< Izikiel 1 >
1 O ruo nʼafọ nke iri atọ, nʼọnwa nke anọ, nʼụbọchị nke ise ya, mgbe mụ onwe m na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri na mba ọzọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, na e meghere eluigwe mee ka m hụ ọhụ dị iche iche site nʼaka Chineke.
Now it came to pass in the thirtieth year, in the fourth month, on the fifth day of the month, when I was in the midst of the captives by the river Chobar, the heavens were opened, and I saw the visions of God.
2 Nʼụbọchị nke ise nʼọnwa ahụ, ọ bụ nʼafọ nke ise mgbe a dọkpụụrụ eze Jehoiakin jee mba ọzọ,
On the fifth day of the month, the same was the fifth year of the captivity of king Joachin,
3 okwu Onyenwe anyị ruru Izikiel onye nchụaja nwa Buzi ntị, mgbe ọ nọ nʼakụkụ iyi ukwu Keba, nke dị nʼala ndị Kaldịa. Nʼebe ahụ kwa ka aka Onyenwe anyị nọ dịkwasị ya nʼahụ.
The word of the Lord came to Ezechiel the priest the son of Bud in the land of the Chaldeans, by the river Chobar: and the hand of the Lord was there upon him.
4 Elere m anya hụ oke ifufe nke si nʼugwu na-abịa, ahụkwara m oke igwe ojii na amụma nke na-egbuke egbuke; ìhè nke na-enwu nnọọ vaa gbara ya gburugburu. Etiti ọkụ ahụ nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amụke.
And I saw, and behold a whirlwind came out of the north: and a great cloud, and a fire infolding it, and brightness was about it: and out of the midst thereof, that is, out of the midst of the fire, as it were the resemblance of amber:
5 Ihe e kere eke anọ dị ndụ, nke yiri mmadụ nʼụdịdị ha, nọkwa nʼetiti oke ihe ahụ.
And in the midst thereof the likeness of four living creatures: and this was their appearance: there was the likeness of a man in them.
6 Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ, na nku anọ.
Every one had four faces, and every one four wings.
7 Ụkwụ ha guzoro kwem; ọbụ ụkwụ ha dịka nke nwa ehi, na-amụkekwa dịka bronz e hichara nke ọma.
Their feet were straight feet, and the sole of their foot was like the sole of a calf’s foot, and they sparkled like the appearance of glowing brass.
8 Nʼokpuru nku ha, ha nwere aka yiri aka mmadụ nʼakụkụ anọ ha niile. Otu a ka ihu ha na nku anọ dị.
And they had the hands of a man under their wings on their four sides: and they bad faces, and wings on the four sides,
9 Nku ha na-emetụ na nke ibe ha. Mgbe ha na-efe, ha na-eche ihu ha nʼotu ụzọ, ha adịghị agha anya ha nʼazụ mgbe ha na-aga.
And the wings of one were joined to the wings of another. They turned not when they went: but every one went straight forward.
10 Maka oyiyi ihu ha: Ha anọ nwere ihu mmadụ, nʼakụkụ aka nri ha nwere ihu ọdụm, nʼakụkụ aka ekpe ha bụ ihu ehi, onye ọbụla nwekwara ihu ugo.
And as for the likeness of their faces: there was the face of a man, and the face of a lion on the right side of all the four: and the face of an ox, on the left side of all the four: and the face of an eagle over all the four.
11 Otu ahụ ka ihu ha niile dị. Ha gbasara nku ha nʼelu, nke ọbụla nwere nku abụọ, otu nʼime nku ndị a na-emetụ nku nke ibe ya, ebe abụọ kpuchiri ahụ ha.
And their faces, and their wings were stretched upward: two wings of every one were joined, and two covered their bodies:
12 Ha niile gawara nʼihu. Ebe ọbụla mmụọ ahụ gara ka ha na-aga, na-eleghị anya nʼazụ.
And every one of them went straight forward: whither the impulse of the spirit was to go, thither they went: and they turned not when they went.
13 Nʼetiti ihe ndị a dị ndụ, e nwere ihe dịka icheku ọkụ na-enwu enwu, dịkwa ka ọwa na-enwu ọkụ. Ọkụ na-esi nʼetiti ihe ndị ahụ dị ndụ na-aga ihu na azụ, ọkụ ahụ nwupụrụ enwupụ, amụma eluigwe sikwa na ya egbupụta.
And as for the likeness of the living creatures, their appearance was like that of burning coals of fire, and like the appearance of lamps. This was the vision running to and fro in the midst of the living creatures, a bright fire, and lightning going forth from the fire.
14 Ihe ndị ahụ dị ndụ na-efegharị nʼebe a, na-efegharịkwa nʼebe nke ọzọ, dịka mgbe amụma na-egbu.
And the living creatures ran and returned like flashes of lightning.
15 Mgbe m na-ele ihe e kere eke dị ndụ ndị a anya, ahụrụ m ụkwụ ụgbọ agha anọ nke dị nʼala nʼokpuru ha. Onye ọbụla nwere nke ya.
Now as I beheld the living creatures, there appeared upon the earth by the living creatures one wheel with four faces.
16 Ụkwụ ụgbọala ahụ niile dị ka ihe e ji nkume na-egbu maramara a na-akpọ beril kpụọ. Nke ọbụla nʼime ha anọ yikwara ibe ya. Ha niile dịkwa ka wịịlu a kpụrụ tinye nʼetiti ụkwụ ụgbọala buru ibu.
And the appearance of the wheels, and the work of them was like the appearance of the sea: and the four had all one likeness: and their appearance and their work was as it were a wheel in the midst of a wheel.
17 Mgbe ha pụrụ, ha na-aga nʼakụkụ anọ nke ha chere ihu ha, ma ụkwụ ụgbọ agha ahụ adịghị echigharị echigharị mgbe ha na-aga.
When they went, they went by their four parts: and they turned not when they went.
18 Azụ ụkwụ ụgbọ agha ha dị elu, dịkwa egwu. Anya jupụtakwara nʼazụ ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ.
The wheels had also a size, and a height, and a dreadful appearance: and the whole body was full of eyes round about all the four.
19 Mgbe ihe ndị a dị ndụ fepụrụ gaa nʼihu, ụkwụ ụgbọala ndị ahụ dị nʼakụkụ ha na-eso ha. Mgbe ha feliri elu, ụkwụ ndị ahụ na-esokwa.
And when the living creatures went, the wheels also went together by them: and when the living creatures were lifted up from the earth, the wheels also were lifted up with them.
20 Ebe ọbụla mmụọ ha jere, ebe ahụ ka ha na-aga, ụkwụ ụgbọ agha ahụ na-esokwa ha, nʼihi na mmụọ nke anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ.
Whithersoever the spirit went, thither as the spirit went the wheels also were lifted up withal, and followed it: for the spirit of life was in the wheels.
21 Mgbe ha biliri, ndị ọzọ na-ebilikwa. Mgbe ha guzoro otu ebe, ndị ọzọ na-eguzokwa. Mgbe ha feliri elu, ụkwụ ụgbọala ahụ na-eso ha. Nʼihi na mmụọ anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼime ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ.
When those went these went, and when those stood these stood, and when those were lifted up from the earth, the wheels also were lifted up together, and followed them: for the spirit of life was in the wheels.
22 A tụsara ihe sara mbara dịka mbara eluigwe nʼelu isi ihe ndị ahụ dị ndụ. Ọ na-eyi egwu, ma na-egbukwa nweghenweghe dịka kristal.
And over the heads of the living creatures was the likeness of the firmament, as the appearance of crystal terrible to behold, and stretched out over their heads above.
23 Nʼokpuru ihe ahụ ka ha gbasapụrụ nku ha, ka ọ na-emetụ nke ibe ya. Ha niile nʼotu nʼotu nwere nku abụọ nke na-ekpuchi ahụ ya.
And under the firmament were their wings straight, the one toward the other, every one with two wings covered his body, and the other was covered in like manner.
24 Mgbe ha na-aga, nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ ebili mmiri na-amagharị amagharị. Mkpọtụ ahụ dịkwa ka ịda ụda nke olu Onye pụrụ ime ihe niile, ka olu iti mkpu nke usuu ndị agha. Mgbe ọbụla ha guzoro, ha na-achịtu nku ha.
And I heard the noise of their wings, like the noise of many waters, as it were the voice of the most high God: when they walked, it was like the voice of a multitude, like the noise of an army, and when they stood, their wings were let down.
25 Mgbe ahụ ha kwụsịrị mechie nku ha olu sitere nʼime ihe ahụ dịka mbara eluigwe nke dị nʼelu isi ha na-abịa.
For when a voice came from above the firmament, that was over their heads, they stood, and let down their wings.
26 Nʼelu mbara eluigwe ahụ, o nwere ihe dịka ocheeze e ji nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ safaia wuo. Otu onye, nke ụdịdị ya dị ka nwoke, nọkwasịkwara nʼelu oche ahụ.
And above the firmament that was over their heads, was the likeness of a throne, as the appearance of the sapphire stone, and upon the likeness of the throne, was a likeness as of the appearance of a man above upon it.
27 Site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya, ahụ onye ahụ na-egbu maramara dịka ọkụ. Site nʼụkwụ ya ruo nʼukwu ya, ọ dị ka ọkụ na-enwu enwu, ìhè nke na-enwukwa ka ọkụ gbara ya gburugburu.
And I saw as it were the resemblance of amber as the appearance of fire within it round about: from his loins and upward, and from his loins downward, I saw as it were the resemblance of fire shining round about.
28 Ìhè ahụ gbara ya gburugburu, nke a na-ahụ anya, dịkwa ka ìhè eke na egwurugwu, nke a na-ahụ anya nʼoge mmiri na-ezo. Otu a ka ebube Onyenwe anyị si gosi m onwe ya. Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala kpuo ihu m nʼala. Mgbe ahụ, anụrụ m olu onye na-ekwu okwu.
As the appearance of the rainbow when it is in a cloud on a rainy day: this was the appearance of the brightness round about.