< Izikiel 23 >

1 Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị m,
The word of the LORD came again to me, saying,
2 “Nwa nke mmadụ, ọ dị ndị inyom abụọ nke otu nne mụrụ.
Son of man, there were two women, the daughters of one mother:
3 Ha ghọrọ ndị akwụna nʼala Ijipt site na mgbe ha bụ agbọghọ. Nʼala ahụ, a bịagidere ara ha aka, pịakwa ọnụ ara agbọghọ ha aka nʼọnọdụ igwuri egwu.
And they committed prostitutions in Egypt; they committed prostitutions in their youth: there were their breasts pressed, and there they bruised the teats of their virginity.
4 Aha nke okenye bụ Ohola. Aha nwanne ya nwanyị bụ Oholiba. Ha bụrịị nkem, ha mụtakwara m ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyị. Ohola bụ Sameria, Oholiba bụkwa Jerusalem.
And the names of them were Aholah the elder, and Aholibah her sister: and they were mine, and they bore sons and daughters. Thus were their names; Samaria is Aholah, and Jerusalem Aholibah.
5 “Ohola na-agba akwụna mgbe ọ ka bụ nkem. O nwere agụụ ịkwa iko nʼebe ndị niile ọ hụrụ nʼanya nọ, bụ ndị dike nʼagha nke ndị Asịrịa,
And Aholah played the harlot when she was mine; and she doted on her lovers, on the Assyrians her neighbors,
6 ndị yi uwe anụnụ, ndịisi ọchịchị na ndị ọchịagha, ha niile bụ ụmụ okorobịa mara mma nʼile anya, na ndịisi agha, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya.
Which were clothed with blue, captains and rulers, all of them desirable young men, horsemen riding on horses.
7 O weere onwe ya nyefee nʼaka ndị ikom Asịrịa ogugo ha kachasị elu dịka onye akwụna, merụọkwa onwe ya site nʼife arụsị dị iche iche nke onye ọbụla agụụ ya gụrụ obi ya.
Thus she committed her prostitutions with them, with all them that were the chosen men of Assyria, and with all on whom she doted: with all their idols she defiled herself.
8 Ma ọ hapụghị mmụọ akwụna ahụ dị nʼime ya, bụ nke o bidoro nʼIjipt, nke bụ na mgbe ọ bụ agbọghọ ya na ndị ikom dinakọrọ, ha na-apịkwa ọnụ ara agbọghọ ya aka, na-awụkwasịkwa agụụ nke ọchịchọ ọjọọ ha nʼahụ ya.
Neither left she her prostitutions brought from Egypt: for in her youth they lay with her, and they bruised the breasts of her virginity, and poured their prostitution on her.
9 “Nʼihi nke a enyefere m ya nʼaka ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, bụ ndị Asịrịa, ndị agụụ ha na-agụ ya.
Why I have delivered her into the hand of her lovers, into the hand of the Assyrians, on whom she doted.
10 Ha gbara ya ọtọ, ha kpọọrọ ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, ma ya onwe ya ka ha were mma agha gbuo. Nʼụzọ dị otu a, ọ ghọrọ ihe akụkọ ilu nʼetiti ndị inyom niile, a takwara ya ahụhụ.
These discovered her nakedness: they took her sons and her daughters, and slew her with the sword: and she became famous among women; for they had executed judgment on her.
11 “Oholiba bụ nwanne ya nwanyị hụrụ ihe ndị a, ma nʼime agụụ ihe ọjọọ nke gụrụ ya nakwa ịgba akwụna, ọ kpara agwa jọrọ njọ karịa nke nwanne ya nwanyị.
And when her sister Aholibah saw this, she was more corrupt in her inordinate love than she, and in her prostitutions more than her sister in her prostitutions.
12 Ya onwe ya kwa, agụụ ụmụ Asịrịa gụrụ ya, bụ ndịisi ọchịchị, na ndị ọchịagha, ndị dike nʼagha yi uwe agha dịka o kwesiri, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya, ha niile bụ ụmụ okorobịa dị mma nʼile anya.
She doted on the Assyrians her neighbors, captains and rulers clothed most gorgeously, horsemen riding on horses, all of them desirable young men.
13 Ahụrụ m na ya onwe ya merụkwara onwe ya; ha abụọ si otu ụzọ aga.
Then I saw that she was defiled, that they took both one way,
14 “O gara nʼihu tụkwasị ihe nʼịgba akwụna ya karịa. Ọ hụrụ onyinyo ndị ikom atụnyere nʼahụ aja, bụ onyinyo nke ndị Kaldịa e ji ihe chara uhie uhie sepụta,
And that she increased her prostitutions: for when she saw men portrayed on the wall, the images of the Chaldeans portrayed with vermilion,
15 ha kere ihe okike nʼukwu ha nakwa akwa okike nʼisi ha; nʼile anya ha niile dịka ndịisi ụgbọ agha ndị Babilọn, Kaldịa bụ ala amụrụ ha.
Girded with girdles on their loins, exceeding in dyed attire on their heads, all of them princes to look to, after the manner of the Babylonians of Chaldea, the land of their nativity:
16 Ngwangwa ọ na-ele ha anya, agụ ha gụrụ ya, o zipụrụ ha ndị ozi na Kaldịa.
And as soon as she saw them with her eyes, she doted on them, and sent messengers to them into Chaldea.
17 Mgbe ahụ ndị Babilọn bịakwutere ya, nʼelu ihe ndina ịhụnanya, nʼime agụụ nke anụ ahụ ha, ha merụrụ ya. Mgbe ha mesịrị ka ọ bụrụ ihe rụrụ arụ site nʼịkwa iko, o si nʼebe ha nọ wezuga onwe ya nʼọnọdụ ịsọ ha oyi.
And the Babylonians came to her into the bed of love, and they defiled her with their prostitution, and she was polluted with them, and her mind was alienated from them.
18 Mgbe ọ gara nʼihu na-akwa iko nʼezoghị ezo na-ekpughekwa ọtọ ya, elepụrụ m ya anya nʼihi ịsọ oyi, dịka m mere lepụkwara anya site nʼebe nwanne ya nwanyị nọ.
So she discovered her prostitutions, and discovered her nakedness: then my mind was alienated from her, like as my mind was alienated from her sister.
19 Ma ọ gara nʼihu na-akwa iko karịa, dịka ọ na-echeta ndụ akwụna o biri nʼIjipt mgbe ọ bụ agbọghọ.
Yet she multiplied her prostitutions, in calling to remembrance the days of her youth, wherein she had played the harlot in the land of Egypt.
20 Nʼebe ahụ, agụụ ndị ikom ya na ha na-akwa iko gụrụ ya, bụ ndị anụahụ ha dịka nke ịnyịnya ibu, ndị ihe ha na-anyụpụta dịkwa ka nke ịnyịnya.
For she doted on their paramours, whose flesh is as the flesh of asses, and whose issue is like the issue of horses.
21 Ya bụ, na-agụụ ndụ ọjọọ nke i biri mgbe ị bụ agbọghọ na-agụsị gị ike, mgbe ị nọ nʼIjipt ebe a na-abịagide gị aka nʼara, ebe apịkwara ọnụ ara nta gị aka.
Thus you called to remembrance the lewdness of your youth, in bruising your teats by the Egyptians for the breasts of your youth.
22 “Nʼihi nke a, gị Oholiba, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m akpali ndị ahụ hụrụ gị nʼanya megide gị, bụ ndị ahụ ihe ha na-amasịkwaghị gị ọzọ. Aga m esi nʼakụkụ niile kpọta ha, megide gị.
Therefore, O Aholibah, thus says the Lord GOD; Behold, I will raise up your lovers against you, from whom your mind is alienated, and I will bring them against you on every side;
23 Ndị Babilọn, ndị Kaldịa niile, ndị ikom Pekod, ndị Shoa, na ndị Koa, na ndị Asịrịa niile ha na ha soo. Ụmụ okorobịa niile dị mma ile anya, ha niile bụ ndị na-achị achị na ndị ọchịagha, ndịisi na-agba ịnyịnya, na ndị ikom ọkwa ha dị elu, ha niile ga-anọkwasị nʼelu ịnyịnya.
The Babylonians, and all the Chaldeans, Pekod, and Shoa, and Koa, and all the Assyrians with them: all of them desirable young men, captains and rulers, great lords and renowned, all of them riding on horses.
24 Ha ga-eji ngwa agha dị iche iche, ụgbọala nke agha na ọtụtụ igwe ndị mmadụ dị iche iche; ha ji ọta ukwu na ọta nta, kpurukwa okpu agha igwe, were ọnọdụ gburugburu gị nʼakụkụ ọbụla, imegide gị. Aga m enyefe gị nʼaka ha, ka ha taa gị ahụhụ, ha ga-atakwa gị ahụhụ dịka usoro ikpe ha si dị.
And they shall come against you with chariots, wagons, and wheels, and with an assembly of people, which shall set against you buckler and shield and helmet round about: and I will set judgment before them, and they shall judge you according to their judgments.
25 Aga m edo ekworo nke iwe m megide gị, ha ga-eji iwe na ọnụma mesie gị ike. Ha ga-ebipụ imi unu na ntị unu, ndị fọdụkwara nʼime unu ga-anwụ site na mma agha. Ha ga-achịkọrọ ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom pụọ, unu ndị nke fọdụrụ ka ọkụ ga-erepịa.
And I will set my jealousy against you, and they shall deal furiously with you: they shall take away your nose and your ears; and your remnant shall fall by the sword: they shall take your sons and your daughters; and your residue shall be devoured by the fire.
26 Ha ga-eyipụ gị uwe ọma gị niile, chikọrọ ihe ịchọ mma gị niile.
They shall also strip you out of your clothes, and take away your fair jewels.
27 Nʼụzọ dị otu a, a ga-eme ka agụ ọchịchọ ọjọọ nke anụahụ na ịkwa iko, bụ nke i bidoro nʼala Ijipt kwụsị. Ị gaghị enwekwa agụụ ile ihe ndị a niile anya maọbụ chetakwa Ijipt nʼuche gị.
Thus will I make your lewdness to cease from you, and your prostitution brought from the land of Egypt: so that you shall not lift up your eyes to them, nor remember Egypt any more.
28 “Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m aga iwere gị nyefee nʼaka ndị ahụ kpọrọ gị asị, bụ ndị ahụ ị wezugara onwe gị site nʼebe ha nọ nʼihi ịsọ oyi.
For thus says the Lord GOD; Behold, I will deliver you into the hand of them whom you hate, into the hand of them from whom your mind is alienated:
29 Ha ga-esite nʼịkpọ asị mesie gị ike, pụnara gị ihe niile i nwere nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ha. Ha ga-ahapụ gị ka ịgbara ọtọ ihu na azụ, mgbe ahụ ihere nke ịgba akwụna gị ga-apụta ihe. Agụụ nke ọchịchọ ọjọọ na ịkwa iko gị
And they shall deal with you hatefully, and shall take away all your labor, and shall leave you naked and bore: and the nakedness of your prostitutions shall be discovered, both your lewdness and your prostitutions.
30 emeela ka ihe ndị a bịakwasị gị, nʼihi na agụụ mmekọrịta nʼebe mba ndị ọzọ gụrụ gị, ị jikwa arụsị ha merụọ onwe gị.
I will do these things to you, because you have gone a whoring after the heathen, and because you are polluted with their idols.
31 Ị gbasoro nzọ ụkwụ nwanne gị nwanyị, nʼihi ya, aga m ewere iko ya tinye gị nʼaka.
You have walked in the way of your sister; therefore will I give her cup into your hand.
32 “Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “Iko nwanne gị nwanyị ka ị ga-aṅụ bụ iko sara mbara ma dịkwa omimi; nke ga-eme ka ị ghọọ onye a na-achị ọchị na onye a na-akwa emo, nʼihi na ọ na-anagide ihe dị ukwuu.
Thus says the Lord GOD; You shall drink of your sister’s cup deep and large: you shall be laughed to scorn and had in derision; it contains much.
33 Ị ga-ejupụta nʼịṅụbiga mmanya oke na iru ụjụ, nʼihi iko mbibi na ntikpọsi, bụ iko nke nwanne gị nwanyị bụ Sameria.
You shall be filled with drunkenness and sorrow, with the cup of astonishment and desolation, with the cup of your sister Samaria.
34 Ị ga-aṅụ ya, ṅụchaa ihe dị nʼiko ahụ. Ị ga-atapịakwa iberibe ya niile, dọkasịakwa ara gị abụọ. Ekwuola m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
You shall even drink it and suck it out, and you shall break the shards thereof, and pluck off your own breasts: for I have spoken it, says the Lord GOD.
35 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na i chefuola m, gbakụta m azụ gị, ị ga-ata ahụhụ niile ruuru gị nʼihi mmehie, agụụ ọchịchọ ọjọọ na ịgba akwụna gị.”
Therefore thus says the Lord GOD; Because you have forgotten me, and cast me behind your back, therefore bear you also your lewdness and your prostitutions.
36 Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe Ohola na Oholiba ikpe? Mgbe ahụ, guzogide ha mee ka ha mara ihe arụ niile ha na-eme.
The LORD said moreover to me; Son of man, will you judge Aholah and Aholibah? yes, declare to them their abominations;
37 Nʼihi na ha akwaala iko, ọbara jupụtakwara nʼaka ha, ha na arụsị ha kwakwara iko. Ha jikwa ọ bụladị ụmụ nke ha mụtaara m chụọ aja nsure ọkụ nye ha.
That they have committed adultery, and blood is in their hands, and with their idols have they committed adultery, and have also caused their sons, whom they bore to me, to pass for them through the fire, to devour them.
38 Ihe ọzọ ha mere m bụ nke a: Ha merụrụ ebe nsọ m nʼotu ụbọchị ahụ ha mere ka ụbọchị izuike m gharakwa ịdị nsọ.
Moreover this they have done to me: they have defiled my sanctuary in the same day, and have profaned my sabbaths.
39 Nʼihi na nʼotu ụbọchị ahụ ha ji ụmụ ha chụọ aja nye arụsị ha, bụkwa ụbọchị ha batara nʼụlọnsọ m merụọ ya. Ihe dị otu a ka ha mere nʼụlọnsọ m.
For when they had slain their children to their idols, then they came the same day into my sanctuary to profane it; and, see, thus have they done in the middle of my house.
40 “Ọ bụghị naanị nke a, ha zigara ndị ozi ịkpọ ndị ikom na-esi ebe dị anya bịa, mgbe ha bịara, nʼihi ha, ị sachara ahụ gị nke ọma, tee ihe nʼanya gị, yirikwa ezigbo ihe ịchọ mma gị.
And furthermore, that you have sent for men to come from far, to whom a messenger was sent; and, see, they came: for whom you did wash yourself, painted your eyes, and decked yourself with ornaments,
41 Ị nọdụrụ nʼelu ihe ndina e doziri nke ọma, na tebul e doro nʼusoro dịkwa nʼihu ya nke ị dọbara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na mmanụ oliv bụ nke m nʼelu ya.
And sat on a stately bed, and a table prepared before it, whereupon you have set my incense and my oil.
42 “Olu igwe mmadụ ndị obi dị ụtọ na-ada gburugburu ya nʼime ụlọ, e sitekwara nʼọzara bubata ndị ṅụbigara mmanya oke, ha na ọtụtụ ndị ọzọ, Ha gbanyekwara nwanyị a na nwanne ya nwanyị mgbaaka na nkwoji aka ha, yinyekwa ha okpueze mara mma nʼisi.
And a voice of a multitude being at ease was with her: and with the men of the common sort were brought Sabeans from the wilderness, which put bracelets on their hands, and beautiful crowns on their heads.
43 Mgbe ahụ, ihe m kwuru banyere nwanyị ahụ ịkwa iko riri ahụ bụ nke a, ‘Ugbu a, ka ha mesoo ya mmeso dịka onye na-agba akwụna, nʼihi na nke ahụ ka ọ bụ.’
Then said I to her that was old in adulteries, Will they now commit prostitutions with her, and she with them?
44 Ha bara dinakwuru ya. Dịka ndị ikom si abakwuru nwanyị akwụna, otu a ka ha si bakwuru ụmụ nwanyị ndụ ọjọọ a bụ Ohola na Oholiba.
Yet they went in to her, as they go in to a woman that plays the harlot: so went they in to Aholah and to Aholibah, the lewd women.
45 Ma ndị ikpe ezi omume ga-ama ha ụdị ikpe a na-ama ndị inyom na-akwa iko na ndị na-awụsikwa ọbara. Nʼihi na ha bụ ndị na-akwa iko, na ndị ọbara dị nʼaka ha.
And the righteous men, they shall judge them after the manner of adulteresses, and after the manner of women that shed blood; because they are adulteresses, and blood is in their hands.
46 “Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m akpọkọta igwe ndị mmadụ ga-emegide ha, nyefee ha nʼaka oke ihe egwu, nakwa ihe nlụta nʼagha.
For thus says the Lord GOD; I will bring up a company on them, and will give them to be removed and spoiled.
47 Mkpọkọta mmadụ ahụ ga-atụ ha nkume, werekwa mma agha gbudasịa ha. Ha ga-egbu ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, kpọkwaa ụlọ ha niile ọkụ.
And the company shall stone them with stones, and dispatch them with their swords; they shall slay their sons and their daughters, and burn up their houses with fire.
48 “Otu a, aga m eme ka ibi ndụ ọjọọ kwụsị nʼala ahụ, ka esi otu a adọ ndị inyom niile aka na ntị, ka ha hapụ ịgbaso nzọ ụkwụ gị.
Thus will I cause lewdness to cease out of the land, that all women may be taught not to do after your lewdness.
49 Ị ghaghị ịta ahụhụ nʼihi ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị, hụkwaa ahụhụ nʼihi mmehie niile nke ịkpọ isiala nye arụsị. Mgbe ahụ ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.”
And they shall recompense your lewdness on you, and you shall bear the sins of your idols: and you shall know that I am the Lord GOD.

< Izikiel 23 >