< Izikiel 15 >

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Yehova anayankhulanso nane kuti,
2 “Nwa nke mmadụ, olee, ụzọ osisi vaịnị si pụọ iche site nʼalaka osisi ndị ọzọ dị nʼime oke ọhịa?
“Iwe mwana wa munthu, kodi mtengo wamphesa umapambana bwanji mtengo wina uliwonse? Nthambi zake zimapambana bwanji nthambi ina iliyonse.
3 A na-esi nʼime osisi ya were mepụta ihe ọbụla bara uru? Ọ bụ site na ya ka a na-esi emepụta osisi nke e ji ekonye ihe?
Mtengo umene uja nʼkupangira chiyani? Kodi anthu angathe kupangira chikhomo chokolekapo zinthu zawo?
4 Uru ha bara bụ iji ha menye ọkụ. Ma mgbe isi ya abụọ repịara, mgbe etiti ya rekwara ọkụ, o nwere ihe ọzọ mmadụ nwere ike iji ya mee?
Taonani, ndi nkhuni chabe zosonkhera moto. Ukaponyedwa pa moto monga nkhuni ndi kuyaka mbali zonse ndi kusanduka makala, kodi ungagwiritsidwe ntchito ina iliyonse?
5 Ọ bụrụ na ọ baghị uru mgbe o zuruoke, a ga-esi aṅa were ya mepụta ihe bara uru mgbe ọkụ repịasịrịla ya, ọ ghọọ unyi?
Ngati pamene unali wosapsa sukanatheka kuwugwiritsa ntchito, nanga bwanji utapserera ndi moto, adzawugwiritsa ntchito bwanji?
6 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, dịka m sitere nʼetiti ọhịa niile wepụta osisi vaịnị nye ka ọ bụrụ nkụ e ji emenye ọkụ, otu a ka m ga-esi mesoo ndị bi na Jerusalem.
“Nʼchifukwa chake Ambuye Yehova akuti, ‘Mtengo wamphesa ndidzawuponya mʼmoto monga ndimachitira ndi mitengo ina ya ku nkhalango. Momwemonso ndidzachita ndi anthu a ku Yerusalemu.
7 Aga m eche ihu m imegide ha. Ọ bụ ezie na ha esitela nʼọkụ pụta, ma ọkụ ga-erepịa ha. Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m guzoro onwe m megide ha.
Ndidzawalanga pamenepo ngakhale iwo atuluka pa moto, motowo udzawatenthabe. Ndipo pamene ndidzatsutsana nawo, mudzadziwa kuti Ine ndine Yehova.
8 Aga m emekwa ka ala ha tọgbọrọ nʼefu, nʼihi na ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
Ine ndidzasandutsa dziko kukhala chipululu chifukwa anthu akhala osakhulupirika, akutero Ambuye Yehova.’”

< Izikiel 15 >