< Ọpụpụ 30 >

1 “Jiri osisi akashia rụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
ועשית מזבח מקטר קטרת עצי שטים תעשה אתו
2 Akụkụ anọ ya ga-aha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya ga-adị iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya ga-adị iri sentimita itoolu. Mpi ya niile ga-esi na ya pụta.
אמה ארכו ואמה רחבו רבוע יהיה ואמתים קמתו ממנו קרנתיו
3 Jiri ọlaedo a nụchara anụcha machie elu ya, akụkụ ya niile nakwa mpi ya niile. Ị ga-ejikwa ọlaedo kpụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu.
וצפית אתו זהב טהור את גגו ואת קירתיו סביב--ואת קרנתיו ועשית לו זר זהב סביב
4 Kpụnye mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọbụla, ebe ga na-ejide mkpara e ji ebu ya.
ושתי טבעת זהב תעשה לו מתחת לזרו על שתי צלעתיו--תעשה על שני צדיו והיה לבתים לבדים לשאת אתו בהמה
5 Ị ga-eji osisi akashia mee mkpara, jiri ọlaedo machie ha.
ועשית את הבדים עצי שטים וצפית אתם זהב
6 Ị ga-adọba ebe ịchụ aja ahụ nʼihu akwa mgbochi nke kpuchiri igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihu oche ebere ahụ dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ, nʼebe m ga-ezute gị.
ונתתה אתו לפני הפרכת אשר על ארן העדת--לפני הכפרת אשר על העדת אשר אועד לך שמה
7 “Ụtụtụ niile, mgbe Erọn doziri oriọna, ọ ga-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.
והקטיר עליו אהרן קטרת סמים בבקר בבקר בהיטיבו את הנרת--יקטירנה
8 Nʼanyasị kwa, mgbe ọ na-amụnye ọkụ nʼoriọna ahụ, ọ ga-esurekwa ihe nsure ọkụ. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke ga-adị nʼihu Onyenwe anyị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
ובהעלת אהרן את הנרת בין הערבים יקטירנה--קטרת תמיד לפני יהוה לדרתיכם
9 Unu echekwala ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-adịghị nsọ nʼelu ya, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ihe oriri, unu awụpụla onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ya.
לא תעלו עליו קטרת זרה ועלה ומנחה ונסך לא תסכו עליו
10 Otu ugbo nʼafọ Erọn ga-ekpuchi mmehie nʼelu mpi ya. Mmemme mkpuchi mmehie a nke a na-eme otu ugbo nʼafọ, aghaghị ịbụ nke e ji ọbara nke si nʼaja a chụrụ nʼihi mkpuchi mmehie, nʼihi ọgbọ niile nke na-abịa. A ga na-edo ebe ịchụ aja nsọ otu a. Nke a bụ ebe dịkarịsịrị nsọ nye Onyenwe anyị.”
וכפר אהרן על קרנתיו אחת בשנה מדם חטאת הכפרים אחת בשנה יכפר עליו לדרתיכם--קדש קדשים הוא ליהוה
11 Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
וידבר יהוה אל משה לאמר
12 “Mgbe ọbụla a gụrụ mmadụ ọnụ, onye Izrel ọbụla ga-akwụ Onyenwe anyị ụgwọ o ji gbara mkpụrụobi ya. Nke a dị mkpa, ka ihe otiti ọbụla ghara ịbịakwasị ha mgbe ị ga-agụ ha ọnụ.
כי תשא את ראש בני ישראל לפקדיהם ונתנו איש כפר נפשו ליהוה בפקד אתם ולא יהיה בהם נגף בפקד אתם
13 Ihe onye a gụrụ ọnụ ga-akwụ bụ ọkara shekel, dịka shekel nke ebe nsọ si dị. Ọkara shekel bụ iri gera abụọ. Ọkara shekel a bụ onyinye nye Onyenwe anyị.
זה יתנו כל העבר על הפקדים--מחצית השקל בשקל הקדש עשרים גרה השקל--מחצית השקל תרומה ליהוה
14 Ndị kwesiri inye onyinye a bụ ndị niile gbara iri afọ abụọ gbagoo. Ọ bụ ndị a kwesiri inye Onyenwe anyị onyinye a.
כל העבר על הפקדים מבן עשרים שנה ומעלה--יתן תרומת יהוה
15 Ndị ọgaranya agaghị enye karịa ọkara shekel. Otu a kwa ndị ogbenye agaghị enye ihe dị ntakịrị karịa ọkara shekel. Nʼihi na onyinye a bụ onyinye unu na-enye Onyenwe anyị maka ikpuchiri mkpụrụobi unu mmehie.
העשיר לא ירבה והדל לא ימעיט ממחצית השקל--לתת את תרומת יהוה לכפר על נפשתיכם
16 Nabata ego niile ndị a site nʼaka ụmụ Izrel, ma jiri ya jee ozi dị nʼụlọ nzute. Ihe onyinye a ga-eme bụ ịkpọtụ uche Onyenwe anyị nʼebe unu nọ nʼihi mkpuchi mmehie maka ndụ unu.”
ולקחת את כסף הכפרים מאת בני ישראל ונתת אתו על עבדת אהל מועד והיה לבני ישראל לזכרון לפני יהוה לכפר על נפשתיכם
17 Ọzọkwa, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
וידבר יהוה אל משה לאמר
18 “Jiri bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya, maka ịsa ihe. Wụnye mmiri nʼime ya, dọsa ya nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja.
ועשית כיור נחשת וכנו נחשת--לרחצה ונתת אתו בין אהל מועד ובין המזבח ונתת שמה מים
19 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga na-asa ụkwụ na aka ha site na ya.
ורחצו אהרן ובניו ממנו את ידיהם ואת רגליהם
20 Mgbe ọbụla ha na-aba nʼụlọ nzute ahụ, ha ga-eji mmiri saa onwe ka ha ghara ịnwụ. Ọzọkwa, mgbe ha na-abịaru nso nʼebe ịchụ aja, maka ije ozi iche onyinye nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ,
בבאם אל אהל מועד ירחצו מים--ולא ימתו או בגשתם אל המזבח לשרת להקטיר אשה ליהוה
21 ha ga-asa aka ha na ụkwụ ha, ka ha ghara ịnwụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
ורחצו ידיהם ורגליהם ולא ימתו והיתה להם חק עולם לו ולזרעו לדרתם
22 Ọzọkwa, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
וידבר יהוה אל משה לאמר
23 “Were eso osisi na-esi isi ụtọ ndị a dị iche iche: máá, nke ọtụtụ ya ruru kilo isii, na ihe ruru kilo sinamọn abụọ na ụma itoolu, na kilo kalamus atọ,
ואתה קח לך בשמים ראש מר דרור חמש מאות וקנמן בשם מחציתו חמשים ומאתים וקנה בשם חמשים ומאתים
24 na kilo kashia isii, na lita anọ na ụma asatọ nke mmanụ oliv, dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ ahụ si dị.
וקדה חמש מאות בשקל הקדש ושמן זית הין
25 Ị ga-eji ya mepụta mmanụ nsọ, nke dị nsọ, nke a gwakọtara nke ọma dịka nke onye na-eme mmanụ na-esi isi ụtọ mere. Ọ ga-abụ mmanụ otite dị nsọ.
ועשית אתו שמן משחת קדש--רקח מרקחת מעשה רקח שמן משחת קדש יהיה
26 Ị ga-ewere mmanụ ahụ tee ụlọ nzute ahụ niile na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ,
ומשחת בו את אהל מועד ואת ארון העדת
27 na tebul ahụ, na ngwongwo ya niile, na nʼihe ịdọsa oriọna, na nʼihe niile dị ya nʼahụ, na nʼebe ịdọsa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ,
ואת השלחן ואת כל כליו ואת המנרה ואת כליה ואת מזבח הקטרת
28 na nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya niile, na nʼite ịsa ụkwụ na aka, na nʼebe a na-adọba ya.
ואת מזבח העלה ואת כל כליו ואת הכיר ואת כנו
29 Ị ga-edo ha nsọ, ka ha bụrụ ihe dịkarịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-adịkwa nsọ.
וקדשת אתם והיו קדש קדשים כל הנגע בהם יקדש
30 “Ị ga-eji mmanụ otite a tee Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Ha niile ga-adịkwa nsọ, bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
ואת אהרן ואת בניו תמשח וקדשת אתם לכהן לי
31 Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nke a bụ mmanụ nsọ m, nke dị nsọ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
ואל בני ישראל תדבר לאמר שמן משחת קדש יהיה זה לי--לדרתיכם
32 Agaghị awụsa ya nʼahụ mmadụ. O nwekwaghị onye kwesiri imepụta mmanụ otite dị otu a. Ọ dị nsọ, unu kwesikwara ido ya nsọ.
על בשר אדם לא ייסך ובמתכנתו לא תעשו כמהו קדש הוא קדש יהיה לכם
33 A ga-esite nʼetiti ndị m wezuga onye ọbụla mere ụdị mmanụ isi ọma a, maọbụ tee ya onye na-abụghị onye nchụaja m.’”
איש אשר ירקח כמהו ואשר יתן ממנו על זר--ונכרת מעמיו
34 Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Were ụda na-esi isi ụtọ, dịka eso osisi stakit, na ọnyịcha, na galbanọm, na ezigbo frankisens a na-agwaghị ihe, nke ọtụtụ ha niile ga-abụ otu ihe.
ויאמר יהוה אל משה קח לך סמים נטף ושחלת וחלבנה סמים ולבנה זכה בד בבד יהיה
35 Mee ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, nke a gwakọtara nke ọma, bụ ọrụ onye na-eme mmanụ isi ụtọ. Tinyekwa ya nnu, ka ọ bụrụ ihe nsure ọkụ a nụchara anụcha, nke dịkwa nsọ.
ועשית אתה קטרת רקח מעשה רוקח ממלח טהור קדש
36 Gwerie ụfọdụ nʼime ya ka ọ dịka uzuzu. Wụsa ya nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ nʼime ụlọ nzute, ebe m ga-ezute gị. Ọ ga-abụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye unu.
ושחקת ממנה הדק ונתתה ממנה לפני העדת באהל מועד אשר אועד לך שמה קדש קדשים תהיה לכם
37 Unu emerela onwe unu nke dịka ọtụtụ ụdị ihe nsure ọkụ a. Hụta ya ka ihe dị nsọ nʼebe Onyenwe anyị nọ.
והקטרת אשר תעשה--במתכנתה לא תעשו לכם קדש תהיה לך ליהוה
38 Onye ọbụla meere onwe ya ụdị ihe nsure ọkụ a, ịnụ isisi ya, a ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ụmụnna ya.”
איש אשר יעשה כמוה להריח בה--ונכרת מעמיו

< Ọpụpụ 30 >