< Izikiel 19 >

1 “Ma gị onwe gị, bụọrọnụ ndịisi Izrel abụ akwa a,
And thou, —do thou lift up a lamentation for the princes of Israel,
2 ma kwuo, “‘Ụdị nne Ọdụm gịnị ka nne gị bụ nʼetiti ụmụ ọdụm. Ọ dinara nʼetiti ha, na-azụ ụmụ ya.
And say, What a noble lioness was thy mother! among lions did she lie down, in the midst of young lions did she raise her whelps!
3 Ọ zụlitere otu nʼime ụmụ ya nke ghọrọ nwa ọdụm siri ike. Ọ mụtakwara ka e si adọrisi anụ ọhịa, ghọọ ọdụm na-eri mmadụ.
And she brought up one of her whelps: he became a young lion, and he learned to tear in pieces the prey; [even] men he devoured.
4 Mba niile nụrụ maka ihe banyere ya, mee ka ọ danye nʼolulu ha gwuru. Ha ji nko koro ya, duru ya gaa nʼala Ijipt.
And when nations heard of him, he was caught in their pit, and they brought him with nose-rings unto the land of Egypt.
5 “‘Mgbe ọ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe ọzọ o nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ, matakwa na olileanya ya abụrụla ihe efu, ọ họpụtara nwa ya ọzọ kuziere ya otu ọ ga-esi bụrụ ọdụm dị ike.
Now when she saw that she had long waited, [that] her hope was lost, she took another one of her whelps, and made him a young lion.
6 Ọ ghọrọ onyeisi ụmụ ọdụm niile, nʼihi na ọ bụ ọdụm siri ike, ọ mụtakwara ka e si ejide anụ ọhịa, ya onwe ya ghọkwara ọdụm na-eri mmadụ.
And he went up and down in the midst of lions, he became a young lion; and he learned to tear in pieces the prey; even men he devoured.
7 O tikpọrọ ebe ha niile e wusiri ike meekwa obodo ha niile mkpọmkpọ ebe. Ala ahụ na ndị niile nọ nʼime ya, mara jijiji site nʼoke egwu nʼihi olu ịgbọ ụja ya.
And he broke down their palaces, and their cities laid he in ruins: and then was terrified the land, with all that filled it, because of the noise of his roaring.
8 Mgbe ahụ, ndị agha nke mba niile dị iche iche pụtara gbaa ya gburugburu. Ha sitere nʼakụkụ niile nwude ya nʼọnya olulu ha siiri ya.
Then set themselves the nations against him on every side from the provinces; and they spread over him their net: in their pit was he caught.
9 Ha tinyere ya nko nʼimi, were dọkpuo ya nʼụlọ igwe a kpara akpa, bute ya nʼihu eze Babilọn. E mere ka o biri na mba ọzọ dịka ohu, ka a ghara ịnụ ụda olu ya ọzọ nʼugwu niile nke Izrel.
And they put him in a cage with nose-rings [in his nose], and they brought him to the king of Babylon: they brought him into strong-holds, in order that his voice should no more be heard on the mountains of Israel.
10 “‘Nne gị dịka osisi vaịnị nʼogige vaịnị a kụrụ nʼakụkụ mmiri, nke nwere ọtụtụ alaka, nke na-amịkwa mkpụrụ nʼihi mmiri ọ na-enweta.
Thy mother was like a vine, if I compare thee to aught, planted by the waters: fruitful and full of boughs was she by reason of many waters.
11 Alaka ya niile siri ike, ha topụtara ghọọ mkpara eze. O topụrụ etopụ, tokarịa alaka ndị ọzọ elu. Nke a mere e ji na-ahụ ya anya site nʼebe dị anya.
And she had strong branches [fit] for the sceptres of rulers, and her stature grew up high between the thick-branched [trees], and she was seen through her height by means of the multitude of her tendrils.
12 Ma e ji oke iwe hopu ya tụpụ ya nʼala. Oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ mere ka akwụkwọ ya kpọnwụsịa, meekwa ka mkpụrụ ya daa. Alaka ya ndị ahụ dị ike kpọnwụsịrị, ọkụ rechapụkwara ha niile.
But she was plucked up in fury, to the ground was she cast down, and the east wind dried up her fruit: and torn off and dried up were her strong branches, a fire consumed them.
13 Ugbu a, akụọla ya nʼime ọzara ebe kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị.
And now is she planted in the wilderness, in a dry and thirsty land.
14 Ọkụ esitela nʼogwe ya rechapụ alaka ya na mkpụrụ ya niile. Ọ dịkwaghị alaka siri ike fọdụrụ nke dịkwa mma ịbụ mkpara eze.’ Abụ a bụ abụ akwa, nke e kwesiri ịbụ mgbe ịkwa akwa.”
And fire is gone out of a branch of her boughs, and hath devoured her fruit, so that there is no more on her a strong branch for a sceptre to rule. This is a lamentation, and it is become a lamentation.

< Izikiel 19 >