< Ọpụpụ 27 >

1 “Ị ga-eji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja. Ịdị elu ya ga-abụ otu mita na iri sentimita anọ. Ogologo ya na obosara ya ga-aha nʼotu, mita abụọ na iri sentimita atọ, mita abụọ na iri sentimita atọ.
And thou shalt make the altar of acacia-wood, five cubits the length, and five cubits the breadth; the altar shall be square; and the height thereof three cubits.
2 Rụnye mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ bụrụ ihe e jikọtara nʼotu. Jiri bronz machie ebe ịchụ aja a.
And thou shalt make its horns at the four corners thereof; its horns shall be of itself; and thou shalt overlay it with copper.
3 Jiri bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ.
And thou shalt make its pots to cleanse it of the fat, its shovels, and its bowls, and its forks, and its firepans; for all the utensils thereof thou shalt employ copper.
4 Ị ga-eme ngịga mbadamba, ihe ọkpụkpa bronz, meekwa mgbaaka bronz nke ga-adị nʼakụkụ anọ nke ngịga ahụ.
And thou shalt make for it a grating of network of copper; and on the net shalt thou make four copper rings at its four corners;
5 Tinye ya nʼokpuru oghere dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Tinye ya ka ọ dịrị nʼetiti ebe ịchụ aja ahụ.
and thou shalt put it under the ledge of the altar beneath, and the net shall be to the very middle of the altar.
6 Jiri osisi akashia mee mkpara osisi maka ebe ịchụ aja ahụ, were bronz machie ha.
And thou shalt make staves for the altar, staves of acacia-wood, and overlay them with copper.
7 A ga-eme ka mkpara ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ka ha dị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ mgbe ọbụla a na-ebu ya.
And its staves shall be put into the rings, that the staves may be on both sides of the altar, when it is carried.
8 Jiri obodobo osisi rụọ ebe ịchụ aja ahụ, ka o nwee oghere nʼime, dịka igbe. Ị ga-arụ ya dịka e gosiri gị nʼelu ugwu ahụ.
Hollow with boards shalt thou make it: as it hath been shewn thee on the mountain, so shall they make [it].
9 “Ị ga-arụkwa ogige maka ụlọ nzute ahụ. Nʼakụkụ ndịda ya ga-adị iri mita anọ na ise nʼogologo. Ọ ga-enwekwa akwa mgbochi nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.
And thou shalt make the court of the tabernacle. On the south side, southward, hangings for the court of twined byssus; a hundred cubits the length for the one side,
10 Iri ogidi abụọ ga-adị na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ. Anya nko ogidi ndị ahụ ha na ihe ikegide ha ga-abụ ọlaọcha.
and the twenty pillars thereof, and their twenty bases of copper, the hooks of the pillars and their connecting-rods of silver.
11 Otu a kwa, akụkụ ugwu ga-adịkwa iri mita anọ na ise. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, nwekwa iri ogidi abụọ na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ, ya na anya nko nke ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.
And likewise on the north side in length, hangings a hundred [cubits] long, and its twenty pillars, and their twenty bases of copper; the hooks of the pillars and their connecting-rods of silver.
12 “Akụkụ ọdịda anyanwụ nke ogige ahụ ga-adị iri mita abụọ na atọ nʼobosara. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, na ogidi iri na ebe ndọkwasị iri.
— And the breadth of the court on the west side, hangings of fifty cubits; their pillars ten, and their bases ten.
13 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe anwụ na-awalite, akwa mgbochi ahụ ga-adịkwa iri mita abụọ na atọ nʼobosara.
— And the breadth of the court on the east side, eastward, fifty cubits;
14 Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ ga-adị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.
the hangings on the one wing, of fifteen cubits; their pillars three, and their bases three.
15 Otu a kwa, akwa mgbochi nke ịdị ogologo ya dị mita asaa ga-adị nʼakụkụ nke ọzọ. Ọ ga-enwekwa ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.
And on the other wing hangings of fifteen [cubits]; their pillars three, and their bases three.
16 “Banyere ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ, mee akwa mgbochi ga-adị mita itoolu nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, akaọrụ nke onye na-akpa ihe ịchọ mma. Ọ ga-enwe ogidi anọ na ihe ndọkwasị anọ.
— And for the gate of the court a curtain of twenty cubits, of blue, and purple, and scarlet, and twined byssus, embroidered with needlework; their pillars four, and their bases four.
17 Ogidi niile dị gburugburu ogige ahụ ga-enwe ihe njikọta ọlaọcha na nko, tinyere ebe ndọkwasị bronz.
All the pillars of the court round about shall be fastened together with [rods of] silver; their hooks of silver, and their bases of copper.
18 Ogologo ogige ahụ ga-abụ iri mita anọ na ise. Ebe obosara ya ga-adị iri mita abụọ na atọ. Ọ ga-enwe akwa mgbochi nke ịdị elu ya dị iri mita abụọ na atọ, nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, nwekwa ebe ndọkwasị bronz.
The length of the court shall be a hundred cubits, and the breadth fifty everywhere, and the height five cubits of twined byssus; and their bases of copper.
19 Ngwongwo niile nke e ji eje ozi nʼụlọ nzute ahụ, ihe ọbụla bụ ọrụ ha, tinyere ǹtu ya niile na nke ogige ahụ, ga-abụ ihe e ji bronz rụọ.
All the utensils of the tabernacle for the service thereof and all the pegs thereof, and all the pegs of the court shall be of copper.
20 “Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ nke a na-agwaghị ihe maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile.
And thou shalt command the children of Israel, that they bring thee olive oil, pure, beaten, for the light, to light the lamp continually.
21 Nʼime ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe Ihe Ama ahụ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eme ka oriọna ndị ahụ dị nʼihu Onyenwe anyị, na-enwu ọkụ, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nʼetiti ndị Izrel nye ọgbọ niile dị nʼihu.
In the tent of meeting outside the veil, which is before the testimony, Aaron and his sons shall dress them from evening to morning before Jehovah: [it is] an everlasting statute, for their generations, on the part of the children of Israel.

< Ọpụpụ 27 >