< Ọpụpụ 37 >

1 Bezalel ji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya bụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya ga-abụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ.
Bê-sa-lê đóng một cái Hòm bằng gỗ keo dài 1,15 mét, rộng 0,69 mét, cao 0,69 mét.
2 O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie nʼime na azụ ya, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile.
Ông lấy vàng ròng bọc bên ngoài, lót bên trong và viền chung quanh.
3 Ọ kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnyekwa ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya.
Ông làm bốn cái khoen bằng vàng gắn vào bốn góc Hòm, mỗi bên hai cái.
4 O jikwa osisi akashia ahụ mee okporo osisi, machiekwa ha ọlaedo.
Ông cũng làm đòn khiên bằng cây keo bọc vàng,
5 O tinyekwara mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ; ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.
và xỏ đòn vào các khoen ở hai bên để khiêng Hòm đi.
6 Emesịa, o ji ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe e ji ekwuchi igbe ahụ. Aha a na-akpọ okwuchi igbe a bụ Oche Ebere. Ịdị ogologo ya dị otu mita na sentimita iri, obosara ya dị iri sentimita asaa.
Bê-sa-lê cũng làm nắp chuộc tội bằng vàng ròng, dài 1,15 mét, rộng 0,69 mét.
7 Mgbe ahụ, o ji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa, kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ.
Ông làm hai chê-ru-bim bằng vàng dát dính liền với nắp chuộc tội.
8 A rụnyere otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; nʼisi nsọtụ abụọ ahụ, ka o jikọtara ha ọnụ ka ha na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu.
Ông làm mỗi chê-ru-bim đứng trên một đầu nắp, tất cả đều bằng vàng.
9 Cherubim ndị a gbasara nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ cherịtara onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị.
Hai chê-ru-bim đứng đối diện nhau, xòe cánh che trên Nắp Chuộc Tội, mặt nhìn xuống nắp.
10 Emesịa, o mere tebul nke ịdị ogologo ya bụ iri sentimita itoolu. Obosara ya bụ iri sentimita ise, ịla elu ya bụ iri sentimita asaa. Ọ bụ osisi akashia ka o ji mee ya.
Bê-sa-lê lại đóng một cái bàn bằng gỗ keo, dài 0,92 mét, rộng 0,46 mét, cao 0,69 mét,
11 Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji machie ya. A kpụnyekwara ihe ọkpụkpụ ọlaedo gburugburu ọnụ ọnụ ya.
rồi lấy vàng ròng bọc bàn và viền chung quanh.
12 A rụnyere ihe nʼọnụ ọnụ tebul ahụ nke ịla elu ya ga-eru sentimita asatọ. Ihe a dị gburugburu ọnụ ọnụ tebul ahụ, ọ bụkwa ọlaedo a kpụrụ akpụ ka e ji rụọ ya.
Ông đóng khung chung quanh mặt bàn, bề rộng của khung bằng một bàn tay, rồi viền vàng chung quanh khung.
13 Ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ; kwụnyekwa ha nʼakụkụ anọ ahụ nʼebe ụkwụ anọ ya dị.
Ông làm bốn cái khoen bằng vàng gắn vào bốn góc, chỗ có bốn chân bàn.
14 E tinyere mgbaaka ndị ahụ nso nso ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, e ji ebu tebul ahụ.
Cái khoen đó gắn gần khung của mặt bàn để xỏ đòn khiêng.
15 O jikwa osisi akashia mee okporo osisi ahụ e ji ebu tebul ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ya.
Đòn khiêng làm bằng gỗ keo bọc vàng.
16 O mekwara ihe niile na-adị nʼelu tebul ahụ: efere, ngaji, ọkwa na iko, nke e ji awụpụ aja ihe ọṅụṅụ. Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka o ji kpụọ ha.
Ông cũng lấy vàng ròng làm các dụng cụ để trên bàn: Đĩa, muỗng, bát, và bình.
17 Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Ha kpụrụ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mekwaa ka iko ya niile yiri okoko osisi, nʼisi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya.
Bê-sa-lê làm một chân đèn bằng vàng ròng dát, từ chân cho đến thân, đài, bầu, và hoa của đèn đều dính liền nhau.
18 Alaka isii sitere nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ.
Từ thân mọc ra sáu cành, mỗi bên ba cành.
19 Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile dịkwa nʼotu alaka; iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ.
Mỗi cành có ba cái hoa hình hạnh nhân.
20 Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, enwere iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya.
Thân của chân đèn có bốn hoa hình hạnh nhân.
21 Otu isi dị nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta, isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ, isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii.
Cứ mỗi hai cành mọc ra từ thân, ông làm một cái đài bên dưới.
22 Isi nwapụta ya na alaka ya niile dịkọtara ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ.
Đài và cành được làm dính liền nhau bằng vàng dát nguyên miếng.
23 Ha mekwara oriọna asaa ya, ma mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile. Ha bụ ọlaedo a nụchara anụcha.
Ông cũng làm bảy cái đèn, kéo cắt tim đèn, và đĩa đựng tàn bằng vàng ròng.
24 Ha sitere na iri kilogram atọ na anọ nke ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna ahụ na ngwongwo ya niile.
Ông dùng hết 34 ký vàng ròng để làm chân đèn và đồ phụ tùng.
25 Ha ji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja a na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Akụkụ anọ ya ha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya bụ iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya bụ iri sentimita itoolu. Mpi ya niile si na ya pụta.
Ông đóng một bàn thờ xông hương bằng gỗ keo. Bàn thờ hình vuông, mỗi bề 0,46 mét, cao 0,92 mét. Các sừng của bàn thờ được gắn liền với bàn thờ.
26 Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha machie elu ya; akụkụ ya niile nakwa mpi ya niile. Ha jikwa ọlaedo kpụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu.
Ông lấy vàng ròng lót mặt bàn, bọc cạnh bàn, các sừng của bàn thờ, và viền chung quanh bàn.
27 Ha kpụnyere mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọ bụla, ebe a ga na-ejide mkpara e ji ebu ya.
Ông làm hai khoen vàng, gắn bên dưới đường viền của bàn, mỗi bên một cái, dùng xỏ đòn khiêng.
28 Ha ji osisi akashia mee mkpara ndị ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ha.
Đòn khiêng được làm bằng gỗ keo bọc vàng.
29 Ha mekwara mmanụ otite dị nsọ, na ezigbo ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke a na-agwaghị ihe; bụ ọrụ nke onye na-eme mmanụ isi ụtọ.
Ông cũng chế dầu xức thánh và hương thơm thuần túy theo đúng phương pháp hòa hợp hương liệu.

< Ọpụpụ 37 >