< Izikiel 24 >

1 O ruo nʼafọ nke itoolu, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
On the tenth day of the tenth month of the ninth year, a message from the Lord came to me, saying,
2 “Nwa nke mmadụ, detuo ụbọchị taa nʼakwụkwọ, nʼihi na ọ bụ taa ka eze Babilọn gbara Jerusalem gburugburu.
“Son of man, write down today's date, because this is the day that the king of Babylon started his siege of Jerusalem.
3 Ugbu a, tụọrọ ndị a na-enupu isi ilu a, gwa ha: ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “‘Sikwasịnụ ite ahụ nʼọkụ; sikwasị ya kunyekwanụ mmiri nʼime ya.
Then repeat the following parable to these rebellious people. Tell them that this is what the Lord God says: Get a pot and set it on the fire. Pour in some water.
4 Tinyenụ anụ a bọrọ abọ nʼime ya. Tinye anụ dị mma, apata ya na aka ya. Tinyekwa ọkpụkpụ ndị ahụ dị mma nʼime ya.
Fill it with some good cuts of meat from the thigh and the shoulder. Put in the best bones.
5 Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ, kwajuokwa nkụ nʼokpuru ya maka ọkpụkpụ ndị ahụ, mee ya ka ọ gbọọ nke ọma, sie ọkpụkpụ ndị ahụ nʼime ya.
Choose the best animal from the flock. Pile up the fuel underneath it. Get it boiling and cook the bones in it.
6 “‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya. E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya, nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya. Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu. Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a.
So this is what the Lord God says: Disaster is coming to the city of that has shed so much blood! It is symbolized by the rusted pot, whose rust can't be cleaned off. Take out the meat bit by bit as it comes—don't choose which piece.
7 “‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya. Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya. Ọ bụghị nʼelu ala efu, ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya.
For the blood she shed is still inside the city. She shed it openly on bare rock—she didn't even spill it on the ground and cover it up with dirt.
8 Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume, ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya.
In my anger and to punish, I have spilled her blood openly on bare rock, so it wouldn't be covered up.
9 “‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara. Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ.
So this is what the Lord God says: Disaster is coming to the city of that has shed so much blood. I will also pile up a large heap of firewood.
10 Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu, mụnyekwanụ ọkụ. Jirinụ ụda dị iche iche sizie anụ ahụ nke ọma; surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ.
Put on plenty of wood and light the fire. Make sure the meat is well cooked and add spices. Burn the bones.
11 Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ, tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa, gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị, nchara ya ga-agwụsịkwa.
Then put the empty pot back on the burning coals until it's hot and the copper metal glows. This will melt the dirt inside it and get rid of the rust.
12 Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ. Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya emeghị ka ọ gbazee.
So far it's been impossible to clean it —even fire couldn't burn out all its rust.
13 “‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke.
Because of your immorality you had made yourself unclean and I tried to clean you, but you refused to let me clean away your filth. So now you won't be pure again until I've finished being angry with you.
14 “‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Oge m ji emezu ihe m kwuru eruola. Agaghị m ahapụ imezu ya. Agaghị m eme ebere maọbụ weghachi aka m azụ. A ga-ekpe gị ikpe dịka omume na obibi ndụ gị si dị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’”
I, the Lord, have spoken. The time is soon coming when I will do what I say. I won't change my mind or show pity, I won't stop. I will judge you by your attitude and actions, declares the Lord God.”
15 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
A message from the Lord came to me, saying,
16 “Nwa nke mmadụ, ana m aga iwere ihe otiti napụ gị onye ahụ ihe ya na-atọ gị ụtọ. Ma mgbe o mere, ị gaghị eti aka nʼobi maọbụ kwaa akwa. Anya mmiri agakwaghị esi gị nʼanya pụta.
“Son of man, look, I'm about to take away the one you love the most. She will die. But you must not mourn or weep. Don't cry any tears.
17 I nwere ike sụọ ude, ma asụsila ya ike. Ị gaghị eru uju nʼihi onye nwụrụ anwụ. Kechie isi gị, yirikwa akpụkpọụkwụ gị, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ na-eri.”
Mourn in silence. Don't have any rituals for the dead. Dress normally—have your turban on and put your sandals on your feet. Don't veil your face and don't eat the bread used by mourners.”
18 Agwara m ndị mmadụ okwu a nʼụtụtụ, ma nʼanyasị nwunye m nwụrụ. Nʼụtụtụ echi ya, emere m ihe niile dịka e siri nye m ya nʼiwu.
I talked to the people in the morning, and my wife died in the evening. The next morning I did as I'd been told.
19 Mgbe ahụ, ndị mmadụ sịrị m, “Ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara? Gịnị mere iji eme omume dị otu a?”
The people asked me, “What are you doing? Aren't you going to explain to us what this means?”
20 Ya mere a sịrị m ha, “Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
So I told them, “A message from the Lord came to me, saying:
21 Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha.
Tell the people of Israel that this is what the Lord God says: I am about to make my sanctuary unclean, this place you're so proud of that you think gives you power, the place you love so much, the place that makes you happy. Your sons and daughters that you left behind will be killed by the sword.
22 Mgbe ahụ, unu ga-eme dịka m mere. Unu agaghị ekpuchi egbugbere ọnụ unu, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ kwesiri iri.
Then you'll do what I did. You won't veil your face or eat the bread used by mourners.
23 Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu.
You will keep your turbans on your heads and your sandals on your feet. You won't mourn or weep, but you will die inside because of your sins, and you will groan to one another.
24 Izikiel ga-abụrụ unu ihe ịmaatụ. Unu ga-emekwa dịka o mere mgbe ihe ndị a mezuru. Unu ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.’
In this way Ezekiel will be a sign for you; you will do everything that he did. When this happens, then you will know that I am the Lord God.
25 “Ma gị, nwa nke mmadụ, nʼụbọchị ahụ m napụrụ ha ebe ha siri ike, nke bụ ọṅụ ha na ebube ha, na ihe anya ha na-achọsi ike; na ihe na-atọ obi ha ụtọ, na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom,
You, son of man, should know that when I destroy their fortress that is their pride and joy, the place they looked to for comfort and happiness —and their sons and daughters too—
26 nʼụbọchị ahụ, ọ bụ onye na-agba ọsọ ndụ ga-agbakwute gị ịkọrọ gị ihe mere.
when that happens someone who managed to get away will come and give you the news.
27 Nʼoge ahụ, ị ga-asaghe ọnụ gị. Gị na onye ahụ na-agba ọsọ ndụ ga-ekwurịta okwu. Ị gaghị anọkwa juu ọzọ. Nʼihi ya, ị ga-aghọrọ ha ihe ịrịbama. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
On that day you will be able to speak; you won't be mute any longer. This is how you will be a sign to them, and they will know that I am the Lord.”

< Izikiel 24 >