< Ọpụpụ 9 >

1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Jekwuru Fero sị ya. ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.”
Then Yahweh said to Moses, “Go to Pharaoh and tell him, 'Yahweh, the God of the Hebrews, says this: “Let my people go so that they may worship me.”
2 Ọ bụrụ na ị jụ, ma gaa nʼihu igbochi ha,
But if you refuse to let them go, if you still keep them back,
3 aka Onyenwe anyị ga-ewebata oke ọrịa na-efe efe nke ga-abịakwasị igwe anụ ụlọ unu niile dị nʼubi. Ya bụ, ịnyịnya unu, na ịnyịnya ibu unu, na ịnyịnya kamel unu, na ehi unu, na atụrụ unu na ewu unu.
then Yahweh's hand will be on your cattle in the fields and on the horses, donkeys, camels, herds, and flocks, and it will cause a terrible disease.
4 Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti anụ ụlọ ndị Ijipt na nke ndị Izrel. Nʼihi ya, o nweghị anụ ụlọ ọbụla si nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel ga-anwụ.’”
Yahweh will treat Israel's cattle and Egypt's cattle differently and no animal that belongs to the Israelites will die.
5 Onyenwe anyị ekwuola oge nke a ga-amalite sị, “Echi ka Onyenwe anyị ga-eme ihe dị otu a nʼala a.”
Yahweh has fixed a time; he has said, “It is tomorrow that I will do this thing in the land.”'”
6 Nʼụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe anụ ụlọ niile dị nʼIjipt nwụrụ. Ma ọ dịghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ.
Yahweh did this the next day: All the cattle of Egypt died, but none of the Israelites' animals died, not one animal.
7 Mgbe ahụ Fero zipụrụ ndị mmadụ ndị gara chọpụta na o nweghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. Ma ọ bụladị mgbe ọ chọpụtara na nke a bụ eziokwu, ọ gbanweghị obi ya, ọ nọgidere jụ ikwe ka ndị Izrel laa.
Pharaoh investigated, and, behold, not even one animal of the Israelites died. But his heart was stubborn, so he did not let the people go.
8 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị, “Sitenụ nʼekwu e ji esi nri kporo ntụ nke Mosis ga-awụli elu nʼihu Fero.
Then Yahweh said to Moses and to Aaron, “Take some handfuls of ashes from a kiln. You, Moses, must throw the ashes up into the air while Pharaoh is watching.
9 Ntụ ahụ ga-efesasị, dịka uzuzu nʼala Ijipt niile. Ọ ga-ebute etuto nke ga-aghọ ọnya nʼahụ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ dị iche iche dị nʼala ahụ niile.”
They will become fine dust over all the land of Egypt. They will cause blisters and sores to break out on people and animals throughout all the land of Egypt.”
10 Mosis na Erọn kpooro ntụ gaa guzo nʼihu Fero. Mgbe Fero nọ na-ele anya Mosis wụliri ntụ ahụ elu. Ọ ghọrọ etuto, nke gbawara ghọọ ọnya nʼahụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ niile.
So Moses and Aaron took ashes from a kiln and stood in front of Pharaoh. Then Moses threw the ashes up into the air. The ashes caused blisters and sores to break out on people and animals.
11 Ndị majiki Ijipt enweghị ike iguzo nʼihu Mosis, nʼihi etuto ndị jupụtara ha nʼahụ dịka ọ dị nʼahụ ndị Ijipt ndị ọzọ.
The magicians could not resist Moses because of the blisters, because the blisters were on them and on all the other Egyptians.
12 Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike. Ọ jụrụ ige Mosis na Erọn ntị dịka Onyenwe anyị gwara Mosis na ọ ga-eme.
Yahweh hardened Pharaoh's heart, so Pharaoh did not listen to Moses and Aaron. This was just as Yahweh had said to Moses that Pharaoh would do.
13 Onyenwe anyị gwara Mosis ọzọ sị, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi gaa gwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.
Then Yahweh said to Moses, “Get up early in the morning, stand in front of Pharaoh, and say to him, 'Yahweh, the God of the Hebrews, says this: “Let my people go so that they may worship me.
14 Ma ọ bụghị ya, nʼoge a, aga m ezite ọrịa ọjọọ niile nke na-efe efe, ka ha bịakwasị gị, na ndị na-ejere gị ozi, na ndị Ijipt niile. Nke a ga-eme ka unu ghọta na ọ dịghị Onye ọzọ dịka m nʼelu ụwa niile.
For this time I will send all my plagues on you yourself, on your servants and your people. I will do this so that you may know that there is no one like me in all the earth.
15 Nʼihi na tupu oge a, agaara m esetipụ aka m, jiri ajọ ọrịa tie gị na ndị gị niile nke ga-egbuchapụ unu site nʼelu ụwa.
By now I could have reached out with my hand and attacked you and your people with disease, and you would have been eradicated from the land.
16 Ma ọ bụ nʼihi nke a ka m ji guzobe gị, ka m gosipụta ike m nʼebe ịnọ, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.
But it was for this reason I allowed you to survive: In order to show you my power, so that my name may be proclaimed throughout all the earth.
17 Ma ị nọ na-ebuli onwe gị elu megide ndị m, jụ na ha agaghị ala.
You are still lifting yourself up against my people by not letting them go.
18 Ya mere, nʼoge dịka oge a echi, aga m ezipu oke ifufe nke ya na akụmmiri igwe so nʼala Ijipt niile. Ụdị ifufe a adịbeghị mbụ nʼala Ijipt, malite nʼoge a tọrọ ntọala ya rute ugbu a.
Listen! Tomorrow about this time I will bring a very strong hail storm, such as has not been seen in Egypt since the day it was begun until now.
19 Ya mere, nye iwu ka a gaa ngwangwa nʼubi unu webata anụ ụlọ unu na ihe ndị ọzọ unu nwere nʼebe a ga-echebe ha, nʼihi na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-egbu mmadụ na anụ ụlọ ọbụla a hapụrụ nʼezi.’”
Now then, send men and gather your cattle and everything you have in the fields to a safe place. Every man and animal that is in the field and is not brought home—the hail will come down on them, and they will die.”'”
20 Ụfọdụ ndị na-ejere Fero ozi, ndị na-atụ okwu Onyenwe anyị egwu mere ngwangwa gaa dulata anụ ụlọ ha, na ndị ohu ha.
Then those of Pharaoh's servants who believed in Yahweh's message hurried to bring their slaves and cattle into the houses.
21 Ma ndị ahụ na-enweghị nrube isi nye okwu Onyenwe anyị hapụrụ ndị ohu ha nakwa anụ ụlọ ha nʼọhịa.
But those who did not take Yahweh's message seriously left their slaves and cattle in the fields.
22 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis, “Setịpụ aka gị nʼeluigwe. Nke a ga-eme ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so malite izokwasị ala Ijipt niile, na ụmụ mmadụ, na anụmanụ, na ihe niile a kụrụ nʼubi nʼIjipt.”
Then Yahweh said to Moses, “Reach out with your hand toward the sky so that there will be hail in all the land of Egypt, on people, on animals, and on all the plants in the fields throughout the land of Egypt.”
23 Mgbe Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼihu eluigwe, Onyenwe anyị zidatara egbe eluigwe na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so. Amụma egbe eluigwe chakwara nʼala. Ya mere, Onyenwe anyị zidatara oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so nʼala Ijipt.
Moses reached out with his staff toward the sky, and Yahweh sent thunder, hail, and lightning to the ground. He also rained hail on the land of Egypt.
24 Mkpụrụ mmiri dara, amụma gbukwara nʼihu nakwa nʼazụ. Nʼezie, ọ bụ oke ifufe dị njọ, ụdị nke a na-ahụtụbeghị nʼala Ijipt kemgbe ọ ghọrọ nnukwu mba.
So there were hail and lightning mixed with hail, very severe, such as had not been in all the land of Egypt since it became a nation.
25 Mkpụrụ mmiri ahụ tigburu ihe niile dị nʼọhịa, ma mmadụ ma anụmanụ niile dị nʼala Ijipt. O feturu ihe niile na-epu nʼubi, ma ahịhịa niile dị nʼosisi.
Throughout all the land of Egypt, the hail struck everything in the fields, both people and animals. It struck every plant in the fields and broke every tree.
26 Ma akụkụ ebe mkpụrụ mmiri ndị a na-erughị bụ naanị Goshen, ebe ụmụ Izrel bi.
Only in the land of Goshen, where the Israelites lived, was there no hail.
27 Mgbe ahụ Fero ziri ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. O kwupụtara nʼihu ha sị, “Nʼoge a, emehiela m. Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, mụ na ndị m bụ ndị mejọrọ.
Then Pharaoh sent men to summon Moses and Aaron. He said to them, “I have sinned this time. Yahweh is righteous, and I and my people are wicked.
28 Kpee ekpere rịọọ Onyenwe anyị nʼihi na oke mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe a ezuola. Aga m ekwe ka unu gaa, unu agaghị atụfukwa mgbe.”
Pray to Yahweh, because the mighty thunderbolts and hail are too much. I will let you go, and you will stay here no longer.”
29 Mosis gwara Fero sị ya, “Mgbe m si nʼobodo a pụọ, aga m esetipụ aka m nʼebe Onyenwe anyị nọ, egbe eluigwe a, na ifufe a nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-akwụsịkwa. Site na nke a, ị ga-amata na ụwa niile bụ nke Onyenwe anyị.
Moses said to him, “As soon as I leave the city, I will spread my hands out to Yahweh. The thunder will stop, and there will not be any more hail. In this way you will know that the earth belongs to Yahweh.
30 Ma amaara m na gị onwe gị na ndị na-ejere gị ozi adịghị atụ Onyenwe anyị Chineke egwu.”
But as for you and your servants, I know that you do not yet really honor Yahweh God.”
31 Oke ifufe ahụ nke ya na mkpụrụ mmiri so mebiri ihe a kụrụ nʼubi, dịka flakisi na ọka balị. Nʼihi na nʼoge a, ọka balị emenyela isi, flakisi etojuokwala maa ifuru.
Now the flax and the barley were ruined, for the barley was maturing in the ear, and the flax was in bloom.
32 Ma ifufe na mmiri ukwu ahụ emebighị ọka wiiti na spelti, nʼihi na ha achabeghị.
But the wheat and the spelt were not harmed because they were later crops.
33 Mosis hapụrụ Fero si nʼobodo ahụ pụọ. Ọ gbasapụrụ aka ya abụọ nʼihu Onyenwe anyị, egbe eluigwe na mkpụrụ mmiri ahụ kwụsịrị. Mmiri ozuzo kwụsịkwara izo nʼala ahụ.
When Moses had left Pharaoh and the city, he spread out his hands to Yahweh; the thunder and hail stopped, and the rain came down no more.
34 Mgbe Fero hụrụ na mmiri ozuzo na mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe akwụsịla, o mehiere ọzọ. Ya na ndị na-ejere ya ozi gara nʼihu nyịchie obi ha.
When Pharaoh saw that the rain, hail, and thunder had ceased, he sinned again and hardened his heart, together with his servants.
35 Ya mere, Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ jụrụ ikwere ka ụmụ Izrel pụọ, dịka Onyenwe anyị gwararịị Mosis.
Pharaoh's heart was hardened, so he did not let the people of Israel go. This was the way that Yahweh had said to Moses that Pharaoh would act.

< Ọpụpụ 9 >