< Izikiel 28 >

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Kisha neno la Yahwe likanijia, kusema,
2 “Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “‘Nʼihi nganga nke juru gị obi, ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi, mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi, nke dị nʼetiti oke osimiri niile.” Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi.
“Mwanadamu, waambie watawala wa Tiro, 'Bwana Yahwe asema hivi: Moyo wako unakiburi! Umesema, “mimi ni mungu! Nitakaa kwenye kiti cha miungu katika moyo wa bahari!” Ingawa wewe ni mtu na sio mungu, unaufanya moyo wako kama moyo wa mungu,
3 Ị maara ihe karịa Daniel? Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ?
unafikiri kwamba unahekima kuliko Danieli, na kwamba hakuna siri ikushangazayo!
4 I werela amamihe gị na nghọta gị nwetara onwe gị akụ, tụkọba ọlaedo na ọlaọcha, nʼime ụlọakụ gị dị iche iche.
Umejitajirisha mwenyewe pamoja na hekima na ujuzi, na kujipatia dhahabu na fedha katika hazina yako!
5 E, mmụta nʼịzụ ahịa gị emeela ka ị ghọọ ọgaranya, nʼihi akụnụba inwere ị bụrụla onye na-akpa nganga.
Kwa hekima kubwa na kwa biashara yako, umeongeza utajiri wako, hivyo moyo wako una kiburi kwa sababu ya utajiri yako.
6 “‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu; “‘ebe ọ bụ na ị gụrụ onwe gị dịka onye maara ihe onye maara ihe dịka chi,
Kwa hiyo, Bwana Yahwe asema hivi: Kwa sababu umetengeza moyo wako kama moyo wa mungu,
7 ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị, bụ mba kachasị mba niile dị iche iche njọ na-enweghị obi ebere. Ha ga-amịpụta mma agha ha megide ịma mma gị na amamihe gị, ha ga-adụwakwa ebube nke mma gị.
kwa hiyo nitaleta wageni juu yako, watu wa kuogofya kutoka mataifa mengine. Wataleta panga zao juu hekima ya uzuri wako, na watauchafua uzuri wako.
8 Ha ga-eme ka ị rịdaruo nʼolulu nke ala mmụọ. Ị ga-anwụ ọnwụ ike nʼetiti oke osimiri niile.
Watakupeleka chini hata kwenye shimo, na utakufa kifo cha waliokufa katika Bahari.
9 Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,” nʼihu ndị ahụ na-egbu gị? Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, nʼaka ndị ahụ na-egbu gị.
Je! kweli utasema, “Mimi ni mungu” mbele ya uso wa yule akuuaye? Wewe ni mwanadamu na sio Mungu, na utakuwa kwenye mkono wa yule akujeruaye.
10 Ị ga-anwụ ọnwụ dịka ndị a na-ebighị ugwu, site nʼaka ndị ọbịa. Mụ onwe m ekwuola, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’”
Utakufa kifo cha asiyetahiriwa kwa mkono wa wageni kwa kuwa nimesema hili-asema Bwana Yahwe.
11 Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,
Neno la Yahwe likanijia, kusema,
12 “Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘Gị onwe gị bụ akara izuoke, ị jupụtara na amamihe na ịma mma.
“Mwanadamu, inua maombolezo kwa ajili ya mfalme wa Tiro na umwambie, 'Bwana Yahwe asema hivi: Uliumbwa mkamilifu, umejaa hekima na ukamilifu wa hekima.
13 Ị nọ nʼIden, nʼubi Chineke a gbara ogige. Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma, rubi, na topaazi, na emeralụdụ, na krisolaịt, na ọniks, na jaspa, na safaia, na tọkwọisi, na beril. A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo. Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha.
Ulikuwa katika Edeni, bustani ya Mungu. Kila jiwe la thamani lilikufunika: akiki, yakuti manjano, almasi, zabarajadi, shohamu, yaspi, yakuti samawi, zumaridi, baharamani, na dhahabu. Ilikuwa siku uliyokuwa umeiumba ambayo walikuwa wameiandaa.
14 Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub, ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ. Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ, na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ.
Nimekuweka juu ya mlima mtakatifu wa Mungu kama kerubi nimekutia mafuta kwa ajili ya kumlinda mwanadamu. Ulikuwa kati ya mawe ya moto ulipozunguka.
15 Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị, tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị.
Ulikuwa mwadilifu kwenye njia zako kutoka siku ulipoumbwa hadi uovu ulipoonekana ndani yako.
16 Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị ị ghọrọ onye na-eme ihe ike, si otu a mehiekwa. Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị. Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị, gị cherub na-ekpuchi ekpuchi.
Kupitia biashara yako kubwa uliyokuwa umeijaza kwa udhalimu, hivyo umetenda dhambi. Hivyo nimekutupilia mbali ya mlima wa Mungu, kama mmoja wao wa aliyekuwa ameninajisi, na nimekuharibu, kerubi mlinzi, na kukutoa miongono mwa mawe ya moto.
17 Obi gị jupụtara na nganga nʼihi ịma mma gị, i mere ka amamihe gị bụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị. Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala, mee ka ị bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile.
Moyo wako ulikuwa na kiburi kwa uzuri wako; umeiharibu hekima yako kwa sababu ya fahari yako. Nimekupeleka chini kwenye dunia. Nimekuweka mbele ya wafalme ili waweze kukuona.
18 Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị, i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ. Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta, repịa gị. Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala, nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya.
Kwa sababu ya wingi wa dhambi zako na biashara za udanganyifu, umepanajisi mahali pako patakatifu. Basi nimetengeneza moto kutoka ndani yako; utakula wewe. Nitakugeuza kwenye majivu juu ya dunia katika macho ya wote wakutazamao.
19 Ndị niile maara gị ka ihe ndị a juru anya, nʼihi na ị ghọọla ihe oke egwu. Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’”
Wale wote waliokujua miongoni mwa watu watakao kutetemekewa; watakuwa watu wa kutisha, na hutakuwepo tena milele.”'
20 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Kisha neno la Bwana Yahwe likanijia, kusema,
21 “Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya,
“Mwanadamu, elekeza uso wako Sidoni na toa utabiri juu yake.
22 ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn, nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m. Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị mgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu, nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ.
Sema, Bwana Yahwe asema hivi: Tazama! Niko juu yako, Sidoni! Kwa kuwa nitatukuzwa kati yako hivyo watu wako watajua kwamba mimi ni Yahwe wakati nitakapokuwa nimezitekeleza hukumu ndani yako. Nitaonyesha utakatifu ndani yako.
23 Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya, meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile. Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya, site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Nitapeleka tauni juu yako na tazama mitaa yako, na walioua wataanguka kati yako. Wakati upanga utakapokuja juu yao kutoka pande zote, kisha mtajua kwamba mimi ni Yahwe.
24 “‘Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
Kisha hakutakuwa na mtemba uchomao na maumivu ya miba kwa ajili ya nyumba ya Israeli kutoka wale wote waliomzunguka wanaowadharau watu wake, hivyo watajua kwamba mimi ni Bwana Yahwe!'
25 “‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị Izrel ga-alọghachi biri nʼala nke aka ha ọzọ, ala nke m nyere nna ha Jekọb ohu m. Nʼihi na aga m esite na mba niile ha gbasasịrị chịkọtaa ha, si otu a gosi mba niile nke ụwa ịdị nsọ m.
Bwana Yahwe asema hivi, Nitakapowakusanya nyumba ya Israeli kutoka miongni mwa watu waliokuwa wamekusanyika, na wakati nilipokuwa nimewatenga miongoni mwao, hivyo mataifa aanaweza kuona, kisha watafanya nyumba zao katika nchi nitakayo mpatia mtumishi wangu Yakobo.
26 Ha ga-ebi nʼala a na ntụkwasị obi. Ha ga-ewu ụlọ, kụọ ubi vaịnị, birikwa na-atụghị egwu ọbụla. Mgbe m pịachara mba niile dị ha gburugburu ụtarị, bụ mba ndị ahụ mekpara ha ahụ, mgbe ahụ, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.’”
Kisha wataishi salama ndani yake na kujenga nyumba, kulima mizabibu, na kuishi salama wakati nitakapo zitekeleza hukumu juu ya wote wale ambao sasa wanawadharau kutoka sehemu zote; basi watajua yakwamba mimi ni Yahwe Mungu wao!”'

< Izikiel 28 >