasa. Dukan al’umman duniya suka fito daga ƙarƙashin inuwarsa suka bar shi.
13 Ụmụ nnụnụ niile bere nʼelu ukwu osisi ahụ dara ada, nʼetiti alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa bịara biri.
Dukan tsuntsaye sararin sama suka zauna a itacen da ya fāɗi, dukan namun jeji kuma suna cikin rassansa.
14 Ya mere, ka osisi niile nke dị nʼakụkụ mmiri gharakwa eto ogologo, maọbụ ka ọnụ ọnụ ya ghakwara ịdị elu karịa alaka ndị ahụ bara ụba. Nyekwa na ọ dịkwaghị osisi ọbụla na-enwetazu mmiri nke ga-etoru osisi ndị ahụ nʼogologo. Nʼihi na edebela ha nye ọnwụ, nye ịrịdaru nʼokpuru ụwa, nʼetiti ndị mmadụ ndị na-arịda nʼolulu omimi ahụ.
Saboda haka ba wani daga cikin itatuwan da suke kusa da ruwan da zai taɓa yin fariyar tsawonsa, har kawunansu su kai cikin gizagizai. Ba wani daga cikin itatuwan da ya sha ruwa sosai da zai taɓa yi wannan tsayi; duk an bashe su ga mutuwa, zuwa can ƙasa, a cikin matattu, tare da waɗanda suka gangara zuwa rami.
15 “‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ e mere ka ọ rịdaruo nʼala mmụọ, a kwụsịrị m ogbu mmiri niile were ha kpuchie ya. A kwụsịrị nsọgharị nke mmiri, meekwa ka ịba ụba nke mmiri ya niile kwụsị. Nʼihi ya, eyinyere m Lebanọn uwe mkpe, osisi niile nke ọhịa kpọnwụkwara nʼihi ya. (Sheol h7585)
“‘Ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka yana cewa a ranar da aka yi ƙasa da shi zuwa kabari na rufe zurfafa maɓulɓulai da makoki dominsa; na janye rafuffukansa, aka kuma hana yalwan ruwansa. Saboda shi na rufe Lebanon da baƙin ciki, dukan itatuwan kurmi suka bushe. (Sheol h7585)
16 Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma. (Sheol h7585)
Na sa al’ummai suka yi rawar jiki da jin ƙarar fāɗuwarsa sa’ad da na yi ƙasa da shi zuwa kabari tare da waɗanda suka gangara rami. Sai dukan itatuwan Eden, zaɓaɓɓu da kuma mafi kyau na Lebanon, dukan itatuwan da aka yi musu banruwa, sun ta’azantu a ƙarƙashin ƙasa. (Sheol h7585)
17 Ha onwe ha kwa, dịka sida ukwuu ahụ, sokwaara gbadaruo nʼala mmụọ, gakwuru ndị niile eji mma agha gbuo, ha na ndị ikom ji mma agha bụ ndị biri nʼokpuru ndo ya nʼetiti mba dị iche iche. (Sheol h7585)
Waɗanda suka zauna a inuwarsa, dukan masu tarayyarsa a cikin al’ummai, su ma sun gangara zuwa kabari tare da shi, sun haɗu da waɗanda aka kashe da takobi. (Sheol h7585)
18 “‘Olee osisi dị nʼIden a ga-eji tụnyere gị nʼịma mma, na nʼịdị ebube? Ma gị onwe gị kwa, na osisi ndị a niile dị nʼIden ka a ga-eme ka unu rịdaruo nʼokpuru ụwa. Ị ga-edina nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị eji mma agha gbuo. “‘Nke a bụ Fero na usuu ndị agha ya niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’”
“‘Da wa cikin itatuwan Eden za a kwatanta da kai cikin girma da daraja? Duk da haka kai ma, za a yi ƙasa da kai tare da itatuwan Eden zuwa ƙarƙashin ƙasa; za ka kwanta a cikin marasa kaciya, tare da waɗanda aka kashe da takobi. “‘Fir’auna ke nan da dukan jama’arsa, in ji Ubangiji Mai Iko Duka.’”

< Izikiel 31 >