< Izikiel 20 >

1 O ruo, nʼọgwụgwụ ọnwa ise, nʼafọ nke asaa, ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel bịara ịjụta Onyenwe anyị ase. Ha nọdụrụ ala nʼihu m.
Kwasekusithi ngomnyaka wesikhombisa, ngenyanga yesihlanu, ngolwetshumi lwenyanga, abathile babadala bakoIsrayeli beza ukuzabuza iNkosi, bahlala phambi kwami.
2 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Ilizwi leNkosi laselifika kimi lisithi:
3 “Nwa nke mmadụ, gwa ndị okenye Izrel okwu sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ajụ, Ọ bụ ịjụpụta ase nʼaka m ka unu bịara? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase ọbụla, ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’
Ndodana yomuntu, khuluma kubadala bakoIsrayeli, uthi kubo: Itsho njalo iNkosi uJehova: Lize ukuzangibuza yini? Kuphila kwami, isibili kangiyikubuzwa yini, itsho iNkosi uJehova.
4 “Ị ga-ekpe ha ikpe? Ị ga-ekpe ha ikpe, nwa nke mmadụ? Mee ka ha mara banyere ihe arụ niile nna nna ha mere.
Uzabahlulela yini, uzabahlulela yini, ndodana yomuntu? Bazise izinengiso zaboyise;
5 Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼụbọchị m họpụtara Izrel, eweliri m aka m ṅụọrọ ya na ụmụ ya bụ ụlọ Jekọb iyi ma kpugheekwa onwe m gosi ha nʼala Ijipt. Site nʼiweli aka m, agwara m ha okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.”
uthi kubo: Itsho njalo iNkosi uJehova: Ngosuku engakhetha ngalo uIsrayeli, ngaphakamisa isandla sami kunzalo yendlu kaJakobe, ngazazisa kubo elizweni leGibhithe, lapho ngiphakamisa isandla sami kibo, ngisithi: NgiyiNkosi uNkulunkulu wenu.
6 Nʼụbọchị ahụ, aṅụụrụ m ha iyi na m ga-esi nʼala Ijipt dupụta ha baa nʼala nke m chọpụtara ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, bụ ala nke kachasị ibe ya mma.
Ngalolusuku ngaphakamisa isandla sami kubo, ukuthi ngibakhuphe elizweni leGibhithe ngibase elizweni engangibahlolele lona, eligeleza uchago loluju, eliludumo lwawo wonke amazwe.
7 Mgbe ahụ, agwara m ha, “Onye ọbụla nʼime unu, wezuganụ oyiyi ihe arụ niile ndị ahụ bụ nke unu legidere anya, unu ejikwala arụsị niile nke Ijipt merụọ onwe unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.”
Ngasengisithi kubo: Lahlani ngulowo lalowo izinengiso zamehlo akhe, lingazingcolisi ngezithombe zeGibhithe: NgiyiNkosi uNkulunkulu wenu.
8 “‘Ma ha nupuru isi megide m. Ha aṅaghị m ntị. Ha ewezugakwaghị oyiyi ihe arụ ndị a, bụ nke ha lekwasịrị anya, maọbụ hapụkwanụ arụsị niile nke ndị Ijipt. Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha oke iwe m, meekwa ka iwe m zuo oke nʼahụ ha nʼIjipt.
Kodwa bangivukela, bengavumi ukulalela kimi, kabalahlanga ngulowo lalowo izinengiso zamehlo abo, kabatshiyanga izithombe zeGibhithe. Ngasengisithi ngizathululela ukuthukuthela kwami phezu kwabo, ukuze ngiphelelise ulaka lwami ngimelene labo phakathi kwelizwe leGibhithe.
9 Ma nʼihi aha m, e si m Ijipt kpọpụta ha. E mere m nke a ka a ghara imerụ aha m bụ nke dị nsọ, nʼanya ndị mba dị iche iche nʼetiti ndị ha binyere, bụ ndị mkpughere onwe m nye Izrel nʼihu ha.
Kodwa ngakwenza ngenxa yebizo lami, ukuze lingangcoliswa emehlweni ezizwe, ababephakathi kwazo, engazazisa kubo phambi kwamehlo azo, ukubakhupha elizweni leGibhithe.
10 Nʼihi ya, esitere m nʼIjipt dupụta ha, dubata ha nʼọzara.
Ngakho ngabakhupha elizweni leGibhithe, ngabangenisa enkangala.
11 Nʼebe ahụ ka m nọ nye ha iwu m niile, gosikwa ha ụkpụrụ m, gwa ha na onye ọbụla debere ha ga-adị ndụ.
Ngabanika izimiso zami, ngabazisa izahlulelo zami, okuthi nxa umuntu ezenza, uzaphila ngazo.
12 Ọzọ, e nyekwara m ha ụbọchị izuike, ka ọ bụrụ ihe ịrịbama dị nʼetiti mụ na ha, ka ha maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-edo ha nsọ.
Ngabanika futhi amasabatha ami ukuze abe yisibonakaliso phakathi kwami labo, ukuze bazi ukuthi ngiyiNkosi ebangcwelisayo.
13 “‘Ma ụlọ nke Izrel nupuru isi megide m. Nʼime ọzara ahụ, ha jụrụ idebe iwu m. Ha agbasoghị usoro m, ọ bụ ezie na ịgbaso ya pụtara ịdị ndụ. Ha edebeghị ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi ya, ekpebikwara m na m ga-awụkwasị ha iwe ọkụ m, ka m kpochapụ ha nʼime ọzara.
Kodwa indlu kaIsrayeli yangivukela enkangala; kabahambanga ngezimiso zami, badelela izahlulelo zami, okuthi nxa umuntu ezenza, uzaphila ngazo; lamasabatha ami bawangcolisa kakhulu. Ngasengisithi ngizathululela ukuthukuthela kwami phezu kwabo enkangala, ukuze ngibaqede.
14 Ma nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha.
Kodwa ngakwenza ngenxa yebizo lami, ukuze lingangcoliswa emehlweni ezizwe, engabakhupha emehlweni azo.
15 Ma nʼime ọzara ahụ, eweliri m aka ṅụọrọ ha iyi na m agaghị eduba ha nʼala ahụ m nyere ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ala ahụ kachasị ala niile ọzọ dị nʼụwa mma.
Futhi lami ngabaphakamisela isandla sami enkangala, ukuthi kangiyikubaletha elizweni engangilinike bona, eligeleza uchago loluju, eliludumo lwawo wonke amazwe;
16 Nʼihi na ha jụrụ iwu m, ha jụkwara ịgbaso ụkpụrụ m niile. Ha merụrụ ụbọchị izuike m, nʼihi na obi ha niile dị nʼebe arụsị ha dị.
ngoba badelela izahlulelo zami, kabahambanga ngezimiso zami, kodwa bangcolisa amasabatha ami, ngoba inhliziyo yabo yalandela izithombe zabo.
17 Ma eji m obi ebere lee ha anya ma ghara ịla ha nʼiyi. Ekpochapụghị m ha nʼọzara.
Lanxa kunjalo ilihlo lami labahawukela ukuze ngingababhubhisi, futhi kangibaqedanga enkangala.
18 Mgbe ahụ, agwara m ụmụ ha okwu nʼọzara, “Unu agbasola nzọ ụkwụ nna unu ha maọbụ debe iwu ha maọbụ jiri arụsị ha merụọ onwe unu.
Kodwa ngathi kubantwana babo enkangala: Lingahambi ngezimiso zaboyihlo, lingagcini izahlulelo zabo, lingazingcolisi ngezithombe zabo.
19 Mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke gị. Gbasoonụ iwu m niile, lezie anya ka ị sorokwa ụzọ m niile.
NgiyiNkosi uNkulunkulu wenu; hambani ngezimiso zami, ligcine izahlulelo zami, lizenze.
20 Doonụ ụbọchị izuike m nsọ, ka ha ghọọkwa ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke unu.”
Lingcwelise amasabatha ami, abe yisibonakaliso phakathi kwami lani, ukuze lazi ukuthi ngiyiNkosi uNkulunkulu wenu.
21 “‘Ma ụmụ ahụ nupuru isi megide m. Ha ejegharịghị nʼụkpụrụ m, ha elezighị anya ka ha debe iwu nke m kwuru banyere ha, “Na onye ọbụla na-erubere ha isi ga-adị ndụ site na ha,” ha merụrụ ụbọchị izuike m. Nʼihi ya, asịrị m, Aga m awụkwasị ha ọnụma m, mezuokwa iwe m megide ha nʼọzara.
Kodwa abantwana bangivukela; kabahambanga ngezimiso zami, kabagcinanga izahlulelo zami ukuthi bazenze; okuthi nxa umuntu ezenza, uzaphila ngazo; bawangcolisa amasabatha ami; ngasengisithi ngizathululela intukuthelo yami phezu kwabo, ukuthi ngiphelelise ulaka lwami ngimelene labo enkangala.
22 Ọzọkwa, eseghachiri m aka m, nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha
Kodwa ngabuyisa isandla sami, ngenza ngenxa yebizo lami, ukuze lingangcoliswa phambi kwamehlo ezizwe, engangibakhuphe phambi kwamehlo azo.
23 E jikwa m iweli aka elu ṅụọrọ ha iyi nʼime ọzara, na m ga-achụsasị ha nʼetiti mba niile, mee ka ha gbasaa nʼakụkụ niile nke ụwa,
Mina ngabaphakamisela isandla sami futhi enkangala, ukuthi ngizabahlakaza phakathi kwezizwe, ngibasabalalisele emazweni;
24 nʼihi na ha edebeghị iwu m, kama ha jụrụ ụkpụrụ niile, lelịa ma merụọkwa ụbọchị izuike m. Naanị ihe na-agụ ha bụ arụsị niile nke nna ha.
ngoba bengazenzanga izahlulelo zami, kodwa badelela izimiso zami, bangcolisa amasabatha ami, lamehlo abo alandela izithombe zaboyise.
25 Ahapụrụ m ha ka ha nabatara onwe ha iwu na omenaala dị iche iche nke na-abaghị uru. Nʼihi na site nʼidebe omenaala ndị a, ha apụghị inweta ndụ.
Ngakho mina ngabanika futhi izimiso ezazingalunganga, lezahlulelo ababengeke baphile ngazo.
26 E merụrụ ha site nʼonyinye ha, bụ, iji nwa mbụ ọbụla chụọ aja, ka m si otu a menye ha egwu ka ha mara na mụ onwe m bụ Onyenwe.’
Ngasengibangcolisa kuzo izipho zabo, ekudabuliseni kwaboemlilweni konke okuvula isizalo, ukuze ngibachithe, ukuze bazi ukuthi ngiyiNkosi.
27 “Ya mere, nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel okwu, sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Nna unu ha kwuluru m na nke a, site na-ekwesighị ntụkwasị obi nye m.
Ngakho, ndodana yomuntu, khuluma kuyo indlu yakoIsrayeli, uthi kubo: Itsho njalo iNkosi uJehova: Lakulokhu oyihlo bangihlambazile, ngokuthi baphambeke isiphambeko bemelene lami.
28 Mgbe m dubatara ha nʼala ahụ nke m ṅụrụ nʼiyi inye ha, ha hụrụ ugwu dị elu maọbụ osisi nwere ọtụtụ akwụkwọ, ebe ahụ ha chụrụ aja ha, nyekwa onyinye ha, si otu a kpasuo m iwe. Ha doro ha ihe ndị ahụ niile na-esi isi ụtọ, wụsakwara ha aja ihe ọṅụṅụ
Lapho sengibalethe elizweni, engaphakamisela isandla sami ngalo ukuthi ngibanike lona, babona lonke uqaqa oluphakemeyo, lazo zonke izihlahla eziqatha, bahlaba khona imihlatshelo yabo, banikela khona isicunulo somnikelo wabo, bafaka khona iphunga labo elimnandi, bathulula khona iminikelo yabo yokunathwayo.
29 Ya mere a jụrụ m ha, Gịnị ka a na-akpọ ebe ịchụ aja a unu na-aga?’” (A na-akpọ ya Baama ruo taa.)
Ngasengisithi kubo: Iyini indawo ephakemeyo eliya kuyo? Lebizo layo lithiwa yiNdawo ePhakemeyo kuze kube lamuhla.
30 “Nʼihi nke a, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Unu ọ ga-emerụ onwe unu dịka nna nna unu ha mere site nʼịchụso oyiyi ihe arụ ha dị iche iche?
Ngakho tshono kuyo indlu kaIsrayeli: Itsho njalo iNkosi uJehova: Lizazingcolisa ngendlela yaboyihlo yini, liphinge lilandela izinengiso zabo?
31 Mgbe unu na-enye onyinye unu, na-eme ka ụmụ unu site nʼọkụ gafee, unu na-aga nʼihu jiri arụsị unu niile na-emerụ onwe unu ruo taa. Mụ onwe m, m ga-ekwe ka unu jụta m ase, O ụlọ Izrel? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase.
Ngoba lapho linikela izipho zenu, lapho lisenza amadodana enu adabule emlilweni, liyazingcolisa ngezithombe zenu zonke kuze kube lamuhla. Mina-ke ngizabuzwa yini na, wena ndlu kaIsrayeli? Kuphila kwami, itsho iNkosi uJehova, isibili kangiyikubuzwa yini.
32 “‘Unu na-ekwu nʼobi unu sị, “Anyị chọrọ ịdị ka mba ndị ọzọ, dịka agbụrụ ndị ọzọ nọ nʼụwa, ndị na-akpọ isiala nye osisi na nkume.” Ma ihe unu bu nʼobi agaghị emezu.
Lalokho okuvela engqondweni yenu kakuyikuba khona ngitsho, elikutshoyo ukuthi: Sizakuba njengabezizwe, njengensapho zamazwe, ukuthi sikhonze isigodo lelitshe.
33 Dịka m na-adị ndụ, aga m eji aka ike na ogwe aka e setịrị eseti nakwa nwụpụ nke oke iwe m chịa unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
Kuphila kwami, itsho iNkosi uJehova, isibili ngizabusa phezu kwenu ngesandla esilamandla langengalo eyeluliweyo langolaka oluthululiweyo!
34 Aga m akpọpụta unu site na mba dị iche iche, chịkọtaa unu site na mba ndị ahụ a chụsasịrị unu. Ọ bụ aka m dị ike, aka m setịpụrụ na ọnụma a wụpụrụ ka m ga-eji mee ya.
Ngoba ngizalikhupha ebantwini, ngiliqoqe emazweni elihlakazekele kuwo, ngesandla esilamandla langengalo eyeluliweyo langolaka oluthululiweyo.
35 Aga m akpọbata unu nʼọzara nke mba niile, nọdụ nʼebe ahụ kpee unu ikpe nʼihu nʼihu.
Njalo ngizaliletha enkangala yabantu, ngizaphikisana lani lapho ubuso ngobuso.
36 Dịka m kpere nna nna unu ha ikpe nʼọzara nke dị nʼala Ijipt, otu a ka m ga-esi kpee unu ikpe, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Njengalokhu ngaphikisana laboyihlo enkangala yelizwe leGibhithe, ngokunjalo ngizaphikisana lani, itsho iNkosi uJehova.
37 Aga m eme ka unu si nʼokpuru mkpanaka m gafee, aga m akpọbata unu na njikọ nke ọgbụgba ndụ ahụ.
Njalo ngizalidlulisa ngaphansi kwentonga, ngilingenise kusibopho sesivumelwano.
38 Aga m esi nʼetiti unu wezuga ndị na-ekwe ntị ike ma na-enupu isi megide m. Ọ bụ ezie na m ga-akpọpụta ha site nʼala ahụ ha bi, ma ha agaghị abata nʼala Izrel. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Ngihlanze ngikhuphe phakathi kwenu abavukeli lalabo abaphambeka bemelene lami, ngibakhuphe elizweni lokuhlala kwabo njengabezizwe, kodwa kabayikungena emhlabathini wakoIsrayeli. Khona lizakwazi ukuthi ngiyiNkosi.
39 “‘Ma banyere unu, bụ ụlọ Izrel, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gaanụ fee arụsị unu niile dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu. Ma emesịa, unu aghaghị ịṅa m ntị, ọ dịghịkwa mgbe unu ga-eji onyinye na arụsị unu niile merụọ aha nsọ m.
Lina-ke, ndlu kaIsrayeli, itsho njalo iNkosi uJehova, hambani likhonze, ngulowo lalowo izithombe zakhe, langemva kwalokho, uba lingangilaleli; kodwa lingangcolisi futhi ibizo lami elingcwele ngezipho zenu langezithombe zenu.
40 Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu m dị nsọ, nke bụ elu ugwu ukwu nke Izrel, ka Izrel niile ga-anọ fee m. Nʼebe ahụ ka m ga-anọkwa nabata onyinye unu na onyinye pụrụ iche unu, na aja nsọ unu dị iche iche. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Ngoba entabeni yami engcwele, entabeni yengqonga yakoIsrayeli, itsho iNkosi uJehova, lapho izangikhonza indlu yonke yakoIsrayeli, bonke elizweni; khona ngizabemukela, lakhona ngibize iminikelo yenu, lezithelo zokuqala zeminikelo yenu, lazo zonke izinto zenu ezingcwele.
41 Aga m anabatakwa unu dịka onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, mgbe m si na mba dị iche iche kpọlata unu, mgbe m ga-achịkọta unu site nʼobodo ahụ niile a chụgara unu. Mgbe ahụ, mba niile ga-amata na m dị nsọ.
Ngizalemukela ngephunga elimnandi nxa ngilikhupha ebantwini, ngiliqoqe emazweni ebelihlakazelwe kuwo; njalo ngizangcweliswa phakathi kwenu phambi kwamehlo ezizwe.
42 Mgbe m mere ka unu lọta nʼala Izrel, bụ ala ahụ m weliri aka elu ṅụọ iyi inye nna nna unu ha, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Lizakwazi-ke ukuthi ngiyiNkosi, lapho sengilingenise emhlabathini wakoIsrayeli, elizweni engaliphakamisela isandla sami ukulinika oyihlo.
43 Nʼebe ahụ, unu ga-echeta obibi ndụ na omume mmehie niile unu ji merụọ onwe unu. Unu ga-asọkwa onwe unu oyi, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere.
Lapho-ke lizakhumbula izindlela zenu lezenzo zenu zonke, elazingcolisa ngazo; njalo lizazenyanya phambi kobuso benu ngenxa yazo zonke izinto ezimbi elizenzileyo.
44 Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesochara unu mmeso nʼihi aha m, na-agụghị ajọ omume unu maọbụ otu ụzọ ọjọọ niile unu si dị, unu bụ ụlọ Izrel. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.’”
Beselisazi ukuthi ngiyiNkosi, nxa ngenze kini ngenxa yebizo lami, hatshi njengokwezindlela zenu ezimbi, kumbe njengokwezenzo zenu zenkohlakalo, lina ndlu kaIsrayeli, itsho iNkosi uJehova.
45 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Ilizwi leNkosi lafika kimi futhi lisithi:
46 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ ndịda. Kwuokwa okwu megide ala ahụ dị na ndịda, na oke ọhịa niile dị na ndịda.
Ndodana yomuntu, misa ubuso bakho ngasendleleni yeningizimu, utshumayele ngaseningizimu, uprofethe umelene legusu lensimu yeningizimu;
47 Sị oke ọhịa ndịda ahụ, ‘Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ana m akwado isunye gị ọkụ, nke ga-erechapụ osisi niile dị nʼime gị, ma ndị dị ndụ ma ndị kpọnwụrụ akpọnwụ. A pụghị imenyụ oke ọkụ ahụ, ọ ga-erechapụkwa ihu niile site na ndịda ruo nʼugwu niile.
uthi kilo igusu leningizimu: Zwana ilizwi leNkosi: Itsho njalo iNkosi uJehova: Khangela, ngizaphemba umlilo phakathi kwakho, njalo uzaqeda phakathi kwakho sonke isihlahla esiluhlaza laso sonke isihlahla esomileyo; ilangabi elivuthayo kaliyikucitshwa, kodwa kuzatshiswa ngalo bonke ubuso kusukela eningizimu kuze kufike enyakatho.
48 Ihe niile bụ mmadụ, ga-ahụ na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, sunyere ọkụ ahụ. A gaghị emenyụkwa ya.’”
Futhi yonke inyama izabona ukuthi mina Nkosi ngiwuphembile, kawuyikucitshwa.
49 Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ha na-ekwu banyere m, sị, ‘Ọ bụghị naanị ilu ka ọ na-atụ?’”
Ngasengisithi: Hawu, Nkosi Jehova! Bathi ngami: Kakhulumi imifanekiso yini?

< Izikiel 20 >