< Ọpụpụ 8 >
1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Jekwuru Fero gwa ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru. Hapụ ndị m, ka ha gaa fee m ofufe.
上主又對梅瑟說:「你去見法朗向他說:上主這樣說:你該放我的百姓走,好叫他去崇拜我。
2 Ọ bụrụ na ị jụ ịhapụ ha ka ha gaa, aga m eme ka awọ jupụta nʼala Ijipt niile.
你若拒絕不放,我要用蝦蟆打擊你的全境。
3 Osimiri Naịl ga-ejupụta nʼawọ. Ha ga-abata nʼụlọeze gị na nʼime ọnụụlọ ndina gị, ma nʼelu ihe ndina gị, ma nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, ma nʼụlọ ndị gị niile, na nʼebe a na-esi nri, ma nʼime ihe e ji agwakọta ụtụ ọka.
河中要滋生蝦蟆,牠們要上來進入你的宮殿和臥室,爬上你的床榻,進入你臣僕和你百姓的房屋,進入你的爐灶和搏麵盆。
4 Awọ ndị a ga-arịgokwa nʼahụ gị, na nʼahụ ndị gị, na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi.’”
這些蝦蟆要爬到你、你百姓、你臣僕的身上。」
5 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Gwa Erọn, ‘Setịpụ aka gị ya na mkpanaka gị nʼelu osimiri niile, na mmiri nta na ọdọ mmiri ndị Ijipt, mee ka awọ jupụta ala Ijipt niile.’”
上主對梅瑟說:「你給亞郎說:將你手中的棍杖伸在河、溝渠和池沼之上,使蝦蟆上到埃及地上。」
6 Erọn setịpụrụ aka nʼelu mmiri niile nke Ijipt, awọ pụtara kpuchie ala ahụ niile.
亞郎將手一伸在埃及的水上,蝦蟆就上來遮蓋了埃及地。
7 Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ihe ahụ Mosis na Erọn mere. Ha mekwara ka awọ jupụta ala ahụ niile.
而巫士也用巫術作了同樣的事,使蝦蟆上到了埃及地。
8 Fero kpọrọ Mosis na Erọn rịọọ ha sị, “Rịọọnụ Onyenwe anyị ka o wepụrụ mụ na ndị m awọ ndị a. Emesịa aga m ekwe ka ndị gị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.”
法朗召梅瑟和亞郎來說:「請你們祈求上主,使這些蝦蟆離開我和我的人民,我必放這百姓去祭獻天主。」
9 Mosis zaghachiri Fero sị, “Gị ka ọ dịrị ịgwa m mgbe m ga-arịọ arịrịọ a nʼisi gị na nʼisi ndị gị, ka e wezuga awọ ndị a site nʼụlọ unu, ma hapụ naanị ndị nọ nʼosimiri Naịl.”
梅瑟回答法朗說:「請給我指定,叫我幾時為你,為你的臣僕和你的人民祈求,使蝦蟆離開你和你的宮殿,而只留在河中! 」
10 Mgbe ahụ Fero sịrị Mosis, “Achọrọ m ka i mee ya echi.” Mosis zaghachiri Fero sị, “Ọ dị mma, ka ọ dịrị dịka i kwuru. Mgbe ahụ, ị ga-amata na o nweghị onye dịka Onyenwe anyị Chineke anyị.
法朗說:「明天。」梅瑟回答說:「就照你說的話作,為叫你知道,沒有誰能相似上主,我們的天主。
11 Awọ ndị a niile ga-apụ site nʼebe ị nọ, na site nʼụlọ gị na site nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi na site nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ọ bụ naanị nʼosimiri Naịl ka ha ga-anọ.”
蝦蟆必要離開你,你的宮殿,你的臣僕和你的人民,而只留在河中。」
12 Mgbe Mosis na Erọn sitere nʼụlọ Fero pụọ, Mosis kpọkuru Onyenwe anyị ka o wepụ awọ ndị a o mere ka ha bịakwasị Fero.
於是梅瑟和亞郎離開法朗走了。梅瑟遂呼求上主,除去加於法朗的蝦蟆。
13 Onyenwe anyị mere ihe Mosis rịọrọ. Awọ ndị ahụ niile nwụrụ nʼime ụlọ, na nʼama, na nʼọhịa.
上主就照梅瑟所求的作了;在房屋、院庭和田地中的蝦蟆都死了。
14 E kpokọtara ozu awọ ndị a niile nʼebe dị iche iche. Isi ọjọọ ha wetara nʼala ahụ dị egwu.
人把蝦蟆堆成堆,遍地發出腥臭。
15 Ma mgbe Fero hụrụ na awọ ndị a anwụchaala, o mechiri obi ya jụ ige Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme.
法朗見災情減輕,又硬了心,不肯聽梅瑟和法郎的話,正如上主所說。第三災、蚊子
16 Ya mere, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn, setịpụ mkpanaka gị, tie nʼaja nke ala nʼala Ijipt niile, aja ya ga-aghọ anwụ nta nke na-ata ata.”
上主又對梅瑟說:「你給亞郎說:伸你的棍杖擊打地上的塵土,塵土要在埃及全地變成蚊子。」
17 Mosis na Erọn mere nke a. Mgbe Erọn setịpụrụ aka tie mkpanaka ya nʼelu ala, anwụ nta jupụtara nʼala Ijipt niile, nʼahụ ndị mmadụ, na nʼahụ anụmanụ ha. Ndanda ndị a jupụtakwara nʼuzuzu niile dị nʼala ahụ.
他們便照樣作了;亞郎伸手,用棍杖擊打地上塵土,蚊子就來到人和牲畜的身上。埃及全國的塵土都變成了蚊子。
18 Ndị Ijipt na-eme majiki gbalịrị iji ihe nzuzo ha mee otu ihe ahụ Erọn mere, ma ha enweghị ike ime ka anwụ nta ọbụla pụta. Ebe ọ bụ na anwụ nta ndị a jupụtara nʼahụ mmadụ na nʼahụ anụmanụ niile.
巫士也想照樣用巫術產生蚊子,但都沒有成功。蚊子仍留在人和牲畜的身上。
19 Naanị ihe ndị na-eme majiki gwara Fero bụ, “Nke a bụ akaọrụ Chineke.” Ma Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ chọghị ige, ọ bụladị ndị majiki ya ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme.
巫士向法朗說:「這是天主的手指。」但是法朗還是心硬,不肯聽從梅瑟和亞郎,正如上主所說。第四災、狗蠅
20 Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi jekwuru Fero. Mgbe ọ ga-aga nʼosimiri, gwa ya okwu sị, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.
上主對梅瑟說:「明天早晨,法朗往水邊去的時候,你要去見他對他說:上主這樣說:放我的百姓去崇拜我罷!
21 Ọ bụrụ na ị chọghị ime otu a, aga m eme ka igwe ijiji jupụta nʼala Ijipt niile. Ha ga-ejupụta gị nʼahụ na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi, na nʼahụ ndị gị niile, na nʼime ụlọ unu niile.
你若不放走我的百姓,看,我要叫狗蠅到你和你臣僕,以及你人民身上,進入你的宮殿,埃及人的房屋和他們所在的地方都要充滿狗蠅。
22 “‘Nʼụbọchị ahụ, igwe ijiji ndị a agaghị emetụ ndị nọ na Goshen ebe ndị m bi. Mgbe ahụ ka ị ga-amata na mụ bụ Onyenwe anyị bịara ije nʼala a.
那時,我要使我百姓所住的哥笙地例外,在那裏沒有狗蠅,為叫你知道,在地上只有我是上主。
23 Aga m emekwa ka ọ pụta ìhè na o nwere ihe dị iche nʼetiti ndị m na ndị gị. Ihe ịrịbama a ga-emezukwa echi.’”
我要將我的百姓同你的百姓分開。明早必發生這奇事。」
24 Nʼechi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe ijiji dị egwu nʼọnụọgụgụ bịara nʼala Ijipt, jupụta nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị niile na-ejere ya ozi, na nʼala Ijipt niile. E mere ka ala Ijipt bụrụ ihe e ji ijiji mebie.
上主就這樣行了:成群的狗蠅進了法朗的宮殿和他臣僕的房屋,埃及全境的土地都為狗蠅毀壞。
25 Mgbe ihe ndị a na-eme, Fero kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha okwu sị, “Gaanụ chụọrọ Chineke unu aja, ma ka ọ bụrụ nʼala Ijipt.”
法朗又召梅瑟和亞郎來說:「你們去,在此地祭獻你們的天主! 」
26 Mosis zaghachiri Fero sị, “Nke ahụ abụghị ihe ziri ezi, nʼihi na aja anyị na-aga ịchụrụ Onyenwe anyị Chineke anyị bụ ihe rụrụ arụ nʼanya ndị Ijipt. Ọ bụrụ na anyị achụọ aja a nʼihu ha, ha ga-eji nkume tugbuo anyị.
梅瑟回答說:「決不能這樣行,因為我們給上主我們的天主所獻的祭物,是埃及人視為不可侵犯的。若是我們在埃及人前祭殺他們視為不可侵犯的東西,他們豈不用石頭打死我們﹖
27 Anyị ga-aga njem ụbọchị atọ nʼime ọzara gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja, dịka o nyere anyị iwu ka anyị mee.”
我們要走三天的路程,到曠野裏給上主我們的天主獻祭,全照他吩咐我們的。」
28 Fero zaghachiri ha sị, “Aga m ekwenye ka unu ga chụọrọ Onyenwe anyị Chineke unu aja nʼọzara, ma unu agaghị aga ebe dị anya. Ugbu a, kperenụ m ekpere.”
法朗回答說:「我讓你們到曠野裏給上主你們的天主獻祭,但是不可走的太遠。也請你們為我祈禱。」
29 Mosis zara Fero sị ya, “Ngwangwa m si nʼihu gị pụọ, aga m arịọ Onyenwe anyị arịrịọ. Echi, a ga-esite nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị na-ejere ya ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile wezuga ijiji ndị a. Ọ ga-adị mkpa na Fero ga-elezi anya hapụ ịghọ aghụghọ ọzọ site ịjụ ka ụmụ Izrel gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.”
梅瑟說:「我現在辭別你去祈求上上主,明天狗蠅將會離開陛下,你的臣僕和你的人民,但希望陛下不再欺騙,不放百性去給上主獻祭。」
30 Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Fero pụọ rịọọ Onyenwe anyị ka o mee ka ijiji ndị a gabiga.
於是梅瑟離開法朗去祈求上主。
31 Onyenwe anyị mere dịka Mosis rịọrọ. Ijiji ndị a sitere nʼụlọ Fero na ụlọ ndị na-ejere ya ozi na ụlọ ndị Ijipt niile pụọ. O nwekwaghị ijiji ọ bụla fọdụrụ nʼala ahụ.
上主便照梅瑟祈求的行了,叫狗蠅離開法朗、他的臣僕和人民,一個也沒有留下。
32 Ma nʼoge a, Fero gara nʼihu ime ka obi ya sie ike. O kweghị ka ụmụ Izrel laa.
但是這一次法朗還是心硬,不肯放走百姓。