< Izikiel 17 >
1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Maganar Ubangiji ta zo mini cewa,
2 “Nwa nke mmadụ, tụọ ilu kọwaara ụlọ Izrel akụkọ ihe ọmụma atụ.
“Ɗan mutum, ka shirya kacici-kacici ka faɗa wa gidan Isra’ila misali.
3 Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, otu ugo nke nwere nku abụọ buru ibu, nke abụba ya tụrụ agwa agwa ma dịkwa ogologo, feere bịa na Lebanọn, tụjiri ọnụ ọnụ osisi sida kachasị ibe ya ogologo.
Ka ce musu, ‘Ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka yana cewa babbar gaggafa mai manyan fikafikai, dogayen gasusuwa da gasusuwa da yawa masu launi iri-iri ta zo Lebanon. Ta cire kan al’ul,
4 Ọ kubipụrụ ọnụ ọnụ alaka osisi a, buru ya gaa nʼala ebe ọtụtụ ndị na-azụ ahịa juru, kụọ ya nʼobodo ahụ.
ta karya kan tohonsa da yake can bisansa ta kai ƙasar ciniki, inda ta shuka shi a birnin’yan kasuwa.
5 “‘O sitekwara nʼala ahụ were otu mkpụrụ kụọ ya nʼala mara nnọọ ezi mma. Ọ kụrụ ya dịka e si akụ osisi wilo nʼakụkụ ebe enwere ụba mmiri.
“‘Ta ɗebi waɗansu irin ƙasarku ta sa a ƙasa mai taƙi. Ta shuka shi kamar itacen wardi kusa da ruwa mai yawa,
6 Ọ dịghị anya, mkpụrụ osisi ahụ gbara mgbọrọgwụ, too, ghọọ osisi vaịnị dị mkpụmkpụ, nke na-awasa awasa, nke alaka ya niile chere ihu nʼebe ugo ahụ nọ. O nwekwara alaka siri ike, na akwụkwọ mara mma.
ya kuwa yi toho ya zama kuringa gajeruwa mai yaɗuwa. Rassanta suka tanƙwasa wajen gaggafar, amma saiwoyinta suka zauna a ƙarƙashinta. Ta haka ta zama kuringa, ta yi rassa ta kuma fid da ganyaye.
7 “‘Ma e nwekwara ugo ọzọ, nke nwere nku sara mbara, nke jupụtara nʼabụba. Mgbe ugo a bịara, osisi vaịnị a gbasakwara mgbọrọgwụ ya na alaka ya, chee ugo ahụ ihu, ka ọ gbakwasị ya mmiri.
“‘Akwai kuma wata babbar gaggafa mai manyan fikafikai da gashi mai yawa. Kuringan nan ta tanƙwasa saiwoyinta zuwa wajen wannan gaggafa daga inda aka shuka ta, ta kuma miƙe rassanta wajenta don gaggafar ta yi mata banruwa.
8 A kụrụ ya nʼebe ala dị mma, nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ka o nwee ike wapụta ngalaba, mịa mkpụrụ, ghọọkwa ezigbo vaịnị mara mma.’
An shuka ta a ƙasa mai kyau kusa da ruwa mai yawa don tă yi rassa masu yawa, ta ba da’ya’ya ta kuma zama kuringa mai daraja.’
9 “Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ ga-adịhụkwa? Ọ bụ na agaghị ehopu mgbọrọgwụ ya niile, bipụkwa mkpụrụ ya niile mee ka ọ kpọnwụọ? Ka akwụkwọ ndụ niile nke na-epute ọhụrụ kpọnwụọ. Ọ gaghị ewekwa ogwe aka dị ike maọbụ ọtụtụ ndị mmadụ ihopụta ya site na mgbọrọgwụ ya.
“Ka gaya musu cewa, ‘Ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka yana cewa wannan za tă ci gaba? Ba za a tumɓuke ta a kuma kakkaɓe’ya’yanta don ta bushe ba? Dukan sababbin tohonta za su bushe. Ba sai da hannu mai ƙarfi, ko kuwa da yawan mutane za a tumɓuke ta daga saiwoyinta ba.
10 A kụọla ya ma ọ ga-etokwa? Ọ gaghị akpọnwụ kpamkpam mgbe oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ feturu ya, kpọnwụchakwaa nʼala ebe ahụ ọ nọ puo?’”
Ko da an sāke shuka ta, za tă yi amfani ne? Ba za tă bushe gaba ɗaya sa’ad da iskar gabas ta hura ba, tă bushe a ƙasar da ta yi girma?’”
11 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Sai maganar Ubangiji ta zo mini cewa,
12 “Ugbu a, gwa ndị nnupu isi ahụ, ‘unu maara ihe ilu a pụtara?’ Sị ha, ‘Lee, Babilọn bịara na Jerusalem dọkpụrụ eze ya na ndị ọchịchị ya laa Babilọn.
“Ka faɗa wa gidan’yan tawayen nan, ‘Ba ka san abin da waɗannan abubuwa suke nufi ba?’ Ka faɗa musu cewa, ‘Sarkin Babilon ya tafi Urushalima ya tafi da sarkinta da kuma manyan garinta, ya dawo da su Babilon.
13 O were otu onye site nʼezinaụlọ eze, ya na ya gbara ndụ, bụ onye o mere ka ọ ṅụọ iyi. O sitekwara nʼala ahụ bupụ ndị ndu obodo ahụ niile.
Sa’an nan ya ɗauki wani daga iyalin sarauta ya yi yarjejjeniya da shi, ya sa shi ya yi rantsuwa. Ya kuma tafi da shugabannin ƙasar,
14 Nʼụzọ dị otu a, alaeze ahụ ghọrọ alaeze e wedara nʼala nke ukwuu, nke na-enweghịkwa ike ibili ọzọ. Ọganihu nke alaeze ahụ dabeere naanị na ndebe ha debere ọgbụgba ndụ ahụ.
don a raunana masarautar, kada tă ƙara tashi, amma ta tsaya dai kan cika yarjejjeniyarsa.
15 Ma o nupuru isi nʼokpuru ya site nʼiziga ndị ozi nʼIjipt ka ha nye ya ọtụtụ ịnyịnya na ndị agha. Ọ ga-enwetakwa ihe ọ chọrọ? Onye na-eme ihe dị otu a, ọ pụrụ ịgbanarị ntaramahụhụ? Ọ pụrụ imebi ọgbụgba ndụ ma gbalaga?
Amma sarkin nan ya yi tawaye a kan sarkin Babilon ta wurin aika jakadunsa zuwa Masar don a ba shi dawakai da sojoji masu yawa. Zai ci nasara? Shi da ya yi wannan abu zai tsira? Zai iya taka yarjejjeniya har ya tsere?
16 “‘Nʼezie, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, ọ ga-anwụ na Babilọn, nʼala nke eze ahụ mere ka ọ nọkwasị nʼocheeze, bụ onye o ledara ịṅụ iyi ya anya mebikwaa ọgbụgba ndụ ya.
“‘Muddin in raye, in ji Ubangiji Mai Iko Duka, zai mutu a Babilon, a ƙasar sarkin nan da ya naɗa shi, domin bai cika rantsuwa da alkawarin da ya yi ba.
17 Nʼagbanyeghị igwe ndị agha ya siri ike, Fero agaghị enwe ike zọpụta ya nʼagha, mgbe ha ga-ewulite mgbidi agha, gwuokwa olulu nnọchibido iji gbuo ọtụtụ mmadụ.
Fir’auna da yawan sojojinsa da kuma yawan jama’arsa ba zai zama da taimako gare shi a yaƙi ba, sa’ad da sarkin Babilon zai gina mahaurai ya kuma yi ƙawanya don yă hallaka rayuka masu yawa.
18 O lelịrị ịṅụ iyi ahụ site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ. Nʼihi na o nyere aka ya nʼihe ibe ma gaa nʼihu mee ihe ndị a niile, mgbapụ agaghị adịrị ya.
Bai cika rantsuwa ba ta wurin take alkawari. Domin sarkin Isra’ila ya ƙulla alkawari ya kuma aikata dukan waɗannan abubuwa, ba zai tsira ba.
19 “‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, aga m akwụghachi ya nʼihi nleda anya o ledara ịṅụ iyi m nakwa nʼihi ọgbụgba ndụ nke o mebiri.
“‘Saboda haka ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka ya ce muddin ina raye, zan nemi hakkin rantsuwata da ya ƙi cikawa da kuma alkawarin da ya take.
20 Aga m agbasa ụgbụ m nʼụzọ o si aga; ọnya m ga-amakwa ya. Aga m ewetakwa ya na Babilọn, nọdụkwa nʼebe ahụ taa ya ahụhụ nʼihi na ọ kwesighị ntụkwasị obi nye m.
Zan kafa masa tarkona, zai kuma fāɗi a tarkona. Zan kawo shi a Babilon in kuma hukunta shi a can domin ya yi mini rashin aminci.
21 Mma agha ka a ga-eji gbuo ndị agha ya niile na-agbapụ ọsọ, ndị niile fọdụrụ ka a ga-achụsasị nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
Dukan sojojinsa zaɓaɓɓu za a kashe su da takobi, za a kuma watsar da waɗanda suka ragu ko’ina. Ta haka za ku san cewa Ni Ubangiji na faɗa.
22 “‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m ga-esi nʼọnụ ọnụ osisi kachasị mma nke osisi sida kachasị elu kụrụ ihe m ga-akụ. Aga m esi nʼọnụ ọnụ osisi sida dị elu kụrụ alaka dị nro, nke m ga-akụ nʼugwu dị ezigbo elu.
“‘Ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka yana cewa ni kaina zan cire toho a kan itacen al’ul da yake can bisa in shuka; zan kuma karya ƙanƙanin reshe daga can bisan tohon in shuka a dutse mai tsayi.
23 Ọ bụ nʼelu ugwu niile nke Izrel ka m ga-akụnye ya. Ọ ga-awapụtakwa alaka ya, mịa mkpụrụ, bụrụkwa sida mara oke mma. Ụmụ nnụnụ dị iche iche ga-ewu akwụ ha na ya, ha ga-achọtakwa ebe obibi na ndo nke alaka ya niile.
A ƙwanƙolin dutsen Isra’ila zan shuka shi; zai yi rassa yă ba da’ya’ya yă kuma zama al’ul mai daraja. Tsuntsaye iri-iri za su yi sheƙa a cikinsa; za su sami mafaka a inuwar rassansa.
24 Nʼoge ahụ, osisi ọhịa niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ onye na-egbuda osisi niile dị elu, ma na-ewelikwa ndị dị nta elu. Na ọ bụ m na-eme ka osisi dị ndụ kpọnwụọ, ma na-emekwa ka nke nwụrụ anwụ dịrị ndụ. “‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Aghakwaghị m ime ya.’”
Dukan itatuwan jeji za su san cewa Ni Ubangiji ne mai sa manyan itatuwa su zama ƙanana in kuma sa ƙananan itatuwa su zama manya. Nakan sa ɗanyen itace ya bushe, busasshen itace kuma ya zama ɗanye. “‘Ni Ubangiji na faɗa, zan kuma aikata.’”