< Izikiel 19 >

1 “Ma gị onwe gị, bụọrọnụ ndịisi Izrel abụ akwa a,
“Tena wewe, chukua maombolezo juu ya viongozi wa Israeli
2 ma kwuo, “‘Ụdị nne Ọdụm gịnị ka nne gị bụ nʼetiti ụmụ ọdụm. Ọ dinara nʼetiti ha, na-azụ ụmụ ya.
na sema, 'Mama yako alikuwa nani? Simba jike mmoja, aliishi na mtoto wa simba dume; katikati ya simba wadogo, aliwalisha watoto wake.
3 Ọ zụlitere otu nʼime ụmụ ya nke ghọrọ nwa ọdụm siri ike. Ọ mụtakwara ka e si adọrisi anụ ọhịa, ghọọ ọdụm na-eri mmadụ.
Alimlea mmoja wa wale watoto kurarua wanyama wengine, na kisha alijifunza jinsi ya kuwinda watu na kuwala.
4 Mba niile nụrụ maka ihe banyere ya, mee ka ọ danye nʼolulu ha gwuru. Ha ji nko koro ya, duru ya gaa nʼala Ijipt.
Kisha mataifa wakasikia kuhusu yeye. Akakamatwa kwenye mtego wao, na wakamleta kwa kulabu hata nchi ya Misri.
5 “‘Mgbe ọ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe ọzọ o nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ, matakwa na olileanya ya abụrụla ihe efu, ọ họpụtara nwa ya ọzọ kuziere ya otu ọ ga-esi bụrụ ọdụm dị ike.
Kisha alipoona kwamba ingawa alikuwa akimsubiri arudi, matumaini yake sasa yalienda, hivyo alimchukua mtoto wake wengine katika watoto wake na kumlea hata kuwa mwana simba.
6 Ọ ghọrọ onyeisi ụmụ ọdụm niile, nʼihi na ọ bụ ọdụm siri ike, ọ mụtakwara ka e si ejide anụ ọhịa, ya onwe ya ghọkwara ọdụm na-eri mmadụ.
Huyu mwana simba alitembea huku na huku katikati ya simba. Akawa mwana simba na kujifunza kuwinda mawindo; akala watu.
7 O tikpọrọ ebe ha niile e wusiri ike meekwa obodo ha niile mkpọmkpọ ebe. Ala ahụ na ndị niile nọ nʼime ya, mara jijiji site nʼoke egwu nʼihi olu ịgbọ ụja ya.
Akawakamata wajane na kuiharibu miji. Nchi na viijazavyo vilitelekezwa kwa sababu ya sauti ya kunguruma kwake.
8 Mgbe ahụ, ndị agha nke mba niile dị iche iche pụtara gbaa ya gburugburu. Ha sitere nʼakụkụ niile nwude ya nʼọnya olulu ha siiri ya.
Lakini mataifa yakaja juu yake kutoka mikoa yote; wakatengeneza nyavu juu yake. Akakamatwa kwenye mtego wao.
9 Ha tinyere ya nko nʼimi, were dọkpuo ya nʼụlọ igwe a kpara akpa, bute ya nʼihu eze Babilọn. E mere ka o biri na mba ọzọ dịka ohu, ka a ghara ịnụ ụda olu ya ọzọ nʼugwu niile nke Izrel.
Kwa kulabu wakamuweka kwenye tundu na kisha wakamleta hata kwa mfalme wa Babeli. Wakamleta hata kwenye ngome imara ili kwamba sauti yake isiweze kusikika juu ya milima ya Israeli.
10 “‘Nne gị dịka osisi vaịnị nʼogige vaịnị a kụrụ nʼakụkụ mmiri, nke nwere ọtụtụ alaka, nke na-amịkwa mkpụrụ nʼihi mmiri ọ na-enweta.
Mama yako alikuwa kama mzabibu uliopandwa kwenye damu yako karibu na maji. ulizaa matunda na kujaa matawi kwa sababu ya wingi wa maji.
11 Alaka ya niile siri ike, ha topụtara ghọọ mkpara eze. O topụrụ etopụ, tokarịa alaka ndị ọzọ elu. Nke a mere e ji na-ahụ ya anya site nʼebe dị anya.
Ulikuwa na matawi imara yaliyokuwa yakitumika kwa ajili ya fimbo ya utawala, na kipimo chake kiliinuka juu ya matawi, na kina wake ulionekana kwa ukubwa wa majani yake.
12 Ma e ji oke iwe hopu ya tụpụ ya nʼala. Oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ mere ka akwụkwọ ya kpọnwụsịa, meekwa ka mkpụrụ ya daa. Alaka ya ndị ahụ dị ike kpọnwụsịrị, ọkụ rechapụkwara ha niile.
Lakini mzabibu uling'olewa kwa ghadhabu na kutupwa chini hata aridhini, na upepo wa mashariki uliuvunja na kunyauka na moto ukavila.
13 Ugbu a, akụọla ya nʼime ọzara ebe kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị.
Hivyo sasa, umepandwa jangwani, kwenye nchi ya ukame na kavu.
14 Ọkụ esitela nʼogwe ya rechapụ alaka ya na mkpụrụ ya niile. Ọ dịkwaghị alaka siri ike fọdụrụ nke dịkwa mma ịbụ mkpara eze.’ Abụ a bụ abụ akwa, nke e kwesiri ịbụ mgbe ịkwa akwa.”
Kwa kuwa moto ulitoka kwenye matawi makubwa na kuyala matunda yake. Hakuna tawi imara juu yake, hakuna fimbo ya kifalme kutawala.' Haya ni maombolezo na yataimbwa kama maombolezo.”

< Izikiel 19 >