< Ọpụpụ 35 >

1 Emesịa, Mosis kpọrọ nzukọ ụmụ Izrel niile gwa ha sị, “Ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere nke unu na-aghaghị idebe.
Then Moses assembled the whole congregation of Israel and said to them, “These are the things that the LORD has commanded you to do:
2 Rụọnụ ọrụ ụbọchị isii, ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike, ụbọchị dị nsọ nke izuike nye Onyenwe anyị. Onye ọbụla rụrụ ọrụ nʼụbọchị nke asaa ga-anwụ.
For six days work may be done, but the seventh day shall be your holy day, a Sabbath of complete rest to the LORD. Whoever does any work on that day must be put to death.
3 Unu amụnyela ọkụ nʼebe obibi unu nʼụbọchị izuike ahụ.”
Do not light a fire in any of your dwellings on the Sabbath day.”
4 Mgbe ahụ Mosis gwara nzukọ Izrel niile sị, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere,
Moses also told the whole congregation of Israel, “This is what the LORD has commanded:
5 sitenụ nʼihe unu nwere wetara Onyenwe anyị onyinye. Onye ọbụla nke ọ masịrị, ya wetara Onyenwe anyị onyinye nke ihe ndị a: “Ọlaọcha, ọlaedo na bronz,
Take from among you an offering to the LORD. Let everyone whose heart is willing bring an offering to the LORD: gold, silver, and bronze;
6 ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, na ajị ewu;
blue, purple, and scarlet yarn; fine linen and goat hair;
7 akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri, na osisi akashia;
ram skins dyed red and fine leather; acacia wood;
8 mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, ụda a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;
olive oil for the light; spices for the anointing oil and for the fragrant incense;
9 nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi.
and onyx stones and gemstones to be mounted on the ephod and breastpiece.
10 “Unu niile ndị nwere onyinye ịkwa ǹka, bịanụ rụọ ihe ahụ niile Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu ịrụ, nke bụ ihe ndị a:
Let every skilled craftsman among you come and make everything that the LORD has commanded:
11 “ụlọ nzute ahụ, na ihe mkpuchi ya, na nko ya niile, na mbudo ibo ya, na mkpọrọ osisi ya, na ogidi ya, na ụkwụ ya niile.
the tabernacle with its tent and covering, its clasps and frames, its crossbars, posts, and bases;
12 Rụkwanụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na mkpara ahụ e ji ebu ya. Ya na oche ebere ahụ. Mekwaanụ akwa mgbochi nke ga-ekpuchi ebe nsọ ahụ,
the ark with its poles and mercy seat, and the veil to shield it;
13 na tebul ahụ, na mkpara e ji ebu ya, na ngwongwo ya niile, na achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị.
the table with its poles, all its utensils, and the Bread of the Presence;
14 Mekwaa ebe ịdọkwasị oriọna maka ìhè, ya na ngwongwo ya niile, iheọkụ na mmanụ maka ịmụ ọkụ;
the lampstand for light with its accessories and lamps and oil for the light;
15 nʼebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na mkpara ya. Mmanụ nsọ ahụ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke e ji ụda mee; akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ nke dị nʼebe mbata ụlọ nzute ahụ;
the altar of incense with its poles; the anointing oil and fragrant incense; the curtain for the doorway at the entrance to the tabernacle;
16 ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ya na ihe ọkpụkpa bronz ya, mkpara e ji ebu ya na ngwongwo ya niile, efere ukwu ahụ na ihe ndọkwasị ya.
the altar of burnt offering with its bronze grate, its poles, and all its utensils; the basin with its stand;
17 Akwa mgbochi nke ogige ụlọ ahụ na ogidi ha, na ihe ndọkwasị ya, nakwa akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ e si abanye nʼogige ahụ;
the curtains of the courtyard with its posts and bases, and the curtain for the gate of the courtyard;
18 ǹtu maka ịkpọgide ụlọ ikwu ahụ na nke ogige ahụ, na ụdọ ha,
the tent pegs for the tabernacle and for the courtyard, along with their ropes;
19 uwe niile a kpara akpa nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja.”
and the woven garments for ministering in the holy place—both the holy garments for Aaron the priest and the garments for his sons to serve as priests.”
20 Ugbu a, ọgbakọ ụmụ Izrel niile siri nʼihu Mosis pụọ.
Then the whole congregation of Israel withdrew from the presence of Moses.
21 Onye ọbụla chọrọnụ na onye nke mmụọ ya kwaliri laghachiri azụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye nʼihi ọrụ nke ụlọ nzute ahụ na nʼihi ije ozi dị nʼime ya na nʼihi uwe nsọ ndị ahụ.
And everyone whose heart stirred him and whose spirit prompted him came and brought an offering to the LORD for the work on the Tent of Meeting, for all its services, and for the holy garments.
22 Ndị niile ọ metụrụ nʼobi, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị bịara weta onyinye ha. Ha wetaara Onyenwe anyị onyinye ihe ịchọ mma nke ọlaedo dị iche iche: ihe ịkpọchi uwe, ọlantị, ọlaaka na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma dị iche iche, nke e ji ọlaedo kpụọ. Ha chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
So all who had willing hearts, both men and women, came and brought brooches and earrings, rings and necklaces, and all kinds of gold jewelry. And they all presented their gold as a wave offering to the LORD.
23 Ụfọdụ mmadụ wetara akwa na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie na nke uhie uhie maọbụ ezi akwa ọcha maọbụ akpụkpọ ajị ewu, akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara na akpụkpọ ehi mmiri.
Everyone who had blue, purple, or scarlet yarn, or fine linen, goat hair, ram skins dyed red, or articles of fine leather, brought them.
24 Ndị ọzọ wetara ọlaọcha na bronz, dịka onyinye ha nyere Onyenwe anyị, ụfọdụ wetara osisi akashia nke a ga-eji wuo ụlọ ikwu ahụ.
And all who could present an offering of silver or bronze brought it as a contribution to the LORD. Also, everyone who had acacia wood for any part of the service brought it.
25 Ụmụ nwanyị ndị bụ ọka nʼịdụ akwa na ikwe akwa tụrụ eri na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, webata ha dịka onyinye.
Every skilled woman spun with her hands and brought what she had spun: blue, purple, or scarlet yarn, or fine linen.
26 Ụfọdụ ụmụ nwanyị kwa ji onyinye ǹka pụrụ iche ha nwere kpaa ajị ewu dịka akwa pụrụ iche.
And all the skilled women whose hearts were stirred spun the goat hair.
27 Ndị ndu niile wetakwara nkume ọniks na nkume ndị ọzọ nke ịhịọnye nʼihe a ga-eji dụọ efọọd na ihe mgbochi obi ahụ.
The leaders brought onyx stones and gemstones to mount on the ephod and breastpiece,
28 Ha wetakwara ụda dị iche iche, mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, nke a ga-eji mee mmanụ otite dị nsọ, mekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
as well as spices and olive oil for the light, for the anointing oil, and for the fragrant incense.
29 Nʼụzọ dị otu a ka ụmụ Izrel niile, ma nwoke ma nwanyị, ndị chọrọ inyeaka nʼọrụ ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu si weta onyinye ha. Onye ọbụla nʼime ha nyere Onyenwe anyị onyinye afọ ofufu.
So all the men and women of the Israelites whose hearts prompted them brought a freewill offering to the LORD for all the work that the LORD through Moses had commanded them to do.
30 Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Izrel, sị, “Lee, Onyenwe anyị ahọpụtala Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda.
Then Moses said to the Israelites, “See, the LORD has called by name Bezalel son of Uri, the son of Hur, of the tribe of Judah.
31 O mejupụtala na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta na ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche.
And He has filled him with the Spirit of God, with skill, ability, and knowledge in all kinds of craftsmanship,
32 Ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz,
to design artistic works in gold, silver, and bronze,
33 ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi nakwa ọrụ ǹka niile dị iche iche.
to cut gemstones for settings, and to carve wood, so that he may be a master of every artistic craft.
34 Ma o tinyela nʼime ya na Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, amara ikuziri ndị ọzọ ihe.
And the LORD has given both him and Oholiab son of Ahisamach, of the tribe of Dan, the ability to teach others.
35 O mejupụtala ha nʼike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche, dịka igbunye akara, ise ihe osise, ịkpanye ihe ịchọ mma nʼakwa dị iche iche, ya bụ iji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa nʼezi akwa ọcha na nke ndị ọkpa akwa. Ha niile bụkwa ndị ǹka na ndị nchepụta ihe ịchọ mma doro anya.”
He has filled them with skill to do all kinds of work as engravers, designers, embroiderers in blue, purple, and scarlet yarn and fine linen, and as weavers—as artistic designers of every kind of craft.

< Ọpụpụ 35 >