< Ọpụpụ 33 >
1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Duru ndị a i si nʼala Ijipt kpọpụta baa nʼala ahụ m kwere Ebraham, na Aịzik na Jekọb na nkwa, nʼihi na agwara m ha sị, ‘Aga m enye ụmụ ụmụ unu ala a, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.’
Olúwa sọ fún Mose pé, “Fi ìhín yìí sílẹ̀, ìwọ àti àwọn ènìyàn tí o mú gòkè láti Ejibiti wá, kí ẹ sì gòkè lọ sí ilẹ̀ tí Èmi ti pinnu ní ìbúra fún Abrahamu, Isaaki àti Jakọbu wí pé, ‘Èmi yóò fi fún irú-ọmọ rẹ.’
2 Aga m ezipu Mmụọ ozi m ka ọ gaa nʼihu unu chụpụrụ unu ndị Kenan, na ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus.
Èmi yóò rán angẹli ṣáájú yín, Èmi yóò sì lé àwọn Kenaani, àwọn ará Amori, àwọn ará Hiti, àwọn ará Peresi, àwọn ará Hifi àti àwọn ará Jebusi jáde.
3 Gbago nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ma agaghị m eso unu nʼije unu, nʼihi na unu bụ ndị isiike. Ọ bụrụ na m esoro unu, unu ga-anwa m ọnwụnwa, nke ga-eme ka m laa unu nʼiyi nʼụzọ.”
Ẹ gòkè lọ sí ilẹ̀ tí ó ń sàn fún wàrà àti oyin. Ṣùgbọ́n èmi kò ní lọ pẹ̀lú yín, nítorí ènìyàn ọlọ́rùn líle ni ẹ̀yin, kí èmi má ba à run yín ní ọ̀nà.”
4 Mgbe ndị mmadụ ahụ nụrụ okwu olu ike ndị a, ha malitere iru ụjụ, ọ dịghịkwa onye ọbụla yinyere ihe ịchọ mma ya nʼahụ ha.
Nígbà tí àwọn ènìyàn náà gbọ́ ọ̀rọ̀ ìparun wọ̀nyí, wọ́n bẹ̀rẹ̀ sì ní kùn, ẹnìkankan kò sì le è wọ ohun ọ̀ṣọ́ rẹ̀.
5 Nʼihi na Onyenwe anyị agwala Mosis sị, “Gwa ụmụ Izrel, ‘Unu bụ ndị isiike. A sị na m nọ nʼetiti unu, otu ntabi anya ezuorola m ịla unu nʼiyi. Ugbu a, yipụnụ ihe ịchọ mma niile unu yi nʼahụ, aga m ekpebi ihe m ga-eme unu.’”
Nítorí Olúwa ti wí fún Mose pé, “Sọ fún àwọn ọmọ Israẹli pé, ‘Ènìyàn Ọlọ́rùn líle ní ẹ̀yin, bí Èmi bá lè wá sí àárín yín ni ìṣẹ́jú kan, Èmi lè pa yín run. Nísìnsinyìí, bọ́ ohun ọ̀ṣọ́ rẹ kúrò, Èmi yóò sì gbèrò ohun tí Èmi yóò ṣe pẹ̀lú rẹ.’”
6 Ya mere, ndị Izrel yipụrụ ihe ịchọ mma ha niile. Nʼugwu Horeb ka ha nọ mgbe ihe ndị a mere.
Bẹ́ẹ̀ àwọn ọmọ Israẹli bọ́ ohun ọ̀ṣọ́ wọn kúrò lára wọn ní òkè Horebu.
7 Nʼoge a, Mosis na-ewere ụlọ ikwu manye nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ọ na-akpọ ya ụlọ nzute. Ọ na-amanye ya nʼebe dị anya site nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Onye ọ bụla nke chọrọ ịjụta Onyenwe anyị ase, na-apụ, gaa nʼụlọ nzute ahụ nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
Mose máa ń gbé àgọ́ náà, ó sì pa á sí ìta ibùdó, ó jìnnà díẹ̀ sí ibùdó, ó pè é ni “Àgọ́ àjọ.” Ẹnikẹ́ni tí ó bá ń béèrè Olúwa yóò lọ sí ibi àgọ́ àjọ náà ní ìta ibùdó.
8 Mgbe ọbụla Mosis na-aga nʼụlọ ikwu nzute ahụ, ndị Izrel niile na-apụta guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ha, na-ele ya anya tutu Mosis abanye nʼụlọ ikwu ahụ.
Nígbàkígbà tí Mose bá jáde lọ sí ibi àgọ́, gbogbo ènìyàn á dìde, wọ́n á sì dúró sí ẹnu-ọ̀nà àgọ́ wọn, wọn yóò máa wo Mose títí yóò fi wọ inú àgọ́ náà.
9 Mgbe ọ banyere nʼụlọ ikwu ahụ; ogidi igwe ojii ahụ na-abịa guzochie nʼọnụ ụzọ mgbe Onyenwe anyị na Mosis na-akparị ụka.
Bí Mose ṣe wọ inú àgọ́ náà, ọ̀wọ́n àwọsánmọ̀ yóò sọ̀kalẹ̀, yóò sì dúró sí ẹnu ọnà, nígbà tí Olúwa ń sọ̀rọ̀ pẹ̀lú Mose.
10 Nʼoge ọbụla, ndị mmadụ hụrụ ogidi igwe ojii ahụ ka o guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu nzute ahụ, ha onwe ha na-eguzokwa, onye ọbụla, nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, kpọọ isiala.
Nígbàkígbà tí àwọn ènìyàn bá rí i ti ọ̀wọ́n àwọsánmọ̀ bá dúró ní ẹnu-ọ̀nà àgọ́, gbogbo wọn yóò dìde wọn yóò sì sìn, olúkúlùkù ní ẹnu-ọ̀nà àgọ́ rẹ̀.
11 Nʼime ụlọ nzute ahụ, Onyenwe anyị na-agwa Mosis okwu ihu na ihu, dịka mmadụ sị agwa enyi ya okwu. Mgbe ha kparịchara ụka, Mosis na-alọghachi azụ nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Ma nwokorobịa ahụ na-enyere ya aka, bụ Joshua, nwa Nun, na-anọgide nʼụlọ ikwu nzute ahụ.
Olúwa máa ń bá Mose sọ̀rọ̀ lójúkojú, gẹ́gẹ́ bí i pé ènìyàn ń bá ọ̀rẹ́ rẹ̀ sọ̀rọ̀. Nígbà náà ni Mose yóò tún padà lọ sí ibùdó, ṣùgbọ́n ọ̀dọ́mọkùnrin Joṣua ìránṣẹ́ rẹ̀ ọmọ Nuni kò fi àgọ́ sílẹ̀.
12 Mgbe Mosis na Onyenwe anyị nọ na-ekwurịta okwu, ihe Mosis gwara ya bụ nke a, “Ọ dịla anya kemgbe ị na-agwa m sị m, ‘Duru ndị m baa nʼala ahụ e kwere na nkwa inye ha.’ Ma matakwa na ị gwabeghị m onye ị ga-edunyere m ga-eduzi m ụzọ. I kwuola na ị maara aha m, kwukwaa na achọtala m ihuọma nʼebe ị nọ.
Mose sọ fún Olúwa pé, “Ìwọ ti ń sọ fún mi, ‘Darí àwọn ènìyàn wọ̀nyí,’ ṣùgbọ́n ìwọ kò jẹ́ kí ń mọ ẹni tí ìwọ yóò rán pẹ̀lú mi. Ìwọ ti wí pé, ‘Èmi mọ̀ ọ́n nípa orúkọ, ìwọ sì ti rí ojúrere mi pẹ̀lú.’
13 Biko, ọ bụrụ na o si otu a dị, zi m ụzọ gị, nke ga-eme ka m mata gị, gaakwa nʼihu inweta ihuọma site nʼebe ị nọ. Chetakwa na mba a dị ukwu bụ ndị gị.”
Bí ìwọ bá ní inú dídùn pẹ̀lú mi, kọ́ mi ní ọ̀nà rẹ, kí èmi kí ó lè mọ̀ ọ́n, kí n sì le máa wá ojúrere rẹ pẹ̀lú. Rántí wí pé orílẹ̀-èdè yìí ènìyàn rẹ ni.”
14 Ọ zara sị, “Mụ onwe m ga-eso gị gaa, aga m enyekwa gị izuike.”
Olúwa dáhùn wí pé, “Ojú mi yóò máa bá ọ lọ, Èmi yóò sì fún ọ ní ìsinmi.”
15 Mgbe ahụ Mosis sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị gaghị eso anyị nʼije a, ekwela ka anyị si nʼebe a zọpụ ụkwụ.
Nígbà náà ni, Mose wí fún un pé, “Bí ojú rẹ kò bá bá wa lọ, má ṣe rán wa gòkè láti ìhín lọ.
16 Ọ bụrụ na i soghị anyị, olee otu a ga-esi mata na mụ onwe m, na ndị gị achọtala ihuọma gị? Olee otu ọ ga-esi pụta ìhè na mụ na ndị gị bụ mba dị iche site na mba ndị ọzọ dị nʼụwa?”
Báwo ni ẹnikẹ́ni yóò ṣe mọ̀ pé inú rẹ dùn pẹ̀lú mi àti pẹ̀lú àwọn ènìyàn rẹ àyàfi ti o bá bá wa lọ? Kí ni yóò lè yà mí àti àwọn ènìyàn rẹ kúrò lára gbogbo ènìyàn tí ó wà ní ayé?”
17 Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị, “E, aga m eme ihe ị rịọrọ m, nʼihi na ị chọtala ihuọma m. Nʼezie, amara m onye ị bụ, marakwa aha gị.”
Olúwa sì sọ fún Mose pé, “Èmi yóò ṣe ohun gbogbo tí ìwọ ti béèrè, nítorí inú mi dún sí o, Èmi sì mọ̀ ọ́n nípa orúkọ rẹ̀.”
18 Mgbe ahụ, Mosis rịọrọ sị, “Gosi m ebube gị.”
Mose sì wí pé, “Nísinsin yìí fi ògo rẹ hàn mí.”
19 Ma Onyenwe anyị zara sị, “Aga m eme ka ị hụ ịdị mma m, aga m akọwakwara gị ihe aha m bụ Onyenwe anyị pụtara. Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.
Olúwa sì wí pé, “Èmi yóò sì mú gbogbo ìre mí kọjá níwájú rẹ, Èmi yóò sì pòkìkí orúkọ Olúwa níwájú rẹ. Èmi yóò ṣàánú fún ẹni tí Èmi yóò ṣàánú fún, Èmi yóò sì ṣoore-ọ̀fẹ́ fún ẹni tí Èmi yóò ṣoore-ọ̀fẹ́ fún.
20 Ma ị pụghị ịhụ ihu m nʼihi na mmadụ ọbụla enweghị ike ịhụ ihu m ma dịrịkwa ndụ.”
Ṣùgbọ́n,” ó wí pé, “Ìwọ kò le è rí ojú mi, nítorí kò sí ènìyàn kan tí ń rí mi, tí ó lè yè.”
21 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Lee, e nwere ebe dị nso nʼakụkụ m, nʼelu nkume, ebe i nwere ike iguzo.
Olúwa sì wí pé, “Ibìkan wà lẹ́gbẹ̀ẹ́ ọ̀dọ̀ mi, níbi tí o ti lè dúró lórí àpáta.
22 Mgbe ebube m ga-agafe, aga m ezo gị nʼokpuru nkume, werekwa aka m kpuchie gị, tutu ruo mgbe m gafechara.
Nígbà tí ògo mi bá kọjá, Èmi yóò gbé ọ sínú pàlàpálá àpáta, Èmi yóò sì bò ọ́ pẹ̀lú ọwọ́ mi títí Èmi yóò fi rékọjá.
23 Emesịa, aga m eweli aka m, ka i nwee ike ịhụ azụ m anya, ma ị pụghị ịhụ ihu m.”
Nígbà tí Èmi yóò mú ọwọ́ mi kúrò, ìwọ yóò sì rí ẹ̀yìn mi; ṣùgbọ́n ojú mi ni o kò ní rí.”