< Izikiel 21 >

1 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Puis la parole de l'Éternel me fut adressée en ces mots:
2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ Jerusalem, buo amụma megide ụlọnsọ ukwu ahụ. Bukwaa amụma megide ala Izrel
Fils de l'homme, tourne ta face vers Jérusalem; prêche vers les saints lieux, prophétise contre le pays d'Israël.
3 sị ala Izrel otu a, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Mụ onwe m na-emegide gị. Aga m esite nʼọbọ mịpụta mma agha m, site na gị gbuchapụ ma onye ezi omume na onye ajọ omume.
Dis au pays d'Israël: Ainsi a dit l'Éternel: Voici, c'est à toi que j'en veux; je tirerai mon épée de son fourreau, et j'exterminerai du milieu de toi le juste et le méchant.
4 Nʼihi na m na-aga igbuchapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume, mma agha m ga-esite nʼọbọ ya pụta megide onye ọbụla site nʼugwu ruo na ndịda.
Et parce que je vais exterminer du milieu de toi le juste et le méchant, mon épée sortira de son fourreau pour frapper toute chair du midi au septentrion,
5 Mgbe ahụ, mmadụ niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị amịpụtala mma agha m site nʼọbọ ya, ọ gaghị amịghachi baa nʼọbọ ọzọ.’
Et toute chair saura que moi, l'Éternel, j'ai tiré l'épée de son fourreau; elle n'y rentrera plus.
6 “Nʼihi ya, sụọ ude, nwa nke mmadụ, sụọ ude nʼihu ha nʼọnọdụ oke mwute na obi mgbawa.
Et toi, fils de l'homme, gémis, les reins brisés; dans une amère douleur tu dois gémir.
7 Mgbe ha jụrụ gị, ‘Gịnị kpatara i ji asụ ude?’ Ị ga-asị, ‘Nʼihi ozi nke na-abịa. Obi niile ga-agbaze site nʼegwu, aka niile ga-akụdakwa; mmụọ niile ga-ada mba, ikpere niile ga-ede mmiri site nʼamịrị.’ Ọ na-abịa, ọ ghaghị imezu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
Quand ils te diront: Pourquoi gémis-tu? tu répondras: C'est à cause de la rumeur! Quand elle arrivera, tous les cœurs fondront, toutes les mains défailliront, tout esprit sera abattu, et tous les genoux se fondront en eau. Voici, elle arrive! Elle est là! dit le Seigneur, l'Éternel.
8 Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
La parole de l'Éternel me fut encore adressée en ces termes:
9 “Nwa nke mmadụ buo amụma sị, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “‘Lee, mma agha, lee, mma agha, a mụọla ya, hichakwaa ya.
Fils de l'homme, prophétise, et dis: Ainsi a dit l'Éternel: Dis: L'épée, l'épée! Elle est aiguisée, elle est fourbie!
10 Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị, hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma. “‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya.
Elle est aiguisée pour le massacre; elle est fourbie pour lancer des éclairs! Faut-il se réjouir, sceptre de mon fils, qui dédaignes tout pouvoir?
11 “‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ, ka e jidekwa ya nʼaka. A mụọla ya, hichazie ya. E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi.
On l'a donnée à fourbir pour qu'on la prenne en main; elle est aiguisée, cette épée, elle est fourbie pour armer la main de l'égorgeur.
12 Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike, nʼihi na ọ bụ megide ndị m ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile. A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha, ha na ndị m. Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.
Crie et lamente-toi, fils de l'homme, car elle est tirée contre mon peuple, contre tous les principaux d'Israël, qui seront livrés à l'épée avec mon peuple. Frappe donc sur ta cuisse.
13 “‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’
Oui, l'épreuve sera faite. Eh quoi! lors même que ce sceptre est si dédaigneux, il sera anéanti! dit le Seigneur, l'Éternel.
14 “Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ. Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ, ka mma agha gbuo ugboro abụọ e, ọ bụladị ugboro atọ. Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu, nke e debere maka oke ogbugbu nke ga-abịachibido ha gburugburu.
Toi donc, fils de l'homme, prophétise, frappe des deux mains, et que l'épée double et triple ses coups; c'est l'épée du carnage, la grande épée du carnage, qui va les presser de toute part.
15 Ka obi ha gbazee site nʼegwu, ka ndị na-ada ada hie nne, nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niile maka oke ogbugbu. Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma, etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu.
C'est pour fondre les cœurs, pour multiplier les monceaux à toutes leurs portes, que j'ai pris l'épée menaçante. Ah! elle est faite pour lancer l'éclair; elle est aiguisée pour égorger!
16 Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla, ma ọ nọ gị nʼaka nri ma ọ nọ gị nʼaka ekpe.
Rassemble tes forces, frappe à droite! Tourne-toi, frappe à gauche, de quel côté que tu tournes ton tranchant!
17 Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m, ime ka iwe m jụrụ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”
Et moi aussi, je frapperai des deux mains, et j'assouvirai ma fureur. Moi, l'Éternel, j'ai parlé.
18 Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Puis la parole de l'Éternel me fut adressée en ces termes:
19 “Nwa nke mmadụ mee ụzọ abụọ nke mma agha eze Babilọn ga-eso. Ka ụzọ abụọ ndị a malite nʼotu obodo. Dee ihe ngosi manye ha nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ.
Toi, fils de l'homme, trace-toi deux chemins pour le passage de l'épée du roi de Babylone; qu'ils partent tous deux d'un même pays; fais une marque, fais-la à l'entrée du chemin qui conduit à une ville.
20 Mee ka otu nʼime ụzọ ndị ahụ bụrụ ebe mma agha ga-esi bịa megide Raba nke Amọn, ka nke ọzọ megide Juda na Jerusalem, bụ ebe e wusiri ike.
Trace l'un des chemins par où l'épée arrive à Rabbath, ville des enfants d'Ammon, et l'autre par où elle arrive en Juda, à Jérusalem, la ville forte.
21 Nʼihi na eze Babilọn ga-abịa guzo nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ, nʼisi ụzọ abụọ ahụ ịchọ ihe ama. Ọ ga-esite nʼịgba àkụ nke ife nza, jụọ ase site nʼaka arụsị ya niile, nyochakwaa umeju ahụ.
Car le roi de Babylone se tient à la bifurcation, à l'entrée des deux chemins pour tirer des présages; il secoue les flèches, il interroge les idoles, il examine le foie.
22 Nʼụzọ dị nʼaka nri, ka ihe ịjụ ase banyere Jerusalem ga-esi bịa. Nʼebe ahụ ka ọ ga-ewu ihe niile ha ji etida mgbidi obodo ahụ. Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ nye iwu maka igbuchapụ ndị niile, na iwu ido ihe e ji etipu mgbidi nʼọnụ ụzọ ama niile, na iwu a ga-eji wuo nkwasa agha na mgbidi e ji ebuso ya agha.
Le sort qui est dans sa main droite désigne Jérusalem, pour y dresser des béliers, commander le carnage, pousser des cris de guerre, pour ranger les béliers contre les portes, élever des terrasses et construire des forts.
23 Ọ ga-adị ha dịka ọjụjụ ase nke na-abaghị uru, nye ndị ahụ ṅụrụ ha iyi, ma ọ ga-echetara ha ihe ọjọọ ha mere, dọkpụrụ ha nʼike.
C'est à leurs yeux un présage trompeur, eux qui ont fait serments sur serments; mais lui, il se souvient de leur iniquité, en sorte qu'ils seront pris.
24 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. ‘Ebe ọ bụ na unu esitela na nnupu isi unu mee ka e cheta ajọ omume unu, si otu a na-ekpughe mmehie unu nʼihe niile unu na-eme. Ebe ọ bụ na unu emeela ihe dị otu a, a ghaghị ịdọta unu nʼagha.
C'est pourquoi, ainsi a dit le Seigneur, l'Éternel: Parce que vous rappelez le souvenir de votre iniquité, en mettant à nu vos transgressions, en montrant vos péchés dans toutes vos actions; parce que vous en rappelez le souvenir, vous serez saisis par la main de l'ennemi.
25 “‘Gị onye rụrụ arụ, onye na-emebi iwu, gị nwa eze nʼIzrel, gị onye ụbọchị ahụhụ ya rurula,
Et toi, profane, méchant, prince d'Israël, dont le jour arrive, au temps où l'iniquité a son terme,
26 ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu.
Ainsi a dit le Seigneur, l'Éternel: Ote cette tiare; enlève cette couronne; les choses vont changer. Ce qui est élevé sera abaissé, et ce qui est abaissé sera élevé.
27 Mbibi, mbibi. Aga m eme ka ọ ghọọ ihe e bibiri ebibi. A gaghị eweghachikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe onye ahụ o ruuru nʼizi ezi bịara. Ya ka m ga-enyefe ya nʼaka.’
En pièces, en pièces, en pièces je la réduirai! Et elle ne sera plus, jusqu'à ce que vienne celui à qui appartient le jugement, et auquel je le remettrai.
28 “Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha: “‘Lee mma agha, lee mma agha, nke a mịpụtara maka oke ogbugbu. E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa, ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe.
Et toi, fils de l'homme, prophétise, et dis: Ainsi a dit le Seigneur, l'Éternel, au sujet des enfants d'Ammon et de leur opprobre. Dis: L'épée, l'épée est dégainée pour le massacre; elle est polie pour dévorer en lançant l'éclair!
29 Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu, na a jụtakwala ase ụgha banyere unu, a ga-etinye ya nʼolu ndị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu, bụ ndị ụbọchị ha rurula, ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara.
Au milieu de tes visions trompeuses et de tes présages menteurs, elle te jettera sur les cadavres des méchants, dont le jour arrive au temps où leur iniquité est à son terme.
30 “‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya. Nʼebe ahụ e kere unu nʼala nna nna unu ha, Aga m ekpe unu ikpe.
Remets ton épée dans le fourreau! C'est dans le lieu où tu as été formée, dans le pays de ta naissance que je te jugerai.
31 Aga m awụkwasị unu ọnụma m, kukwasịkwa unu ikuku nke oke iwe m. Aga m ewere unu nyefee nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị bụ ọka na ịla mmadụ nʼiyi.
Et je répandrai sur toi mon indignation; du feu de mon courroux je soufflerai sur toi, et je te livrerai entre les mains d'hommes barbares, artisans de destruction.
32 Unu ga-aghọkwa mmanụ a na-awụnye nʼọkụ. A ga-awụsịkwa ọbara unu nʼala unu. Ọ dịkwaghị onye ga-echeta unu ọzọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.’”
Tu deviendras la proie du feu; ton sang coulera au sein du pays, et on ne se souviendra plus de toi; car moi, l'Éternel, j'ai parlé.

< Izikiel 21 >