< Ọpụpụ 5 >

1 Emesịa, Mosis na Erọn jekwuuru Fero guzo nʼihu ya gwa ya okwu sị, “Ihe a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m mmemme dị nsọ nʼime ọzara.’”
Emva kwalokho-ke uMozisi loAroni bahamba bathi kuFaro: Itsho njalo iNkosi uNkulunkulu wakoIsrayeli: Bayekele abantu bami bahambe, bangigcinele umkhosi enkangala.
2 Fero zara sị, “Onye ka Onyenwe anyị bụ m ga-eji gee ntị nʼolu ya ịhapụ ụmụ Izrel ka ha si nʼebe a pụọ? Amaghị m onye ọ bụ, agaghị m ekwekwa ka Izrel gaa ebe ọbụla.”
Kodwa uFaro wathi: Ingubani iNkosi ukuthi ngilalele ilizwi layo, ngiyekele uIsrayeli ahambe? Kangiyazi iNkosi, futhi kangiyikumyekela uIsrayeli ahambe.
3 Ha zara sị, “Chineke ndị Hibru zutere anyị. Biko kwere ka anyị gaa njem ụbọchị atọ nʼime ọzara nọọ nʼebe ahụ chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja. Ọ bụrụ na anyị ajụ ige ntị nʼolu ya, ọ ga-eji ọrịa ọjọọ maọbụ mma agha kpochapụ anyị.”
Basebesithi: UNkulunkulu wamaHebheru uhlangane lathi; ake usiyekele sihambe uhambo lwensuku ezintathu enkangala, siyihlabele iNkosi uNkulunkulu wethu, hlezi isehlele ngomatshayabhuqe wesifo kumbe ngenkemba.
4 Eze Ijipt zara ha sị, “Mosis na Erọn, gịnị mere unu ji na-ewepụ ụmụ Izrel aka site nʼọrụ ha? Laghachinụ nʼọrụ unu!”
Kodwa inkosi yeGibhithe yathi kubo: Kungani, Mozisi loAroni, lisusa abantu emisebenzini yabo? Yanini emithwalweni yenu!
5 Fero gara nʼihu sị, “Lee, ka ndị obodo a si dị ọtụtụ ugbu a, ihe unu na-eme bụ naanị igbochi ha ịrụ ọrụ ha.”
UFaro wasesithi: Khangelani, abantu belizwe sebebanengi, kanti liyabaphumuza emithwalweni yabo.
6 Nʼụbọchị ahụ kwa, Fero nyere ndị nlekọta ụmụ Izrel na ndị o mere ndịisi nʼebe ụmụ Izrel nọ iwu sị,
Ngalolosuku uFaro waselaya abaqhubi besibhalo besizwe lezinduna zaso, esithi:
7 “Unu enyekwala ụmụ Izrel ahịhịa ha ga-eji kpụọ brik dịka unu na-eme nʼoge gara aga. Kama, ha ga-achọta ahịhịa ahụ nʼonwe ha.
Lingabe lisabanika abantu amahlanga okwenza izitina njengamandulo; kabahambe bona bayezibuthela amahlanga;
8 Ọzọ, meenụ ka ọnụọgụgụ brik ha na-akpụ dịrị ka ọ dị na mbụ, unu emela ka ọ dịrị ala. Ha bụ ndị umengwụ. Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, ‘Ka anyị gaa nʼọzara gaa chụọrọ Chineke anyị aja.’
lenani lezitina abalenze mandulo lizabamisela lona, lingaphunguli kulo; ngoba bayavilapha; yikho bekhala besithi: Siyekeleni siyehlabela uNkulunkulu wethu.
9 Nyenụ ha ọrụ dị ike, nke ga-ezi ha na ha ekwesighị ịṅa ntị nʼokwu ụgha Mosis na Erọn na-ekwuru ha.”
Yenzani umsebenzi ube nzima kakhulu phezu kwamadoda, ukuze basebenze kuwo, bangalaleli amazwi enkohliso.
10 Ndị na-achị ndị ohu na ndị nlekọta jekwuuru ụmụ Izrel sị ha, “Ihe a ka Fero kwuru: ‘Agaghị m enyekwa unu ahịhịa ọzọ.
Abaqhubi besibhalo babantu baphuma, lezinduna zabo, bakhuluma ebantwini besithi: Utsho njalo uFaro: Kangiyikulinika amahlanga;
11 Gaanụ chọtara onwe unu okporo ahịhịa ebe ọbụla unu nwere ike ịchọta ya, ma nke a agaghị eme ka e gbubilata ọrụ unu kwesiri ịrụ.’”
hambani lina, lizithathele amahlanga lapho elingawathola khona; kodwa umsebenzi wenu kakuyikuphungulwa lutho kuwo.
12 Ya mere ndị ha gbasasịrị nʼala Ijipt niile ịchịkọta okporo ahịhịa ha ji akpụ brik.
Abantu basebehlakazeka elizweni lonke leGibhithe ukuze babuthe izidindi zibe ngamahlanga.
13 Ndị na-achị ha nọgidere na-akwagide ha sị ha, “Rụchaanụ ọrụ unu kwesiri ịrụ nʼụbọchị dịka unu si arụ ya mgbe a na-enye unu ahịhịa.”
Abaqhubi besibhalo babahaluzelisa besithi: Qedani imisebenzi yenu, umlandu wosuku ngosuku lwawo, njengamhla kulamahlanga.
14 Ndịisi ọrụ Fero malitere iti ndị Izrel ha họpụtara maka inyere ha aka ilekọta ndị ọrụ ihe, na-ajụ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu akpụtaghị oke ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụta ụnyaahụ maọbụ taa?”
Njalo izinduna zabantwana bakoIsrayeli, abaqhubi besibhalo bakaFaro abababekela zona, zatshaywa, kuthiwa: Kaliqedanga ngani umsebenzi wenu omisiweyo wokwenza izitina njengamandulo, layizolo lalamuhla?
15 Mgbe ahụ, ndịisi ọrụ ndị Izrel bịakwutere Fero kwaara ya akwa sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-emeso ndị ohu gị mmeso?
Izinduna zabantwana bakoIsrayeli zasezisiza, zakhala kuFaro zathi: Wenzelani kanje ezincekwini zakho?
16 Ọ dịghị okporo ahịhịa a na-enye ndị ohu gị, ma ha na-asị anyị, ‘Kpụọnụ brik!’ A na-etikwa ndị ohu gị ihe, ma ịta ụta ekwesighị ịdịrị anyị kama ịta ụta dịrị ndị gị.”
Amahlanga kawanikwa inceku zakho, kanti bathi kithi: Yenzani izitina. Khangela-ke, inceku zakho ziyatshaywa; kodwa icala ngelabantu bakho.
17 Fero zaghachiri ha sị, “Ndị umengwụ! Nʼezie ndị umengwụ ka unu bụ. Ọ bụ ya mere unu ji nọgide na-asị, ‘Ka anyị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.’
Kodwa wathi: Lina lingamavila, lingamavila; ngalokhu lithi: Siyekeleni siyehlabela iNkosi.
18 Laghachinụ azụ ugbu a nʼọrụ unu. A gaghị enye unu okporo ahịhịa ọbụla. Ma unu ga-arụpụtarịrị ọnụọgụgụ brik dị ka a chọrọ nʼaka unu.”
Khathesi-ke hambani, lisebenze; kodwa amahlanga kaliyikuwanikwa, kanti lizaletha inani lezitina.
19 Ndịisi ọrụ ụmụ Izrel ghọtara na ha nọ na nsogbu mgbe a gwara ha okwu sị ha, “Unu ga-akpụtarịrị ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụ kwa ụbọchị.”
Izinduna zabantwana bakoIsrayeli zasezibona ukuthi zazisebubini, nxa kuthiwa: Kaliyikuphungula ezitineni zenu, umlandu wosuku ngosuku lwawo.
20 Mgbe ha si nʼihu Fero pụọ, ha zutere Mosis na Erọn ebe ha nọ na-eche ha.
Zasezihlangana loMozisi loAroni ababemi ukubahlangabeza ekuphumeni kwabo kuFaro;
21 Ndị nlekọta ọrụ ndị a gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ka Onyenwe anyị lee unu anya ma kpee unu ikpe. Unu emeela ka anyị bụrụ ihe na-esi ajọ isi nʼihu Fero na ndị na-ejere ya ozi. Unu etinyela mma agha nʼaka ha nke ha ga-eji gbuo anyị.”
zasezisithi kubo: INkosi ilibone yahlulele; ngoba lenze iphunga lethu libe livumba emehlweni kaFaro lemehlweni enceku zakhe; linike inkemba esandleni sabo ukuze basibulale.
22 Mgbe ahụ Mosis laghachikwuru Onyenwe anyị jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji butere ndị a nsogbu? Gịnị mere i ji zite m?
UMozisi wasebuyela eNkosini wathi: Nkosi, wenzeleni okubi kulesisizwe? Kungani ungithumile?
23 Nʼihi na site na mgbe m jekwuuru Fero gwa ya okwu nʼaha gị, o meela ka nsogbu dakwasị ndị a, ma ị napụtabeghị ndị gị.”
Ngoba selokhu ngaya kuFaro ukukhuluma ebizweni lakho, wenzile okubi kulesisizwe; futhi kawusikhululanga lokusikhulula isizwe sakho.

< Ọpụpụ 5 >