< Ọpụpụ 3 >

1 Nʼoge a, Mosis na-azụ igwe anụ ụlọ Jetro ọgọ ya nwoke, onye nchụaja na Midia. Otu ụbọchị, o duuru igwe anụ ụlọ ndị a gaa nʼakụkụ ọzara. Ọ batara Horeb, ugwu Chineke.
Basi Mose alikuwa anachunga mifugo ya Yethro mkwewe, kuhani wa Midiani. Mose akapeleka mifugo mbali nyuma ya jangwa, naye akafika Horebu, mlima wa Mungu.
2 Nʼebe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọkụ na-ere nʼetiti ọhịa. Mosis hụrụ na ọ bụ ezie na ọhịa ahụ na-enwu ọkụ ma ọ naghị ere ọkụ.
Huko malaika wa Bwana akamtokea Mose katika mwali wa moto kutoka kichakani. Mose akaona kwamba ingawa kile kichaka kilikuwa kinawaka moto, kilikuwa hakiteketei.
3 Nʼihi ya, Mosis chere nʼobi ya sị, “Aga m aga nso leruo ihe omimi a anya, otu ọkụ si enwu ma ọhịa anaghị ere ọkụ.”
Ndipo Mose akawaza, “Nitageuka sasa nione kitu hiki cha ajabu, nami nione ni kwa nini kichaka hiki hakiteketei.”
4 Mgbe Onyenwe anyị hụrụ na ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, Chineke kpọrọ ya oku site nʼime ọhịa ahụ, “Mosis! Mosis!” Ọ sị, “Lekwa m nʼebe a.”
Bwana alipoona kuwa amegeuka ili aone, Mungu akamwita kutoka ndani ya kile kichaka, “Mose! Mose!” Naye Mose akajibu, “Mimi hapa.”
5 Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Abịakwala nso. Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.”
Mungu akamwambia, “Usikaribie zaidi. Vua viatu vyako, kwa maana mahali unaposimama ni patakatifu.”
6 Ọ sịrị, “Abụ m Chineke nke nna gị. Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.” Mosis zoro ihu ya, nʼihi na ọ tụrụ egwu ilegide Chineke anya.
Kisha akamwambia, “Mimi ni Mungu wa baba yako, Mungu wa Abrahamu, Mungu wa Isaki, na Mungu wa Yakobo.” Mose aliposikia hayo, akafunika uso wake kwa sababu aliogopa kumtazama Mungu.
7 Mgbe ahụ Onyenwe anyị sịrị, “Nʼezie, ahụla m nhụju anya nke ndị m nọ nʼIjipt, anụkwala m mkpu akwa ha, nʼihi aka ike nke ndị na-achị ha dịka ndị ohu. Nʼihi na ama m ahụhụ ha na-agabiga.
Bwana akamwambia, “Hakika nimeona mateso ya watu wangu katika Misri. Nimesikia kilio chao kwa sababu ya wasimamizi wao, nami naguswa na mateso yao.
8 Ya mere, agbadatala m ịnapụta ha site nʼaka ndị Ijipt na ịkpọpụta ha site nʼala ahụ, idubata ha nʼala ọma ahụ, nke sara mbara, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ala ebe ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi.
Basi nimeshuka niwaokoe kutoka mkono wa Wamisri, niwatoe na kuwapandisha kutoka nchi hiyo, niwapeleke katika nchi nzuri na kubwa, nchi itiririkayo maziwa na asali, nchi ya Wakanaani, Wahiti, Waamori, Waperizi, Wahivi na Wayebusi.
9 Ugbu a, akwa ụmụ Izrel eruola m ntị, ahụkwala m otu ndị Ijipt si na-emegbu ha.
Sasa kilio cha Waisraeli kimenifikia, nami nimeona jinsi Wamisri wanavyowatesa.
10 Ugbu a, aga m eziga gị ka i jekwuru Fero, ka i dupụta ndị m bụ ụmụ Izrel site nʼala Ijipt.”
Basi, sasa nenda. Ninakutuma kwa Farao ili kuwatoa watu wangu Waisraeli kutoka Misri.”
11 Mosis sịrị Chineke, “Onye ka m bụ na m ga-ejekwuru Fero, meekwa ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụta?”
Lakini Mose akamwambia Mungu, “Mimi ni nani hata niende kwa Farao kuwatoa Waisraeli nchini Misri?”
12 Chineke gwara ya sị, “Aga m anọnyere gị. Nke a ga-abụ ihe ama nye gị na ọ bụ m na-eziga gị. Mgbe i sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel, unu niile ga-efe m ofufe nʼelu ugwu a.”
Naye Mungu akasema, “Mimi nitakuwa pamoja nawe. Hii itakuwa ishara kwako kwamba ni Mimi nimekutuma: Hapo utakapokuwa umewatoa watu Misri, mtamwabudu Mungu katika mlima huu.”
13 Ma Mosis jụrụ Chineke sị, “Ọ bụrụ na m agwa ụmụ Izrel sị, ‘Chineke nna nna unu zitere m izi unu ozi,’ ha ga-ajụ m sị, ‘Gịnị bụ aha ya?’ Gịnị ka m ga-aza ha?”
Mose akamwambia Mungu, “Ikiwa nitawaendea Waisraeli na kuwaambia, ‘Mungu wa baba zenu amenituma kwenu,’ nao wakiniuliza, ‘Jina lake ni nani?’ Nitawaambia nini?”
14 Chineke sịrị Mosis, “ABỤ M ONYE M BỤ. Naanị gwa ụmụ Izrel na ‘ABỤ M zitere gị.’”
Mungu akamwambia Mose, “Mimi niko ambaye niko. Hivyo ndivyo utakavyowaambia Waisraeli: ‘Mimi niko amenituma kwenu.’”
15 Chineke gakwara nʼihu gwa Mosis sị, Si otu a gwa ụmụ Izrel okwu. “Onyenwe anyị, Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb, zitere m ịbịakwute unu.” Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, aha nke e ji echeta m site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Vilevile Mungu akamwambia Mose, “Waambie Waisraeli, ‘Bwana, Mungu wa baba zenu, Mungu wa Abrahamu, Mungu wa Isaki, na Mungu wa Yakobo amenituma kwenu.’ Hili ndilo Jina langu milele, Jina ambalo mtanikumbuka kwalo kutoka kizazi hadi kizazi.
16 “Gaa, kpọkọta ndị okenye Izrel niile zie ha sị, ‘Onyenwe anyị Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb, egosila m onwe ya, sị m, Eleruola m ọnọdụ unu anya hụ ihe a na-eme unu nʼala Ijipt.
“Nenda, ukawakusanye wazee wa Israeli, uwaambie, ‘Bwana, Mungu wa baba zenu, Mungu wa Abrahamu, Isaki na Yakobo, alinitokea akaniambia: Nimewatazama, nami nimeona mliyofanyiwa katika Misri.
17 Ekweela m nkwa ịkpọpụta unu site nʼahụhụ unu na-ahụ nʼala Ijipt duru unu baa nʼala nke ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi nʼime ya. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’
Nami nimeahidi kuwapandisha kutoka mateso yenu katika nchi ya Misri, niwapeleke nchi ya Wakanaani, Wahiti, Waamori, Waperizi, Wahivi na Wayebusi, nchi itiririkayo maziwa na asali.’
18 “Ndị okenye Izrel ga-anabata ozi gị. Mgbe ahụ gị na ha ga-eso gaa nʼihu eze Ijipt gwa ya sị, ‘Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru ezutela anyị. Kwere ka anyị gaa njem nʼime ọzara abalị atọ gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja.’
“Wazee wa Israeli watakusikiliza. Kisha wewe na wazee mtakwenda kwa mfalme wa Misri na kumwambia, ‘Bwana, Mungu wa Waebrania ametutokea. Turuhusu twende safari ya siku tatu huko jangwani kutoa dhabihu kwa Bwana Mungu wetu.’
19 Amaara m rịị na eze Ijipt agaghị ekwe ka unu gaa, tutu ruo mgbe e ji aka ike kwagide ya.
Lakini nafahamu kwamba mfalme wa Misri hatawaruhusu kwenda, mpaka mkono wenye nguvu umlazimishe.
20 Ma aga m esetipụ aka m tie Ijipt ihe otiti, site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke m ga-eme nʼetiti ya. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ahapụ unu ka unu laa.
Kwa hiyo nitaunyoosha mkono wangu na kuwapiga Wamisri kwa maajabu yote nitakayofanya miongoni mwao. Baada ya hayo, atawaruhusu mwondoke.
21 “Aga m emekwa ka unu nweta amara nʼihu ndị Ijipt, ka unu ghara ịgba aka mgbe unu na-ala.
“Nami nitawapa hawa watu upendeleo mbele ya Wamisri, kwa hiyo mtakapoondoka nchini hamtaondoka mikono mitupu.
22 Nwanyị ọbụla ga-arịọ site nʼaka nwanyị Ijipt onye agbataobi ya na nwanyị ọbịa bi nʼụlọ ya, ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na akwa dị iche iche. Unu ga-eyikwasị ha ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom, bịa si otu a kwakọrọ ngwongwo ndị Ijipt.”
Kila mwanamke Mwisraeli atamwomba jirani yake Mmisri na mwanamke yeyote anayeishi nyumbani kwake ampe vyombo vya fedha, dhahabu na nguo, ambavyo mtawavika wana wenu na binti zenu. Hivyo mtawateka nyara Wamisri.”

< Ọpụpụ 3 >