< Ọpụpụ 3 >
1 Nʼoge a, Mosis na-azụ igwe anụ ụlọ Jetro ọgọ ya nwoke, onye nchụaja na Midia. Otu ụbọchị, o duuru igwe anụ ụlọ ndị a gaa nʼakụkụ ọzara. Ọ batara Horeb, ugwu Chineke.
Now Moses fed the sheep of Jethro his father in law, the priest of Madian: and he drove the flock to the inner parts of the desert, and came to the mountain of God, Horeb.
2 Nʼebe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọkụ na-ere nʼetiti ọhịa. Mosis hụrụ na ọ bụ ezie na ọhịa ahụ na-enwu ọkụ ma ọ naghị ere ọkụ.
And the Lord appeared to him in a flame of fire out of the midst of a bush: and he saw that the bush was on fire and was not burnt.
3 Nʼihi ya, Mosis chere nʼobi ya sị, “Aga m aga nso leruo ihe omimi a anya, otu ọkụ si enwu ma ọhịa anaghị ere ọkụ.”
And Moses said: I will go and see this great sight, why the bush is not burnt.
4 Mgbe Onyenwe anyị hụrụ na ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, Chineke kpọrọ ya oku site nʼime ọhịa ahụ, “Mosis! Mosis!” Ọ sị, “Lekwa m nʼebe a.”
And when the Lord saw that he went forward to see, he called to him out of the midst of the bush, and said: Moses, Moses. And he answered: Here I am.
5 Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Abịakwala nso. Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.”
And he said: Come not nigh hither, put off the shoes from thy feet: for the place whereon thou standest is holy ground.
6 Ọ sịrị, “Abụ m Chineke nke nna gị. Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.” Mosis zoro ihu ya, nʼihi na ọ tụrụ egwu ilegide Chineke anya.
And he said: I am the God of thy father, the God of Abraham, the God of Isaac, and the God of Jacob. Moses hid his face: for he durst not look at God.
7 Mgbe ahụ Onyenwe anyị sịrị, “Nʼezie, ahụla m nhụju anya nke ndị m nọ nʼIjipt, anụkwala m mkpu akwa ha, nʼihi aka ike nke ndị na-achị ha dịka ndị ohu. Nʼihi na ama m ahụhụ ha na-agabiga.
And the Lord said to him: I have seen the affliction of my people in Egypt, and I have heard their cry because of the rigour of them that are over the works:
8 Ya mere, agbadatala m ịnapụta ha site nʼaka ndị Ijipt na ịkpọpụta ha site nʼala ahụ, idubata ha nʼala ọma ahụ, nke sara mbara, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ala ebe ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi.
And knowing their sorrow, I am come down to deliver them out of the hands of the Egyptians, and to bring them out of that land into a good and spacious land, into a land that floweth with milk and honey, to the places of the Chanaanite, and Hethite, and Amorrhite, and Pherezite, and Hevite, and Jebusite.
9 Ugbu a, akwa ụmụ Izrel eruola m ntị, ahụkwala m otu ndị Ijipt si na-emegbu ha.
For the cry of the children of Israel is come unto me: and I have seen their affliction, wherewith they are oppressed by the Egyptians.
10 Ugbu a, aga m eziga gị ka i jekwuru Fero, ka i dupụta ndị m bụ ụmụ Izrel site nʼala Ijipt.”
But come, and I will send thee to Pharao, that thou mayst bring forth my people, the children of Israel out of Egypt.
11 Mosis sịrị Chineke, “Onye ka m bụ na m ga-ejekwuru Fero, meekwa ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụta?”
And Moses said to God: Who am I that I should go to Pharao, and should bring forth the children of Israel out of Egypt?
12 Chineke gwara ya sị, “Aga m anọnyere gị. Nke a ga-abụ ihe ama nye gị na ọ bụ m na-eziga gị. Mgbe i sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel, unu niile ga-efe m ofufe nʼelu ugwu a.”
And he said to him: I will be with thee: and this thou shalt have for a sign, that I have sent thee: When thou shalt have brought my people out of Egypt, thou shalt offer sacrifice to God upon this mountain.
13 Ma Mosis jụrụ Chineke sị, “Ọ bụrụ na m agwa ụmụ Izrel sị, ‘Chineke nna nna unu zitere m izi unu ozi,’ ha ga-ajụ m sị, ‘Gịnị bụ aha ya?’ Gịnị ka m ga-aza ha?”
Moses said to God: Lo, I shall go to the children of Israel, and say to them: The God of your fathers hath sent me to you. If they should say to me: What is his name? what shall I say to them?
14 Chineke sịrị Mosis, “ABỤ M ONYE M BỤ. Naanị gwa ụmụ Izrel na ‘ABỤ M zitere gị.’”
God said to Moses: I AM WHO AM. He said: Thus shalt thou say to the children of Israel: HE WHO IS, hath sent me to you.
15 Chineke gakwara nʼihu gwa Mosis sị, Si otu a gwa ụmụ Izrel okwu. “Onyenwe anyị, Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb, zitere m ịbịakwute unu.” Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, aha nke e ji echeta m site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
And God said again to Moses: Thus shalt thou say to the children of Israel: The Lord God of your fathers, the God of Abraham, the God of Isaac, and the God of Jacob, hath sent me to you: This is my name for ever, and this is my memorial unto all generations.
16 “Gaa, kpọkọta ndị okenye Izrel niile zie ha sị, ‘Onyenwe anyị Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb, egosila m onwe ya, sị m, Eleruola m ọnọdụ unu anya hụ ihe a na-eme unu nʼala Ijipt.
Go, gather together the ancients of Israel, and thou shalt say to them: The Lord God of your fathers, the God of Abraham, the God of Isaac, and the God of Jacob, hath appeared to me, saying: Visiting I have visited you: and I have seen all that hath befallen you in Egypt.
17 Ekweela m nkwa ịkpọpụta unu site nʼahụhụ unu na-ahụ nʼala Ijipt duru unu baa nʼala nke ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi nʼime ya. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’
And I have said the word to bring you forth out of the affliction of Egypt, into the land of the Chanaanite, the Hethite, and the Amorrhite, and Pherezite, and Hevite, and Jebusite, to a land that floweth with milk and honey.
18 “Ndị okenye Izrel ga-anabata ozi gị. Mgbe ahụ gị na ha ga-eso gaa nʼihu eze Ijipt gwa ya sị, ‘Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru ezutela anyị. Kwere ka anyị gaa njem nʼime ọzara abalị atọ gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja.’
And they shall hear thy voice: and thou shalt go in, thou and the ancients of Israel, to the king of Egypt, and thou shalt say to him: The Lord God of the Hebrews hath called us: we will go three days’ journey into the wilderness, to sacrifice unto the Lord our God.
19 Amaara m rịị na eze Ijipt agaghị ekwe ka unu gaa, tutu ruo mgbe e ji aka ike kwagide ya.
But I know that the king of Egypt will not let you go, but by a mighty hand.
20 Ma aga m esetipụ aka m tie Ijipt ihe otiti, site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke m ga-eme nʼetiti ya. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ahapụ unu ka unu laa.
For I will stretch forth my hand and will strike Egypt with all my wonders which I will do in the midst of them: after these he will let you go.
21 “Aga m emekwa ka unu nweta amara nʼihu ndị Ijipt, ka unu ghara ịgba aka mgbe unu na-ala.
And I will give favour to this people, in the sight of the Egyptians: and when you go forth, you shall not depart empty:
22 Nwanyị ọbụla ga-arịọ site nʼaka nwanyị Ijipt onye agbataobi ya na nwanyị ọbịa bi nʼụlọ ya, ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na akwa dị iche iche. Unu ga-eyikwasị ha ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom, bịa si otu a kwakọrọ ngwongwo ndị Ijipt.”
But every woman shall ask of her neighbour, and of her that is in her house, vessels of silver and of gold, and raiment: and you shall put them on your sons and daughters, and shall spoil Egypt.