< Ọpụpụ 38 >

1 Ha ji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Nke ịla elu ya dị otu mita na iri sentimita atọ. Ogologo ya na obosara ya ha nʼotu. Ha dị mita abụọ na iri sentimita atọ, mita abụọ na iri sentimita atọ.
And he made the altar of burnt-offering of acacia-wood: five cubits was the length thereof, and five cubits the breadth thereof, four-square, and three cubits the height thereof.
2 Ha rụnyekwara mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ ghọọ nke e jikọtara nʼotu. Ha jikwa bronz machie ebe ịchụ aja a.
And he made the horns thereof upon the four corners of it; the horns thereof were of one piece with it; and he overlaid it with brass.
3 Ha ji bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ.
And he made all the vessels of the altar, the pots, and the shovels, and the basins, the flesh-hooks, and the fire-pans; all the vessels thereof made he of brass.
4 Ha mere ngịga mbadamba maka ebe ịchụ aja ahụ, ihe ọkpụkpa bronz, nke ga-adị nʼokpuru oghere ọnụ ọnụ ya.
And he made for the altar a grating of network of brass, under the ledge round it beneath, reaching halfway up.
5 Ha kpụrụ mgbaka bronz ndị a ga-eji jide mkpara ndị ahụ maka akụkụ anọ nke ngịga bronz ahụ.
And he cast four rings for the four ends of the grating of brass, to be holders for the staves.
6 Ha mere mkpara osisi akashia ndị a, were bronz machie ha.
And he made the staves of acacia-wood, and overlaid them with brass.
7 Ha mere ka mkpara ndị ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ime ka ha dịrị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ maka iji nʼebu ya. Ha ji obodobo osisi rụọ ya dịka igbe.
And he put the staves into the rings on the sides of the altar, wherewith to bear it; he made it hollow with planks.
8 Ha ji bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya. Ọ bụ enyo nke ndị inyom ahụ ndị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka e ji kpụọ ha.
And he made the laver of brass, and the base thereof of brass, of the mirrors of the serving women that did service at the door of the tent of meeting.
9 Ọzọ, ha mere ogige ahụ. Ịdị ogologo nke nʼakụkụ ndịda dị iri mita anọ na ise. O nwere akwa mgbochi nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.
And he made the court; for the south side southward the hangings of the court were of fine twined linen, a hundred cubits.
10 Iri ogidi abụọ ga-adị na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ. Anya nko ogidi ndị ahụ ha na ihe ikegide ha ga-abụ ọlaọcha.
Their pillars were twenty, and their sockets twenty, of brass; the hooks of the pillars and their fillets were of silver.
11 Otu a kwa, akụkụ ugwu dịkwa iri mita anọ na ise. O nwere iri ogidi abụọ na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ, na anya nko nke ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.
And for the north side a hundred cubits, their pillars twenty, and their sockets twenty, of brass; the hooks of the pillars and their fillets of silver.
12 Akụkụ ọdịda anyanwụ dị iri mita abụọ na atọ. Nwekwaa akwa mgbochi, nwere ogidi iri na ebe ndọkwasị iri, tinyere anya nko ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.
And for the west side were hangings of fifty cubits, their pillars ten, and their sockets ten; the hooks of the pillars and their fillets of silver.
13 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe anwụ na-awalite dịkwa iri mita abụọ na atọ nʼobosara.
And for the east side eastward fifty cubits.
14 Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ bụ ihe dị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.
The hangings for the one side of the gate were fifteen cubits; their pillars three, and their sockets three.
15 Otu a kwa, akwa mgbochi nke ịdị ogologo ya dị mita asaa bụ ihe dị nʼakụkụ nke ọzọ nke ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ. Ọ ga-enwekwa ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ
And so for the other side; on this hand and that hand by the gate of the court were hangings of fifteen cubits; their pillars three, and their sockets three.
16 Akwa mgbochi niile nke ogige ahụ gburugburu bụ ezi akwa ọcha a kpara nke ọma.
All the hangings of the court round about were of fine twined linen.
17 Ogidi ọbụla nwere ihe ndọkwasị bronz. Nko niile na ihe njikọta niile ka e jikwa ọlaọcha machie. Ọ bụkwa naanị ọlaọcha ka e ji mee okporo osisi ndị ahụ.
And the sockets for the pillars were of brass; the hooks of the pillars and their fillets of silver; and the overlaying of their capitals of silver; and all the pillars of the court were filleted with silver.
18 Akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ bụ ihe e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee; akaọrụ nke onye na-akpa ihe ịchọ mma. Ọ dị mita itoolu nʼogologo, yikwaa akwa mgbochi nke ebe ogige ahụ, dị mita abụọ na iri sentimita atọ nʼịdị elu.
And the screen for the gate of the court was the work of the weaver in colours, of blue, and purple, and scarlet, and fine twined linen; and twenty cubits was the length, and the height in the breadth was five cubits, answerable to the hangings of the court.
19 Ọ bụ ogidi anọ ka e ji jidesie ha ike na ihe ndọkwasị bronz anọ, nko na okporo osisi ha niile bụ ọlaọcha. E jikwa ọlaọcha machie isi ogidi ndị ahụ.
And their pillars were four, and their sockets four, of brass; their hooks of silver, and the overlaying of their capitals and their fillets of silver.
20 Ǹtu niile nke ụlọ nzute ahụ nakwa nʼogige ya gburugburu bụ bronz ka e ji kpụọ ha.
And all the pins of the tabernacle, and of the court round about, were of brass.
21 Ndị a bụ ngwongwo niile e ji wuo ụlọ nzute ahụ; ebe a ga-edebe Ihe Ama ahụ. Ọ bụ ndị Livayị depụtara ihe niile ndị a nʼusoro dịka Mosis si nye ha nʼiwu. Ọ bụkwa Itama, nwa Erọn onye nchụaja, lekọtara ndị niile rụrụ ọrụ idekọta ya.
These are the accounts of the tabernacle, even the tabernacle of the testimony, as they were rendered according to the commandment of Moses, through the service of the Levites, by the hand of Ithamar, the son of Aaron the priest. —
22 Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda, rụzuru ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.
And Bezalel the son of Uri, the son of Hur, of the tribe of Judah, made all that the LORD commanded Moses.
23 Onye na-enyere ya aka bụ Oholiab nwa Ahisamak, onye ebo Dan, bụ onye ọka a maara aha ya, ọ bụ onye ọka ihe ọtụtụ, na onye ọka ịdụnye ihe ịchọ mma dị iche iche nʼakwa na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha.
And with him was Oholiab, the son of Ahisamach, of the tribe of Dan, a craftsman, and a skilful workman, and a weaver in colours, in blue, and in purple, and in scarlet, and fine linen. —
24 Ịdị arọ nke onyinye ọlaedo niile sitere nʼaja mfufe ahụ nke ndị mmadụ wetara maka ịrụ ebe nsọ ahụ, bụ otu puku na narị kilogram ise.
All the gold that was used for the work in all the work of the sanctuary, even the gold of the offering, was twenty and nine talents, and seven hundred and thirty shekels, after the shekel of the sanctuary.
25 Ịdị arọ nke ọlaọcha enwetara nʼaka ọgbakọ ahụ, bụ puku kilogram anọ, na narị kilogram isii na iri ise dịka shekel ebe nsọ si dị.
And the silver of them that were numbered of the congregation was a hundred talents, and a thousand seven hundred and three-score and fifteen shekels, after the shekel of the sanctuary:
26 Ha niile tụrụ otu beka, otu isi, dịka ụtụ mgbe e kere ụtụ ọkara shekel dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị, e nyere nʼisi onye ọbụla nke gabigara nʼebe ndị a gụrụ ọnụ nọ, bụ ndị gbara iri afọ abụọ rigoo. Ọnụọgụgụ ha dị narị isii, na puku atọ, na narị ise, na iri ise.
a beka a head, that is, half a shekel, after the shekel of the sanctuary, for every one that passed over to them that are numbered, from twenty years old and upward, for six hundred thousand and three thousand and five hundred and fifty men.
27 Ịdị arọ nke ọlaọcha niile e ji rụọ ụkwụ ibo niile nke ebe nsọ ahụ, na ụkwụ ogidi niile e ji jidesie akwa mgbochi ndị ahụ ike bụ puku kilogram atọ, na narị kilogram isii. Ịdị arọ nke ọlaọcha e ji wuo ụkwụ ọbụla bụ iri kilogram atọ na isii.
And the hundred talents of silver were for casting the sockets of the sanctuary, and the sockets of the veil: a hundred sockets for the hundred talents, a talent for a socket.
28 Ịdị arọ nke ọlaọcha e ji menye nko nʼibo osisi niile, na nke e ji machie okporo osisi niile, na nke e ji techie isi ogidi osisi niile, bụ iri kilogram abụọ.
And of the thousand seven hundred seventy and five shekels he made hooks for the pillars, and overlaid their capitals, and made fillets for them.
29 Ịdị arọ nke bronz niile ndị mmadụ wetara dịka onyinye aja mfufe bụ puku kilogram atọ, na narị kilogram atọ, na iri isii.
And the brass of the offering was seventy talents and two thousand and four hundred shekels.
30 E ji bronz ndị a wuo ụkwụ ogidi niile a manyere nʼihu ụzọ e si abata ogige ụlọ nzute ahụ. E jikwa ya wuo ebe ịchụ aja bronz ahụ, na ihe ọkpụkpụ bronz ahụ, na ngwongwo niile e ji eje ozi nʼebe ịchụ aja,
And therewith he made the sockets to the door of the tent of meeting, and the brazen altar, and the brazen grating for it, and all the vessels of the altar,
31 na ụkwụ ogidi a manyere nʼihu ụlọ nzute, na ǹtu niile e ji wuo ụlọ nzute ahụ, na ogige gbara ya gburugburu.
and the sockets of the court round about, and the sockets of the gate of the court, and all the pins of the tabernacle, and all the pins of the court round about.

< Ọpụpụ 38 >