< Ọpụpụ 33 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Duru ndị a i si nʼala Ijipt kpọpụta baa nʼala ahụ m kwere Ebraham, na Aịzik na Jekọb na nkwa, nʼihi na agwara m ha sị, ‘Aga m enye ụmụ ụmụ unu ala a, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.’
וידבר יהוה אל משה לך עלה מזה--אתה והעם אשר העלית מארץ מצרים אל הארץ אשר נשבעתי לאברהם ליצחק וליעקב לאמר לזרעך אתננה
2 Aga m ezipu Mmụọ ozi m ka ọ gaa nʼihu unu chụpụrụ unu ndị Kenan, na ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus.
ושלחתי לפניך מלאך וגרשתי את הכנעני האמרי והחתי והפרזי החוי והיבוסי
3 Gbago nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ma agaghị m eso unu nʼije unu, nʼihi na unu bụ ndị isiike. Ọ bụrụ na m esoro unu, unu ga-anwa m ọnwụnwa, nke ga-eme ka m laa unu nʼiyi nʼụzọ.”
אל ארץ זבת חלב ודבש כי לא אעלה בקרבך כי עם קשה ערף אתה--פן אכלך בדרך
4 Mgbe ndị mmadụ ahụ nụrụ okwu olu ike ndị a, ha malitere iru ụjụ, ọ dịghịkwa onye ọbụla yinyere ihe ịchọ mma ya nʼahụ ha.
וישמע העם את הדבר הרע הזה--ויתאבלו ולא שתו איש עדיו עליו
5 Nʼihi na Onyenwe anyị agwala Mosis sị, “Gwa ụmụ Izrel, ‘Unu bụ ndị isiike. A sị na m nọ nʼetiti unu, otu ntabi anya ezuorola m ịla unu nʼiyi. Ugbu a, yipụnụ ihe ịchọ mma niile unu yi nʼahụ, aga m ekpebi ihe m ga-eme unu.’”
ויאמר יהוה אל משה אמר אל בני ישראל אתם עם קשה ערף--רגע אחד אעלה בקרבך וכליתיך ועתה הורד עדיך מעליך ואדעה מה אעשה לך
6 Ya mere, ndị Izrel yipụrụ ihe ịchọ mma ha niile. Nʼugwu Horeb ka ha nọ mgbe ihe ndị a mere.
ויתנצלו בני ישראל את עדים מהר חורב
7 Nʼoge a, Mosis na-ewere ụlọ ikwu manye nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ọ na-akpọ ya ụlọ nzute. Ọ na-amanye ya nʼebe dị anya site nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Onye ọ bụla nke chọrọ ịjụta Onyenwe anyị ase, na-apụ, gaa nʼụlọ nzute ahụ nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
ומשה יקח את האהל ונטה לו מחוץ למחנה הרחק מן המחנה וקרא לו אהל מועד והיה כל מבקש יהוה יצא אל אהל מועד אשר מחוץ למחנה
8 Mgbe ọbụla Mosis na-aga nʼụlọ ikwu nzute ahụ, ndị Izrel niile na-apụta guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ha, na-ele ya anya tutu Mosis abanye nʼụlọ ikwu ahụ.
והיה כצאת משה אל האהל יקומו כל העם ונצבו איש פתח אהלו והביטו אחרי משה עד באו האהלה
9 Mgbe ọ banyere nʼụlọ ikwu ahụ; ogidi igwe ojii ahụ na-abịa guzochie nʼọnụ ụzọ mgbe Onyenwe anyị na Mosis na-akparị ụka.
והיה כבא משה האהלה ירד עמוד הענן ועמד פתח האהל ודבר עם משה
10 Nʼoge ọbụla, ndị mmadụ hụrụ ogidi igwe ojii ahụ ka o guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu nzute ahụ, ha onwe ha na-eguzokwa, onye ọbụla, nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, kpọọ isiala.
וראה כל העם את עמוד הענן עמד פתח האהל וקם כל העם והשתחוו איש פתח אהלו
11 Nʼime ụlọ nzute ahụ, Onyenwe anyị na-agwa Mosis okwu ihu na ihu, dịka mmadụ sị agwa enyi ya okwu. Mgbe ha kparịchara ụka, Mosis na-alọghachi azụ nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Ma nwokorobịa ahụ na-enyere ya aka, bụ Joshua, nwa Nun, na-anọgide nʼụlọ ikwu nzute ahụ.
ודבר יהוה אל משה פנים אל פנים כאשר ידבר איש אל רעהו ושב אל המחנה ומשרתו יהושע בן נון נער לא ימיש מתוך האהל
12 Mgbe Mosis na Onyenwe anyị nọ na-ekwurịta okwu, ihe Mosis gwara ya bụ nke a, “Ọ dịla anya kemgbe ị na-agwa m sị m, ‘Duru ndị m baa nʼala ahụ e kwere na nkwa inye ha.’ Ma matakwa na ị gwabeghị m onye ị ga-edunyere m ga-eduzi m ụzọ. I kwuola na ị maara aha m, kwukwaa na achọtala m ihuọma nʼebe ị nọ.
ויאמר משה אל יהוה ראה אתה אמר אלי העל את העם הזה ואתה לא הודעתני את אשר תשלח עמי ואתה אמרת ידעתיך בשם וגם מצאת חן בעיני
13 Biko, ọ bụrụ na o si otu a dị, zi m ụzọ gị, nke ga-eme ka m mata gị, gaakwa nʼihu inweta ihuọma site nʼebe ị nọ. Chetakwa na mba a dị ukwu bụ ndị gị.”
ועתה אם נא מצאתי חן בעיניך הודעני נא את דרכך ואדעך למען אמצא חן בעיניך וראה כי עמך הגוי הזה
14 Ọ zara sị, “Mụ onwe m ga-eso gị gaa, aga m enyekwa gị izuike.”
ויאמר פני ילכו והנחתי לך
15 Mgbe ahụ Mosis sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị gaghị eso anyị nʼije a, ekwela ka anyị si nʼebe a zọpụ ụkwụ.
ויאמר אליו אם אין פניך הלכים אל תעלנו מזה
16 Ọ bụrụ na i soghị anyị, olee otu a ga-esi mata na mụ onwe m, na ndị gị achọtala ihuọma gị? Olee otu ọ ga-esi pụta ìhè na mụ na ndị gị bụ mba dị iche site na mba ndị ọzọ dị nʼụwa?”
ובמה יודע אפוא כי מצאתי חן בעיניך אני ועמך--הלוא בלכתך עמנו ונפלינו אני ועמך מכל העם אשר על פני האדמה
17 Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị, “E, aga m eme ihe ị rịọrọ m, nʼihi na ị chọtala ihuọma m. Nʼezie, amara m onye ị bụ, marakwa aha gị.”
ויאמר יהוה אל משה גם את הדבר הזה אשר דברת אעשה כי מצאת חן בעיני ואדעך בשם
18 Mgbe ahụ, Mosis rịọrọ sị, “Gosi m ebube gị.”
ויאמר הראני נא את כבדך
19 Ma Onyenwe anyị zara sị, “Aga m eme ka ị hụ ịdị mma m, aga m akọwakwara gị ihe aha m bụ Onyenwe anyị pụtara. Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.
ויאמר אני אעביר כל טובי על פניך וקראתי בשם יהוה לפניך וחנתי את אשר אחן ורחמתי את אשר ארחם
20 Ma ị pụghị ịhụ ihu m nʼihi na mmadụ ọbụla enweghị ike ịhụ ihu m ma dịrịkwa ndụ.”
ויאמר לא תוכל לראת את פני כי לא יראני האדם וחי
21 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Lee, e nwere ebe dị nso nʼakụkụ m, nʼelu nkume, ebe i nwere ike iguzo.
ויאמר יהוה הנה מקום אתי ונצבת על הצור
22 Mgbe ebube m ga-agafe, aga m ezo gị nʼokpuru nkume, werekwa aka m kpuchie gị, tutu ruo mgbe m gafechara.
והיה בעבר כבדי ושמתיך בנקרת הצור ושכתי כפי עליך עד עברי
23 Emesịa, aga m eweli aka m, ka i nwee ike ịhụ azụ m anya, ma ị pụghị ịhụ ihu m.”
והסרתי את כפי וראית את אחרי ופני לא יראו

< Ọpụpụ 33 >