< Ọpụpụ 39 >

1 Ha sitekwara nʼogho akwa na-acha anụnụ anụnụ na nke na-acha ngwakọta anụnụ na uhie (odo odo), nke na-acha uhie uhie, meere ndị nchụaja uwe akpara akpa nke ọma iyi jee ozi nʼebe nsọ ahụ. Ha meekwara Erọn uwe nsọ, nʼusoro iwu Onyenwe anyị nyere Mosis.
Tie taisīja arī amata drēbes priekš Dieva kalpošanas svētā vietā no ziluma un purpura un karmezīna; un taisīja tās svētās drēbes Āronam, kā Tas Kungs Mozum bija pavēlējis.
2 Ha ji ogho ọlaedo, na nke na-acha anụnụ anụnụ, nke na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, na nke na-acha uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee efọọd ahụ.
Un viņš taisīja to efodu no zelta, ziluma un purpura un karmezīna un smalkām šķetinātām dzijām.
3 Ha tipịara mpempe ọlaedo ndị ahụ mee ka ọ dị mbadamba. Bipụtasịa ha ntakịrị ntakịrị dịka eriri maka i ji ha kpanye nʼetiti ogho ndị a na-acha anụnụ anụnụ; ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
Un tie zeltu sakala plakanu un izgrieza drāti no tā, ieaust starp to zilumu un purpuru un karmezīnu un tām smalkām šķetinātām dzijām, izrotātu darbu.
4 Ha dụrụ akwa na-adị nʼubu maka efọọd ahụ, nke e jikọtara na nkuku ya abụọ, maka i ji na-ekechisi ya ike.
Tie taisīja divus saliekamus plecu gabalus pie tā, abējos viņa galos tie tapa sasieti.
5 Ihe okike nke ukwu ahụ, nke onye ǹka kpaziri nke ọma yiri ya, ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Un efoda josta, kas pār to bija, tā bija tāds pat darbs, no zelta, ziluma un purpura un karmezīna un smalkām šķetinātām dzijām, kā Tas Kungs Mozum bija pavēlējis.
6 Ha doziri nkume ọniks ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa; ma gbunye aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu ya dịka onye ọka si egbunye aha mmadụ nʼelu mgbaaka akara.
Tie sataisīja arī tos oniksa akmeņus, zelta iekalumos ieliktus, grieztus, tā kā gredzenus, kur Israēla bērnu vārdi bija uzgriezti.
7 Ha jikọtara ha nʼelu akwa ubu nke efọọd ahụ, ka ọ bụrụ nkume ncheta mgbe ebighị ebi nye ụmụ Izrel, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Un viņš tos lika efodam uz pašiem pleciem par piemiņas akmeņiem priekš Israēla bērniem, kā Tas Kungs Mozum bija pavēlējis.
8 Ha mekwara ihe mgbochi obi, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Ha mere ya dịka e si mee efọọd ahụ. Ọ bụ ogho edo edo, nke na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma ka e ji mee ya.
Un viņš taisīja krūšu glītumu, izrotātu darbu, kā efoda darbu no zelta, ziluma un purpura un karmezīna un smalkām šķetinātām dzijām.
9 Ọ ha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara; nke apịajiri ụzọ abụọ.
Tas bija četrkantīgs; tie taisīja to krūšu glītumu divkārtīgu, viens sprīdis bija viņa garums un viens sprīdis viņa platums, divkārtīgs tas bija.
10 Mgbe ahụ, ha hịọnyere ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa nʼime ya. Ụdị dị nʼahịrị nke mbụ bụ: nkume kanelian, krisolaịt na beril,
Un tie to aplika ar četrām akmeņu rindām; vienā kārtā bija sardis, topāzs un smaragds - šī ir tā pirmā kārta.
11 nʼahịrị nke abụọ bụ: nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.
Un otrā kārtā bija rubīns, safīrs un dimants.
12 Nʼahịrị nke atọ bụ: nkume jasint, ageeti na ametisiti.
Un trešā kārtā bija hiacints, akats un ametists.
13 Nʼahịrị nke anọ bụ: nkume topaazi, ọniks na jaspa. Ahịọnyere ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa.
Un ceturtā kārtā bija krizolits, berils un jaspis zelta iekalumos savās rindās.
14 Ha dị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.
Un to akmeņu pēc Israēla bērnu vārdiem bija divpadsmit, pēc viņu vārdiem, griezti kā gredzeni, ikviens ar savu vārdu pēc tām divpadsmit ciltīm.
15 Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi.
Tie taisīja pie krūšu glītuma arī ķēdītes, vienā garumā savītas, no tīra zelta.
16 Ha mere ihe ọlaedo abụọ nke a kpara akpa, ya na mgbaaka ọlaedo abụọ. Dụnyekwa mgbaaka ndị ahụ na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ.
Un tie taisīja divus zelta iekalumus ar diviem zelta gredzeniem, un lika tos divus gredzenus pie krūšu glītuma diviem galiem.
17 Ha dụnyere ụdọ ọlaedo abụọ ndị ahụ nʼelu mgbaaka ndị ahụ dị na nkuku ihe mgbochi obi ahụ.
Un pielika tās savītās ķēdītes tiem diviem gredzeniem pie krūšu glītuma galiem.
18 Were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa. Konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya.
Bet abu savīto ķēdīšu otrus galus pielika pie tiem diviem iekalumiem un pie efoda saliekamiem gabaliem priekšpusē.
19 Ha mere mgbaaka ọlaedo. Konyekwa ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ, nʼime ọnụ ọnụ ya ebe dị nso efọọd ahụ.
Tie taisīja divus zelta gredzenus un tos lika uz tiem diviem otriem krūšu glītuma galiem, pie viņa vīles iekšpusē, efodam pretim.
20 Mgbe ahụ, ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konyekwa ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe ihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ.
Vēl tie taisīja divus zelta gredzenus, un tos lika uz efoda abiem plecu gabaliem, apakšā uz to priekšgalu, kur tas top sasprādzēts pār efoda jostu.
21 Ha jikwa eriri na-acha anụnụ kekọta mgbaaka ihe mgbochi obi ahụ na mgbaaka efọọd ahụ, jikọta ya na ihe okike ukwu ahụ, ime ka ihe mgbochi obi ahụ hapụ ịtọghapụ site nʼefọọd ahụ, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
Un tie piesēja krūšu glītumu ar viņa gredzeniem pie efoda gredzeniem ar vienu pazilu auklu, ka tas būtu pār efoda jostu, ka no efoda nešķirtos, - itin kā Tas Kungs Mozum bija pavēlējis.
22 Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ha ji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ, ọrụ onye okwe akwa.
Un viņš darīja efoda uzvalku, austu darbu, visu no ziluma.
23 A ga-enwe oghere nʼetiti uwe mwụda ahụ, dịka oghere olu uwe agha, nwekwa akwa nta a dụnyere nʼokpuru oghere a, ime ka o sie ike gharakwa ịdọka.
Un paša uzvalka vidū bija caurums, tā kā krūšu bruņu caurums; šim caurumam bija vīle visapkārt, ka tas neplīstu.
24 Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma kpanye oyiyi mkpụrụ pomegranet, gburugburu nʼọnụ ala ala uwe mwụda ahụ.
Un pie uzvalka apakšvīlēm tie taisīja granātābolus no ziluma un purpura un karmezīna un šķetinātām smalkām dzijām.
25 Ha dụnyekwara ataṅụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, gburugburu nʼọnụ ọnụ ala ya nʼetiti pomegranet ndị ahụ.
Tie taisīja arī zvārgulīšus no šķīsta zelta un lika tos zvārgulīšus starp tiem granātāboliem pie uzvalka apakšvīlēm visapkārt starp tiem granātāboliem,
26 Otu ataṅụ, otu oyiyi mkpụrụ pomegranet, otu a ka a dụnyere ya gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ahụ, nke a ga-eyi mgbe a na-eje ozi, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
Ka bija viens zvārgulīts un tad viens granātābols un atkal viens zvārgulīts un viens granātābols pie uzvalka apakšvīlēm visapkārt priekš kalpošanas, - itin kā Tas Kungs Mozum bija pavēlējis.
27 Ha ji ezi akwa ọcha metara Erọn na ụmụ ya ndị ikom, uwe ime ahụ, akaọrụ nke onye ọkpa akwa,
Tie taisīja arī svārkus no šķetinātām smalkām dzijām, austu darbu, priekš Ārona un priekš viņa dēliem,
28 jirikwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi, okpu akwa ọcha, na uwe ukwu nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma.
Un cepuri no dārgām dzijām un paaugstas cepures no smalkām dzijām un linu ūzas no šķetinātām smalkām dzijām
29 Ihe ike nʼukwu bụ nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie uhie, na uhie uhie, nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma, dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.
Un jostu no šķetinātām smalkām dzijām un no ziluma un purpura un karmezīna, izrotātu darbu, itin kā Tas Kungs Mozum bija pavēlējis.
30 Ha mere efere, bụ okpu nsọ ahụ, site nʼọlaedo a nụchara anụcha, gbunyekwa akara nʼelu ya, dịka ihe e dere nʼelu mgbaaka akara: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
Tie taisīja arī to zelta platīti, to svēto kroni, no tīra zelta, un uzrakstīja rakstu, itin kā gredzeni top griezti: svēts Tam Kungam.
31 Mgbe ahụ, ha kenyere ya eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.
Un piesēja pazilu auklu pie tās, ka tā uz cepures virsas taptu piesieta, itin kā Tas Kungs Mozum bija pavēlējis.
32 Otu a ka ha si rụchaa ọrụ iwu ụlọ nzute ahụ. Ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.
Tā viss tas darbs tapa pabeigts pie saiešanas telts dzīvokļa. Un Israēla bērni bija darījuši, itin kā Tas Kungs Mozum bija pavēlējis, tā tie bija darījuši.
33 Mgbe ahụ, ha buteere Mosis ụlọ nzute ahụ: ụlọ ikwu ahụ ya na ngwongwo ya niile, ya bụ nko ya niile, mbudo ibo ya niile, mkpọrọ osisi ya niile, ogidi ya niile na ụkwụ ya niile,
Pēc tam tie atnesa to dzīvokli pie Mozus, to telti un visus viņas rīkus, viņas kāsīšus, viņas galdus, viņas nesamās kārtis, viņas stabus un viņas kājas,
34 na akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri e ji emechi elu ụlọ nzute ahụ, na akwa mgbochi,
Un to segu no pasarkanām aunu ādām un to segu no roņu ādām un to priekškaramo,
35 na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, ya na mkpara e ji ebu ya, na oche ebere ya,
To liecības šķirstu un viņa nesamās kārtis un to salīdzināšanas vāku,
36 na tebul ahụ, ya na ngwongwo ya niile na achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị,
To galdu, visus viņa rīkus un tās priekšliekamās maizes,
37 na ihe ịdọkwasị oriọna e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, na iheọkụ ya niile na ngwongwo ya niile, na mmanụ oliv maka ịmụ ọkụ,
To zelta lukturi ar viņa eļļas lukturīšiem, kas jāuzliek, un visus viņa rīkus un to eļļu spīdēšanai,
38 na ebe ịchụ aja ọlaedo, mmanụ nsọ na ụda na-esi isi ụtọ na akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ ụlọ nzute,
Un to zelta altāri un to svaidāmo eļļu un to kvēpināmo no smaržīgām zālēm un to segu priekš telts durvīm,
39 na ebe ịchụ aja bronz ahụ, na ihe ọkpụkpa bronz ya, mkpara ya niile na ngwongwo ya niile, efere ukwu ahụ ya na ihe ndọkwasị ya,
To vara altāri un tos vara traliņus, kas tam bija, viņa nesamās kārtis un visus viņa rīkus, to mazgājamo trauku un viņa kāju,
40 akwa mgbochi nke ogige ụlọ ahụ, na ogidi ya na ihe ndọkwasị ya nakwa akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ e si abanye nʼogige ahụ; ụdọ na ǹtu ịkpọgide ogige ahụ; ngwongwo niile nke ụlọ nzute ahụ, ụlọ ikwu nzute ahụ
Tās pagalma gardīnes, viņa stabus un viņa kājas un to pagalma vārtu segu, viņa virves un viņa naglas un visus rīkus, ko vajadzēja, pie saiešanas telts dzīvokļa.
41 na uwe niile a kpara akpa, nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja, na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja.
Tās amata drēbes kalpošanai svētā vietā, priestera Ārona svētās drēbes, un viņa dēlu drēbes, ka tie būtu priesteri.
42 Ndị Izrel niile rụzuru ọrụ ndị a niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.
Itin kā Tas Kungs Mozum pavēlējis, tā Israēla bērni visu to darbu bija darījuši.
43 Mosis nʼonwe ya hụkwara ọrụ ndị a niile, nabata ya ka nke e jere dịka iwu Onyenwe anyị nyere si dị. Nʼihi ya, Mosis gọziri ha.
Tad Mozus apraudzīja visu to darbu, un redzi, tie to bija darījuši, tā kā Tas Kungs bija pavēlējis, tā tie bija darījuši. Tad Mozus tos svētīja.

< Ọpụpụ 39 >