< Ọpụpụ 40 >

1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Yahweh parla à Moïse, en disant:
2 “Guzobe ụlọ nzute ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ.
" Le premier jour du premier mois, tu dresseras la Demeure, la tente de réunion.
3 Dọnye igbe ọgbụgba ndụ nke Ihe Ama ahụ nʼime ya. Konyekwa akwa mgbochi nke ga-ezo ya.
Tu y placeras l'arche du témoignage, et tu couvriras l'arche avec le voile.
4 Webata tebul ahụ, na ngwongwo dị nʼelu ya, webatakwa ihe ịdọba oriọna ahụ. Mụnyekwa oriọna ndị ahụ ọkụ.
Tu apporteras la table et tu y disposeras ce qui doit la garnir. Tu apporteras le chandelier et tu poseras dessus ses lampes.
5 Doo ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nke e mere maka ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nke kwesiri ịdị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ nzute ahụ.
Tu placeras l'autel d'or pour le parfum devant l'arche du témoignage, et tu mettras le voile à l'entrée de la Demeure.
6 “Doo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nʼihu ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọ nzute bụ ụlọ ikwu ahụ.
Tu placeras l'autel des holocaustes devant l'entrée de la Demeure, de la tente de réunion.
7 Dọnye efere ukwu ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja ahụ. Gbajukwaa ya mmiri.
Tu placeras la cuve entre la tente de réunion et l'autel, et tu y mettras de l'eau.
8 Guzobe ogige gburugburu ụlọ nzute ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ogige ahụ.
Tu dresseras le parvis à l'entour, et tu mettras la tenture à la porte du parvis.
9 “Were mmanụ nsọ ahụ tee ụlọ nzute ahụ, ya na ihe niile dị nʼime ya, si otu a doo ha nsọ ma ngwongwo ịchọ mma ya niile. Ọ ga-abụ ebe dị nsọ.
" Tu prendras l'huile d'onction, tu en oindras la Demeure et tout ce qu'elle renferme; tu la consacreras avec tous ses ustensiles, et elle sera sainte.
10 Mgbe ahụ, tee ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ mmanụ ya na ihe ya niile e ji eje ozi. Doo ebe ịchụ aja ahụ nsọ, ọ ga-abụkwa ebe dịkarịsịrị nsọ.
Tu oindras l'autel des holocaustes et tous ses ustensiles; tu consacreras l'autel, et l'autel sera très saint.
11 Tekwaa efere ukwu ịsa mmiri ahụ na ụkwụ ya mmanụ. Doo ha nsọ.
Tu oindras la cuve avec sa base, et tu la consacreras.
12 “Kpọbata Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Jiri mmiri saa ha ahụ nʼebe ahụ.
" Tu feras avancer Aaron et ses fils près de l'entrée de la tente de réunion, et tu les laveras avec de l'eau.
13 Yikwasị Erọn uwe nsọ ya. Tekwaa ya mmanụ, ido ya nsọ maka i jere m ozi dịka onye nchụaja.
Puis tu revêtiras Aaron des vêtements sacrés, tu l'oindras et tu le consacreras, et il sera prêtre à mon service.
14 Mekwaa ka ụmụ ya ndị ikom bịaruo nso, yikwasịkwa ha uwe ime ahụ.
Tu feras approcher ses fils et, les ayant revêtus des tuniques,
15 Tee ha mmanụ dịka i si tee nna ha, ime ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Otite mmanụ ha ga-abụ nye ọrụ nchụaja ha nke ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
tu les oindras comme tu auras oint leur père, et ils seront prêtres à mon service. Cette onction leur conférera le sacerdoce à perpétuité parmi leurs descendants. "
16 Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ime.
Moïse fit tout ce que Yahweh lui avait ordonné; il fit ainsi.
17 O ruo, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ, nʼafọ nke abụọ, e mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ.
Le premier jour du premier mois de la seconde année, la Demeure fut dressée.
18 Mosis mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ site nʼitinye mbudo ibo ya niile, ụkwụ ya na mkpọrọ osisi ya niile nʼọnọdụ ha.
Moïse dressa la Demeure; il en posa les socles, il en plaça les planches et les traverses, en dressa les colonnes.
19 Emesịa, ọ gbasapụrụ ihe mkpuchi nʼelu ụlọ nzute ahụ, tụkwasịkwa okpukpu ihe mkpuchi nke abụọ nʼelu ya dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu.
Il étendit la tente sur la Demeure, et mit par-dessus la couverture de la tente, comme Yahweh l'avait ordonné à Moïse.
20 O tinyere Ihe Ama nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Emesịa, ọ tụkwasịkwara mkpara e ji ebu igbe ahụ nʼakụkụ igbe ahụ, were okwuchi igbe ahụ, nke bụ Oche Ebere ahụ, kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
Il prit le témoignage et le plaça dans l'arche; il mit les barres à l'arche et posa le propitiatoire au-dessus de l'arche.
21 Emesịa, o bubatara igbe ahụ nʼime ụlọ nzute ahụ, kwụnyekwa akwa mgbochi nke mgbochi, kewapụ igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
Il porta l'arche dans la Demeure; et, ayant mis le voile de séparation, il en couvrit l'arche du témoignage, comme Yahweh l'avait ordonné à Moïse.
22 Mosis dọnyere tebul ahụ nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi ahụ.
Il plaça la table dans la tente de réunion, au côté septentrional de la Demeure, en dehors du voile,
23 Ọ dọkwasịrị achịcha ahụ a na-edo nʼihu Onyenwe anyị nʼelu tebul ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
et il y disposa les pains devant Yahweh, comme Yahweh l'avait ordonné à Moïse.
24 Ọ dọkwasịrị ihe ịdọba oriọna ahụ nʼime ụlọ nzute nʼakụkụ tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
Il plaça le chandelier dans la tente de réunion, vis-à-vis de la table, au côté méridional de la Demeure,
25 Ọ mụnyere oriọna ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka Onyenwe anyị si nye nʼiwu.
et il y posa les lampes devant Yahweh, comme Yahweh l'avait ordonné à Moïse.
26 Mosis debere ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nʼime ụlọ nzute nso nso ebe akwa mgbochi ahụ dị,
Il plaça l'autel d'or dans la tente de réunion, devant le voile,
27 surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ya, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
et il y fit brûler l'encens, comme Yahweh l'avait ordonné à Moïse.
28 Ọ kwụbara akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
Il plaça le rideau à l'entrée de la Demeure.
29 Debekwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nso ọnụ ụzọ ịba ụlọ nzute ahụ. O surekwara aja nsure ọkụ nʼelu ya, na aja onyinye mkpụrụ ọka dịka Onyenwe anyị si nye ya nʼiwu.
Il plaça l'autel des holocaustes à l'entrée de la Demeure, de la tente de réunion, et il y offrit l'holocauste et l'oblation, comme Yahweh l'avait ordonné à Moïse.
30 Ọ dọbara efere ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja, wụjuo ya mmiri, maka iji sachaa ihe.
Il plaça la cuve entre la tente de réunion et l'autel, et il y mit de l'eau pour les ablutions;
31 Mosis, na Erọn, na ụmụ ya ndị ikom na-eji ya akwọcha aka ha, sakwaa ụkwụ ha.
Moïse, Aaron et ses fils s'y lavèrent les mains et les pieds.
32 Mgbe ọbụla ha na-abanye nʼụlọ nzute na mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja, ha na-asacha, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.
Lorsqu'ils entraient dans la tente de réunion et qu'ils s'approchaient de l'autel, ils se lavaient, comme Yahweh l'avait ordonné à Moïse.
33 Mosis guzobere ogige ahụ gburugburu ụlọ nzute ahụ na ebe ịchụ aja ahụ. O konyekwara akwa mgbochi nʼụzọ mbata nke ogige ụlọ nzute ahụ. Otu a, Mosis rụzuru ọrụ niile ahụ.
Il dressa le parvis autour de la Demeure et de l'autel, et il mit la tenture à la porte du parvis. Ce fut ainsi que Moïse acheva cette œuvre.
34 Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼime ya.
Alors la nuée couvrit la tente de réunion, et la gloire de Yahweh remplit la Demeure.
35 Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọ nzute ahụ.
Et Moïse ne pouvait plus entrer dans la tente de réunion, parce que la nuée restait dessus, et que la gloire de Yahweh remplissait la Demeure.
36 Nʼime njegharị ha niile, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, mgbe ahụ ka ụmụ Izrel na-ebuli njem.
Tant que durèrent leurs marches, les enfants d'Israël partaient lorsque la nuée s'élevait de dessus la Demeure;
37 Ma ọ bụrụ na igwe ojii ahụ ebilighị, ụmụ Izrel adịghị ebulikwa njem tutuu ruo mgbe o biliri.
et si la nuée ne s'élevait pas, ils ne partaient pas, jusqu'au jour où elle s'élevait.
38 Igwe ojii Onyenwe anyị ahụ na-anọgide nʼelu ụlọ nzute ahụ nʼehihie ma nʼabalị, ọkụ na-esi nʼime ya na-enwupụta. Ndị Izrel niile na-ahụkwa ya anya ụbọchị niile nke ha jegharịrị nʼọzara.
Car la nuée de Yahweh reposait pendant le jour sur la Demeure, et, pendant la nuit, il y avait du feu dans la nuée, aux yeux de toute la maison d'Israël, tant que durèrent leurs marches.

< Ọpụpụ 40 >