< Izikiel 17 >
1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
A message from the Lord came to me, saying,
2 “Nwa nke mmadụ, tụọ ilu kọwaara ụlọ Izrel akụkọ ihe ọmụma atụ.
“Son of man, present this riddle—share it as a parable with the people of Israel.
3 Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, otu ugo nke nwere nku abụọ buru ibu, nke abụba ya tụrụ agwa agwa ma dịkwa ogologo, feere bịa na Lebanọn, tụjiri ọnụ ọnụ osisi sida kachasị ibe ya ogologo.
Tell them that this is what the Lord God says: There was a great eagle that had large wings, long feathers, and multi-colored plumage. It came to Lebanon and took off the top of the cedar.
4 Ọ kubipụrụ ọnụ ọnụ alaka osisi a, buru ya gaa nʼala ebe ọtụtụ ndị na-azụ ahịa juru, kụọ ya nʼobodo ahụ.
He broke off its highest branch and took it to a country of merchants, and planted it in a city of traders.
5 “‘O sitekwara nʼala ahụ were otu mkpụrụ kụọ ya nʼala mara nnọọ ezi mma. Ọ kụrụ ya dịka e si akụ osisi wilo nʼakụkụ ebe enwere ụba mmiri.
He took some of the seed of the land and planted it in good soil beside a large river where he could grow it like a willow.
6 Ọ dịghị anya, mkpụrụ osisi ahụ gbara mgbọrọgwụ, too, ghọọ osisi vaịnị dị mkpụmkpụ, nke na-awasa awasa, nke alaka ya niile chere ihu nʼebe ugo ahụ nọ. O nwekwara alaka siri ike, na akwụkwọ mara mma.
The seed sprouted and grew into a low, spreading vine, with its branches facing toward him, and its roots went down into the ground beneath. So the vine developed, growing leaves and branches.
7 “‘Ma e nwekwara ugo ọzọ, nke nwere nku sara mbara, nke jupụtara nʼabụba. Mgbe ugo a bịara, osisi vaịnị a gbasakwara mgbọrọgwụ ya na alaka ya, chee ugo ahụ ihu, ka ọ gbakwasị ya mmiri.
But there was another great eagle that had large wings and many feathers. This vine sent out its roots toward him. It stretched out its branches to him from where it had been planted, wanting him to water it.
8 A kụrụ ya nʼebe ala dị mma, nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ka o nwee ike wapụta ngalaba, mịa mkpụrụ, ghọọkwa ezigbo vaịnị mara mma.’
Yet it had been planted in good soil beside a large river so it could grow strong, produce fruit, and become a superb vine.
9 “Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ ga-adịhụkwa? Ọ bụ na agaghị ehopu mgbọrọgwụ ya niile, bipụkwa mkpụrụ ya niile mee ka ọ kpọnwụọ? Ka akwụkwọ ndụ niile nke na-epute ọhụrụ kpọnwụọ. Ọ gaghị ewekwa ogwe aka dị ike maọbụ ọtụtụ ndị mmadụ ihopụta ya site na mgbọrọgwụ ya.
So you tell them this is what the Lord God says: ‘Will it grow well? Won't it be uprooted and its fruit ripped off so that it withers? All its leaves will dry up. You wouldn't need strong arms or lots of people to pull it up by its roots.
10 A kụọla ya ma ọ ga-etokwa? Ọ gaghị akpọnwụ kpamkpam mgbe oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ feturu ya, kpọnwụchakwaa nʼala ebe ahụ ọ nọ puo?’”
Even if it's transplanted, is it going to survive? Won't it wither up completely when the east wind blows? In fact, it will wither right where it was planted.”
11 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
A message from the Lord came to me, saying,
12 “Ugbu a, gwa ndị nnupu isi ahụ, ‘unu maara ihe ilu a pụtara?’ Sị ha, ‘Lee, Babilọn bịara na Jerusalem dọkpụrụ eze ya na ndị ọchịchị ya laa Babilọn.
“Tell these rebellious people: ‘Don't you know what this riddle means?’ Explain to them, ‘Look, the king of Babylon came to Jerusalem, made its king and officials his prisoners, and took them back with him to Babylon.
13 O were otu onye site nʼezinaụlọ eze, ya na ya gbara ndụ, bụ onye o mere ka ọ ṅụọ iyi. O sitekwara nʼala ahụ bupụ ndị ndu obodo ahụ niile.
He made an agreement with one of the royal family and made him take an oath that he would be a loyal subject as king. Then he took into exile the country's leaders,
14 Nʼụzọ dị otu a, alaeze ahụ ghọrọ alaeze e wedara nʼala nke ukwuu, nke na-enweghịkwa ike ibili ọzọ. Ọganihu nke alaeze ahụ dabeere naanị na ndebe ha debere ọgbụgba ndụ ahụ.
so that the kingdom would be kept in subjection and wouldn't be strong enough to rebel—it would only survive by keeping its agreement with him.
15 Ma o nupuru isi nʼokpuru ya site nʼiziga ndị ozi nʼIjipt ka ha nye ya ọtụtụ ịnyịnya na ndị agha. Ọ ga-enwetakwa ihe ọ chọrọ? Onye na-eme ihe dị otu a, ọ pụrụ ịgbanarị ntaramahụhụ? Ọ pụrụ imebi ọgbụgba ndụ ma gbalaga?
However, this king did rebel against Babylon, and sent ambassadors to Egypt to ask for help by supplying horses and many soldiers. Will he do well? Would someone who acts like this succeed? Could he break an agreement and not be punished?’
16 “‘Nʼezie, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, ọ ga-anwụ na Babilọn, nʼala nke eze ahụ mere ka ọ nọkwasị nʼocheeze, bụ onye o ledara ịṅụ iyi ya anya mebikwaa ọgbụgba ndụ ya.
As I live, declares the Lord God, ‘he is going to die in Babylon, in the country of the king who put him on the throne, whose oath he disregarded and whose agreement he broke.
17 Nʼagbanyeghị igwe ndị agha ya siri ike, Fero agaghị enwe ike zọpụta ya nʼagha, mgbe ha ga-ewulite mgbidi agha, gwuokwa olulu nnọchibido iji gbuo ọtụtụ mmadụ.
Pharaoh with his powerful army of many soldiers won't help him in battle, when attack ramps are piled up and siege walls built and many people end up being killed.
18 O lelịrị ịṅụ iyi ahụ site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ. Nʼihi na o nyere aka ya nʼihe ibe ma gaa nʼihu mee ihe ndị a niile, mgbapụ agaghị adịrị ya.
He disregarded his oath by breaking the agreement. Because he shook hands as a sign of the promise he made, yet rebelled in this way, he won't go unpunished!’
19 “‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, aga m akwụghachi ya nʼihi nleda anya o ledara ịṅụ iyi m nakwa nʼihi ọgbụgba ndụ nke o mebiri.
So this is what the Lord God says: As I live, I will punish him for disregarding my oath and for breaking my agreement.
20 Aga m agbasa ụgbụ m nʼụzọ o si aga; ọnya m ga-amakwa ya. Aga m ewetakwa ya na Babilọn, nọdụkwa nʼebe ahụ taa ya ahụhụ nʼihi na ọ kwesighị ntụkwasị obi nye m.
I will throw my net over him and catch him; I will trap in my snare. I will take him to Babylon and sentence him to punishment there for his treason towards me.
21 Mma agha ka a ga-eji gbuo ndị agha ya niile na-agbapụ ọsọ, ndị niile fọdụrụ ka a ga-achụsasị nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
All his best soldiers will be killed in battle, and those who do survive will be scattered in all directions. Then you will know that I, the Lord, have spoken.
22 “‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m ga-esi nʼọnụ ọnụ osisi kachasị mma nke osisi sida kachasị elu kụrụ ihe m ga-akụ. Aga m esi nʼọnụ ọnụ osisi sida dị elu kụrụ alaka dị nro, nke m ga-akụ nʼugwu dị ezigbo elu.
This is what the Lord God says: I'm going to break off a branch from the high top of the cedar, and I will plant it on the top of a high mountain.
23 Ọ bụ nʼelu ugwu niile nke Izrel ka m ga-akụnye ya. Ọ ga-awapụtakwa alaka ya, mịa mkpụrụ, bụrụkwa sida mara oke mma. Ụmụ nnụnụ dị iche iche ga-ewu akwụ ha na ya, ha ga-achọtakwa ebe obibi na ndo nke alaka ya niile.
I will plant it on Israel's high mountain so that it can grow branches, produce fruit and become a magnificent cedar. All kinds of birds will live in it, nesting in the shade of its branches.
24 Nʼoge ahụ, osisi ọhịa niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ onye na-egbuda osisi niile dị elu, ma na-ewelikwa ndị dị nta elu. Na ọ bụ m na-eme ka osisi dị ndụ kpọnwụọ, ma na-emekwa ka nke nwụrụ anwụ dịrị ndụ. “‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Aghakwaghị m ime ya.’”
All the trees in the countryside will know that I am the Lord. I can bring down the tall and have the low tree grow tall. I can make the green tree dry up, and make the withered tree become green again. I, the Lord, have spoken, and I will do it.”