< Ọpụpụ 36 >
1 Ya mere, Bezalel na Oholiab na ndị ǹka niile Onyenwe anyị nyere ike na nghọta ịmata otu ha ga-esi rụọ ọrụ iwu ebe nsọ ahụ ga-arụ ọrụ ahụ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
貝匝肋耳和敖曷里雅布以及所有各種技工,即上主賜給他們才能智慧為明瞭做聖所的一切工程的人,全按照上主所吩咐的一切去做。
2 Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Bezalel na Oholiab na ndị ǹka ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ike na nghọta, ndị wepụtara obi ha ịbịa ịrụ ọrụ ahụ.
梅瑟將貝匝肋耳和敖曷里雅布以及上主賜給他們才能的一切技工,所有心甘情願來工作的人,都叫了來。
3 Ha si nʼaka Mosis nara onyinye ndị ahụ niile ụmụ Izrel wetara maka ịrụ ọrụ ebe nsọ ahụ. Ndị mmadụ nọkwa na-eweta onyinye afọ ofufu ha ụtụtụ niile.
他們當著梅瑟的面,接收了以色列子民為建造聖所的各種工程送來的一切獻儀。但以色列子民仍天天早晨將自願的獻儀送來;
4 Nʼihi ya, ndị ọrụ ǹka niile nọ na-arụ ọrụ nʼebe nsọ ahụ hapụrụ ọrụ ha na-arụ,
因此建造聖所各種的技工,人人都停止他們所做的工程,
5 bịakwute Mosis, sị ya, “Lee, onyinye ndị mmadụ na-eweta adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ịrụ ọrụ a Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
來向梅瑟說:「百姓送來的太多,已超過上主命令為完成這工程所需要的。」
6 Mgbe ahụ, Mosis nyere iwu, ha zisara ozi ahụ nʼọmụma ụlọ ikwu niile sị, “Ka nwoke maọbụ nwanyị ọbụla gharakwa inwe ihe ọbụla nke ọ ga-eweta dịka onyinye maka ọrụ ebe nsọ a.” Nʼihi nke a, ndị mmadụ kwụsịrị iweta ihe ọzọ.
梅瑟遂吩咐在營中傳令說:「無論男女,不必再為聖所的工程送獻儀。」百姓這才停止不送。
7 Nʼihi na onyinye e wetara adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ọrụ ahụ.
送來的材料足夠全工程之用,而且有餘。製帳棚的布幔和頂
8 Ndị niile mara ǹka nʼetiti ndị ọrụ ahụ ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie wuo ụlọ nzute ahụ. Onye ọka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha.
在作工的人中,最有技術的工人用十幅布幔做了帳棚;布幔是用捻的細麻,紫色、紅色、朱紅色的毛線做的,用繡工繡上革魯賓。
9 Akwa mgbochi ndị a ha nʼotu. Ịdị ogologo ha nʼotu nʼotu bụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ha bụ otu mita na sentimita asatọ.
每幅布幔長二十八肘,寬四肘;每幅布幔都是一樣的尺寸。
10 E jikọtara akwa mgbochi ise nʼotu, jikọtakwa akwa ise nke ọzọ nʼotu.
五幅布幔相連縫在一起,另五幅相連縫在一起。
11 Ha ji akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka emekwara menyekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ.
在這一組布幔末幅的邊上做了紫色的鈕,在另一組布幔末幅的邊上也照樣做了;
12 Ha dụnyere iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ, mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu.
在這一幅上做了五十個鈕,在另一組布幔末幅的邊上,也做了五十個鈕;這些鈕都彼此相對。
13 Emesịa, ha ji iri nko ọlaedo ise jikọta ụzọ akwa mgbochi abụọ ndị a, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ ghọọ otu.
又做了五十個金鉤,用金鉤使布幔彼此相連,這樣成了一個帳棚。
14 Ha ji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ.
又用山羊毛做了布幔,作帳棚頂用,共做了十一幅布幔,
15 Akwa mgbochi iri na otu ndị a ha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo, ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ.
每幅長三十肘,寬四肘;十一幅布幔都是一樣尺寸。
16 Ha dụkọtara ise nʼime akwa mgbochi ahụ, debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche.
將五幅布幔縫在一起,
17 Mgbe ahụ, ha dụnyekwara iri anya nko ise nʼelu ọnụ otu akwa mgbochi ndị ahụ. Mekwaa otu ihe ahụ nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ e debere iche.
將另六幅也縫在一起;在這一組布幔末幅的邊上做了五十個鈕,在另一組布幔末幅的一邊上,也做了五十個鈕;
18 Ha mekwara iri nko bronz ise, iji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu.
又製了五十個銅鉤,使棚頂連結在一起,成為一個。
19 Mgbe ahụ, ha ji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ịkpụkwasị nʼelu ya.
以後用染紅的公羊皮作了棚頂的罩,上邊又蒙上一塊海豚皮的罩。帳棚的木架
20 Ha meere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.
為支帳棚,用皂莢木做了豎立的木板。
21 Mbudo ibo ọ bụla dị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara,
每塊木板高十肘,寬一肘半。
22 nwee ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ha rụrụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.
每塊木板下有兩個筍頭彼此並列,帳棚的一切木板;都是這樣做。
23 Ha rụrụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ,
支帳棚的木板,在向陽的一面,即南邊,做了二十塊木板;
24 ma mekwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ.
在二十塊木板下邊做了四十個銀卯座,每塊木板下兩個銀卯座,為安木板的兩筍頭。
25 Nʼakụkụ nke ọzọ bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ha rụkwara iri mbudo ibo abụọ,
為帳棚的另一面,即北邊,也做了二十塊木板,
26 rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
也做了四十個銀卯座,每塊木板下兩個卯座。
27 Nʼebe isi isi nsọtụ ya bụ akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute, ha rụrụ mbudo ibo isii.
為帳棚的後面,即西邊做了六塊木板。
28 Mbudo ibo abụọ ka e mere maka nkuku niile nke nsọtụ ụlọ nzute ahụ,
在帳棚的後面的兩角上,做了兩塊木板,
29 Nʼisi nkuku abụọ ndị a, mbudo ibo ndị a nọ iche iche site nʼokpuru ruo nʼelu ya; ma e jikọrọ ha ọnụ nʼime otu mgbaaka. Emere ka ha abụọ yie ibe ya.
木板下端是雙的,直到上端第一環都是雙的;兩塊木板都照樣做了,形成兩個角。
30 Ha niile dị mbudo ibo asatọ na ụkwụ ọlaọcha dị iri na isii, ya bụ ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
所以共有八塊木板,十六個銀卯座,每塊板下兩個卯座。
31 Ha ji osisi akashia mekwaa osisi ntụbichi, ise maka mbudo ibo ndị dị nʼotu akụkụ nke ụlọ nzute ahụ,
又用皂莢木做了橫木為帳棚這一面木板做了五根,
32 ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ
為帳棚另一面木板,也做了五根橫木,為帳棚後面即西邊的木板,也做了五根橫木。
33 Ha mere osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ka ọ gabiga site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ.
又做了木板中間的那根橫木,從這頭穿到那頭。
34 Ha ji ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile. Kpụkwaa mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta mkpọrọ osisi ahụ niile. Ha ji ọlaedo machiekwa mkpọrọ osisi ndị ahụ niile.
木板上包了金;做了穿橫木的金環,橫木上也包了金。帳棚與門簾
35 Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee akwa mgbochi. Onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
隨後用紫色、紅色、朱紅色的毛線和捻的細麻,做了一個帳幔,用繡工繡上革魯賓。
36 Ha mere ogidi osisi akashia anọ maka ya were ọlaedo machie ha. Ha meere ha anya nko; wukwara ha ụkwụ ọlaọcha anọ.
為掛帳幔做了四根皂莢木柱子,包上金,柱釘是金的,又鑄了四個銀卯座。
37 Ha mere akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ, nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
又做了會幕的門簾,是用紫色、紅色、朱紅色的毛線和捻的細麻編成的。
38 Ha rụrụ ogidi ise ya na anya nko ha. Ha ji ọlaedo machie isi ogidi ahụ na ihe mkpọrọ ha, were bronz rụọ ụkwụ ise ha.
為掛門簾,又做了五根柱子和柱釘,柱帽和橫棍包了金;又做了五個銅卯座。