< Izikiel 13 >

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Tena, neno la Yahwe likanijia, kusema,
2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị amụma nke Izrel ndị na-ebu amụma ugbu a, gwa ndị amụma ahụ na-ekwu ihe sitere ha nʼuche: ‘Nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị.
“Mwanadamu, tabiri dhidi ya manabii wanaotabiri katika Israeli, na uwaambie wale wanotabiri nje ya fikra zao wenyewe, 'Lisikilizeni neno la Yahwe.
3 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ahụhụ ga-adịrị ndị amụma nzuzu ndị na-agbaso mmụọ nke onwe ha, ndị ọ dịghị ihe ha na-ahụ.
Bwana Yahwe asema hivi: Ole wao manbii wajinga ambao wafwatao roho zao wenyewe, lakini wale wasioona kitu!
4 Gị Izrel, lee, ndị amụma gị niile dị ka nkịta ọhịa bi na mkpọmkpọ ebe.
Israeli, manabii zako wamekuwa kama mbeha kwenye aridhi iliyoharibiwa na vita.
5 Unu arịgobeghị na oghere jupụtara na mgbidi maọbụ rụzie mgbidi aja ndị ahụ maka nchekwa ndị Izrel ka o nwee ike kwudosie ike nʼụbọchị agha nke Onyenwe anyị.
Hamkwenda kwenye nyufa katika ukuta uliozunguka nyumba ya Israeli kwa ajili ya kuukarabati, ili kupigana katika vita katika siku ya Yahwe.
6 Ọhụ ha bụ ụgha, otu a, ịjụ ase ha bụkwa ụgha, ha na-asị, “Onyenwe anyị kwupụtara,” ebe Onyenwe anyị ezipụghị ha, ha na-agakwa nʼihu na-atụ anya ka o mezuo okwu ha.
Watu wameona uongo na kufanya utabiri wa uongo, wale wasemao, “Hivi na hivi ndvyo Yahwe asemavyo.” Yahwe hajawatuma, lakini hata hivyo wamewafanya watu kutumaini kwamba ujumbe wao utakuwa kweli.
7 Ọ bụghị ọhụ ụgha ka unu hụrụ, ọ bụghịkwa okwu ịjụ ase ụgha ka unu kwuru, mgbe unu na-asị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m ekwughị okwu?
Je hamkusikia maono ya uongo na kufanya utabiri wa uongo, ninyi msemao, “Hivi na hivi ndivyo Yahwe asemavyo” Wakati mimi mwenyewe sikuongea?'
8 “‘Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m ebibi unu nʼihi okwu ụgha na ọhụ ụgha unu niile. Edoola m onwe m imegide unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Kwa hiyo Bwana Yahwe asema hivi, 'Kwa sababu mmesikia maono ya uongo na kuwaambia uongo-kwa hiyo hivi ndivyo Bwana Yahwe asemavyo dhidi yenu:
9 Aka m ga-emegide ndị amụma niile ahụ bụ ndị na-ahụ ọhụ ụgha, na-agbakwa afa ụgha. Ha a gaghị esonye na otu ọgbakọ ndị m maọbụ bụrụ ndị agụnyekọrọ nʼakwụkwọ ndekọta aha ụlọ nke Izrel, ha agaghị abakwa nʼala ndị Izrel. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
Mkono wangu utakuwa juu yenu ninyi manabii mliodanganya maono na wale waliofanya unabii wa uongo. Hawatakuwepo kwenye kusanyiko la watu wangu, au kuandikishwa katika kumbukumbu ya nyumba ya Israeli; hawataenda kwenye nchi ya Israeli. Kwa kuwa mtajua yakwamba mimi ni Bwana Yahwe!
10 “‘Nʼihi na ha eduhiela ndị m, mgbe ha na-asị, “Udo,” ebe udo na-adịghị, nʼihi na mgbe e wuru mgbidi na-esighị ike, ndị amụma ndị a jara ha mma, werekwa nzu techie ya.
Kwa sababu hiyo, na kwa sababu wamewaongoza watu wangu kuwapotosha na kusema, “Amani!” wakati hakuna amani, wanajenga ukuta ambao wataupaka rangi ya chokaa.'
11 Ya mere, gwa ndị ahụ jiri nzu techie mgbidi ahụ na ọ ga-ada. Oke mmiri ozuzo nke ga-ezobiga oke ga-ezo, aga m ezitekwa mkpụrụ mmiri dị ukwuu nke ga-ada, na oke ifufe nke ga-akwada ya.
Waambie wale wanaopaka chokaa ukuta, 'Utaanguka chini; kutakuwa na mvua ya kufurika, na nitaleta mvua ya mawe kuufanya uanguke chini, na upepo wa dhoruba kupuliza hata kuuvunja chini.
12 Mgbe mgbidi ahụ dara, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ, “Olee ebe mgba ọcha ahụ ị ji techie ya dị?”
Tazama, ukuta utaanguka chini. Je wengine hawakuwaambia, “Iko wapi chokaa mliyoipaka juu yake?”
13 “‘Ya mere, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m eji oke ifufe nke ọnụma m, na oke mmiri ozuzo nke iwe m, ma oke akụmmiri nke oke iwe m mebie ya.
Kwa hiyo Bwana Yahwe asema hivi: Nitaleta upepo wa dhoruba katika ghadhabu yangu, na kutakuwa na mafuriko ya mvua kwenye ghadhabu yangu! Mvua ya mawe katika ghadhabu yangu itauharibu kabisa.
14 Aga m akwada mgbidi ahụ unu tere nzu, aga m emekwa ka ọ daruo ala nke ga-eme ka ahụ ntọala ya anya; ọ ga-adakwasịkwa unu, gwepịa unu. Mgbe ọ dara ọ ga-egbuchapụ unu niile; unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Kwa kuwa nitaurarua chini ukuta ambao mlioufunika kwa chokaa, na nitaubomoa hata kwenye nchi na kuifunua misingi yake. Hivyo utaanguka, nanyi nyote mtaangamizwa katikati ya huo.
15 Otu a ka m ga-esi gosipụta iwe m nʼebe mgbidi ahụ nọ, na nʼahụ ndị ahụ ji nzu techie ya. Aga m asị unu, “Mgbidi ahụ adịghịkwa, otu a ka ọ dịkwa ndị ahụ ji nzu techie ya,
Ndivyo nitakavouangamiza kwa ghadhabu yangu ukuta na wale walioupaka chokaa. Nitawaambia, “Ukuta hautaonekana tena, wala watu wanaoupaka chokaa-
16 bụ ndị amụma Izrel ndị ahụ buru amụma nye Jerusalem, ndị hụkwara ya ọhụ udo mgbe udo na-adịghị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”’
manabii wa Israeli wale waliotabiri kuhusu Yerusalemu na wale waliokuwa wameona amani kwa ajili yake. Lakini hakuna amani! -hivi ndivyo Bwana Yahwe asemavyo.”
17 “Ma ugbu a, gị nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe ụmụada ndị unu nọ, ndị nke na-ebu amụma dị ka o si si ha nʼobi pụta. Buo amụma megide ha
Hivyo wewe, mwanadamu, weka uso wako dhidi ya binti za watu wako wale wanaotabiri kwa akili zao wenyewe, na kutabiri dhidi yao.
18 sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Ahụhụ dịrị ndị inyom na-adụnye ọgwụ mgbaasị na nkwoji aka ha na-emekwa akwa mgbokwasị nke ikpuchi isi maka ndị mmadụ dị iche iche, iji raata ha. Unu si aṅaa chee na unu ga-echebe ndụ unu mgbe unu buru ụzọ mee ka ndị m maa nʼọnya?
Sema, 'Bwana Yahwe asema hivi: Ole kwa wanawake washonao hiziri kwenye kila sehemu ya mkono wao na kutengeza vitambaa vya shela kwa ajili ya vichwa vyao kwa kila kipimo, ili kuwinda watu. Je mtawawinda watu wangu ila kuokoa maisha yenu wenyewe?
19 Unu emeela ka m ghara ịdị nsọ nʼetiti ndị m, nʼihi mkpoju aka ọka balị na iberibe achịcha ole na ole. Nʼihi ya, unu emeela ka ha nwụọ bụ ndị na-ekwesighị ịnwụ anwụ. Unu edebekwala ha ndụ bụ ndị na-ekwesighị ịdị ndụ, site nʼokwu ụgha unu na-agwa ndị m, bụ ndị na-aṅa ntị nʼokwu ụgha.
Ninyi mmenikufuru mbele ya watu wangu kwa ajili ya makonzi ya shayiri na vipande vya mkate, kuwaua watu ambao hawakutakiwa kufa, na kuyalinda maisha ya wale ambao hawatakiwi kuendelea kuishi, kwa sababu ya uongo wenu kwa watu wangu walio wasikiliza.
20 “‘Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ana m emegide ọgwụ mgbaasị niile nke unu ji achụ nta mkpụrụobi ndị m dịka nnụnụ. Aga m adọwapụ ha site nʼaka unu, napụtakwa ndị m, bụ ndị unu ji nʼọnya dị ka nnụnụ e tinyere nʼụlọ akpara akpa.
Kwa hiyo Bwana Yahwe asema hivi: Niko kinyume dhidi ya hirizi ambazo mlizozitumia kuyakamata kwa hila maisha ya watu kana kwamba wamekuwa ndege. Naam, nitazichana kutoka kwenye mikono yenu; na wale watu mlio watega kama ndege-nitawaacha waende huru.
21 Aga m adọwa akwa mgbokwasị ọgwụ unu, napụta ndị m site nʼaka unu. Ha agaghị amakwa nʼọnya nke ike unu ọzọ. Nʼụzọ dị otu a unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Nitavichana mbali vitambaa vya shela na kuwaokoa watu wangu kutoka kwenye mikono yangu, kwa hiyo hawatategwa tena kwenye mikono yenu. Mtajua kwamba mimi ni Yahwe.
22 Nʼihi na ụgha unu emeela ka obi ndị ezi omume daa mba, mgbe ọ na-abụghị uche m na ihe dị otu a ga-eme. Ma unu emeela ka obi ndị ajọ omume sie ike site na nkwa ogologo ndụ unu kwere ha, mee ka ha ghara isite nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa ma zọpụta ndụ ha.
Kwa sababu mmeuvunja moyo wa mtu mwenye haki kwa uongo, ingawa hata mimi sikutamani kuvunjwa kwake moyo, na kwa sababu mmemtia moyo badala yake matendo ya mtu mwovu ili kwamba asitaweze kurudi kutoka kwenye njia yake kuokoa maisha yake-
23 Nʼihi nke a, unu agaghị ahụkwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ gbaa afa. M ga-anapụta ndị nke m site nʼaka unu. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
kwa hiyo hamtayaona tena maono ya uongo au kuendelea kufanya utabiri, kwa kuwa nitawaokoa watu wangu kutoka kwenye mkono wako. Nanyi mtajua kwamba mimi ni Yahwe.'”

< Izikiel 13 >