< Izikiel 11 >

1 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m mee ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama ụlọ Onyenwe anyị, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Nʼebe ahụ, nʼoghere nke ọnụ ụzọ ama ahụ, ahụrụ m iri mmadụ abụọ na ise. Ahụkwara m nʼetiti ha, Jaazanaya nwa Azoa na Pelataya nwa Benaya, bụ ndịisi ndị Izrel.
Ipapo Mweya wakandisimudza ukaenda neni pasuo reimba yaJehovha rakatarira kumabvazuva. Pamukova wesuo ipapo, pakanga pane varume makumi maviri navashanu, uye ndakaona pakati pavo Jaazania mwanakomana waAzuri naPeratia mwanakomana waBhenaya, vatungamiri vavanhu.
2 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị ikom na-agba izu ajọ ihe, na-enyekwa ndụmọdụ ọjọọ niile a na-enye nʼobodo a.
Jehovha akati kwandiri, “Mwanakomana womunhu, ava ndivo varume vanorangana zvakaipa nokupa mano akaipa muguta rino.
3 Ha na-asị, ‘Oge a ga-ewuzi ụlọ ndị ahụ ọ dịghị nso? Obodo a bụ ite igwe, anyị onwe anyị bụkwa anụ dị nʼime ya.’
Vanoti, ‘Ko, nguva haisati yasvika here yokuvaka dzimba? Guta rino ihari yokubikira, uye isu tisu nyama.’
4 Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma megide ha.”
Naizvozvo profita pamusoro pavo; profita, mwanakomana womunhu.”
5 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Onyenwe anyị bịakwasịrị m sị m kwuo, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: otu a ka unu na-ekwukwa, unu ndị ndu ụlọ Izrel, ma amaara m ihe unu bụ nʼuche.
Ipapo Mweya waJehovha wakauya pamusoro pangu, iye akanditaurira kuti nditi: “Zvanzi naJehovha: Ndizvo zvamunotaura, imi imba yaIsraeri, asi ndinoziva zvamunofunga mundangariro dzenyu.
6 Unu egbuola ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a, meekwa ka okporoụzọ ya jupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ.
Makauraya vanhu vazhinji muguta rino uye mukazadza nzira dzaro nevakafa.
7 “Nʼihi ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ji sị, ozu ndị ahụ niile tọgbọ nʼokporoụzọ obodo unu bụ anụ ndị ahụ unu gburu egbu, obodo a bụkwa ite. Ma aga m eme ka unu site nʼime ya pụta.
“Naizvozvo zvanzi naIshe Jehovha: Zvitunha zvamakandamo ndiyo nyama uye guta rino ndiyo hari, asi ini ndichakubudisai mariri.
8 Mma agha ahụ unu na-atụ egwu ya ka m ga-eme ka ọ bịakwasị unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
Munotya munondo, zvino munondo ndiwo wandichauyisa kuzokurwisai, ndizvo zvinotaura Ishe Jehovha.
9 Aga m esitekwa nʼetiti ya kpọpụta unu, were unu nyefee nʼaka ndị mba ọzọ, ma kpekwa unu ikpe.
Ndichakubudisai kunze kweguta ndigokuisai mumaoko avatorwa uye ndichakurangai.
10 Unu ga-ada site na mma agha. Ọ bụ nʼoke ala Izrel niile ka m ga-anọ kpee unu ikpe. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Muchaurayiwa nomunondo, uye ini ndichakutongai pamiganhu yaIsraeri. Ipapo muchaziva kuti ndini Jehovha.
11 E, obodo a agaghị abụrụ unu ite. Unu agaghị anọkwa nʼime ya dịka anụ. Aga m ekpe unu ikpe nʼoke ala Izrel niile.
Guta rino haringavi hari kwamuri, nemi hamungavi nyama mariri; ndichakutongai ini pamiganhu yeIsraeri.
12 Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na unu bụ ndị na-enupu isi site nʼiwu m na ụkpụrụ m. Ma unu na-agbaso nzọ ụkwụ nke mba ndị ahụ niile gbara unu gburugburu.”
Uye muchaziva kuti ndini Jehovha, nokuti hamuna kutevera mitemo yangu kana kuchengeta mirayiro yangu asi makafamba netsika dzendudzi dzakakupoteredzai.”
13 Mgbe m ka nọ na-ebu amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ. Mụ onwe m kpuo ihu m nʼala kwaa akwa sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị ga-ebibi ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel?”
Zvino ndakati ndichiprofita, Peratia mwanakomana waBhenaya akafa. Ipapo ndakawira pasi nechiso ndikachema zvikuru ndichiti, “Haiwa Ishe Jehovha! Ko, muchaparadza chose vakasara vaIsraeri here?”
14 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Shoko raJehovha rakasvika kwandiri, richiti,
15 “Nwa nke mmadụ, ụmụ nke nna gị, ọ bụladị ụmụnna gị, na ndị mgbapụta gị na ezinaụlọ Izrel niile, ọ bụ ha ka ndị bi na Jerusalem sịrị, ‘Ha esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ gaa ebe dị anya, ọ bụkwa anyị ka enyere ala nke a ka ọ bụrụ ihe nnweta anyị,’
“Mwanakomana womunhu, hama dzako, hama dzako dzeropa neimba yose yaIsraeri, ndivo vainzi navanhu veJerusarema, ‘Vari kure kwazvo naJehovha; nyika ino takaipiwa kuti ive yedu.’
16 “Nʼihi nke a, kwuo, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị, Nʼagbanyeghị na m zipụrụ ha gaa ebe dị anya nʼetiti mba dị iche iche, chụsakwaa ha nʼetiti ala dị iche iche, ma nwa mgbe nta, a bụụrụ m ha ebe dị nsọ nʼala niile ahụ bụ ebe ha gara.’
“Naizvozvo uti, ‘Zvanzi naIshe Jehovha: Kunyange ndakavaendesa kure pakati pendudzi uye ndikavaparadzira pakati penyika, asi kwechinguva chiduku ndakanga ndiri nzvimbo yavo tsvene munyika dzavakaenda.’
17 “Ya mere kwuo, ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m achịkọtakwa unu ọnụ ọzọ, site nʼobodo niile bụ ebe unu gbasara, nyeghachikwa unu ala Izrel.’
“Naizvozvo uti, ‘Zvanzi naIshe Jehovha: Ndichakuunganidzai kubva kundudzi ndigokudzosai kubva kunyika dzamakanga makaparadzirwa uye ndichakupaizve nyika yaIsraeri.’
18 “Ha ga-alọghachi nʼebe ahụ, sitekwa nʼetiti ya wezuga oyiyi ihe arụ niile, na arụsị niile bụkwa ihe arụ.
“Vachadzokera kwairi vagobvisa zvifananidzo zvayo zvose zvakaipisisa nezvifananidzo zvinonyangadza.
19 Aga m enyekwa ha otu obi, tinyekwa mmụọ ọhụrụ nʼime ha. Aga m ewepụ site nʼime ha obi kpọrọ nkụ ma nye ha obi nke anụ ahụ.
Ndichavapa mwoyo mumwe uye ndichaisa mweya mutsva mukati mavo; ndichabvisa mwoyo webwe mukati mavo ndigovapa mwoyo wenyama.
20 Nke a ga-eme ka ha soro ụkpụrụ m na iwu m niile, leziekwa anya idebe ha. Ha ga-abụ ndị nke m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.
Ipapo vachatevera mitemo yangu uye vachachenjerera kuchengeta mirayiro yangu. Vachava vanhu vangu, uye ini ndichava Mwari wavo.
21 Ma banyere ndị ahụ obi ha na-agbaso ihe ọjọọ na ihe niile rụrụ arụ, mmehie ha ka m ga-atụkwasị nʼisi ha; otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
Asi kana vari vaya vane mwoyo inotevera zvakaumbwa zvavo zvakaipisisa nezvifananidzo zvinonyangadza, ndichaburutsa pamisoro yavo chaiyo zvavakaita, ndizvo zvinotaura Ishe Jehovha.”
22 Mgbe ahụ, cherubim ndị ahụ weliri nku ha elu, wịịlu ndị ahụ dịkwa nʼakụkụ ha ma ebube nke Chineke nke Izrel guzokwa nʼelu ha.
Ipapo makerubhi namavhiri parutivi pawo akatambanudza mapapiro awo, uye kubwinya kwaMwari waIsraeri kwakanga kuri pamusoro pawo.
23 Ebube Onyenwe anyị sitere nʼetiti obodo ahụ rigoo, guzo nʼelu ugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
Kubwinya kwaJehovha kwakakwira kuchibva mukati meguta kukandomira pamusoro pegomo nechokumabvazuva kwaro.
24 Nʼime ọhụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu bubata m na Kaldịa, ebe ndị a dọkpụụrụ gaa mba ọzọ nọ. Otu a ka ọhụ m hụrụ si hapụ m.
Mweya wakandisimudza ukaenda neni kuna vakatapwa vari muBhabhironi muchiratidzo chakapiwa noMweya waMwari. Ipapo chiratidzo chandakanga ndaona chakakwidzwa kubva pandiri,
25 Agwakwara m ndị niile ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ ihe niile nke Onyenwe anyị gosiri m.
uye ndakaudza vakatapwa zvinhu zvose zvandakaratidzwa naJehovha.

< Izikiel 11 >