< Izikiel 3 >
1 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, rie ihe a m gaje inye gị. Taa akwụkwọ a a fụkọrọ afụkọ; pụọ gaa gwa ụmụ Izrel okwu.”
Síwájú sí i, ó sọ fún mi pé, “Ọmọ ènìyàn, jẹ ohun tí ó wà níwájú rẹ, jẹ ìwé kíká yìí; kí o sì lọ fi bá ilé Israẹli sọ̀rọ̀.”
2 Ya mere, a saghere m ọnụ m, o nyere m akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ ka m rie.
Mo sì ya ẹnu mi, ó sì mú mi jẹ ìwé kíká náà.
3 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, taa akwụkwọ a niile m nyere gị, tajuo ya afọ gị.” Atara m ya. Ma mgbe m na-ata ya, ọ tọrọ m ụtọ nʼọnụ dịka a ga-asị na ọ bụ mmanụ aṅụ.
Ó tún sọ fún mi pé, “Ọmọ ènìyàn, jẹ ìwé kíká tí mo fún ọ yìí, fi bọ́ inú àti ikùn rẹ.” Nígbà náà ni mo jẹ ẹ́, dídùn rẹ̀ dàbí oyin ní ẹnu mi.
4 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, bilie jekwuru ụmụ Izrel gwa ha okwu m niile.
Ó sì tún sọ fún mi pé, “Ọmọ ènìyàn, lọ ni ìsinsin yìí bá mi sọ ọ̀rọ̀ mi fún ilé Israẹli.
5 Nʼihi na-ezighị m gị ka i jekwuru mba ndị okwu ha edoghị anya na ndị a naghị aghọta asụsụ ha, kama ọ bụ ijekwuru ụlọ Izrel.
A kò rán ọ sí àwọn tó ń sọ èdè àjèjì tàbí tí èdè wọn ṣòro láti gbọ́, ṣùgbọ́n orílẹ̀-èdè Israẹli ni mo rán ọ sí
6 Ezikwaghị m gị ka i jekwuru mba nwere asụsụ na-edoghị anya, nke ị na-adịghị aghọta okwu ha. Nʼihi na a sị na ọ bụ ndị dị otu a ka m zigara gị ka i jekwuru, ha gaara ege gị ntị.
kì í ṣe sí ọ̀pọ̀ ènìyàn tó ń sọ àjèjì èdè tàbí tí èdè wọn ṣòro láti gbọ́, àwọn tí ọ̀rọ̀ wọn le fún ọ láti gbọ́ yé. Dájúdájú bí mo bá rán ọ sí wọn, wọn ìbá sì fetísílẹ̀ sí ọ.
7 Ma ụlọ Izrel agaghị ekwe gee gị ntị, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị. Nʼihi na ụlọ Izrel bụ ndị obi ha siri ike, na ndị isiike.
Ṣùgbọ́n ilé Israẹli kò fẹ́ gbọ́ tìrẹ nítorí pé wọn kò fẹ́ láti gbọ́ tèmi, torí pé aláìgbọ́ràn àti ọlọ́kàn líle ni gbogbo ilé Israẹli.
8 Lee, emeela m ka ihu gị sie ike karịa nke ha, ka egedege ihu gị siekwa ike karịa nke ha.
Ṣùgbọ́n bí i tiwọn lèmi náà yóò ṣe jẹ́ kí ojú àti ọkàn rẹ le.
9 Aga m emekwa ka egedege ihu gị dị ka nkume siri ike, sie ike karịa nkume. Nʼihi ya, atụla ha egwu; ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-enupu isi, ma atụla ihu ha egwu.”
Èmi yóò ṣe iwájú orí rẹ bí òkúta tó le jùlọ, ànító le ju òkúta-ìbọn lọ. Má ṣe bẹ̀rù wọn tàbí jẹ́ kí wọn ó dáyà já ọ. Bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé ìdílé ọlọ̀tẹ̀ ni wọ́n.”
10 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, gee ntị nke ọma nʼokwu ndị a niile m na-agwa gị, tinyekwa ha nʼuche gị.
Ó sì sọ fún mi pé, “Ọmọ ènìyàn, gbọ́ gbogbo ọ̀rọ̀ tí mo ń sọ, kí o sì gba gbogbo ọ̀rọ̀ yìí sí ọkàn rẹ.
11 Jekwuru ndị gị a dọtara nʼagha nọ na mba ọzọ, sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,’ Gwa ha ya, ma ha gere gị ntị ma ha egeghị gị ntị.”
Lọ nísinsin yìí sí ọ̀dọ̀ àwọn ènìyàn rẹ tó wà ní ìgbèkùn. Sọ fún wọn pé báyìí ni Olúwa Olódùmarè wí yálà wọ́n gbọ́ tàbí wọn kò gbọ́.”
12 Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ buliri m elu. Anụrụ m olu mere oke ụzụ nʼazụ m, mgbe ebube nke Onyenwe anyị sị nʼọnọdụ ya bilie.
Nígbà náà ni ẹ̀mí gbé mi sókè, mo sì gbọ́ ohùn ìró ńlá lẹ́yìn mi tó sọ pé, kí a gbé ògo Olúwa ga láti ibùgbé rẹ̀ wá!
13 Ọ bụ ụzụ nke nku ihe ndị ahụ dị ndụ na-eme mgbe ha na-emetụrịta nku ibe ha; ọ bụkwa ụzụ ụkwụ wịịlu ha nke dị nʼakụkụ ha.
Bẹ́ẹ̀ ni mo tún gbọ́ ariwo ìyẹ́ apá àti kẹ̀kẹ́ àwọn ẹ̀dá alààyè náà pẹ̀lú ariwo tó dàbí àrá ńlá.
14 Mmụọ ahụ buliri m, bupụ m. Ejegharịrị m nʼobi ilu na iwe nke mmụọ m, ebe aka Onyenwe anyị dịkwa ike nʼahụ m.
Ẹ̀mí náà sì gbé mi sókè, ó sì mú mi lọ, mo lọ pẹ̀lú ọkàn kíkorò àti ìbínú nínú ẹ̀mí mi, pẹ̀lú ọwọ́ líle Olúwa ni ara mi.
15 A bịakwutere m ndị ahụ a dọọrọ nʼagha, ha aga biri na Tel Abib nʼakụkụ osimiri Keba. Nʼebe ahụ, bụ ebe ha na-ebi, anọdụrụ m nʼetiti ha abalị asaa, nʼọnọdụ obi ilu na ọnụma.
Nígbà náà ni mo lọ sí etí odò Kebari níbi tí àwọn ìgbèkùn ń gbé ni Teli-Abibu. Níbẹ̀ níbi tí wọ́n ń gbé, mo jókòó láàrín wọn pẹ̀lú ìyanu, fún ọjọ́ méje.
16 Mgbe abalị asaa gasịrị, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,
Lẹ́yìn ọjọ́ méje, ọ̀rọ̀ Olúwa tọ̀ mí wá wí pé,
17 “Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.
“Ọmọ ènìyàn, mo ti fi ọ́ ṣe olùṣọ́ fún ilé Israẹli; nítorí náà gbọ́ ọ̀rọ̀ tí mo ń sọ, fún wọn ní ìkìlọ̀ láti ọ̀dọ̀ mi.
18 Mgbe m na-asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma ọ bụrụ na ị dọghị ya aka na ntị, maọbụ ị kwughị okwu ime ka ha chigharịa site nʼụzọ ọjọọ ha niile pụta nʼihi ịzọpụta ndụ ha, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.
Bí mo bá sọ fún ènìyàn búburú pé, dájúdájú, ‘Ìwọ yóò kú,’ tí ìwọ kò sì kìlọ̀ fún ènìyàn búburú yìí láti dáwọ́ ìwà ibi rẹ̀ dúró, kí o sì gba ẹ̀mí rẹ̀ là, ènìyàn búburú náà yóò kú nínú ẹ̀ṣẹ̀ rẹ̀, ṣùgbọ́n ní ọwọ́ rẹ ni èmi yóò ti béèrè ẹ̀jẹ̀ rẹ̀.
19 Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị, ma ha esighị nʼajọ omume maọbụ nʼụzọ ọjọọ ha niile chigharịa, ha ga-anwụ nʼihi mmehie, ma ndụ gị ka ị zọpụtara.
Ṣùgbọ́n bí o bá kìlọ̀ fún ènìyàn búburú, tí ó kọ̀ tí kò fi ìwà búburú rẹ̀ sílẹ̀, yóò kú sínú ẹ̀ṣẹ̀ rẹ̀; ṣùgbọ́n ọrùn tìrẹ ti mọ́.
20 “Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼụzọ ezi omume ya wezuga onwe ya bido ime ihe ọjọọ, m siere ha ọnya, ha ga-anwụ nʼihi na ị dọghị ha aka na ntị, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha. Agaghịkwa echeta ihe ọma niile ndị ha mere, ma ị ga-aza ajụjụ maka ọnwụ ha.
“Bákan náà, bí olódodo kan bá yípadà, tó sì bẹ̀rẹ̀ sí í ṣe àìṣòdodo, tí mo sì fi ohun ìkọ̀sẹ̀ sí ọ̀nà rẹ̀, yóò kú sínú ẹ̀ṣẹ̀ rẹ̀. Nítorí pé ìwọ kọ̀ láti kìlọ̀ fún un, yóò kú sínú ẹ̀ṣẹ̀ rẹ̀, a ó gbàgbé gbogbo ìwà rere tó ti hù tẹ́lẹ̀, ṣùgbọ́n ní ọwọ́ rẹ̀ ni èmi yóò ti béèrè ẹ̀jẹ̀ rẹ̀.
21 Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ezi omume aka na ntị ka ọ ghara ime mmehie, ha gharakwa ime mmehie, ha ga-adị ndụ nʼihi na ha nabatara ịdọ aka na ntị ahụ. Gị onwe gị azọpụtakwala ndụ gị, nʼụzọ dị otu a.”
Ṣùgbọ́n bí o bá kìlọ̀ fún olódodo tó sì dáwọ́ ìwà ẹ̀ṣẹ̀ rẹ̀ dúró, dájúdájú òun yóò yè nítorí pé ó ti gba ìkìlọ̀, ọrùn tìrẹ sì mọ́.”
22 Aka Onyenwe anyị dịgidesịrị ike nʼahụ m nʼebe ahụ. Ma ọ sịrị m, “Bilie gaa nʼebe ahụ obosara ala dị ka m gwa gị okwu nʼebe ahụ,”
Ọwọ́ Olúwa wà lára mi níbẹ̀, ó sì wí fún mi pé, “Dìde, lọ sí ibi tí ó tẹ́jú, èmi yóò sì bá ọ sọ̀rọ̀ níbẹ̀.”
23 Ebiliri m gaa nʼebe ahụ ala dị larịị. Ebube Onyenwe anyị guzo nʼebe ahụ dịka ebube nke m hụrụ nʼakụkụ iyi Keba. Adara m kpuo ihu m nʼala.
Mo sì dìde, mo lọ sí ibi tí ó tẹ́jú. Ògo Olúwa dúró níbẹ̀, ó dàbí irú ògo tí mo rí létí odò Kebari, mo sì dojúbolẹ̀.
24 Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ banyere nʼime m mee ka m guzo ọtọ nʼụkwụ m abụọ. Ọ gwara m okwu sị m, “Gaa, baa nʼụlọ, mechibido onwe gị ụzọ.
Nígbà náà ni Ẹ̀mí wọ inú mi, tí ó sì tún gbé mi dúró. Ó sì wí fún mi pé, “Lọ, ti ara rẹ mọ́ inú ilé rẹ
25 Ma gị, nwa nke mmadụ, a ga-eji ụdọ kee gị ka ị ghara inwe ike ịpụ gaa nʼetiti ndị mmadụ.
ṣùgbọ́n ìwọ, ọmọ ènìyàn, wọn yóò fi okùn dè ọ́ mọ́lẹ̀; dé ibi pé ìwọ kò ní í le rìn káàkiri láàrín àwọn ènìyàn.
26 Aga m eme ka ire gị rapara nʼakpo ọnụ gị, ka ị ghọọ onye ogbi, gharakwa ịbụ onye na-adọ ha aka na ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.
Èmi yóò mú kí ahọ́n rẹ lẹ̀ mọ́ àjà ẹnu rẹ, tó bẹ́ẹ̀ ti ìwọ yóò wà ní ìdákẹ́ jẹ́ẹ́. Ìwọ kò sì ní lè bá wọn wí, bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé ọlọ̀tẹ̀ ilé ní wọn.
27 Ma mgbe ọbụla m ziri gị ozi, aga m atọghepụ ire gị. Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru.’ Ka onye nwere ntị nụrụ, ka onye nke na-achọghị ịnụ ghara ịnụ, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.
Ṣùgbọ́n nígbà tí èmi bá bá ọ sọ̀rọ̀, Èmi yóò ṣí ọ lẹ́nu, ìwọ yóò sì sọ fún wọn pé, ‘Èyí ni ohun tí Olúwa Olódùmarè wí.’ Ẹni tó bá fẹ́ kí ó gbọ́, ẹni tó bá fẹ́ kọ̀, kó kọ̀ nítorí ọlọ̀tẹ̀ ilé ni wọ́n.