< Izikiel 16 >

1 Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
Shoko raJehovha rakasvika kwandiri richiti,
2 “Nwa nke mmadụ, gwa Jerusalem okwu mee ka ọ mara banyere ndụ ya niile rụrụ arụ
“Mwanakomana womunhu, tsiura Jerusarema pamwe chete nezvinyangadzo zvaro
3 sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Jerusalem: Ịpụta ụwa gị na ọmụmụ gị bụ nʼala ndị Kenan; nna gị bụ onye Amọrị, nne gị bụ onye Het.
uti, ‘Zvanzi naIshe Jehovha kuJerusarema: Madzitateguru ako nokwaakaberekerwa ndiko kunyika yeKenani; baba vako vakanga vari muAmori uye mai vako vakanga vari muHiti.
4 Nʼụbọchị ahụ a mụrụ gị, ebeghị otubo gị, ọ dịghị onye lekọtara gị maọbụ jiri mmiri saa gị ahụ ị sachapụ gị unyi maọbụ tee gị nnu, maọbụ jiri akwa kechie gị.
Pazuva rawakaberekwa rukuvhute rwako haruna kugurwa, uye hauna kushambidzwa nemvura kuti uchene, uye hauna kutongokwizwa nomunyu kana kuputirwa mumucheka.
5 Ọ dịghị onye nwere obi ebere nʼebe ị nọ. Ọ dịghị onye ihe banyere gị metụrụ nʼobi, ọ dịkwaghị onye lekọtara gị. Kama nʼụbọchị ahụ a mụrụ gị a tufuru gị nʼọhịa, nʼihi na-eledara gị anya.
Hakuna munhu akakunzwira tsitsi kana kuva nengoni newe kuti akuitire chinhu chimwe chezvinhu izvi. Asi, wakarasirwa kusango, nokuti musi wawakaberekwa iwe wakashorwa.
6 “‘Ma mgbe m si nʼebe ahụ ị tọgbọ na-agafe, ahụrụ m gị ka i chịlịri ụkwụ gị, ọbara jukwara gị ahụ, dịka ị dina nʼime ọbara gị. Nʼoge ahụ, ihe pụrụ m nʼọnụ bụ, “Dị ndụ.”
“‘Ipapo ndakapfuura napo ndikakuona uchipfakanyika uri muropa rako, uye pawakanga uvete ipapo uri muropa rako, ndakati kwauri, “Rarama!”
7 Emere m ka ị too dịka osisi na-eto eto nʼime ọhịa. I tolitere, too ogologo ma tozuo oke na nwanyị, ị kpụrụ ara, agịrị isi gị pukwara, ma gị onwe gị gba ọtọ.
Ndakakuita kuti ukure somuti wesango. Wakakura ukanyatsoumbika ukava ukomba hwakaisvonaka. Mazamu ako akakura nebvudzi rako rikakura, iyewe wakanga wakashama usina chinhu.
8 “‘Emesịa, a gafere m nʼakụkụ gị, mgbe m lere gị anya ahụrụ m na i tozuola onye mmadụ ga-ahụ nʼanya. A gbasapụrụ m akụkụ akwa m nʼahụ gị, jiri ya kpuchie ọtọ gị. Aṅụrụ m gị iyi, mụ na gị gbara ndụ, ị ghọkwara nke m. Ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
“‘Shure kwaizvozvo, ndakapfuura nepauri, uye pandakatarira pauri ndakaona kuti wakanga wakura pane zvorudo, ndikawarira rutivi rwenguo yangu pamusoro pako ndokukufukidza pakushama kwako. Ndakakupikira ndikaita sungano newe, ndizvo zvinotaura Ishe Jehovha, iwe ukava wangu.
9 “‘Eji m mmiri saa gị ahụ, sachapụ ọbara dị gị nʼahụ, teekwa gị mmanụ.
“‘Ndakakushambidza nemvura uye ndikakugeza kubvisa ropa rako, ndokukuzodza mafuta.
10 Enyere m gị akwa ọcha na uwe a kpara nke ọma, nke i ji kpuchie ahụ gị. Nyekwa gị akpụkpọụkwụ e ji ezi akpụkpọ kwaa, jirikwa ezi akwa ọcha na uwe ndị dị oke ọnụ kpuchie gị.
Ndakakufukidza nezvakarukwa zvakanaka ndikakupfekedza shangu dzamatehwe.
11 Eyinyere m gị ihe ịchọ mma, tinye ọlaaka nʼaka gị, nakwa ọlaolu nʼolu gị.
Ndakakufukidza nomucheka wakaisvonaka ndikakufukidza mucheka uno murango unokosha. Ndakakushongedza noukomba: ndikaisa zvishongo zvomumaoko nouketani pamutsipa wako,
12 Etinyekwara m gị ọla nʼimi, tinye gị ọlantị abụọ na ntị gị, na okpueze mara mma nʼisi gị.
uye ndakaisa mhete pamhuno yako, nemhete panzeve dzako uye nekorona yakanaka pamusoro wako.
13 E ji ihe ịchọ mma ọlaọcha na ọlaedo chọọ gị mma. Uwe gị bụkwa uwe ezi akwa ọcha, uwe dị oke ọnụ, na uwe a kpara nke ọma. Nri ị na-eri bụ ụtụ ọka a yọchaziri nke ọma, na mmanụ aṅụ, na mmanụ oliv. Mma gị pụtaziri ihe nke ọma, ị ruo ogo ịbụ eze nwanyị.
Saka wakashongedzwa negoridhe nesirivha; nguo dzako dzaiva dzomucheka wakaisvonaka uye mucheka womutengo mukuru nomucheka wakarukwa. Zvokudya zvako zvaiva zvoupfu hwakatsetseka, nouchi namafuta omuorivhi. Wakabva wanaka chose ukasimukira kusvikira wava mambokadzi.
14 Aha gị dara ụda nke ukwuu nʼetiti mba dị iche iche nʼihi mma gị, nke zuruoke site nʼebube ahụ bụ nke m tụkwasịrị gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
Mukurumbira wokunaka kwako wakapararira pakati pendudzi, nokuti kubwinya kwandakaisa pamusoro pako kwakaita kuti kunaka kwako kuve kwangu, ndizvo zvinotaura Ishe Jehovha.
15 “‘Ma ị tụkwasịrị mma gị obi, jiri nʼihi na a mara aha gị ghọọ onye akwụna. I wekwaara onwe gị nye nwoke ọbụla gabigara mee ka mma gị bụrụ nke ya.
“‘Asi iwe wakavimba norunako rwako ukashandisa mbiri yako kuti uve chifeve. Wakazadza munhu wose akapfuura napauri noufeve uye nokuda kworunako rwako ukava wake.
16 Ị were uwe gị ụfọdụ, meere onwe gị ebe dị iche iche dị elu nke tụrụ agwa, ebe doziri ihe ndina ịkwa iko gị. Ihe dị otu a emetụbeghị mbụ, ha ekwesịkwaghị ime mgbe ọbụla.
Wakatora dzimwe nhumbi dzako ukashongedza nzvimbo dzakakwirira, kwawakaramba uchiitira ufeve hwako. Zvinhu zvakadaro hazvifaniri kuitika uye hazvifaniri kutomboitwa.
17 Ị chịrị ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ mara mma, bụ nke m nyere gị, were ha kpụọrọ onwe gị oyiyi nwoke dị iche iche, ndị ị na-akpọ isiala nye. Nʼụzọ dị otu a ka gị na ha si na-akwakọ iko.
Wakatorazve ukomba hwezvishongo zvakaisvonaka zvandakakupa, ukomba hwakaitwa negoridhe nesirivha, uye ukazviitira zvifananidzo zvechirume ndokuita ufeve nazvo.
18 Uwe ọma ahụ a kpara akpa ka i ji kpuchie ha. Mmanụ m na ụda m na-esi isi ụtọ ka ị chere nʼihu ha dịka onyinye.
Uye wakatora nguo dzako dzakarukwa kuti ufukidze zvifananidzo, uye ukapira mafuta angu ezvinonhuhwira pamberi pazvo.
19 Ọzọkwa, ụtụ ọka ọma, mmanụ oliv na mmanụ aṅụ, nri ndị m nyere gị ka i rie, ka i ji chụọ aja na-esi isi ụtọ nʼihu ha. Otu a ka o si dị, ka Onyenwe anyị Onyenwe anyị kwupụtara.
Uyezve zvokudya zvandakakupa, upfu hwakatsetseka, mafuta omuorivhi nouchi zvandakakupa kuti udye, wakazvipira sezvinonhuhwira pamberi pazvo. Izvozvo ndizvo zvakaitika, ndizvo zvinotaura Ishe Jehovha.
20 “‘Ụmụ niile ị mụtaara m, nwoke na nwanyị, ka i ji chụọrọ arụsị gị aja ka ha rie. Ọ bụ na ịgba akwụna gị ezughịrị gị?
“‘Uye wakatora vanakomana navanasikana vawakaberekera ini ukavabayira sezvokudya kuzvifananidzo. Ko, ufeve hwako hwakanga husina kuringana here?
21 Ma i gburu ụmụ m, jiri ha chụọ aja nye arụsị!
Wakauraya vana vangu ukavabayira kuzvifananidzo.
22 Nʼoge ndị a niile ị na-akwa iko, na-eme ihe arụ ndị a niile, o metụbeghị gị nʼobi ka i cheta ụbọchị niile ndị ahụ ị bụ nwantakịrị, mgbe ị nọ na-agba ọtọ, mgbe ọbara jupụtara gị nʼahụ.
Mumabasa ako ose anonyangadza hauna kurangarira mazuva ouduku hwako, pawakanga usina kupfeka usina chinhu, uchikava-kava uri muropa rako.
23 “‘Ahụhụ, ahụhụ, ga-adịrị gị, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Tinyekwara ajọ omume gị niile,
“‘Nhamo! Une nhamo iwe, ndizvo zvinotaura Ishe Jehovha. Pamusoro pokumwe kuipa kwako kwose,
24 i wuuru arụsị gị ụlọ ebe ịkwa iko, wuokwa ụlọ arụsị ndị ọzọ nʼakụkụ okporoụzọ niile.
wakazvivakira nzvimbo yakakwirira ukazviitira shongwe refu pazvivara zvose zvomusha.
25 I wuuru onwe gị ebe ịchụ aja e wuliri elu dị iche iche nʼisi ụzọ niile, si otu a merụọ mma gị. Nʼebe ahụ ka ị na-anọ na-emeghere onye ọbụla gafetara ụkwụ gị abụọ, mee ka ịkwa iko gị na-amụbanye.
Wakavaka shongwe dzako refu panotangira nzira dzose dzomumusha ndokuderedza runako rwako, uchipira muviri wako nokuwanza kupata kwako kuna ani zvake aipfuura napauri.
26 Ị kwasoro ndị Ijipt bụ ndị agbataobi gị iko, ndị anụahụ ha dị ukwuu. I si otu a mee ka iwe dị ukwuu wee m megide ịkwa iko gị nke na-aba ụba.
Wakaita ufeve navaIjipita, vawakavakidzana navo ivo vazere noruchiva, ukamutsa kutsamwa kwangu, nokuwanda kwokupata kwako.
27 Nʼihi ya, esetipụrụ m aka megide gị, e webilatara m oke ala gị ka ọ dị ntakịrị; ewere m gị nyefee oke ọchịchọ nke ndị iro gị, bụ ndị inyom Filistia, ndị ihere mere nʼihi omume gị niile ruru unyi.
Saka ndakatambanudza ruoko rwangu kuti ndikurwise ndikatapudza nyika yako; ndikakuisa pasi pokukara kwavavengi vako, vanasikana vavaFiristia, ivo vakavhundutswa namafambiro ako.
28 Gị na ndị Asịrịa akwaala iko, nʼihi na afọ adịghị eju gị. Ọ bụladị mgbe nke a gasịrị, ị bụkwa onwe na-enweghị afọ ojuju.
Wakaitazve ufeve navaAsiria, nokuti wakanga usingagoni kuguta; kunyange shure kwaizvozvo hauna kumbogutsikana nazvo.
29 I mere ka ịkwa iko gị mụbaa ruo ala ndị Kaldịa, mba ahụ ịzụ ahịa doro anya. Ma ọbụladị na nke a afọ ejughịkwa gị.
Ipapo wakawanza kupata kwako kuti kubatanidzire Bhabhironi, nyika yavashambadziri, asi kunyange naizvozvi hauna kugutsikana.
30 “‘Iwe m dị ọkụ megide gị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Mgbe ị na-eme ihe ndị a, ị na-eme ha nnọọ dị ka onye akwụna nke ihere adịghị eme.
“‘Unoshayiwa simba sei, ndizvo zvinotaura Ishe Jehovha, paunoita zvinhu izvi zvose, zvinoitwa nechifeve chisinganyari.
31 Mgbe ị rụrụ ụlọ arụsị nʼisi ụzọ niile, wuokwa ụlọ ịkwa iko gị na mbara ụzọ niile, i meghị ya dịka akwụna, nʼihi na ị jụrụ ịnara ndị gị na ha kwara iko ego ọbụla.
Pawakavaka nzvimbo dzakakwirira pamavambo enzira dzose dzomumusha ndokuzviitira shongwe refu pazvivara zvose, wakanga usingaiti sechifeve, nokuti wakashora muripo.
32 “‘Nʼezie, ị bụ nwanyị na-akwa iko ma ị nọ na di, onye na-anabata ndị ikom ọzọ karịa di ya!
“‘Iwe chifeve chomukadzi! Unoshuva vatorwa kupinda murume wako!
33 Ndị akwụna niile na-anata onyinye, ma gị onwe gị na-enye ndị ikom niile hụrụ gị nʼanya onyinye, inye ha ngarị ka ha bịakwute gị site nʼebe niile bịakwute gị nʼihi ịgba akwụna gị.
Chifeve chimwe nechimwe chinogamuchira muripo, asi iwe unopa zvipo kuvadiwa vako vose, nokuvafufura kuti vauye kwauri vachibva kwose kwose nokuda kwokupata kwako kusina unhu.
34 Nʼihi ya, ị dị iche nʼetiti ndị inyom ndị ọzọ nʼụdị ịgba akwụna gị, o nweghị onye na-agbaso gị na-arịọ gị maka ịkwaso gị iko. Ị kwụrụ ụgwọ ma o nweghị ụgwọ a kwụrụ gị, nʼụzọ dị otu a ị dị iche.
Saka iwe wakasiyana navamwe pakufeva kwako; hakuna anokumhanyira nokuda kwokupata kwako. Iwe wakasiyana chose, nokuti ndiwe unopa muripo uye iwe hauna chaunopiwa.
35 “‘Nʼihi nke a, gị nwanyị akwụna, nụrụ okwu Onyenwe anyị!
“‘Naizvozvo, iwe chifeve, chinzwa shoko raJehovha!
36 Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nʼihi na ị wụpụrụ agụụ nke anụ ahụ gị, kpugheekwa ọtọ gị nʼịkwa iko gị nke gị na ndị ị hụrụ nʼanya na-akwa, na nʼihi arụsị gị niile rụrụ arụ, nakwa nʼihi na ị nyere ha ọbara ụmụ gị,
Zvanzi naIshe Jehovha: Nokuda kwokuti wakadurura pfuma yako nokufukura kusasimira kwako mukupata kwako navadiwa vako, uye nokuda kwezvifananidzo zvako zvose zvinonyangadza, uye nokuda kwokuti wakavapa ropa ravana vako,
37 nʼihi ya, aga m achịkọta ndị niile bụ ndị ahụ niile ị hụrụ nʼanya, ndị gị na ha na-enwe obi ụtọ, ndị ị hụrụ nʼanya, ma ndị ị kpọrọ asị. Aga m achịkọta ha site gburugburu gị imegide gị, gbaa gị ọtọ nʼihu ha, ka ha hụ ọtọ gị niile.
Naizvozvo ndichaunganidza vadiwa vako vose, vawaifara navo, vaya vawaida navaya vawaivenga. Ndichavaunganidza kubva kwose kwose kuti vakurwise uye ndichakufukura pamberi pavo uye vachaona kusasimira kwako kwose.
38 Aga m ata gị ahụhụ a na-ata ndị inyom na-akwa iko, na ndị inyom na-egbu mmadụ. Aga m eme ka ịbọ ọbọ ọbara nke ọnụma m, ya na ekworo m, bịakwasị gị.
Ndichakutonga nomutongo wavakadzi vanoita ufeve navanoteura ropa; ndichauyisa pamusoro pako ropa rokutsiva kwehasha dzangu negodo rokutsamwa kwangu.
39 Aga m enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị hụrụ nʼanya, bụ ọtụtụ mba ahụ dị iche iche. Ha ga-ebibi gị, kwada ụlọ ịkwa iko gị, na ụlọ arụsị gị niile dị elu, gbaa gị ọtọ, narakwa gị uwe gị niile, na ihe ịchọ mma gị niile, hapụ gị ka ihere mee gị.
Ipapo ndichakuisa mumaoko avadiwa vako, uye vachakoromora nzvimbo dzako dzakakwirira vagoparadza shongwe dzako refu. Vachakubvisa nguo dzako vagotora ukomba hwako hwakanaka vagokusiya usina kupfeka wakashama.
40 Ha ga-akpọta igwe mmadụ ga-emegide gị, ndị ga-atụ gị nkume, jirikwa mma agha ha bọkasịa gị.
Vachauya nemhomho yavanhu kuti izokurwisa, vachakutema namabwe nokukubvamburanya neminondo yavo.
41 Ha ga-agba ụlọ gị ọkụ ma takwaa gị ahụhụ nʼihu ọtụtụ ndị inyom. Aga m ahụkwa na ị kwụsịrị ịkwa iko ị na-akwa, ị ga-akwụsịkwa ịkwụ ụgwọ ahụ ị na-akwụ ndị iko gị.
Vachapisa dzimba dzako nokukuranga pamberi pavakadzi vazhinji. Ndichagumisa ufeve hwako, uye hauchazoripirizve vadiwa vako.
42 Mgbe ahụ, oke iwe m megide gị ga-adajụ, ekworo m ga-esite nʼebe ị nọ gabiga. Aga m anọ nwayọọ gharakwa iwe iwe ọzọ.
Ipapo hasha dzangu pamusoro pako dzichaserera uye godo rokutsamwa kwangu richabva kwauri; ndichadzikama uye handingatsamwizve.
43 “‘Ebe ọ bụ na ị chetaghị ụbọchị ndị ahụ niile, mgbe ị dị nʼagbọghọbịa, ma i ji ihe ọjọọ ndị a niile ị na-eme kpasuo m iwe. Ya mere, aghaghị m ịkwụghachi gị dịka mmehie gị si dị. Ọ bụ na i meghị omume ndị a rụrụ arụ, tinyekwara mmehie agụụ ịkwa iko? Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
“‘Nokuti hauna kurangarira mazuva ouduku hwako asi wakanditsamwisa nezvinhu zvose izvi, zvirokwazvo ndichauyisa pamusoro pako zvawakaita, ndizvo zvinotaura Ishe Jehovha. Ko, hauna kuwedzera unzenza pane mamwe mabasa ako ose anonyangadza here?
44 “‘Lee, onye ọbụla na-atụ ilu, ga-atụ ilu a banyere gị sị, “Otu ọ dị nne ka ọ dị nwa ya nwanyị.”
“‘Munhu wose achataura tsumo achareva tsumo iyi pamusoro pako: “Sezvakaita mai ndizvo zvakaita mwanasikana.”
45 Nʼezie, ị dị ka nne gị, nʼihi na nne gị kpọrọ di ya na ụmụ ya asị. Ị dịkwa ka ụmụnne gị ndị inyom. Ha na-akpọ di ha na ụmụ ha asị. Nʼezie, nne gị bụ onye Het, nna gị bụkwa onye Amọrị.
Iwe uri mwanasikana chaiye wamai vako, vakashora murume wavo navana vavo; uye uri mununʼuna chaiye wamadzikoma ako, akashora varume vavo navana vavo. Mai vako vakanga vari muHiti uye baba vako vari muAmori.
46 Ada nne gị bụ Sameria, ya na ụmụ ya bi nʼugwu. Nwanne gị nwanyị nke nta bụ Sọdọm, ya na ụmụ ya bi nʼala ndịda.
Mukoma wako akanga ari Samaria, akanga achigara kumusoro kwako navanasikana vake; uye mununʼuna wako, akanga achigara kurutivi rwezasi kwako navanasikana vake, akanga ari Sodhomu.
47 Ọ bụghị naanị na ị soro ụzọ ha niile, ị ṅomiri omume ibi ndụ arụ ha niile, kama dịka a ga-asị na nke a bụ ihe nta, nʼụzọ gị niile, ị ghọrọ onye rụrụ arụ karịa ha.
Hauna kungofamba nenzira dzavo chete nokutevedzera zvinonyangadza zvavo, asi iwe munzira dzako dzose wakakurumidza kuva wakashata chose kupfuura ivo.
48 Ebe m na-adị ndụ, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Sọdọm na ụmụ ya ndị inyom emetụbeghị ihe ndị a gị na ụmụ gị ndị inyom mere.
Zvirokwazvo noupenyu hwangu, ndizvo zvinotaura Ishe Jehovha, mununʼuna wako Sodhomu navanasikana vake havana kumboita zvawakaita iwe nezvakaitwa navanasikana vako.
49 “‘Mmehie nwanne gị nwanyị Sọdọm bụ nganga, na umengwụ, na oke oriri. Ha jụrụ inyere ndị nọ na mkpa, na ndị agụụ na-agụ nọ nʼọnụ ụzọ ha aka.
“‘Zvino ichi ndicho chaiva chivi chomununʼuna wako Sodhomu: Iye navanasikana vake, vaizvikudza vaidyisa uye vaiva vasina hanya; havana kubatsira varombo navanoshayiwa.
50 Ha dị elu nʼobi ha, mee ihe arụ nʼihu m. Nʼihi ya, esitere m nʼihu m wezuga ha dịka ị hụrụ.
Vakanga vana manyawi uye vaiita zvinhu zvinonyangadza pamberi pangu. Naizvozvo ndakavarasa sezvamunoona.
51 Ọ bụladị Sameria emerughị ọkara mmehie niile i mere. I meela ihe arụ bara ụba karịa nke ha mere, si otu a gụọ ụmụnne gị ndị inyom ka ndị ezi omume site nʼihe ndị a niile nke ị mere.
Samaria harina kuita hafu yezvivi zvawakaita iwe. Iwe wakaita zvinhu zvinonyangadza kupfuura zvavakaita ivo, uye wakaita kuti vanunʼuna vako vange vakarurama nokuda kwezvinhu izvi zvawakaita iwe.
52 Gị onwe gị buru ihe ihere gị, nʼihi na omume gị ekpepụtala ụmụnne gị ndị inyom. Nʼihi na mmehie gị dị njọ, dịkwa ukwuu karịa nke ha, ha bụ ndị a gụrụ na ndị ezi omume karịa gị. Ya mere, ka ihere mee gị, burukwa ọnọdụ ihere gị, nʼihi na ị meela ka a gụọ ụmụnne gị ndị inyom dịka ndị ezi omume.
Takura kunyadziswa kwako iwe, nokuti wakavigira mununʼuna wako kururamisirwa. Nokuti zvivi zvako zvakanga zvichinyadzisa chose kupinda zvavo, ivo vanoratidzika kunge vakarurama kupfuura iwe. Saka zvino, chinyara uye zvitakurire nyadzi dzako, nokuti wakaita kuti mununʼuna wako ave akarurama.
53 “‘Ma otu ọ dị, aga m eme ka ọganihu nke Sọdọm na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke Sameria na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke gị dịghachikwa nʼetiti ha:
“‘Kunyange zvakadaro hazvo, ndichadzosazve pfuma yeSodhomu navanasikana varo neyeSamaria navanasikana varo, uye pfuma yako pamwe chete navo,
54 Ka i nwee ike bụrụ ọnọdụ ihere gị, ka ihere mekwa gị nʼihi ihe niile i mere, nʼịkasị ha obi.
kuitira kuti ugotakura nyadzi dzako ugonyara pane zvose zvawakaita uchivanyaradza.
55 Ọzọ ndị ụmụnne gị nwanyị bụ Sọdọm na Sameria na ụmụ ha ndị inyom ga-alọta nʼọnọdụ mbụ ha; gị na ụmụ gị ndị inyom ga-alọtakwa nʼọnọdụ mbụ unu.
Uye vanunʼuna vako, ivo Sodhomu navanasikana vake neSamaria navanasikana vake, uye iwe navanasikana vako muchadzokera pane zvavaiva kare.
56 Ma ị pụghị emeghe ọnụ gị kpọọ aha nwanne gị nwanyị bụ Sọdọm nʼụbọchị nganga gị,
Haungazomborevi nezvomununʼuna wako Sodhomu pazuva rokuzvikudza kwako,
57 tupu e kpughe ajọ omume gị. Ọ bụladị otu ahụ, ugbu a ị bụ ihe ịkwa emo nye ndị ada Edọm na ndị agbataobi ya niile, na ndị ada ndị Filistia. Ndị niile nọ gị gburugburu na-elelịkwa gị anya.
kuipa kwako kusati kwafukurwa. Kunyange zvino, uri kusekwa izvozvi navanasikana veEdhomu navavakidzani varo vose, uye vanasikana veFiristia, navose vakakupoteredza vanokushora.
58 Ị ga-anata ụgwọ ọrụ nke ịkwa iko gị, na ihe arụ ndị ọzọ ị na-eme. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Uchazvitakurira zvibereko zvounzenza hwako namabasa ako anonyangadza, ndizvo zvinotaura Jehovha.
59 “‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị, nʼihi na ị ledara iyi ahụ ị ṅụrụ anya site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ.
“‘Zvanzi naIshe Jehovha: Ndichakuitira zvakakufanira, nokuti wakazvidza mhiko dzangu nokuputsa sungano yangu.
60 Ma otu ọbụla o si dị, aga m edebezu nkwa ahụ niile m kwere gị mgbe ị dị na nwantakịrị. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ahụ dị nʼetiti mụ na gị guzosie ike ruo ebighị ebi.
Asi hazvo ndicharangarira sungano yandakaita newe pamazuva ouduku hwako, ndigosimbisa sungano isingaperi newe.
61 Mgbe ahụ, ị ga-echeta ụzọ gị niile, ma nwee ihere, mgbe m ga-ewere ụmụnne gị ndị inyom ndị ahụ tọrọ gị na ndị nke ị tọrọ nye gị ha dịka ụmụ, ma ọ bụghị nʼihi ọgbụgba ndụ m.
Ipapo ucharangarira nzira dzako ugonyora paunogamuchira vanunʼuna vako, vose vakuru kwauri uye navaduku kwauriwo. Ndichavapa kwauri savanasikana, asi kwete nokuda kwesungano yangu newe.
62 Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị guzosie ike, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Saka ndichasimbisa sungano yangu newe, uye uchaziva kuti ndini Jehovha.
63 Mgbe ahụ, aga m ekpuchiri gị ajọ omume niile bụ nke ị mere. Ihere ga-eme gị mgbe i chetara ndụ ọjọọ gị, ị gaghị emeghekwa ọnụ gị kwuo okwu nʼihi oke mweda nʼala gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’”
Ipapo, kana ndayanana newe pane zvose zvawakaita, ucharangarira ugonyara uye ugozorega kushamisa muromo wako nokuda kwokuninipiswa kwako, ndizvo zvinotaura Ishe Jehovha.’”

< Izikiel 16 >